Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

‘Ọ Dị Nkenke Ma Nwee Ọtụtụ Ihe Mmụta’

‘Ọ Dị Nkenke Ma Nwee Ọtụtụ Ihe Mmụta’

‘Ọ Dị Nkenke Ma Nwee Ọtụtụ Ihe Mmụta’

Otú ahụ ka otu nwanyị si kọwaa broshuọ bụ́ Gịnị Ka Chineke Na-achọ n’Aka Anyị? Ọ gakwara n’ihu ịkọwa ihe mere o ji kwuo otú ahụ. “Site n’iji broshuọ a mee ihe,” ka o kwuru, “otu agadi nwanyị, bụ́ Gloria, enweghachiwo ọchịchọ ịgụ Bible. O siwo n’enweghị ike ịnọdụ ala gụọ akwụkwọ ma ghọta ihe ọ gụrụ gaa n’ịbụ onye nwere ike ịnọdụ ala gụọ akwụkwọ ruo awa abụọ. Ọ na-akwadebe ihe ọmụmụ ya nile nke ọma tupu oge eruo ma na-atụle akụkụ Akwụkwọ Nsọ nile dị na ya.”

Gịnị Ka Chineke Na-achọ n’Aka Anyị? bụ broshuọ dị peeji 32, nke hà ka magazin a. Ọ na-eme ka ihe bụ́ nzube Chineke maka ihe a kpọrọ mmadụ pụta ìhè ma na-ekwu ihe ọ dị mkpa ka anyị mee iji nweta ihu ọma ya. Ihe ọmụmụ ndị na-adọrọ mmasị bụ́ ndị dị n’ime ya na-agụnye “Ònye Bụ Chineke?,” “Ònye Bụ Jisọs Kraịst?,” “Gịnị Bụ Nzube Chineke Maka Ụwa?,” na “Gịnị Bụ Alaeze Chineke?”

Ọ bụrụ na ọ ga-amasị gị inweta otu broshuọ a, biko kpọtụrụ Ndịàmà Jehova nọ n’ógbè gị. Ọ bụrụ na ị ga-enwe mmasị ka mmadụ kpọtụrụ gị, biko dejupụta akụkụ a pụrụ ịdọkapụta adọkapụta dị na peeji a ma zite ya n’adres e dere na ya ma ọ bụ n’adres nke kwesịrị ekwesị e depụtara na peeji nke 5 na magazin a.

□ Biko kpọtụrụnụ m iji duziere m ọmụmụ Bible ebe obibi n’efu.