Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ụzọ Ndị Ọzọ Pụrụ Isi Nye Aka

Ụzọ Ndị Ọzọ Pụrụ Isi Nye Aka

Ụzọ Ndị Ọzọ Pụrụ Isi Nye Aka

IKEKWE ọ dị onye ị maara nke nwere nsogbu ịda mbà n’obi ma ọ bụ nke ihe imetụ mmadụ n’isi. Ọ bụrụ otú ahụ, olee otú ị pụrụ isi nyere ya aka? D. J. Jaffe, bụ́ onye so ná Njikọ Mba nke Na-ahụ Maka Ndị Na-arịa Ọrịa Uche, na-enye ndụmọdụ a rijuru afọ: “Elela ya anya na ọrịa ahụ na onye na-arịa ya bụ otu ihe; kama nke ahụ, kpọọ ọrịa ahụ asị ma hụ onye na-arịa ya n’anya.”

Otu nwanyị aha ya bụ Susanna nwere ndidi na ịhụnanya iji mee nnọọ nke ahụ. O nwere otu enyi nke ihe na-emetụ n’isi. “E nwere oge ndị ọ na-adịghị achọ nnọọ ịnọ m nso,” ka Susanna na-ekwu. Kama ịgbahapụ enyi ya, Susanna mere nnyocha iji mụta banyere nsogbu ahụ. “Ugbu a,” ka ọ na-ekwu, “aghọtawo m otú ọrịa enyi m siworo metụta àgwà ya.” Susanna na-eche na itinye mgbalị iji ghọta ọnọdụ onye nwere nsogbu ahụ nọ na ya pụrụ iweta ụgwọ ọrụ dị ukwuu. “Ọ pụrụ inyere gị aka ịbịa hụ ọmarịcha onye nke na-arịa ọrịa ahụ ma jiri onye ahụ kpọrọ ihe,” ka ọ na-ekwu.

Ọ bụrụ na onye nwere nsogbu ahụ bụ onye ezinụlọ gị, ọ dị oké mkpa iji obi gị dum na-akwado ya. Mario, bụ́ onye a kpọtụrụ aha na mbụ n’usoro isiokwu ndị a, mụtara nke a ngwa ngwa. Nwunye ya, bụ́ Lucia, bụ́kwa onye a kpọtụrụ aha na mbụ, bụ onye ihe na-emetụ n’isi. “Na mbụ,” ka Mario na-ekwu,“ịdị na-esoro nwunye m aga ahụ dọkịta na ịgụ banyere ọrịa a dị egwu, iji mara ihe anyị na-eche ihu, nyeere m aka. Mụ na Lucia na-ekwurịta nnọọ okwu ma nọgide na-anagide ọnọdụ ọ bụla dapụtaranụ ka oge na-aga.”

Nkwado Sitere n’Ọgbakọ Ndị Kraịst

Bible na-adụ Ndị Kraịst ọdụ ‘ịgụgụ mkpụrụ obi ndị dara mbà’ nakwa ‘inwe ogologo ntachi obi n’ebe mmadụ nile nọ.’ (1 Ndị Tesalọnaịka 5:14) Olee otú ị pụrụ isi mee nke a? Nke mbụ, ọ dị mkpa ịghọta ọdịiche dị n’etiti ọrịa uche na ọrịa ime mmụọ. Dị ka ihe atụ, onye so dee Bible, bụ́ Jems, gosiri na ekpere pụrụ ime ka ahụ́ dị onye ahụ́ na-adịghị ike n’ụzọ ime mmụọ mma. (Jems 5:14, 15) Ka o sina dị, Jizọs kwetara na ndị ahụ́ nkịtị na-enye nsogbu nwere mkpa maka dibịa. (Matiu 9:12) N’ezie, o kwesịrị ekwesị ma na-enye aka mgbe nile bụ́ ikpegara Jehova ekpere maka nchegbu ọ bụla anyị na-enwe, gụnyere ahụ́ ike anyị. (Abụ Ọma 55:22; Ndị Filipaị 4:6, 7) Ma Bible adịghị ekwu na mmadụ ikerekwu ókè n’ọrụ ime mmụọ ga-akwụsị nsogbu ahụ́ ike ọ na-enwe.

Ya mere, Ndị Kraịst nwere ezi uche na-ezere inye echiche na ọ bụ ndị dara mbà n’obi kpataara onwe ha ahụhụ ha nọ na ya. Okwu ndị dị otú ahụ agaghị enye aka ọ bụla dị ka nke ahụ ndị nkasi obi adịgboroja atọ gwara Job na-enyereghị ya aka ọ bụla. (Job 8:1-6) Nke bụ́ eziokwu bụ na n’ọtụtụ ọnọdụ, ịda mbà n’obi agaghị aka mma ọ gwụla ma e ji ọgwụ gwọọ ya. Ọ dị otú ahụ karịsịa ma ọ bụrụ na mmadụ dara mbà n’obi nke ukwuu, ikekwe ọbụna na-achọ igbu onwe ya. N’ọnọdụ ndị dị otú ahụ, ọ dị mkpa ka ndị ọkachamara lebara onye dị otú ahụ anya.

Ma, e nwere ihe dị ukwuu Ndị Kraịst ibe onye ahụ pụrụ ime iji nyere ya aka. N’ezie, ọ dị mkpa inwe ndidi. Dị ka ihe atụ, ụfọdụ ọrụ Ndị Kraịst pụrụ ịbụ ihe na-agwụ ike karịsịa nye ndị nwere nsogbu mgbanwe mberede n’ọnọdụ uche. Otu onye ihe na-emetụ n’isi nke aha ya bụ Diane, na-ekwu, sị: “Ikere òkè n’ozi na-abụrụ m ọgụ na mgba. Ọ bụ ihe ịma aka iwegara ndị ọzọ ozi ọma nke obi ụtọ sitere na Bible mgbe mụ onwe m na-enweghị ahụ́ ọma na obi ụtọ.”

Iji nyere ndị nwere nsogbu a aka, gbalịsie ike ịdị na-enwe mmetụta ọmịiko. (1 Ndị Kọrint 10:24; Ndị Filipaị 2:4) Gbalịa ịdị na-ele ihe anya otú onye ọrịa ahụ si ele ya anya kama ịbụ otú gị onwe gị si ele ya. Adịla na-achọ ka onye ahụ mee ihe karịrị ihe ọ ga-emeli. “Mgbe ndị mmadụ nakweere m n’agbanyeghị nsogbu m nwere,” ka Carl, bụ́ onye ya na ịda mbà n’obi na-alụ, na-ekwu, “ana m eji nke nta nke nta amalite inwe mmetụta nke ịbụ onye a chọrọ. Site n’enyemaka ndị enyi m ole na ole, bụ́ ndị mere okenye karịa m, ji ndidi nye m, enwewo m ike iso Chineke na-enwe mmekọrịta chiri anya karị, enwetawokwa m ọṅụ dị ukwuu n’inyere ndị ọzọ aka ime otu ihe ahụ.”

Ọ bụrụ na e nyere ndị na-arịa ọrịa aka, ha pụrụ inweta ahụ́ efe dị ukwuu n’ahụhụ ha. Tụlee banyere otu nwanyị bụ́ Onye Kraịst nke aha ya bụ Brenda, bụ́ onye ihe na-emetụ n’isi. “Ndị enyi m nọ n’ọgbakọ akwadowo m ma na-egosi m nghọta n’ụzọ dị egwu n’oge ndị m dara mbà n’obi, n’adịtụghị mgbe ha nyere echiche na adịghị m ike n’ụzọ ime mmụọ,” ka ọ na-ekwu. “E nwewo oge ndị ha kwere ka m soro ha gaa ozi ma kwe ka m na-ege ha nanị ntị ma ọ bụkwanụ oge ndị ha nwetaara m oche n’Ụlọ Nzukọ Alaeze ka m wee nwee ike ịbata mgbe mmadụ nile nọdụsịworo ala.”

Enyemaka nke ndị okenye ọgbakọ bụ́ ndị na-ahụ n’anya ma nwee mmetụta ọmịiko, enyeworo Cherie, nke a kpọtụrụ aha n’isiokwu bu ụzọ, bụ́ onye nwere nsogbu nke ịda mbà n’obi aka n’ụzọ dị ukwuu. Ọ na-ekwu, sị: “Mgbe ndị okenye mesighachiri m obi ike na Jehova hụrụ m n’anya, gụọrọ m akụkụ ụfọdụ sitere n’Okwu Chineke, bụ́ Bible, ma kwuo banyere nzube Jehova iweta paradaịs nke a ga-enwe udo na ezi ahụ́ ike na ya, mgbe ha na-esokwa m ekpe ekpere—ọbụna na fon—ọ na-adị m ka e buturu ibu na-anyịgbu m. Amaara m na Jehova na ụmụnna m agbahapụbeghị m, nke ahụ na-enyekwa m ume.”

Obi abụọ adịghị ya na site n’inye nkwado dị ukwuu, ndị ezinụlọ na ndị enyi pụrụ ikere òkè pụtara ìhè n’ime ka ọnọdụ onye nwere nsogbu ahụ ka mma. “Echere m na m na-achịkwali ndụ m ugbu a karị,” ka Lucia na-ekwu. “Mụ na di m agbakọwo aka rụsie ọrụ ike iji na-anagide ọnọdụ a, ihe kakwaara anyị mma ugbu a.”

Ọtụtụ ndị ha na ụdị ọrịa uche dịgasị iche iche na-alụ ugbu a, na-aghọta na ọgụ ha na ọrịa ndị a dị egwu na-alụ bụ nke na-adịte aka. Ma, Bible na-ekwe nkwa na n’ụwa ọhụrụ Chineke, “onye obibi ya agaghị asị, Ana m arịa ọrịa.” (Aịsaịa 33:24) Ọrịa ndị na-akpata nhụsianya bụ́ ndị na-emekpa ọtụtụ ndị ahụ́ taa ga-apụ n’anya. N’ezie, ọ bụ ihe na-enye obi ụtọ iche banyere nkwa Chineke maka ụwa ọhụrụ bụ́ nke nrịanrịa nile—gụnyere nsogbu mgbanwe mberede n’ọnọdụ uche—ga-apụ n’anya ruo mgbe ebighị ebi. N’oge ahụ, ka Bible na-ekwu, iru újú ma ọ bụ mkpu ákwá ma ọ bụ ihe mgbu agaghịzi adị.—Mkpughe 21:4.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 12]

Jizọs kwetara na ndị ahụ́ na-enye nsogbu nwere mkpa maka dibịa.—MATIU 9:12

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 13]

Bible na-ekwe nkwa na n’ụwa ọhụrụ Chineke, “onye obibi ya agaghị asị, Ana m arịa ọrịa.”—AỊSAỊA 33:24