Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Inye Ụmụaka Ihe Dị Ha Mkpa

Inye Ụmụaka Ihe Dị Ha Mkpa

Inye Ụmụaka Ihe Dị Ha Mkpa

O DOWO anya na ụmụaka chọrọ nlebara anya dị ukwuu, ihe àmà na-egosikwa na ọtụtụ n’ime ha adịghị enweta ya. Ọnọdụ ndị ntorobịa nọ na ya taa na-egosi na ọ bụ otú ahụ ka ọ dị kpọmkwem. “Ọ dịbeghị mgbe ọ bụla ọzọ ụmụaka anyị na-adịghị eso ezinụlọ ha enwe mmekọrịta, mgbe ha na-enweghị nnọọ ezigbo ahụmahụ nakwa ezi amamihe otú ọ dị ugbu a,” ka otu onye nchọpụta e hotara ihe o kwuru n’akwụkwọ akụkọ bụ́ The Globe and Mail nke Toronto, Canada, mere ná mkpesa.

Olee ebe mmiri si banye n’opi ụgbọgụrụ? À pụrụ ikwu na ihe kpatara nsogbu ahụ bụ, ma ọ́ dịghị ihe ọzọ n’ụzọ ụfọdụ, aghọtaghị mkpa ọ dị ilebara ụmụ ọhụrụ anya? “Ọ dị anyị nile mkpa ịmụta otú e si azụ ụmụ,” ka otu ọkà n’ịmụ akparamàgwà mmadụ na-akọwa, bụ́ onye na-enyere ụmụ nwanyị na-akpata obere ego aka ịmụta otú ha ga-esi na-elekọta ụmụ ọhụrụ ha. “Ọ dịkwa anyị mkpa ịghọta na oge anyị na ụmụ anyị ji nọkọọ ugbu a ga-abara anyị uru nke ukwuu n’ọdịnihu.”

Ọ dị ọbụna ụmụ ọhụrụ mkpa ịdị na-enweta ntụziaka mgbe nile. Ọ bụghị ịdị na-enweta ya nanị minit ole na ole mgbe ụfọdụ, kama mgbe nile—ee, n’oge nile n’ụbọchị. Oge e ji soro ụmụaka nọkọọ, site n’oge a mụrụ ha gaa n’ihu, dị oké mkpa iji mee ka ha too eto n’ụzọ kwesịrị ekwesị.

Mkpa Ọ Dị Ime Nkwadebe

Iji na-ebu nnukwu ibu ọrụ ha, ọ dị nne na nna mkpa ịkwadebe maka ọbịbịa nwa ọhụrụ ha. Ha pụrụ ịmụta ihe site n’ụkpụrụ Jizọs Kraịst kwupụtara banyere mkpa ọ dị ime nkwadebe tupu oge eruo. Ọ sịrị: “Ònye n’ime unu bụ́ onye chọrọ iwu ụlọ elu, nke na-adịghị ebu ụzọ nọdụ ala gbakọọ ihe ọ ga-efu?” (Luk 14:28) Ịzụ nwa—nke a na-akpọkarị ọrụ afọ 20—siri nnọọ ike karịa iwu ụlọ elu. Ya mere, iji zụlite nwa n’ụzọ gara nke ọma, ọ dị mkpa inwe usoro ihe omume, dị nnọọ ka ụkpụrụ ga-adị onye na-ewu ụlọ mkpa.

Nke mbụ, ọ dị mkpa ime nkwadebe n’uche nakwa n’ụzọ ime mmụọ maka ibu ibu ọrụ nke ịzụ nwa. Nnyocha e mere n’ebe ụmụ nwanyị 2,000 dị ime na Germany nọ gosiri na ụmụaka nke ndị inyom bụ́ ndị tụrụ anya inwe ụmụ, gbasiri nnọọ ike—n’ụzọ mmetụta uche nakwa n’ụzọ anụ ahụ́—karịa ụmụaka nke ndị inyom na-achọghị ụmụ ha. N’aka nke ọzọ, otu onye nchọpụta mere atụmatụ na nwanyị nke tọrọ n’alụmdi na nwunye udo na-adịghị na ya nwere ohere dị pasent 237 nke ịmụ nwa ga-enwe nsogbu mmetụta uche ma ọ bụ nkwarụ karịa nwanyị nke alụmdi na nwunye ya na-enweghị nsogbu.

Mgbe ahụ, o doro anya na ka nwatakịrị wee too eto nke ọma, enyemaka nke ndị nna dị mkpa. Dr. Thomas Verny kwuru, sị: “Ọ bụ ihe ole na ole dị ize ndụ n’ụzọ mmetụta uche nakwa n’ụzọ anụ ahụ́ nye nwatakịrị karịa inwe nna nke na-emegbu ma ọ bụ na-eleghara nwunye ya dị ime anya.” N’ezie, e kwuwo mgbe mgbe na onyinye kasị mma nwatakịrị pụrụ inweta bụ nna nke hụrụ nne nwata ahụ n’anya.

Mmiri ọgwụ ahụ́ bụ́ hormone nke na-akpata nchekasị na nrụgide, bụ́ nke na-abanye n’ọbara nwanyị dị ime, pụrụ imetụta nwa o bu n’afọ. Otú ọ dị, o yiri ka ihe àmà ọ̀ na-egosi na ihe dị ize ndụ bụ nanị nchekasị siri oké ike ma ọ bụ nke dịruru ogologo oge nke nwanyị dị ime nwere, kama ịbụ obi mgbarụ ma ọ bụ nrụgide ndị ọ na-enwe mgbe ụfọdụ. Ihe kasị mkpa yiri ka ọ̀ bụ mmetụta nwanyị ahụ dị ime na-enwe n’ebe nwa o bu n’afọ nọ. *

Gịnị ma ọ bụrụ na ị dị ime ma di gị adịghị akwado gị, ma ọ bụkwanụ na gị onwe gị enweghị mmasị ịghọ nne? Ọ bụghị ihe ọhụrụ na ọnọdụ dị iche iche pụrụ ime ka nwanyị nwee nkụda mmụọ banyere ime ọ dị. Ma, na-echeta mgbe nile na ọ bụghị nwa ahụ ka o si n’aka. Oleezi otú ị pụrụ isi nọgide na-enwe obi dị jụụ n’agbanyeghị ọnọdụ ọjọọ ị pụrụ ịnọ na ya?

Ntụziaka amamihe dị na ya nke e nyere n’Okwu Chineke, bụ́ Bible, enyeworo ọtụtụ nde mmadụ aka. Ọ na-ekwu, sị: “N’ihe nile site n’ekpere na ịrịọsi arịrịọ ike ya na inye ekele, meenụ ka Chineke mara ihe unu na-arịọ; udo nke Chineke nke karịrị echiche nile ga-echekwa obi unu na ike iche echiche unu nche site na Kraịst Jizọs.” Ọ ga-atụ gị n’anya otú ịgbaso okwu ndị ahụ pụrụ isi nyere gị aka ịgbaso ndụmọdụ a: “Enwela nchegbu banyere ihe ọ bụla.” (Ndị Filipaị 4:6, 7) Ị ga-ahụ nkwado na nlekọta nke Onye Okike, bụ́ onye pụrụ ilekọta gị.—1 Pita 5:7.

Ọ Bụghị Ahụmahụ A Na-adịghị Ahụkarị

N’ime izu ole na ole ndị mbụ ha mụsịrị nwa, ndị nne ụfọdụ mụrụ nwa mbụ na-enwe obi mgbarụ na ike ọgwụgwụ ha na-apụghị ịkọwa ihe kpatara ya. Ọbụna ụmụ nwanyị ndị obi dị ụtọ na ha mụrụ nwa, pụrụ ịda mbà n’obi. Mgbanwe dị otú ahụ n’ọnọdụ uche abụghị ihe ọhụrụ. Nke a bụ n’ihi na mgbe ụmụ nwanyị mụsịrị nwa, ọ̀tụ̀tụ̀ mmiri ọgwụ hormone dị n’ahụ́ ha pụrụ ịgbanwe n’ụzọ dị ịrịba ama. Ọ bụkwa ihe a na-ahụkarị bụ́ nne mụrụ nwa mbụ ịbụ onye ihe ndị a chọrọ ya n’aka dị ka nne—inye nwa nri, ịgbanwe nwa ákwà, na ilekọta nwa ya, bụ́ onye na-amaghị ihe ọ bụla banyere oge—na-agwụ ike.

Otu nne chere na nwa ya na-ebe ákwá nanị iji taa ya ahụhụ. Ka a sịkwa ihe mere otu ọkachamara n’ịzụ ụmụ na Japan ji kwuo, sị: “Ọ dịghị onye a gụpụrụ n’inweta nrụgide na-abịa site n’ịzụ nwa.” Dị ka ọkachamara a si kwuo, “ihe kasị mkpa bụ ka nne ghara ịdị na-anọrọ onwe ya ma ọlị.”

Ọ bụrụgodị na onye bụ́ nne adaa mbà n’obi mgbe ụfọdụ, ọ pụrụ ichebe nwa ya pụọ n’ịbụ onye ịda mbà n’obi ya ga-emetụta. Magazin bụ́ Time kọrọ, sị: “Ndị nne bụ́ ndị jisiri ike merie ịda mbà n’obi ha, ndị na-elebara nnọọ ụmụ ha anya ma soro ha na-egwuri egwu, nwere ụmụaka ndị ụbụrụ ha na-eme ka ha nwee nnọọ ihu ọchị karị.” *

Otú Onye Bụ́ Nna Pụrụ Isi Nye Aka

Nna nwatakịrị na-anọkarị n’ọnọdụ kasị mma inye aka na inye nkwado. Mgbe nwatakịrị na-ebe ákwá n’etiti abalị, ọtụtụ mgbe, nna ya pụrụ ilekọta ya anya ka nwunye ya wee nwee ike ihi ụra. Bible na-ekwu, sị: “Ndị bụ́ di aghaghị iji nchebara echiche na-emeso ndị nwunye ha ihe mgbe nile ha na-ebikọ ọnụ.”—1 Pita 3:7, The Jerusalem Bible.

Jizọs Kraịst setịpụrụ ihe nlereanya zuru ezu nke ndị bụ́ di ga-agbaso. Ọbụna o nyere ndụ ya maka ụmụazụ ya. (Ndị Efesọs 5:28-30; 1 Pita 2:21-24) N’ihi ya, ndị bụ́ di bụ́ ndị dị njikere ịchụ oge ha gaara eji atụsara ahụ́ n’àjà iji bute ụzọ n’ịzụ ụmụ ha, na-eṅomi Kraịst. N’ezie, ịzụ ụmụ bụ ọrụ a na-agbakọ aka arụ bụ́ nke ọ dị mkpa ka nne na nna jikọọ aka rụọ.

Ọrụ A Na-agbakọ Aka Arụ

“Dị ka di na nwunye, anyị akparịtawo n’ụzọ zuru ezu otú anyị kwesịrị isi zụlite nwa anyị nwanyị,” ka Yoichiro, bụ́ nna nwatakịrị nwanyị dị afọ abụọ, na-ekwu. “Mgbe ọ bụla okwu bilitere, anyị na-ekwurịta otú anyị ga-esi lebara ya anya.” Yoichiro ghọtara na ọ dị nwunye ya mkpa izuru ike, ọ na-akpọrọkwa nwa ha nwanyị mgbe ọ na-aga ịzụ ihe.

N’oge ochie, bụ́ mgbe ezinụlọ na-ebukarị ibu ma na-emekọ ihe ọnụ, ndị nne na nna na-enweta enyemaka nke ụmụ ha ndị nke torola eto nakwa nke ndị ikwu ha, bụ́ ndị na-ekere òkè n’ilekọta nwatakịrị. Ya mere, ọ bụghị ihe ijuanya na otu onye na-arụ n’Ụlọ Ọrụ Na-enye Nkwado Maka Ịzụ Ụmụaka bụ́ nke dị na Kawasaki, Japan, na-ekwu, sị: “Ọtụtụ mgbe, ndị nne ga-enweta ahụ́ efe ma ọ bụrụ na ha akọsara ndị ọzọ ọnọdụ ha. N’ihi inweta nnọọ obere enyemaka, ọtụtụ ndị nne enwewo ike imeri ihe mgbochi dị iche iche.”

Magazin bụ́ Parents na-ekwu na ọ dị ndị nne na nna “mkpa inwe ìgwè ndị ha pụrụ ịdị na-akọsara nchegbu ha.” Ebee ka a pụrụ ịchọta ìgwè mmadụ dị otú ahụ? Site n’ime ka obi ha ghere oghe ma na-ege nne na nna nke ha ma ọ bụ ndị ọgọ ha ntị, ndị nne na nna mụrụ nwa mbụ pụrụ irite uru n’ụzọ dị ukwuu. N’ezie, ndị nne na nna nke ndị lụrụ di na nwunye ọhụrụ kwesịrị ịghọta na ọ bụ di na nwunye ahụ ka ọ dị n’aka ime mkpebi ikpeazụ. *

Ebe ọzọ ndị lụrụ di na nwunye ọhụrụ pụrụ ịdabere bụ n’ebe ndị okpukpe ha nọ. N’ọgbakọ Ndịàmà Jehova nke dị n’ógbè unu, ị pụrụ ịhụ ndị nweworo ahụmahụ n’ịzụ ụmụ ruo ọtụtụ afọ bụ́ ndị dị njikere ige gị ntị mgbe ị na-akọrọ ha nsogbu gị. Ha pụrụ ịtụrụ gị aro ụfọdụ ga-abara gị uru. Mgbe mgbe, ị pụrụ inweta enyemaka n’aka “ndị nwanyị meworo agadi”—dị ka Bible na-akpọ ndị nweworo ahụmahụ karị n’ibi ndụ Ndị Kraịst—bụ́ ndị dị njikere inyere ụmụ agbọghọ aka.—Taịtọs 2:3-5.

N’eziokwu, ọ dị ndị nne na nna mkpa ịdị na-eme nhọrọ mgbe ha na-ege ntị n’aro ndị ọzọ na-atụrụ ha. “Na mberede, ndị gbara anyị gburugburu ghọziri ndị ọkachamara n’inye ụmụaka ọzụzụ,” ka Yoichiro na-ekwu. Nwunye ya bụ́, Takako, na-ekweta, sị: “Na mbụ, aro ndị ọzọ tụụrụ m nyere m nsogbu n’obi, ebe ọ bụ na ọ bịara dị m ka hà na-akatọ m n’ihi ahụmahụ m na-enwebeghị n’ịzụ nwa.” Ma, site n’ịmụta ihe n’aka ndị ọzọ, e nyeworo ọtụtụ ndị di na nwunye aka inwe echiche kwesịrị ekwesị banyere igbo mkpa ụmụ ha.

Enyemaka Kasị Mma E Nwere

Ọ bụrụgodị na o yiri ka ọ dịghị onye nọ ya inyere gị aka, e nwere otu onye a pụrụ ịtụkwasị obi nke pụrụ inye gị ume. Ọ bụ Jehova Chineke, bụ́ onye kere anyị, onye anya ya pụrụ ịhụ ‘ahụ́ ndị a mụrụ n’ụwa ọbụna mgbe ọ ka-ezughị okè.’ (Abụ Ọma 139:16) N’otu oge, Jehova gwara ndị ya nke oge ochie, dị ka e dekọrọ n’Okwu ya, bụ́ Bible, sị: “Nwanyị, ọ̀ ga-echezọ nwa ya na-aṅụ ara, wee ghara inwe obi ebere n’ahụ́ nwa afọ ya? ee, eleghị anya ndị a ga-echezọ, ma Mụ onwe m agaghị echezọ gị.”—Aịsaịa 49:15; Abụ Ọma 27:10.

Ee e, Jehova adịghị echezọ ndị nne na nna. N’ime Bible, o nyewo ha ụkpụrụ nduzi ndị magburu onwe ha banyere ịzụ ụmụ. Dị ka ihe atụ, ihe dị ka afọ 3,500 gara aga, onye amụma Chineke bụ́ Mozis dere, sị: “Ị ga-ewerekwa obi gị nile, werekwa mkpụrụ obi gị nile, werekwa ike gị nile, hụ Jehova, bụ́ Chineke gị, n’anya.” Mozis kwuziri, sị: “Okwu ndị a [gụnyere agbamume nke ịhụ Jehova n’anya na ijere ya ozi], nke mụ onwe m na-enye gị n’iwu taa, ga-adịkwasịkwa n’obi gị: ị ga-ejisikwa ike izi ha ụmụ gị, ị ga-ekwukwa okwu banyere ha mgbe ị na-anọdụ n’ụlọ gị, na mgbe ị na-eje ije n’ụzọ, na mgbe ị na-edina ala, na mgbe ị na-ebili ọtọ.”—Deuterọnọmi 6:5-7.

Gịnị ka ị ghọtara bụ́ isi ihe a na-ekwu banyere ya ná ntụziaka a dị n’Okwu Chineke? Ọ́ bụghị na inye ụmụ gị ọzụzụ kwesịrị ịbụ ihe ị ga na-eme mgbe nile, n’esepụghị aka, ihe ị ga na-eme kwa ụbọchị? N’ezie, o zughị ezu iwepụta ihe a sị na ọ bụ oge bara uru iji soro ụmụ gị na-anọkọ mgbe ụfọdụ. Ebe ọ bụ na oge dị mkpa iji kwurịta okwu na-abịakarị ná ndapụta, ọ dị gị mkpa ịdị na-ewepụta oge iji soro ụmụ gị na-anọkọ mgbe nile. Ime otú ahụ ga-eme ka o kwe gị omume imezu iwu Bible bụ́: “Zụlite nwata dị ka ụzọ ya si dị.”—Ilu 22:6.

Ịzụ ụmụ nke ọma na-agụnye ịdị na-agụpụtara ha ihe. Bible na-agwa anyị na onye na-eso ụzọ na narị afọ mbụ bụ́ Timoti ‘maara ihe odide ndị ahụ dị nsọ malite n’oge ọ bụ nwa ọhụrụ.’ Ya mere, ihe àmà na-egosi na nne ya, bụ́ Yunis, na nne ya ochie, bụ́ Lọịs, gụpụtaara ya ihe mgbe ọ ka bụ nwa ọhụrụ. (2 Timoti 1:5; 3:14, 15) Ọ dị mma ịmalite ime nke a ozugbo ị malitere ịgwa nwa ọhụrụ gị okwu. Ma gịnị ka ị pụrụ ịgụrụ ya, oleekwa ụzọ kasị mma ị pụrụ isi kụziere nwa ọhụrụ ihe?

Mee ka nwa gị nụ ka ị na-agụ Bible. Ihe àmà na-egosi na ọ bụ ihe a gụụrụ Timoti. E nwekwara akwụkwọ ndị nwere ihe osise ndị mara mma bụ́ ndị a pụrụ iji kụziere ụmụaka Bible. Ha na-enyere nwatakịrị aka iji anya nke uche ya hụ ihe ndị Bible na-akụzi n’ezie. Dị ka ihe atụ, e nwere Akwukwọm nke Akukọ Bible na Nwoke Kasị Ukwuu nke Dịworo Ndụ. Site n’akwụkwọ ndị dị otú ahụ, a kụnyewo ozizi Bible n’uche nakwa n’obi ọtụtụ nde ụmụaka.

Dị ka Bible na-ekwu, “ihe nketa nke na-esi n’aka Jehova bịa ka ụmụ bụ: ụgwọ ọrụ Ọ na-akwụ ka mkpụrụ nke afọ bụ.” (Abụ Ọma 127:3) Onye Okike gị enyewo gị “ihe nketa,” nwa dị mma, bụ́ onye pụrụ ịbụ ihe e ji anya isi na ihe na-enye ọṅụ. Ịzụlite ụmụ, karịsịa gaa n’ịbụ ndị na-enye Onye Okike ha otuto, bụ n’ezie ọrụ na-akwụghachi ụgwọ ọrụ!

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 9 Ọ bụghị nanị mmiri ọgwụ ahụ́ bụ́ hormone nke na-akpata nrụgide pụrụ imetụta nwa e bu n’afọ n’ụzọ dị njọ kamakwa, nicotine, mmanya na-aba n’anya, na ọgwụ ndị ọzọ na-emetụtakwa ya. Ụmụ nwanyị dị ime kwesịrị izere ihe ọ bụla dị ize ndụ. Tụkwasị na nke ahụ, ọ dị oké mkpa ịjụ dọkịta banyere mmetụta ọgwụ ị na-aṅụ ga-enwe n’ahụ́ nwa i bu n’afọ.

^ par. 15 Ọ bụrụ na onye bụ́ nne abụrụ onye obi na-adịtụghị mma na onye na-enweghị nnọọ olileanya, bụrụkwa onye na-enweghị mmasị n’ebe nwa ya na ndị ọzọ nọ, ọ pụrụ ịbụ na ọ na-enwe ụdị ịda mbà n’obi mmadụ na-enwe mgbe ọ mụsịrị nwa. Ọ bụrụ na ọ dị otú ahụ, o kwesịrị ịga hụ ọkachamara n’ihe banyere ịmụ nwa, bụ́ onye na-adị ele ya ahụ́. Biko lee Teta! (Bekee), July 22, 2002, peeji nke 19-23 na June 8, 2003, peeji nke 21-23.

^ par. 22 Biko gụọ isiokwu bụ́ “Ndị Nne na Nna Ochie—Ọṅụ Ha na Ihe Ịma Aka Ha,” ná mbipụta Teta! nke April 8, 1999.

[Foto dị na peeji nke 22]

Mmetụta nne na-enwe n’ebe nwa o bu n’afọ nọ dị oké mkpa

[Foto dị na peeji nke 23]

Ọ bụ ezie na nwanyị mụrụ nwa mbụ pụrụ ịda mbà n’obi mgbe ọ mụsịrị nwa, e nwere ọtụtụ ihe ọ pụrụ ime iji mee ka nwa ya nwee mmetụta nke ịbụ onye a hụrụ n’anya na onye nọ ná nchebe

[Foto dị na peeji nke 24]

Ndị bụ́ nna nwere ibu ọrụ nke iso na-elekọta nwatakịrị

[Foto dị na peeji nke 24]

E kwesịrị ịmalite ịgụrụ nwatakịrị ihe mgbe ọ ka bụ nwa ọhụrụ