Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Mmadụ Eṅomie Aka Ọrụ Onye Okike

Mmadụ Eṅomie Aka Ọrụ Onye Okike

Mmadụ Eṅomie Aka Ọrụ Onye Okike

Olee otú o si bụrụ na bọlb eletrik bụ́ nke dị fere fere dị ka mpempe akwụkwọ adịghị agbawa mgbe a na-akwụnye ya n’ọkụ? Dị ka akwụkwọ bụ́ How in the World? si kwuo, azịza ya dabeere karịsịa n’ọdịdị nke bọlb ahụ, bụ́ nke a gbasoro “ọdịdị nke mkpokoro àkwá” wee mee. N’agbanyeghị na mkpokoro àkwá na-adị nnọọ fere fere, ịdị arọ nke nne ọkụkọ adịghị adapịa àkwá ndị ahụ mgbe ọ na-ekpu ha. Nke a bụ n’ihi na ọdịdị àkwá na-eme ka o nwee ike ịnagide ịdị arọ nke nne ọkụkọ. (Ọ bụrụ na mkpokoro àkwá esie ike karị, e nwere ike nwa ọkụkọ agaghị atụwali ya ma ọ chọọ ịpụta.) N’iṅomi aka ọrụ Onye Okike, a na-eme bọlb eletrik ka ọ dị gburugburu nke na mgbe e ji ya n’aka, ‘ebe ugegbe ahụ si rọọ arọ na-eme ka ikike e ji jide ya na-agazu akụkụ nile nke bọlb ahụ.’ Ya mere, dị ka ọ dị n’ihe banyere àkwá, ikike ahụ e ji jide bọlb adịghị anọ nanị n’otu ebe ahụ e ji ya, bọlb ahụ adịghịkwa agbawa. Mmadụ amụtawo ihe dị ukwuu site n’ịmụ banyere ihe e kere eke!