Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Olee Otú M Pụrụ Isi Nwee Ihe Ịga nke Ọma n’Ikwu Okwu n’Ihu Ọha?

Olee Otú M Pụrụ Isi Nwee Ihe Ịga nke Ọma n’Ikwu Okwu n’Ihu Ọha?

Ndị Na-eto Eto Na-ajụ Sị . . .

Olee Otú M Pụrụ Isi Nwee Ihe Ịga nke Ọma n’Ikwu Okwu n’Ihu Ọha?

“Ọ bịara dị m ka ndị mmadụ hà na-ahụ ihe ọ bụla m mejọrọ na ahụ́ erughị ala m na-enwe. Enwelighị m ike itinye uche n’okwu m. Ọ dị m ka hà na-achị m ọchị n’ime obi ha.”—Sandy. *

ỤLỌ ezumezu nke ụlọ akwụkwọ ahụ jupụtara nnọọ na mmadụ. Gị anụ ka a kpọrọ aha gị n’ígwè okwu, na mberede anya nile elewe gị. Nzọụkwụ ole na ole ị na-aghaghị ịzọ iji ruo n’ikpo okwu ahara ka otu kilomita. Ọsụsọ amalite ịgba gị n’ọbụ aka, ụkwụ amalite ịma gị jijiji, n’ihi ihe ụfọdụkwa, asọ mmiri atakọọ gị n’ọnụ. Mgbe ahụ, tupu i nwee ike igbochi ya, ọsụsọ asọdata gị na ntì. Lee ihe mmechuihu ọ bụ! Ị makwanụ na a gajeghị ịgbagbu gị agbagbu, ma otú ahụ ka ọ dị gị n’ezie.

Ka anyị kweta: Ihe ka ọtụtụ n’ime anyị na-atụ ụjọ ikwu okwu n’ihu ndị ọzọ. (Jeremaịa 1:5, 6) Ụfọdụ ndị ọbụna ekwuwo na ha anaghị atụ ụjọ ọnwụ otú ha si atụ ụjọ ikwu okwu n’ihu ọha! Otú ọ dị, n’agbanyeghị otú i pụrụ isi na-ele ya anya, e nwere ezi ihe ndị mere i kwesịrị iji nwee mmasị n’ikwu okwu n’ihu ọha. Ka anyị leba anya n’ụfọdụ n’ime ha ma tụlee ụzọ ị pụrụ isi nwee ihe ịga nke ọma n’ikwu okwu n’ihu ọha.

Mgbe A Kpọrọ Gị Ikwu Okwu

“Ikwu okwu n’ihu ọha bụ nkà dị mkpa nye onye ọ bụla.” Otú ahụ ka e si kwuo ya n’otu mkpọsa e mere maka ihe ọmụmụ n’ikwu okwu n’ihu ọha. Ee, ka oge na-aga, a pụrụ inwe mgbe ị ga-ekwu okwu n’ihu ọha. Otu ihe bụ na ọtụtụ ụlọ akwụkwọ na-akụzi ikwu okwu n’ihu ọha. Otu nwa agbọghọ aha ya bụ Tatiana na-echeta, sị: “Ọ dị ọtụtụ ugboro m kwuru okwu n’ihu ụmụ klas m n’ụlọ akwụkwọ.” Site n’ikwu okwu n’otu isiokwu nakwa n’ikwu otú akwụkwọ dị, ruo n’ikwu okwu n’ihu ndị nta akụkọ nakwa n’arụmụka, ụmụ akwụkwọ aghaghị ịdị njikere ikwu okwu.

I mesịa malite ịrụ ọrụ, a pụrụ ịkpọ gị ka ị kụziere ìgwè ndị ọrụ ibe gị ihe, kọọrọ onye nyere unu ọrụ banyere ọrụ unu chọrọ ịrụrụ ya, ma ọ bụkwanụ kọwaara kọmitii ndị isi otú unu si mefuo ego. N’eziokwu, nkà ikwu okwu bara uru n’ọtụtụ ọrụ, gụnyere nkà ide akụkọ, nlekọta ọrụ, ọrụ ịkwalite mmekọrịta ọha na eze, na ire ahịa.

Otú ọ dị, gịnị ma ị họrọ ịrụ ọrụ dị ka onye ọrụ e goro ego ma ọ bụ onye odeakwụkwọ n’ọfịs? Ikwu okwu nke ọma mgbe a na-agba gị ajụjụ ọnụ maka iwe gị n’ọrụ pụrụ ikpebi ma à ga-ewe gị ma ọ bụ na a gaghị ewe gị n’ọrụ. Mgbe ị na-arụ ọrụ ahụ, ikwu okwu nke ọma pụrụ ịbara gị uru. Mgbe Corrine gụsịrị akwụkwọ, ọ rụrụ ọrụ dị ka onye na-eke nri ruo afọ atọ. Ọ na-ekwu, sị: “Ọ bụrụ na ị pụrụ ikwu okwu nke ọma, a ga-ele gị anya dị ka onye tozuru okè na onye nwere ike ịrụ ọrụ nke ọma karị. Ọ pụkwara ime ka i nweta ọbụna ọrụ ka mma, ụgwọ ọnwa ka ukwuu, ma ọ bụ bụrụ, ma ọ́ dịghị ihe ọzọ, onye a na-akwanyere ùgwù karị.”

N’ikpeazụ, Ndị Kraịst na-eto eto na-ekwu okwu mgbe mgbe n’ihu ndị ọzọ dị ka otu akụkụ nke ofufe ha. (Ndị Hibru 10:23) “Ọ dị mkpa ka ị na-ekwu okwu n’ụzọ doro anya,” ka Taneisha na-ekwu. “Anyị nwere ihe ùgwù nke ikwusa ozi ọma nke Alaeze Chineke.” (Matiu 24:14; 28:19, 20) N’ọgbakọ nakwa n’ozi ihu ọha ha, Ndị Kraịst na-eto eto apụghị “ịkwụsị ikwu banyere ihe ndị [ha] hụworo ma nụ.”—Ọrụ 4:20; Ndị Hibru 13:15.

Otú ọ dị, ịmụ otú e si ekwu okwu nke ọma pụrụ ịbara gị uru n’ụzọ dị iche iche. N’agbanyeghị nke ahụ, ị pụkwara ịdị na-echegbu onwe gị banyere otú ị ga-esi kwuo okwu n’ihu ndị na-ege ntị. Ọ̀ dị ihe i nwere ike ime iji mee ka ahụ́ ghara ịdị na-ama gị jijiji? Ee, ọ dị.

Imeri Egwu Gị

“Ọ dịghị gị mkpa ịbụ onye ụbụrụ na-aghọ nkọ ma ọ bụ onye zuru okè iji nwee ihe ịga nke ọma n’ikwu okwu n’ihu ọha,” ka Dr. Morton C. Orman, onye ọkachamara n’ihe banyere nchegbu nakwa n’ikwu okwu n’ihu ọha, na-ekwu. “Ihe bụ́ isi n’ikwu okwu n’ihu ọha bụ nke a: gwa ndị na-ege gị ntị ihe ga-abara ha uru.” N’ikwu ya n’ụzọ ọzọ, tinye uche gị n’okwu ahụ ị na-ekwu, ọ bụghị n’onwe gị ma ọ bụ ná nchegbu gị. Ụfọdụ ndị na narị afọ mbụ chere na Pọl onyeozi akachaghị bụrụ ọkà n’ikwu okwu, ma ebe ọ bụ na o nwere ihe bara uru ikwu mgbe nile, ọ nọgidere bụrụ ọkà okwu dị irè. (2 Ndị Kọrint 11:6) N’otu aka ahụ, ọ bụrụ na ihe ahụ ị na-ekwu dị mkpa ma bụrụ ihe i kweere n’ezie, ọ ga-eme ka ahụ́ na-ama gị jijiji belata ngwa ngwa karị.

Ron Sathoff, bụ́ ọkà okwu ọzọ a ma ama na onye na-enye ọzụzụ n’ikwu okwu, na-atụ aro a: Elela okwu gị anya dị ka ihe ngosi. Were ya dị ka mkparịta ụka. Ee, gbalịa ịdị na-ele ndị na-ege gị ntị anya, ọ bụghị dị ka ìgwè mmadụ, kama dị ka ndị mmadụ n’otu n’otu, dịkwa ka ị ga-eme ná mkparịta ụka nkịtị. Gosi ezi “mmasị onwe onye” n’ebe ndị na-ege gị ntị nọ, ma jiri olu gị gwa ha okwu. (Ndị Filipaị 2:3, 4) Ka okwu gị na-eyi mkparịta ụka, otú ahụ́ ka ahụ́ ga-eru gị ala karị.

Ihe ọzọ na-akpatakarị nchegbu bụ ịtụ ụjọ na ị ga-emechu onwe gị ihu ma ọ bụ na ndị na-ege ntị ga na-enyochata ebe ndị ị na-ekwutaghị okwu. Lenny Laskowski, bụ́ ọkà n’ikwu okwu nakwa onye na-enye ọzụzụ n’ikwu okwu, na-echetara anyị na ndị na-ege ntị na-adịkarị eji echiche dị mma ele okwu nke ọ bụla anya. “Ha chọrọ ka i mee nke ọma—ọ bụghị ka ị daa,” ka Laskowski na-ekwu. N’ihi ya, nwee echiche ziri ezi. Ọ bụrụ na o kwee gị omume, kelee ụfọdụ ndị ga-ege gị ntị mgbe ha batara. Lee ha anya ọ bụghị dị ka ndị iro, kama dị ka ndị enyi.

Chetakwa na ahụ́ ịma jijiji adịchaghị njọ. “N’adịghị ka ihe ọtụtụ ndị kweere,” ka otu ọkachamara na-ekwu, “ahụ́ ịma jijiji dị mma nye gị na okwu gị.” N’ihi gịnị? N’ihi na ahụ́ ịmatụ gị jijiji na-egosi na ị maara ebe ike gị ruru, bụ́ nke ga-enye aka mee ka ị ghara inwebiga obi ike ókè. (Ilu 11:2) Ọtụtụ ndị na-eme egwuregwu, ndị na-eti egwu, nakwa ndị na-eme ihe nkiri kwuru na ahụ́ ịmatụ ha jijiji na-eme ka ha mee nke ọma n’ezie karị, otu ihe ahụ pụkwara ịbụ eziokwu n’ebe ndị na-ekwu okwu n’ihu ọha nọ.

Aro Ndị Ga-eme Ka E Nwee Ihe Ịga nke Ọma

Site n’iji echiche ndị a na ndị ọzọ mee ihe, ụfọdụ Ndị Kraịst na-eto eto enwewo ahụmahụ ụfọdụ na ihe ịga nke ọma n’ikwu okwu n’ụlọ akwụkwọ, n’ebe ọrụ, nakwa n’ọgbakọ ha dị iche iche. Lee ma aro ole na ole ha tụrụ hà pụrụ inyere gị aka.

Jade: “Jiri okwu nke aka gị mee ihe mgbe ị na-ekwu okwu. Kweta na ihe ị na-aga ikwu bara uru. Ọ bụrụ na i were okwu gị dị ka ihe dị mkpa, otú ahụ ka ndị na-ege gị ntị ga-ewerekwa ya.”

Rochelle: “Achọpụtara m na isenye onwe m na vidio n’oge m na-ekwu okwu, na-enyere m aka. Ọ na-agba ebe ndị m na-emetaghị ihe n’anwụ, ma ọ bara uru. Ọzọkwa, gbalịa họrọ isiokwu na-amasịkarị gị. Ọ ga-apụta nnọọ ìhè n’okwu ị na-ekwu.”

Margrett: “Achọpụtara m na m na-aka ekwu okwu otú m si ekwu ma na-eme ka okwu m yikwuo mkparịta ụka ma ọ bụrụ na m ejiri ihe ndepụta mee ihe kama idetu ihe nile m ga-ekwu edetu. Ọzọkwa, ikuru ume nke ọma tupu m malite ikwu okwu na-eme ka ahụ́ ruo m ala.”

Corrine: “Atụla ụjọ ịchị onwe gị ọchị. Onye ọ bụla na-emejọ ihe. Nanị gbalịa otú i nwere ike.”

N’eziokwu, dịkwa ka ihe omume ndị ọzọ, dị ka egwuregwu, nkà, ma ọ bụ iti egwu, ọ dịghị ihe a pụrụ iji dochie anya inweta ahụmahụ na ịmụgharị ihe ọtụtụ mgbe. Tatiana na-atụ aro ka ị na-akwadebe okwu gị ogologo oge tupu oge eruo ka i wee nwee oge zuru ezu ịmụgharị ya. Adakwala mbà. “Ka m na-ekwu okwu mgbe mgbe n’ihu ndị ọzọ,” ka ọ na-ekwu, “otú ahụ ka ahụ́ na-erukwu m ala.” Otú ọ dị, e nwekwara ebe ọzọ a pụrụ isi nweta enyemaka nke ị na-ekwesịghị ichefu, karịsịa mgbe a kpọrọ gị ikwu okwu maka ezi ofufe.

Enyemaka Sitere n’Aka Onye Ukwu Na-enye Ihe Ọmụma

Dị ka nwa okorobịa, a maara Devid, bụ́ onye na-aga ịbụ eze Izrel, dị ka onye “nwere uche n’okwu.” (1 Samuel 16:18) Gịnị mere o ji dị otú ahụ? O doro anya na n’oge ọ bụ okorobịa, n’ogologo oge nile ọ nọ na-azụ atụrụ n’èzí, Devid zụlitere mmekọrịta chiri anya n’ebe Onye Ukwu Na-enye Ihe Ọmụma, bụ́ Jehova Chineke, nọ, site n’ekpere. (Abụ Ọma 65:2) N’aka nke ya, mmekọrịta a kwadebere ya iji ike na-ekwu okwu n’ụzọ doro anya nakwa n’ụzọ ga-eme ka mmadụ kwenye ọbụna n’ọnọdụ ndị tara akpụ.—1 Samuel 17:34-37, 45-47.

Ị pụrụ ijide n’aka na ka ị na-efe Chineke, ọ ga-enyekwara gị aka ịdị na-ekwu okwu n’ụzọ ga-eme ka mmadụ kwenye, dị ka o nyeere Devid, na-enye gị “ire nke ndị mmụta.” (Aịsaịa 50:4; Matiu 10:18-20) Ee, site n’iji ohere dị iche iche mee ihe n’imeziwanye nkà ikwu okwu gị ugbu a, ị pụrụ ịbụ ọkà okwu dị irè n’ikwu okwu n’ihu ọha!

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 3 A gbanwewo aha ụfọdụ.

[Igbe dị na peeji nke 16]

Ndị A Zụrụ Dị Ka Ndị Ọkà Okwu

N’ọgbakọ Ndịàmà Jehova n’ụwa nile, e nwere usoro izi ihe dabeere na Bible kwa izu, bụ́ nke a na-akpọ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke. Ndị mmụta na-ekere òkè ná nkwurịta okwu a na-enwe na klas, na-eme ihe omume n’ihu ọgbakọ, ma na-enweta enyemaka iji nyere ha aka inwe ọganihu. Usoro ihe omume ahụ, ọ̀ dị irè? Ka Chris, bụ́ onye dị afọ 19 kọọrọ gị ahụmahụ ya.

“Tupu m denye aha n’ụlọ akwụkwọ ahụ, ahụ́ adịtụghị eru m ala ma m nọrọ n’etiti ndị mmadụ,” ka ọ na-ekwu. “Ọ dịtụghị mgbe m chere na m nwere ike ịnọ n’ihu ndị mmadụ kwuo okwu. Ma ụfọdụ ndị mụ na ha nọ n’ọgbakọ gbara m ume, na-ekwu na ọ bụrụgodị na ọ bụ nanị nsụ ka m ji oge nile ahụ sụọ, na ha ga-enwe afọ ojuju, ebe ha maara mgbalị m mere iji pụta n’ihu ndị mmadụ. Ka oge na-aga, mgbe ọ bụla m kwusịrị okwu, ha na-aja m mma. Nke ahụ nyeere m aka nke ukwuu.”

Taa, ka ọ nọworo n’ụlọ akwụkwọ ahụ ruo afọ ise, Chris na-akwadebe ikwu okwu ihu ọha mbụ ya ga-ewe minit 45. Ị̀ na-erite uru ná ndokwa a?

[Foto ndị dị na peeji nke 14, 15]

Ịbụ ezigbo onye ọkà okwu pụrụ inyere gị aka n’akụkụ nile nke ndụ