Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ị̀ Maara?

Ị̀ Maara?

Ị̀ Maara?

(A pụrụ ịchọta azịza nye ajụjụ ndị a n’akụkụ Bible ndị e zoro aka na ha, e bipụtakwara ndepụta zuru ezu nke azịza ha na peeji nke 21. Iji nwetakwuo ihe ọmụma, lee akwụkwọ bụ́ “Insight on the Scriptures” nke Ndịàmà Jehova bipụtara.)

1. Olee ebe Jizọs gwara nwoke ahụ kpuru ìsì ka ọ gaa saa ihu ya iji mee ka ọ hụ ụzọ? (Jọn 9:7)

2. Ebee ka Setan gwara Jizọs ka o si tụda onwe ya n’ala ka ndị mmụọ ozi wee nwee ike ịnapụta ya? (Matiu 4:5, 6)

3. Gịnị mere ọtụtụ ìgwè mmadụ ji na-arịọsi Jizọs arịrịọ ike “ka ha bitụ nanị ọnụ ọnụ uwe elu ya aka”? (Matiu 14:35, 36)

4. Olee ihe e ji mee ihe n’oge ochie, ọ bụghị nanị iji sụọ ákwà kamakwa iji nụchaa ọla ndị dị ka opu na ọlaọcha? (Aịsaịa 1:25)

5. Olee aha ndị a kpọrọ diọkpara Ribeka, n’ihi gịnịkwa? (Jenesis 25:25, 30)

6. Olee ihe ndị Jehova kwuru a chọrọ n’aka ndị a ga-ahọpụta dị ka ndị nledo 12 a ga-eziga n’ala Kenan? (Ọnụ Ọgụgụ 13:2)

7. Olee mba Pọl nọ na ya degara ndị Hibru akwụkwọ ozi ya? (Ndị Hibru 13:24)

8. Olee ọnwa ndị Juu nke Solomọn wusịrị ụlọ nsọ ahụ na ya? (1 Ndị Eze 6:38)

9. Olee ndị ikom abụọ jidere aka Mozis ruo mgbe Jehova mere ka ndị Izrel merie ndị Amalek? (Ọpụpụ 17:12)

10. Olee ahụhụ a ma ama maka ịrụsi ọrụ ike na amamihe ebumpụta ụwa ya? (Ilu 6:6)

11. Kama ịga Ninive dị ka Jehova nyere ya ntụziaka, olee ebe Jona nwara ịgbaga? (Jona 1:2, 3)

12. Ebee ka Mozis wuru ụlọikwuu ahụ? (1 Ihe E Mere 21:29)

13. Ebe ọ bụ na ọ dịghị ókèala e kenyere ebo Livaị, olee otú e si lekọta ha anya? (Ọnụ Ọgụgụ 18:21)

14. N’ụbọchị Jizọs bilitere n’ọnwụ, ebee ka ọ nọ mee ka Kliopas na onye ọzọ na-eso ụzọ hụ ya? (Luk 24:13)

15. Ole ndị ka Jehova họọrọ dị ka ndị isi ọrụ nkà maka iwu ụlọikwuu ahụ? (Ọpụpụ 31:1-11)

16. Okwu dị aṅaa ka Pọl na-ejikarị eme ihe n’izo aka n’ebe ndị ya na ha dọgbukọrọ onwe ha n’ọrụ nọ? (Ndị Filipaị 4:3)

17. Gịnị mere Jehova ji nye ụmụ Izrel iwu ka ha meere onwe ha ọnụ ọnụ n’elu ụsọ uwe ha, tinyekwa n’ọnụ ọnụ nke ụsọ uwe ahụ eriri mma ogho anụnụ? (Ọnụ Ọgụgụ 15:37-40)

18. Osisi dị aṅaa ka e ji mee cherub abụọ ahụ nakwa ibo ụzọ nke Ebe Nsọ Kachasị Ebe Nsọ Nile? (1 Ndị Eze 6:23, 31)

19. Dị ka Zekaraịa si dekọọ ya, okwu ndị dị aṅaa ka Jehova ji gosi otú obi na-adị Ya mgbe a na-emegbu ndị Ya? (Zekaraịa 2:8)

20. Ònye bụ nna Jezebel? (1 Ndị Eze 16:31)

21. Gịnị mere Paịlet ji gbalịa ịtọhapụ Jizọs? (Luk 23:4)

Azịza Nye Ajụjụ

1. Ọdọ mmiri Silom

2. Elu ihe ngebichi nke mgbidi ụlọ nsọ ahụ

3. Ha chọrọ ka a gwọọ ha ọrịa dị iche iche na-arịa ha

4. Akanwụ (sodium carbonate ma ọ bụ potassium carbonate)

5. “Ịsọ” n’ihi ajị jupụtara n’ahụ́ ya mgbe a mụrụ ya nakwa “Idọm” n’ihi otu efere ofe lentil na-acha ọbara ọbara bụ́ nke o ji maka ya ree ihe ruuru ya site n’ọmụmụ

6. “Otu nwoke otu nwoke dịịrị ebo nna ya hà, onye ọ bụla ọ bụrụ onyeisi n’etiti ha”

7. Ịtali

8. Bul, bụ́ ọnwa nke asatọ na kalenda nsọ ahụ

9. Erọn na Hua

10. Ndanda

11. Tashish

12. N’ọzara

13. Ebo ndị ọzọ na-enye ha otu ụzọ n’ụzọ iri nke ihe nile a kụrụ n’ala, nakwa nke ehi

14. N’ụzọ na-aga Emeọs

15. Bezalel na Ọhọliab

16. “Ndị ọrụ ibe m”

17. Iji chetara ha na ha bụ ndị nsọ nke Jehova nakwa na ha kwesịrị idebe iwu ya

18. Osisi mmanụ oliv

19. “Onye na-emetụ unu aka na-emetụ nwa anya [m]”

20. Etbeal, eze ndị Zaịdọn

21. Ọ hụghị ihe ọjọọ ọ bụla n’ime ya