Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ókè Hà Aṅaa Ka Nwa Gị Pụrụ Ịmụtaru Ihe?

Ókè Hà Aṅaa Ka Nwa Gị Pụrụ Ịmụtaru Ihe?

Ókè Hà Aṅaa Ka Nwa Gị Pụrụ Ịmụtaru Ihe?

Ndị meworo okenye adịghị amatakarị ikike nwatakịrị nwere ịmụta ihe. Otú ọ dị, ụmụntakịrị na-amụtakarị asụsụ ọhụrụ ngwa ngwa karịa ndị mụrụ ha. Ka ha na-erule afọ anọ, ụfọdụ ha na-asụ asụsụ abụọ ma ọ bụ karịa. N’afọ gara aga, Rhonda, bụ́ otu nwanyị si Auburn, Washington, U.S.A., bụ́ onye nwere obi abụọ banyere ikike nwatakịrị nwere ịmụta ihe, dere, sị: “Unu emeela maka ohere unu nyere m ikwupụta n’ezie na adara m ya.”

Rhonda kọwara na ya gụrụ otu ahụmahụ dị ná mbipụta nke August 1, 1988 nke Ụlọ Nche, bụ́ magazin a na-ebipụtakọ ya na magazin a, wee kwuo, sị: “Na peeji nke 13, e nwere ihe nne otu nwatakịrị nwoke dị afọ anọ na ọkara kwuru, bụ́ onye kwuru na mgbe ya na-agụrụ nwa ya Akwukwọm nke Akukọ Bible ma kwụsịtụ, na nwa ya nwoke kọọrọ akụkọ ahụ gaa n’ihu otú ahụ e si dee ya. O kwukwara na nwa ahụ ebuwo akụkọ 33 ndị mbụ dị n’akwụkwọ ahụ n’isi, gụnyere aha nke ebe na ndị dị iche iche bụ́ ndị siri ike mkpọpụta. Aghaghị m ikweta na ekwuru m n’ime obi m mgbe ahụ na nke ahụ apụghị ikwe omume. N’ezie, adara m ya. Ugbu a, abụ m nne nke nwatakịrị nwanyị dị afọ anọ, bụ́ onye buworo ọtụtụ akụkọ dị n’akwụkwọ Akukọ Bible ahụ n’isi.”

Gịnị ka i meworo iji gbaa nwa gị ume ịmụta ihe? Ọ bụrụ na ọ ga-amasị gị inweta otu akwụkwọ a dị peeji 256, bụ́ nke nwere akụkọ 116 ndị na-akọ banyere ndị mmadụ na ihe ndị mere na Bible, biko kpọtụrụ Ndịàmà Jehova nọ n’ógbè gị. Ọ bụrụ na ị ga-enwe mmasị ka mmadụ kpọtụrụ gị, biko dejupụta akụkụ a pụrụ ịdọkapụta adọkapụta dị na peeji a ma zite ya n’adres e dere na ya ma ọ bụ n’adres nke kwesịrị ekwesị e depụtara na peeji nke 5 na magazin a.

□ Biko kpọtụrụnụ m iji duziere m ọmụmụ Bible ebe obibi n’efu.