Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ihi Ụra nke Dị Gị Mkpa

Ihi Ụra nke Dị Gị Mkpa

Ihi Ụra nke Dị Gị Mkpa

Ọ BỤ n’ime afọ 50 gara aga ka e nwere ihe kasị ukwuu n’ọganihu ndị e nweworo n’ịghọta otú ụra si arụ ọrụ. Ihe ndị a mụtaworo na-agbagha ụfọdụ echiche na-ezighị ezi ndị e nweworo eri oge. Otu n’ime ha bụ nzọrọ a na-eme na ebe ọ bụ na ahụ́ adịchaghị nnọọ arụ ọrụ n’oge a na-ehi ụra, ụra bụ nnọọ ọnọdụ nke arụghị ọrụ.

Site n’ịmụ usoro ụzarị si erugharị n’ụbụrụ, ndị nnyocha banyere ọgwụ na ahụ́ ike achọpụtawo na ụra dị ná nkebi ná nkebi. Kama ịbụ nke na-adịghị arụ ọrụ, ụbụrụ mmadụ na-arụ ọrụ n’ụzọ dị ngwa ná nkebi ụfọdụ nke ụra. Ụra na-edozi ahụ́ na-agụnye ihi ụra ruo ná nkebi ndị a ugboro anọ ma ọ bụ karịa n’abalị ọ bụla, na-ehi ụra ruo oge zuru nnọọ ezu ná nkebi nke ọ bụla.

Ịdị Mgbagwoju Anya nke Ụra

N’ụzọ bụ́ isi, a na-ekewakarị ụra abalị dị otú o kwesịrị ụzọ abụọ: oge ụra mgbe anya na-ama jijiji ma ọ bụ ụra nrọ na oge ụra mgbe anya na-adị jụụ ma ọ bụ mgbe a naghị arọ nrọ. Ị pụrụ ịmata na mmadụ nọ n’ụra nrọ mgbe ị hụrụ ka anya o mechiri emechi na-ama jijiji.

A pụrụ ikewakwu oge ụra mgbe anya na-adị jụụ gaa ná nkebi anọ. Mgbe i dinasịrị ala, ị na-eji nwayọọ banye ná nkebi nke mbụ—ụra nkịta. N’oge ị nọ ná nkebi ụra a, uru ahụ́ gị na-akụjụ, ụzarị na-erugharịkwa ngwa ngwa n’ụbụrụ gị n’ụzọ na-adịghị n’usoro. N’oge mbụ ị banyere ná nkebi ụra nke a kwa abalị, ị ga-anọ na ya ihe dị ka agbata sekọnd 30 na minit 7. Mgbe ị banyere ná nkebi nke abụọ—ezigbo ụra—bụ́ ebe ị ga-anọkarị ihe dị ka pasent 20 nke abalị, ụzarị na-erugharị n’ụbụrụ gị na-ebu ibu karị. Echiche gị ma ọ bụ ihe ndị i ji anya nke uche gị na-ahụ pụrụ ịdị na-agbasasị agbasasị, ma ị gaghị ama ihe na-aga gburugburu gị, ọ dịghịkwa ihe ị pụrụ ịhụ ọbụna ma ọ bụrụ na anya gị ghere oghe.

Nkebi nke atọ na nke anọ na-esochizi—site n’ihimi ụra ruo n’oké ụra. Ná nkebi a, ụbụrụ gị na-emepụta ụzarị buru ibu bụ́ ndị ji nwayọọ erugharị. Ọ bụ ugbu a ka ọ na-esi ike iteta n’ụra, n’ihi na ihe ka ukwuu n’ọbara gị na-aga n’uru ahụ́ gị. N’oge a, (nke na-abụkarị ihe dị ka pasent 50 nke abalị), mmadụ na-edochi ahụ́, ọ bụkwa n’oge oké ụra a ka ahụ́ ụmụaka na-eto. Ọ dị mkpa ịmara na onye ọ bụla, ntorobịa ma ọ bụ okenye, nke na-ehimighị ụra ehimi pụrụ inwe ike ọgwụgwụ, ghara inwe mmasị n’ihe, ma ọ bụ ọbụna daa mbà n’obi n’echi ya.

N’ikpeazụ, usoro nke ọ bụla na-eji nkebi nke na-adị nnọọ iche bụ́ oge ụra mgbe anya na-ama jijiji, ejedebe. Ná nkebi ụra a mgbe a na-arọ nrọ (nke na-ewerekarị ọnọdụ na minit 90 ọ bụla), ọbara na-agakwu n’ụbụrụ, ụzarị ndị na-erugharị n’ụbụrụ gị na-afọdụ nnọọ nke nta ka ọ dị ka mgbe ị mụ anya. Otú ọ dị, ị pụghị imegharị ahụ́. O yiri ka ọ̀ bụ enweghị ike imegharị ahụ́ a na-eme ka ị ghara ime ihe ndị ị na-arọ ná nrọ ma merụọ onwe gị ma ọ bụ ndị ọzọ ahụ́.

Nkebi nke oge ụra mgbe anya na-ama jijiji, ma ọ bụ ụra nrọ, na-adịwanye ogologo n’oge nke ọ bụla ha weere ọnọdụ n’abalị, o yikwara ka hà dị oké mkpa iji nwee ọnọdụ uche dị mma. Dị nnọọ ka kọmputa, ụbụrụ na-enyocha ikike icheta ihe nke na-adịghị adịte aka, na-ewepụ ihe ọmụma ndị na-adịghị mkpa, ma na-ahapụ ihe ndị dị mkpa a ga na-echeta ruo ogologo oge. A matawo na ọ bụrụ na mmadụ anọzughị oge kwesịrịnụ n’ụra nrọ, ọ ga-enwe nsogbu mmetụta uche. Dị ka ihe atụ, ndị na-enwe nsogbu nke ehighị ụra nke ọma na-anọ n’ụra nrọ ruo oge dị ala karịa otú ha kwesịrị ịnọ na ya, bụ́ nke na-eme ka ha na-enwewanye nchegbu.

Ya mere, gịnị na-eme ma ọ bụrụ na anyị adịkarịghị enwe ike ihi ụra ruo ná nkebi ndị a na-abịaghachi ugboro ugboro (ma ọ bụ anyị ji aka anyị kpata ya ma ọ bụ na ọ bụghị anyị), wee si otú ahụ jiri ụra ụgwọ? Ọ bụrụ na anyị adịghị ehi ụra ruo awa ole ahụ́ anyị chọrọ kwa abalị, anyị agaghị na-anọru oge dị mma ná nkebi nke ikpeazụ nke ụra nrọ, nke na-adị ogologo karịsịa, bụ́ nke dị oké mkpa ka ụbụrụ wee na-arụ ọrụ nke ọma. Ọ bụrụ na oge anyị ji ehi ụra na-agbanwekarị, anyị ana-ehikwa obere ụra n’oge dịgasị iche n’ụbọchị, anyị adịghị ehimikarị ụra ehimi bụ́ nke dị mkpa iji mee ka ahụ́ anyị dochie. Ndị ji ụra ụgwọ dị ukwuu adịghị etinye uche n’ihe ruo ogologo oge, ha na-echefukarị ihe ma na-akpọhiekarị ọnụ, ha adịchaghị enwe ike ịtụle ihe nke ọma, ha adịchaghịkwa echepụta ihe bara uru.

Gịnị na-akpali ahụ́ ịchọ ụra? Ihe àmà na-egosi na e nwere ọtụtụ ihe na-ejikọ aka eme ka mmadụ nwee usoro ihi ụra na iteta ụra n’ụbọchị. O yiri ka otú ụbụrụ dị na mgbanwe a na-enwe na ya ọ̀ na-eso akpata ya. Ọzọkwa, e nwere ebe mkpụrụ ndụ akwara ozi bịakọtara ọnụ n’ụbụrụ, bụ́ nke ihe àmà na-egosi na ọ na-enye aka achịkwa ụra. “Klọọkụ” a dị nso n’ebe akwara anya bịakọtara ọnụ. Ọ bụ ya mere ìhè ji emetụta ókè ụra na-atụru anyị. Ìhè nke na-enwusi ike na-emete gị n’ụra, ebe ọchịchịrị na-eme ka ụra tụwa gị.

Ọ̀tụ̀tụ̀ ikpo ọkụ nke ahụ́ gị na-ekerekwa òkè. Mgbe ahụ́ gị kasị na-ekpo ọkụ—nke na-abụkarị mgbe chi bọchara nakwa ná mgbede—ị na-akasị amụrụ anya. Ka ahụ́ gị na-ajụ oyi, ụra na-amalite ịtụ gị karị. Ndị nchọpụta kwetara na usoro nke ịmụ anya na ụra ịtụ mmadụ na-adịgasị iche site n’otu onye gaa n’ọzọ.

Ụra Hà Aṅaa Ka Ahụ́ Gị Chọrọ?

Ndị ọkà mmụta sayensị na-agwa anyị na, ná nkezi, ụra awa asatọ dị ụmụ mmadụ mkpa kwa abalị. Nnyocha e mere na-egosikwa na ọ̀tụ̀tụ̀ nke ụra dị ụmụ mmadụ mkpa na-adịgasị nnọọ iche site n’otu onye gaa n’ọzọ.

Iji obi eziokwu nyochaa onwe gị ga-agwa gị ma ì nwere usoro ihi ụra dị mma ka ị̀ na-eji ụra ụgwọ. Ndị ọkachamara kwekọrịtara banyere ihe mgbaàmà ndị a nke na-egosi na mmadụ na-ehi ụra na-edozi ahụ́:

▪ Ụra na-eburu mmadụ n’ụzọ dị mfe n’abụghịrịị ma onye ahụ ọ̀ ṅụrụ ọgwụ ma ọ bụkwanụ bụrụ onye ya na oké ntụgharị n’elu ihe ndina ma ọ bụ nchekasị na-alụ.

▪ Ị naghị amakarị mgbe i telatara ụra n’etiti abalị, ma ọ bụrụ na i teta, ụra pụrụ iburu gị ọzọ ngwa ngwa.

▪ Mmadụ na-eteta ụra n’onwe ya n’ihe dị ka n’otu oge kwa ụtụtụ, n’abụkarịghị onye klọọkụ na-akụ mgbịrịgba na-akpọte.

▪ Ozugbo i bilitere ma malite ịgagharị, anya na-efo gị, ahụ́ na-adịkwa gị nnọọ gara gara ụbọchị ahụ nile.

Ihe Ndị Na-enye Aka

Gịnị banyere ndị na-enwe nsogbu nke ehighị ụra nke ọma n’oge ụfọdụ? Ụfọdụ ndị ọkachamara na-atụ aro ihe ndị na-esonụ bụ́ ndị na-enye aka:

1. Zere ịṅụ ihe ndị na-agbaga ahụ́ dị ka kọfị ma ọ bụ tii n’oge ị na-alakpu ụra. Ọtụtụ ndị na-eche n’ụzọ hiere ụzọ na ihe ọṅụṅụ na-aba n’anya ga-enye aka mee ka ụra buru ha. Otú ọ dị, nnyocha ndị dọkịta mere na-egosi na ihe ọṅụṅụ na-aba n’anya pụrụ ime ihe dị iche n’ihe i bu n’uche ṅụọ ya ma mee ka ị mụrụ anya.

2. Kwụsị ise siga. Otu akwụkwọ na-ekwu, sị: “Ọ na-aka esi ike ụra iburu ndị na-ese siga, n’ihi na siga na-eme ka ọ̀tụ̀tụ̀ ọbara ji erugharị n’ahụ́ laa elu, mee ka obi na-akụsikwu ike, ma kpalie ụzarị ịdị na-erugharị n’ụbụrụ. Ndị na-ese siga na-etetakarịkwa n’etiti abalị, ma eleghị anya ọ bụ n’ihi na ahụ́ ha na-enwe mmetụta na-adịghị mma nke ịkwụsị ise siga na-akpata.”

3. Zere iche echiche ma ọ bụ inwe mmega ahụ́ siri ike mgbe ọ fọdụrụ nnọọ obere oge ka ị lakpuo ụra. Mmega ahụ́ na-eme ka mmadụ zuo ike nke ọma ma ọ bụghị ma i mesịa ya ma chọọ nnọọ ihi ụra ozugbo. Iche banyere nsogbu ndị tara akpụ n’oge na-adịghị nnọọ anya tupu ị lakpuo ụra, pụrụ ime ka ị ghara inwe uche dị jụụ bụ́ nke dị mkpa iji mee ka ụra buru gị.

4. Hụ na ọnụ ụlọ ihi ụra gị dị jụụ, gbaa ọchịchịrị, ma ya kwekwa mee, jụtụ nnọọ oyi. A bịa n’ihe banyere ụzụ, tụlee otu nnyocha magburu onwe ya e ji ndị bi nso n’ọdụ ụgbọelu mee bụ́ ndị kwuru na ha adịghịzi anụ ụda ụgbọelu. Mgbe e nyochara usoro ihi ụra ha, ụzarị ụbụrụ ha chọpụtara mgbe ọ bụla ụgbọelu dara ma ọ bụ felie! Ndị mere nnyocha ahụ kwubiri na, ná nkezi, ụra na-edozi ahụ́ ndị ahụ e nyochara na-ehi ji ihe dị ka otu awa adị ala n’abalị ọ bụla karịa nke ndị bi n’ebe dị jụụ karị. Ịkwụnye ngwá ndị e ji akwụchi ntị ma ọ bụ ịgbaso usoro ndị ọzọ e si ebelata ịnụ ụzụ, gaara enyeworo ha aka ihi ụra na-edo ahụ́. Ụfọdụ ndị na-achọpụta na mkpọtụ ndị na-adịghị adasi ike, nke na-adịghị akwụsị akwụsị, ma na-ada nnọọ n’otu ụzọ, dị ka nke fan na-eme, na-enyekarị aka ma ọ bụrụ na ọ dị mkpa ka ụzụ ọzọ nọchie nke a na-eme n’èzí.

5. Kpachapụ anya banyere ịṅụ ọgwụ ụra. A na-enwewanye ihe àmà ndị na-egosi na ọtụtụ n’ime ọgwụ ụra ndị e depụtara ka a ṅụọ na-emesị mara mmadụ ahụ́, bụrụ ndị na-adịchaghịzi arụ ọrụ ka a na-aṅụ ha ruo ogologo oge, ha na-enwekwa mmetụta ndị dị njọ n’ahụ́. Ọ bụrụ na ọ dị aka ha ga-enye, ọ ga-abụ nanị maka iji ha mee ihe nwa oge.

Ebe ọ bụ na nchekasị pụrụ ịkpata nsogbu nke ehighị ụra nke ọma, e chere na otu n’ime ihe ndị ga-eme ka i hie ụra nke ọma bụ ime ka oge ọ fọrọ obere ka ị lakpuo ụra bụrụ nke dị jụụ, na nke obi ụtọ. Ọ pụrụ ịbụ ihe na-enye aka ịhapụ nchegbu nke ụbọchị ma mee ihe na-atọ gị ụtọ ime, dị ka ịgụ akwụkwọ. E nwere nnọọ abamuru doro anya ma gbaa ọkpụrụkpụ dị ná ndụmọdụ Bible ahụ bụ́: “Unu enwela nchegbu banyere ihe ọ bụla, kama n’ihe nile site n’ekpere na ịrịọsi arịrịọ ike ya na inye ekele, meenụ ka Chineke mara ihe unu na-arịọ; udo nke Chineke . . . ga-echekwa obi unu na ike iche echiche unu nche.”—Ndị Filipaị 4:6, 7.

[Igbe/Foto dị na peeji nke 8, 9]

Ụfọdụ Echiche Na-ezighị Ezi A Na-enwekarị

1. Ịṅụ ihe ọṅụṅụ ndị nwere caffein bụ ụzọ kasị mma isi mụrụ anya mgbe ị na-akwọ ụgbọala n’ogologo njem.

Nnyocha ndị e mere na-egosi na ndị ọkwọ ụgbọala na-eduhiekarị onwe ha n’iche na ha mụ anya karịa otú ha mụ n’ezie. Ọ bụrụ na ị pụghị izere ịkwọ ụgbọala n’ogologo njem n’abalị, ọ ka mma ịkwụsịtụ n’ebe na-adịghị ize ndụ site n’oge ruo n’oge ma hitụ ụra (minit 15 ruo minit 30), nke ahụ gasịa, mee ngagharị ma ọ bụ gbaa mwemwe ọsọ ma na-agbatị aka na ụkwụ gị.

2. Ọ bụrụ na m na-enwe nsogbu ihi ụra, ngwọta ya bụ ịdị na-ehi obere ụra.

Ikekwe, ọ ga-enye aka, ma ọtụtụ ndị ọkachamara kweere na usoro dị otú kwesịrịnụ bụ ihi ụra otu mgbe ruo ogologo oge kwa ụbọchị. Obere ụra ehihie (nke na-adịrukarị minit 15 ruo minit 30) pụrụ inye aka n’ime ka ahụ́ gị dịghachi gara gara n’oge ike gwụrụ gị n’ehihie, n’emetụtaghị ụra abalị gị bụ́ nke na-adịru ogologo oge karị. Ma ihi obere ụra n’ihe dị ka awa anọ tupu ị lakpuo ụra pụrụ imetụta ụra abalị gị n’ụzọ dị njọ.

3. Nrọ ndị anyị chetara emewo ka anyị ghara ihi ụra nke ọma.

Nrọ (nke a na-arọkarị n’oge ụra mgbe anya na-ama jijiji) bụ ihe na-egosipụta na mmadụ na-ehi ụra na-edozi ahụ́, ọ na-ewerekarịkwa ọnọdụ ugboro anọ ma ọ bụ karịa n’ụra abalị ọ bụla dị otú kwesịrịnụ. Nnyocha ndị e mere na-egosi na nrọ ndị anyị na-echeta bụ nanị ndị mere ka anyị teta, ma ọ́ bụghị na anyị tetara mgbe anyị na-arọ ha, ọ̀ bụrụ na anyị tetara n’ime minit ole na ole mgbe anyị rọsịrị ha. N’aka nke ọzọ, nrọ ọjọọ pụrụ ịkpata nchegbu ma mee ka o sie ike ihighachi ụra.

[Foto dị na peeji nke 6, 7]

Ezigbo ụra abalị na-eme ka ụra ghara ịtụ gị nakwa ka ị dị gara gara n’oge nile n’ụbọchị

[Foto dị na peeji nke 7]

Ndị ọkà mmụta sayensị maara ugbu a na ụra dị ná nkebi ná nkebi

[Foto dị na peeji nke 8]

Ọ na-esiri ndị na-ese siga ike karị ihi ụra

[Foto dị na peeji nke 9]

Kpachapụ anya banyere ịṅụ ọgwụ ụra