Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Mbara Ala Anyị—Gịnị Bụ Ọdịnihu Ya?

Mbara Ala Anyị—Gịnị Bụ Ọdịnihu Ya?

Mbara Ala Anyị—Gịnị Bụ Ọdịnihu Ya?

“Kemgbe ọtụtụ puku afọ, ndị mmadụ atụwo ọdachi ndị na-emere onwe ha bụ́ ndị karịrị ike mmadụ ụjọ, dị ka iju mmiri na oké ọkọchị, ugbu a, ha adabala n’ọnọdụ ka njọ: ọdachi ndị na-emere onwe ha bụ́ ndị ndị mmadụ ji aka ha akpata,” ka akwụkwọ akụkọ bụ́ Globe and Mail nke Canada na-ekwu. Ngalaba Na-ahụ Maka Gburugburu Ebe Obibi nke Òtù Mba Ndị Dị n’Otu (UNEP) bipụtara akụkọ zuru ezu nke na-agba ume ime ihe ugbu a oge ka dị iji kwụsị imebi gburugburu ebe obibi n’ụzọ dị oké njọ. Nnukwu onyeisi oche nke òtù a, bụ́ Klaus Toepfer, na-ekwu, sị: “Anyị nwere ihe ọmụma zuru ezu ugbu a iji mata otú ihe ndị anyị na-eme ma ọ bụ ihe ndị anyị na-adịghị eme pụrụ isi metụta mbara ala a pụrụ iche nke na-acha anụnụ anụnụ nakwa ndị bi na ya ka ọ na-erule afọ 2032.”

E nwewo ụfọdụ ọganihu n’ichebe gburugburu ebe obibi kemgbe e hiwere òtù ahụ n’afọ 1972. Dị ka a kọrọ n’akwụkwọ akụkọ bụ́ The Toronto Star, “ikuku na mmiri dị n’osimiri ndị e nwere na Europe nakwa n’Ebe Ugwu America akawo mma, iwu ndị machibidoro ịgba kemikal n’ikuku emewo ka o kwe omume idozi ihe ụfọdụ mebirinụ n’ikuku ozone.” Ọzọkwa, usoro ndị e ji echekwa oké ọhịa, dị ka ndị e nwere na Canada, Finland, Norway, na United States, “na-ahụ na a ga-ebelata mmetụta ịwa osisi n’ụzọ gabigara oké na-enwe.” Ka o sina dị, akụkọ ahụ si n’aka òtù UNEP na-akọ na ọ bụrụ na ọ dịghị ihe e mere iji belata uto akụ̀ na ụba, ọ bụrụkwa na akụkụ ka ukwuu nke ụwa anọgide na-aghọ obodo ukwu, nke a ga-emetụta anụmanụ na ụdị ihe dị iche iche dị ndụ n’ụzọ dị njọ. Akwụkwọ akụkọ ahụ bụ́ Globe kwuru, sị: “E metọwo ihe dị ka ọkara nke osimiri dị n’ụwa ma ọ bụ mee ka ha talata n’ụzọ dị nnọọ njọ. Mba 80 bụ́ ndị pasent 40 nke ndị bi n’ụwa bi na ha na-enwe nsogbu nke oké ụkọ mmiri.”

Toepfer kweere na “ime ihe kwesịrị ekwesị pụrụ ịrụpụta ezi ihe.” Ọ na-agbakwụnye, sị: “Ihe dị anyị mkpa bụ usoro ihe omume doro anya . . . ime ihe ndị a hụrụ anya . . . nakwa karịsịa, nkwupụta doro anya.” Ma gịnị bụ olileanya e nwere ma ọ bụrụ na ndị ndú ụwa enweghị mmasị n’ime ihe iji chebe ọdịmma nke mbara ala?

Jide n’aka na ọ dị onye merela “nkwupụta doro anya” na onye ga-eme “ihe kwesịrị ekwesị”—Jehova Chineke. N’ezie, o kwupụtawo n’ụzọ doro anya na ya ga-eme ihe iji ‘bibie ndị na-ebibi ụwa.’ (Mkpughe 11:18) Ọzọkwa, Chineke na-emesi anyị obi ike na a ga-eme ka njikọ nke ihe ndị dị ndụ n’ụwa na gburugburu ebe obibi ha dịghachi mma. Ala ihe na-adịghị ga-agbawa okooko ọhịa. (Aịsaịa 35:1) A ga-enwe ihe oriri n’ụba. A gaghịkwa emetọ osimiri ọzọ. (Abụ Ọma 72:16; 98:8) Chineke kwere nkwa ịgọzi ihe nile dị ndụ nọ n’ụwa.—Abụ Ọma 96:11, 12.

[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 13]

Foto NASA