Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Olee Otú M Pụrụ Isi Nweta Oge Iji Mee Ihe Omume Ụlọ Akwụkwọ E Nyere M Ime n’Ụlọ?

Olee Otú M Pụrụ Isi Nweta Oge Iji Mee Ihe Omume Ụlọ Akwụkwọ E Nyere M Ime n’Ụlọ?

Ndị Na-eto Eto Na-ajụ Sị . . .

Olee Otú M Pụrụ Isi Nweta Oge Iji Mee Ihe Omume Ụlọ Akwụkwọ E Nyere M Ime n’Ụlọ?

‘Anọ m na klas ikpeazụ n’ụlọ akwụkwọ sekọndrị, nrụgide m na-enwe karịkwara akarị. . . . Enwere m nnọọ ọtụtụ ihe omume na okwu ndị m ga-akwadebe, ọ bụghị obere ihe. Enweghị m oge iji mee ha.’—Otu nwa agbọghọ dị afọ 18.

Ị̀ NA-ENWE ike ọgwụgwụ n’ihi ọtụtụ ihe omume a na-enye gị n’ụlọ akwụkwọ kwa ehihie, bụ́ ndị ị ga-eme n’ụlọ? Ọ bụrụ otú ahụ, ọ bụghị nanị gị ka ọ na-adị otú ahụ. “Ka ụlọ akwụkwọ ndị dị ná mba a na-agbalịsi ike ibuli ọnọdụ agụmakwụkwọ ha—nakwa akara ule ha—ha na-enyekwu ụmụ akwụkwọ ihe omume ha na-eme n’ụlọ,” ka otu akụkọ si n’aka ụlọ ọrụ mgbasa ozi dị na United States kọrọ. “N’ebe ụfọdụ, ụmụ akwụkwọ sekọndrị na-akọ na ha na-eji ihe karịrị awa atọ kwa abalị eme ihe omume ụlọ akwụkwọ e nyere ha ime n’ụlọ. Otu nnyocha e mere na Mahadum nke Michigan na-enye echiche na ihe omume ụmụaka na-eme n’ụlọ ugbu a ji ihe dị ka okpukpu atọ karịa ndị nke ụmụaka mere afọ 20 gara aga.”

Ọ bụghị nanị ụmụ akwụkwọ ndị nọ na United States ka a na-enye ọtụtụ ihe omume ụlọ akwụkwọ ime n’ụlọ. Dị ka ihe atụ, ebe ihe dị ka pasent 30 nke ụmụaka dị afọ 13 ná mba ahụ kọrọ na ha na-eji ihe karịrị awa abụọ kwa ụbọchị eme ihe omume ụlọ akwụkwọ e nyere ha ime n’ụlọ, na Taiwan nakwa na Korea, ha dị pasent 40, na France kwa, ha dị ihe karịrị pasent 50. “Mgbe ụfọdụ, nrụgide m na-enwe na-akarị akarị mgbe ihe omume ụlọ akwụkwọ m nwere ime n’ụlọ bịara hie nne,” ka Katie, bụ́ nwa akwụkwọ nọ na mahadum dị na United States kwara n’arịrị. Marilyn na Belinda, bụ́ ndị na-aga akwụkwọ na Marseilles France kwukwara otu ihe ahụ. “Anyị na-ejikarị awa abụọ ma ọ bụ karịa kwa abalị eme ihe omume ụlọ akwụkwọ e nyere anyị ime n’ụlọ,” ka Marilyn na-ekwu. “Mgbe i nwere ihe ndị ọzọ ị ga-eme, ọ pụrụ isi nnọọ ike inweta oge.”

Olee Ebe M Ga-enweta Oge?

Ọ́ gaghị adị mma ma ọ bụrụ na ị ga-enwe nnọọ ike ịgbakwụnye awa ole na ole n’ụbọchị ị chọrọ ya ka i wee nwee ike imecha ihe omume ụlọ akwụkwọ e nyere gị ime n’ụlọ na ihe ndị ọzọ i nwere ime? N’ezie, ị pụrụ ime ihe dị otú ahụ ma ọ bụrụ na ị mụta ihe site n’ụkpụrụ Bible dị ná Ndị Efesọs 5:15, 16: “Nọrọsienụ ike na nche ka otú unu si na-eje ije ghara ịdị ka ndị na-amaghị ihe kama dị ka ndị maara ihe, na-azụpụtara onwe unu oge kwesịrị ekwesị.” Ọ bụ ezie na onye dere akụkụ Bible a ebughị ihe omume ụlọ akwụkwọ e nyere ime n’ụlọ n’obi mgbe ọ na-ede okwu ndị ahụ, a pụrụ iji ụkpụrụ ahụ mee ihe ná ndụ a na-adị kwa ụbọchị. Mgbe ị zụrụ ihe, ị ghaghị inyefe ihe n’ọnọdụ ya. Ihe a na-ekwu n’ebe a bụ na iji nweta oge ịmụ ihe, ị ghaghị inyefe ihe. Ma gịnị ka ị ga-enyefe?

“Depụta ihe ndị ọ dị mkpa ka i buru ụzọ mee,” ka otu nwa agbọghọ aha ya bụ Jillian na-adụ n’ọdụ. N’ikwu ya n’ụzọ ọzọ, mara ihe ndị kasị dị gị mkpa. Nzukọ Ndị Kraịst na ihe ime mmụọ kwesịrị ịbụ ihe mbụ ị ga-edepụta. E chefukwala ibu ọrụ ezinụlọ gị, ọrụ ị na-arụ n’ụlọ mgbe nile, nakwa n’ezie, ihe omume ụlọ akwụkwọ e nyere gị ime n’ụlọ.

Ọzọkwa, gbalịa idetu otú i si eji oge gị eme ihe n’ezie ruo otu izu ma ọ bụ karịa. Ihe ị ga-ahụ pụrụ iju gị anya. Oge hà aṅaa ka ị na-eji ekiri TV? achọ ihe n’Intanet? ekiri sinima? akpọ mmadụ na fon? eleta ndị enyi? Ugbu a, olee ihe ihe ndekọ gị na-egosi banyere ihe ndị ị na-ebute ụzọ? Ọ pụrụ ịbụ na ọ dịghị mkpa ịchọwa ebe ọzọ ị pụrụ isi zụpụta oge buru ibu ma ọ bụghị site n’oge i ji ekiri TV, oge i ji akpọ fon, ma ọ bụ oge i ji achọ ihe n’Intanet!

Debe Ihe Mbụ n’Ọnọdụ Mbụ

Nke a apụtaghị na ị ga-atụfu TV gị ma ọ bụ bụrụ onye na-anọ nanị ya. Ọ pụrụ ịdị mkpa iji ụkpụrụ ahụ bụ́, “Debe ihe mbụ n’ọnọdụ mbụ,” na-eme ihe. Akụkụ Bible a pụrụ iji mee ihe, na-ekwu, sị: “Jide ihe ndị ka mkpa n’aka.” (Ndị Filipaị 1:10) Dị ka ihe atụ, ebe ọ bụ na akwụkwọ ị na-aga dị oké mkpa, ị pụrụ inye onwe gị iwu na ị gaghị agbanye TV ruo mgbe i jesịrị ozi ndị dị n’ụlọ, kwadosịa maka nzukọ Ndị Kraịst, ma mesịa ihe omume ụlọ akwụkwọ e nyere gị ime n’ụlọ. N’eziokwu, ịghara ikiri ihe omume TV nke kasị amasị gị pụrụ ịgbakasị gị ahụ́. Ma n’ikwu eziokwu, ugbo ole ka ị nọdụworo ala iji kirie nanị ihe ngosi nke kasị amasị gị ma nọrọzie n’ihu TV n’anyasị nile—n’enweghịzi ihe ọzọ i mere?

N’aka nke ọzọ, ọ dị gị mkpa iwere ịga nzukọ Ndị Kraịst dị ka ihe dị nnọọ mkpa. Ọ bụrụ na ị ma, dị ka ihe atụ, na i nwere ule dị mkpa ma ọ bụ ihe omume ụlọ akwụkwọ bụ́ nke e mere ndokwa na ị ga-eme, ị pụrụ ime ya ogologo oge tupu oge eruo ka o wee ghara igbochi gị ịga nzukọ. Ị pụkwara ọbụna ịgbalị ka gị na ndị nkụzi gị kwurịta banyere ọnọdụ gị, na-eme ka ha mata na obi ga-adị gị nnọọ ụtọ ma ọ bụrụ na ha enye gị ihe omume ọ bụla a ga-eme ná mgbede nke ụbọchị i ji aga nzukọ, n’oge. Ụfọdụ ndị nkụzi pụrụ ikwe.

Ụkpụrụ ọzọ nke ga-enyere gị aka bụ nke a kụziri n’ihe ndekọ Bible banyere otu enyi Jizọs a kpọrọ Mata. Ọ bụ onye na-eji nnọọ ọrụ n’aka ma na-agba mbọ, ma ọ naghị ebute ihe ndị kwesịrị ekwesị ụzọ. N’otu oge, ọ nọ na-adọgbu onwe ya n’ọrụ n’isiri Jizọs ihe a pụrụ ịkpọ ma eleghị anya nnukwu ihe oriri, ebe nwanne ya nwanyị, bụ́ Meri, nọ na-ege Jizọs ntị kama inyere ya aka. Mgbe Mata mere mkpesa banyere nke a, Jizọs gwara ya, sị: “Mata, Mata, ị na-echegbu ma na-esogbu onwe gị banyere ọtụtụ ihe. Ma, ihe ole na ole, ma ọ bụ nanị otu ihe, dị mkpa. N’aka nke ya, Meri họọrọ òkè dị mma, a gaghịkwa anapụ ya nke ahụ.”—Luk 10:41, 42.

Gịnị bụ ihe mmụta dị na nke a? Mee ihe nile ka ha dị mfe. Olee otú ị pụrụ isi jiri ụkpụrụ a mee ihe n’ọnọdụ nke gị? Ị̀ “na-echegbu ma na-esogbu onwe gị banyere ọtụtụ ihe”—ikekwe na-agbalị ijikọta ihe omume ụlọ akwụkwọ e nyere gị ime n’ụlọ na ọrụ nwa oge? Ọ bụrụ na ị na-arụ ọrụ, ego ahụ a na-akwụ gị, ọ̀ dị ndị ezinụlọ gị mkpa n’ezie? Ka ị̀ na-achọ nanị inwetakwu ego ị ga-eji zụrụ ihe ndị ị chọrọ bụ́kwa ndị na-adịghị gị mkpa n’ezie?

Dị ka ihe atụ, n’ala ụfọdụ, ọ na-agụsi ndị na-eto eto agụụ ike ịzụ ụgbọala nke ha. Onye ndụmọdụ n’ụlọ akwụkwọ sekọndrị, bụ́ Karen Turner, kọwara na “ndị na-eto eto taa na-enwe nrụgide dị nnọọ ukwuu nke inwe ego ma ọ bụ ịkpata ego n’ihi na inwe ụgbọala na-efu nnukwu ego.” Otú ọ dị, Turner, kwubiri, sị: “Ọ na-enye nnọọ nsogbu mgbe i weghaara ọtụtụ ihe omume dị ka ndị a na-eme ma a gbasaa akwụkwọ, na ọrụ nwa oge, tinyere nnukwu ọrụ ụlọ akwụkwọ. Mgbe ahụ, nwa akwụkwọ ahụ na-ebu nnọọ ibu arọ.” Gịnị mere ị ga-eji boo onwe gị ibu arọ ma ọ bụrụ na ọ dịghị mkpa ime otú ahụ? Ọ bụrụ na ọ na-emetụta ọrụ ụlọ akwụkwọ gị n’ụzọ dị njọ, ikekwe, i nwere ike ịrụ ọrụ awa ole na ole ma ọ bu ọbụna kwụsị ịrụ ọrụ.

‘Zụpụta’ Oge n’Ụlọ Akwụkwọ

Tụkwasị n’ịchọ inwetakwu oge mgbe ị na-anọghị n’ụlọ akwụkwọ, chesie echiche ike banyere otú ị pụrụ isi jiri oge gị mee ihe n’ụzọ ka mma n’oge ị nọ n’ụlọ akwụkwọ. “Ana m agbalị otú m nwere ike iji oge ndị e nyere maka ịgụ ihe n’ụlọ akwụkwọ mee ihe omume ụlọ akwụkwọ e nyere m ime n’ụlọ,” ka Josue na-ekwu. “N’ụzọ dị otú a, ana m enwe ohere ịjụ onye nkụzi anyị ajụjụ ma ọ bụrụ na ọ dị ihe m na-aghọtaghị na klas n’ụbọchị ahụ.”

Ihe ọzọ ị ga-atụle pụrụ ịbụ ibelatatụ ọnụ ọgụgụ ihe ọmụmụ ndị na-abụghị iwu na ị ga-amụ ha. Ọzọkwa, ị pụrụ ịkwụsị ụfọdụ n’ime ihe omume ndị ị na-eme ma a gbasaa akwụkwọ. Site n’ime mgbanwe n’ebe ndị a nile, ị pụrụ inwetakwu oge ị ga-eji mụọ ihe.

Iji Oge Gị Eme Ihe nke Ọma Karị

Ọ dị mma, ị chụwo ihe ụfọdụ n’àjà, meekwa mgbanwe, ma nwetatụkwuo oge maka ihe omume ụlọ akwụkwọ e nyere gị ime n’ụlọ. Olee otú ị ga-esi jiri oge ahụ mee ihe nke ọma? Ọ bụrụ na ị pụrụ imekwu pasent 50 nke ihe omume ụlọ akwụkwọ e nyere gị ime n’ụlọ n’ime otu oge ahụ, nke ahụ ọ́ pụtaghị na i nwetakwuola oge dị pasent 50? Lezie aro ụfọdụ ndị ga-enyere gị aka n’ime ihe nke ọma karị.

Nwee usoro ime ihe. Tupu ị malite ime ihe omume ụlọ akwụkwọ e nyere gị ime n’ụlọ, chetụ echiche n’ihe ndị dị ka ndị a: Olee ihe ọmụmụ m ga-ebu ụzọ mee ihe omume ya? Oge hà aṅaa ka ihe omume ahụ kwesịrị iwe? Olee ihe ndị ga-adị gị mkpa—akwụkwọ, akwụkwọ e ji ede ihe, mkpịsị akwụkwọ, ihe e ji agbakọ ihe—iji mee ihe omume ahụ?

Nwee ebe ị ga-anọ na-amụ ihe. Dị ka o kwesịrị ịdị, ebe ị na-anọ agụ akwụkwọ e kwesịghị inwe ihe ndị na-adọpụ uche. ‘Ọ bụrụ na i nwere tebụl, were ya mee ihe,’ ka nwa agbọghọ aha ya bụ Elyse na-ekwu. ‘Ịnọdụ ala nke ọma ga-enyere gị aka itinyekwu uche n’ihe ị na-agụ kama idinara n’ihe ndina.’ Ọ bụrụ na i nweghị ọnụ ụlọ nke gị, ma eleghị anya, ụmụnne gị ga-adị njikere ime ka ahụ́ ruo gị ala nakwa ime ka ime ụlọ ahụ dịrị jii n’oge ndị ahụ i ji agụ akwụkwọ. Ma ọ bụ ikekwe, ị pụrụ iji ogige ntụrụndụ ma ọ bụ ọ́bá akwụkwọ ọha na eze mee ihe. Ọ bụrụ na i nwere ọnụ ụlọ nke gị, emela ihe ga-emebi mgbalị gị site n’ịgbanye TV ma ọ bụ egwú na-adọpụ uche gị mgbe ị na-achọ ịgụ akwụkwọ.

Na-eme nkwụsịtu. Ọ bụrụ na i nwekwaghị ike itinye uche n’ihe ị na-agụ ruo oge ụfọdụ, ịkwụsịtụ ga-enyere gị aka ime ka uche gị dịghachi n’ihe ị na-agụ.

Eyigharịla oge! “Iyigharị oge eriwo m nnọọ ahụ́,” ka Katie, bụ́ onye e hotara ihe o kwuru na mbụ, na-ekwu. “Anaghị m amalite ihe omume m ruo mgbe oge malitere ịchụ m ọsọ.” Zere ịdị na-eyigharị oge site n’inwe usoro doro anya ị ga-eji na-eme ihe omume ụlọ akwụkwọ e nyere gị ime n’ụlọ ma nọgide na-agbaso ya.

Ọrụ ụlọ akwụkwọ dị nnọọ mkpa, ma dị ka Jizọs mere ka o doo Mata anya nke ọma, ọrụ kasị mkpa—“òkè dị mma”—bụ nke ime mmụọ. Jide n’aka na ihe omume ụlọ akwụkwọ e nyere gị ime n’ụlọ anaghị egbochi gị ime ihe ndị ahụ dị mkpa dị ka ịgụ Bible, ikere òkè n’ozi, na ịga nzukọ Ndị Kraịst. Ihe ndị a bụ ihe ndị ga-eme ka ndụ gị ka mma ruo mgbe ebighị ebi!—Abụ Ọma 1:1, 2; Ndị Hibru 10:24, 25.

[Foto ndị dị na peeji nke 29]

Iweghara ọtụtụ ihe omume pụrụ ime ka o siere gị ike inweta oge ị ga-eji mee ihe omume ụlọ akwụkwọ e nyere gị ime n’ụlọ

[Foto dị na peeji nke 29]

Ịhazi ihe nke ọma pụrụ inyere gị aka inwetakwu oge iji mee ihe omume ụlọ akwụkwọ e nyere gị ime n’ụlọ