Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Otú Ị Pụrụ Isi Mara Aha Chineke

Otú Ị Pụrụ Isi Mara Aha Chineke

Otú Ị Pụrụ Isi Mara Aha Chineke

OTU onye na-ede akụkụ pụrụ iche n’akwụkwọ akụkọ nwetara akwụkwọ ozi na-esonụ n’aka onye na-agụ akwụkwọ akụkọ ha: “Echebaworo m nnọọ ajụjụ a echiche ná ndụ m nile, enwekwara m olileanya na ị pụrụ ịza m ya. Gịnị bụ aha Chineke? Ndị Juu sịrị na ọtụtụ afọ gaferenụ emewo ka a gharazie ịma ihe bụ́ ezigbo aha ya. Ndị Kraịst na-akpọ Ya Jizọs. Ndị Alakụba na-akpọ Ya Allah. . . . Ya mere, gịnị bụ aha ya?” Akwụkwọ akụkọ ahụ bipụtara ajụjụ ahụ nakwa azịza a: “Dị ka ozizi oge ochie nke ndị Hibru si dị, Chineke bụ onye nwere ike ime ihe nile, ya mere, Ọ pụghị inwe nanị otu aha. Otú ọ dị, ana m emesi gị obi ike na Ọ ga-aza aha ọ bụla i ji nsọpụrụ kpọọ ya.”

Àgwà ọ̀ gbasara m dị otú ahụ n’ebe aha Chineke dị juru ebe nile taa. Ọ bụ ezie na ha ji okpukpe kpọrọ ihe, ọtụtụ ndị, bụ́ ndị kweere na Bible, adịghị echebachara aha Chineke echiche. Ma olee otú ọ na-adị Chineke? Ò weere ya dị ka obere ihe?

Ọ Bụghị Obere Ihe

Tụlee eziokwu ahụ bụ́ na Bible ji aha Chineke, bụ́ Jehova, mee ihe ọtụtụ puku ugboro. Na New World Translation of the Holy Scriptures, aha Chineke pụtara ugboro 7,210! * Ọ bụ Chineke n’onwe ya nyere ndị dere Bible ike mmụọ nsọ iji aha ya mee ihe ọtụtụ ugboro. Ọbụ abụ bụ́ Esaf, bụ́ otu n’ime ndị edemede a, dere, sị: “Gị, Onye aha Gị bụ Jehova, nanị Gị, bụ Onye kachasị ihe nile elu n’elu ụwa nile.” (Abụ Ọma 83:18) Devid dekwara n’otu abụ ọma, sị: “Anyị na-ehota aha Jehova, bụ́ Chineke anyị.”—Abụ Ọma 20:7.

Bible na-egosi na Jehova Chineke na-enyocha obi anyị iji chọpụta otú aha ya na-adị anyị. Ọbụ abụ ahụ kwuru, sị: “Ọ bụrụ na anyị echezọwo aha Chineke anyị, . . . Chineke ọ̀ gaghị egwupụta ala ihe a? N’ihi na Ya onwe ya maara ihe nzuzo nile nke obi.” (Abụ Ọma 44:20, 21) Aịzaịa onye amụma dere, sị: “Keleenụ Jehova, kpọkuonụ aha Ya, meenụ ka a mara omume Ya nile n’etiti ndị nile dị iche iche, hotanụ na e mewo ka aha Ya dị elu.”—Aịsaịa 12:4.

Chineke n’onwe ya kwuru, sị: “Ha ga-amarakwa na aha m bụ Jehova.” (Jeremaịa 16:21) N’oge ọzọ, o kwuru, sị: “M ga-edokwa aha ukwu m nsọ, nke e mere ka ọ ghara ịdị nsọ n’etiti mba nile, . . . mba nile ga-amakwa na Mụ onwe m bụ Jehova.” (Ezikiel 36:23) Ụfọdụ n’ime okwu ndị a na-arụtụ aka n’oge Jehova ga-eji iwe mee ihe megide ndị na-adịghị asọpụrụ aha ya. Chineke adịghị ewere ihe metụtara aha ya dị ka obere ihe.

Jehova Chineke Anọghị Gị n’Ebe Dị Anya

Olee otú ị pụrụ isi mara aha Chineke? Gịnị ka ịmara aha Chineke pụtara? Bible na-aza, sị: “Ndị maara aha Gị ga-atụkwasị Gị obi.” (Abụ Ọma 9:10) N’ụzọ doro anya, ịmara aha Chineke na-agụnye ihe karịrị nanị ịmara ihe bụ́ aha ya. Ị ghaghị ịtụkwasị ya obi. Nke ahụ pụtara ịmara ụdị Chi ọ bụ na ịmara àgwà ya na echiche ya. Nke a ga-akpali gị ịtụkwasị ya obi.

Ọ bụ nanị iji nlezianya na-agụ ma na-amụ Bible pụrụ ime ka ị ghọta ụdị Chi Jehova bụ. Ọ na-ekwe nkwa ichebe ndị hụrụ ya na aha ya n’anya. Chineke na-ekwu banyere otu onye nke mere otú ahụ, sị: “N’ihi na ọ hụwo m n’anya sie ike, M ga-emekwa ka ọ gbapụta: M ga-eme ka ọ nọọ n’ebe dị elu, n’ihi na ọ mawo aha m. Ọ ga-akpọku m, m ga-azakwa ya; mụ onwe m ga-anọnyere ya n’ahụhụ: m ga-adọpụta ya, sọpụrụkwa ya. Ụbọchị ndụ dị ogologo ka m ga-eji mee ka afọ ju ya, m ga-emekwa ka o lekwasị nzọpụta m anya.”—Abụ Ọma 91:14-16.

Lee mmekọrịta dị ịtụnanya Jehova Chineke na ndị maara aha ya na-enwe! Gị onwe gị pụkwara iso ya nwee mmekọrịta dị otú ahụ. Mgbe ị na-ekpe ekpere sitere n’ala ala obi, alala azụ ma ọlị ịkpọ ya aha ya. Ọ ga-aza gị n’ihi na, dị ka Bible na-ekwu, “ọ nọghị n’ebe dị anya n’ebe onye ọ bụla n’ime anyị nọ.”—Ọrụ 17:27.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 5 New World Translation of the Holy Scriptures, nke Ndịàmà Jehova bipụtara, bụ nsụgharị Bible nke ji ụdị okwu e ji eme ihe ugbu a dochie okwu mgbe ochie e ji sụgharịa Bible n’oge ochie. Ihe kasị pụta ìhè na Bible a bụ mweghachi o weghachiri aha Chineke n’ebe ndị o kwesịrị ịdị n’ihe odide Bible. Ka ọ dị ugbu a, e bipụtawo ya ihe karịrị nde 122, n’ozuzu ma ọ bụ n’akụkụ ya ụfọdụ, n’asụsụ 45.

[Igbe/Foto dị na peeji nke 25]

Chineke Maara Aha Gị

Chineke gwara Mozis, sị: “Amawo m [gị] n’aha.” (Ọpụpụ 33:12) Ihe ndekọ ahụ a maara nke ọma banyere ọhịa na-ere ọkụ na-agba akaebe nke a. Bible na-ekwu na Chineke “si n’etiti osisi nta ahụ kpọọ ya òkù, sị, Mozis, Mozis.” (Ọpụpụ 3:4) Nke a bụ nanị otu ihe atụ nke ọtụtụ oge Chineke kpọrọ ndị mmadụ aha ha. N’ụzọ doro anya, Onye Okike nke eluigwe na ala nwere mmasị n’ebe anyị nọ n’otu n’otu.

Bible na-ekwu na Chineke maara aha nke ọ bụla n’ime ọtụtụ ijeri kpakpando e nwere. (Aịsaịa 40:26) Ọ̀ bụzi ụmụ mmadụ na-efe ya ofufe ka ọ na-agaghị ama karị! Pọl onyeozi dere na “Jehova maara ndị bụ ndị ya.” (2 Timoti 2:19) Nke a na-egosi ihe karịrị nanị iburu aha dị iche iche n’isi. Chineke maara ndị na-efe ya ofufe nke ọma. N’aka nke anyị, anyị kwesịkwara ịmara aha Chineke na àgwà ya nke ọma.

Akwụkwọ ikpeazụ nke Bible na-akọwa otu akwụkwọ ihe atụ nke Chineke deturu aha ndị nile feworo ya ofufe kemgbe ụwa. Ihe a na-akpọ akwụkwọ a bụ ‘akwụkwọ mpịakọta nke ndụ’ n’ihi na Jehova Chineke ga-enye ndị e dere aha ha na ya ndụ ebighị ebi. (Mkpughe 17:8) Nke a bụ atụmanya magburu onwe ya nye ndị maara aha Chineke.

[Igbe/Foto dị na peeji nke 26]

Ha Kpọsara Aha Chineke

● Abụ Mozis bụrụ mgbe ọ fọrọ obere oge ka Izrel banye n’Ala Nkwa ahụ: “Aha Jehova ka m ga-akpọsa.”Deuterọnọmi 32:3.

● Okwu Devid gwara dike ahụ bụ́ Golaịat: “Mụ onwe m na-ewere aha Jehova nke usuu nile nke ndị agha bịakwute gị.”1 Samuel 17:45.

● Ihe Job kwuru mgbe ihe onwunwe ya nile funahụsịrị ya, ụmụ ya nile anwụọkwa na mberede: “Ka aha Jehova bụrụ ihe a gọziri agọzi.”Job 1:21.

● Ka Pita onyeozi na-ehota Akwụkwọ Nsọ Hibru n’okwu ya: “Onye ọ bụla nke na-akpọkukwa aha Jehova ka a ga-azọpụta.”Ọrụ 2:21.

● Aịzaịa onye amụma: “Keleenụ Jehova, kpọkuonụ aha Ya, . . . hotanụ na e mewo ka aha Ya dị elu.”Aịsaịa 12:4.

● Ka Jizọs Kraịst na-akụziri ndị na-eso ụzọ ya ikpe ekpere: “Ya mere, kpeenụ ekpere otú a: ‘Nna anyị nke nọ n’eluigwe, ka e doo aha gị nsọ.’”Matiu 6:9, 10.

● Ka Jizọs Kraịst na-ekpeku Chineke ekpere: “Emewo m ka aha gị pụta ìhè.”Jọn 17:6.

● Ka Chineke na-agwa ndị ya okwu: “Mụ onwe m bụ Jehova; nke ahụ bụ aha m: M gaghị enyekwa onye ọzọ nsọpụrụ m.”Aịsaịa 42:8.