Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ọrụ Oké Ọhịa Na-arụ—Olee Otú Ọ Baruru Uru?

Ọrụ Oké Ọhịa Na-arụ—Olee Otú Ọ Baruru Uru?

Ọrụ Oké Ọhịa Na-arụ—Olee Otú Ọ Baruru Uru?

O KÉ ọhịa mejupụtara ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ otu ụzọ n’ụzọ atọ nke ụwa, ma nke ahụ nọgidere na-ebelata. Magazin bụ́ Choices—The Human Development Magazine, bụ́ nke Atụmatụ Mmepe nke Mba Ndị Dị n’Otu bipụtara, kwuru n’afọ 1998 na ná mba ndị ka na-emepe emepe nanị, “a na-egbukpọsị oké ọhịa ndị dị n’ala ruru nde hekta 4—ihe há ka Switzerland—kwa afọ.”

Ihe Mere Igbukpọsị Oké Ọhịa Ji Bụrụ Mma Ihu Abụọ

Ụfọdụ ndị ọkachamara na-ekwu na mgbukpọ a na-egbukpọsị oké ọhịa, bụ́ nke na-aga n’ihu ugbu a, bụ mma ihu abụọ. Nke a bụ n’ihi na a nọgidewo na-agba oké ọhịa ọkụ, na-egbukpọsịkwa osisi ndị dị na ha iji nweta ego. Ma, dị ka otu akụkọ si kọọ, oké ọhịa “bara nnọọ uru mgbe a hapụrụ ha karịa mgbe e gbukpọsịrị ha ma ọ bụ kpọọ ha ọkụ.” N’ụzọ dị aṅaa?

Dr. Philip M. Fearnside na Dr. Flávio J. Luizão, bụ́ ndị nchọpụta na-arụ n’Ụlọ Ọrụ Mba Na-ahụ Maka Nchọpụta n’Amazon, nke dị na Manaus, Brazil, gwara Teta! na oké ọhịa ndị guzo eguzo na-arụ, dị ka ha si kwuo ya, “ọrụ na-abara ụwa uru.” Ọrụ ndị a na-agụnye ịmịkọrọ na ichekwa ikuku carbon dioxide (ikuku na-eme ka ọ̀tụ̀tụ̀ okpomọkụ na-arị elu n’ụwa), igbochi idei mmiri na igbochi mmiri ozuzo ibupụsị ájá dị n’ala, ime ka ala na-eme nri, ịchịkwa mmiri ozuzo, na ime ka ụmụ anụmanụ ndị a na-egbukpọsị egbukpọsị nwee ebe obibi na ichebe akụ́kụ́ ọhịa. Oké ọhịa bụkwa ebe na-adọrọ mmasị ma a na-ekiri ha, bụrụkwa ebe a pụrụ ịga maka ntụrụndụ. Ndị nnyocha ahụ na-ekwu na ọrụ nile dị otú ahụ ọ na-arụ na gburugburu ebe obibi nwere uru akụ̀ na ụba.

Dị ka ihe atụ, tụlee ike oké ọhịa nwere ichekwa carbon. Mgbe e gbukpọrọ oké ọhịa, carbon osisi na-emepụta mgbe e gbutusịrị ha na-aghọ carbon dioxide n’ikuku ma mee ka a na-enwekwu okpomọkụ n’ụwa. N’ihi ya, a pụrụ ịmata ego ole a na-enweta ‘n’ọrụ a na-abara ụwa uru’ nke oké ọhịa na-arụ,’ ya bụ, ichekwa carbon, site n’ịchọpụta ego ole ọ na-efu iji jiri ngwá ọrụ ndị ụmụ mmadụ rụpụtara belata carbon na-abanye n’ikuku.

Dị ka Marc J. Dourojeanni, bụ́ onye na-enye ndụmọdụ banyere gburugburu ebe obibi n’ụlọ akụ̀ Inter-American Development Bank nke dị na Brazil si kwuo, nchọpụta dị otú ahụ na-egosi na “uru oké ọhịa bara dị ka ebe na-echekwa carbon karịrị nnọọ uru a na-erite n’ịwa osisi ndị dị na ha na iji ha mere ala ubi.” N’agbanyeghị nke ahụ, a ka nọgidere na-egbukpọsị oké ọhịa n’ụzọ na-arịwanye elu. N’ihi gịnị?

Ihe Ga-akpali Ndị Mmadụ Ichekwa Ha

Chegodị echiche banyere ihe atụ a: Otu ìgwè mmadụ nwere otu ụlọ ọrụ ọkụ eletrik. Ụlọ ọrụ ahụ na-enye obodo ndị gbara ya gburugburu ọkụ eletrik, ma ndị na-eji ọkụ ahụ eme ihe adịghị akwụ kobo maka ya. Mgbe oge ụfọdụ gasịrị, ndị nwe ya echee echiche, sị, ‘Imechi ụlọ ọrụ a, ibupụsị ngwá ọrụ nile dị na ya, na irekpọsị ha ga-enye anyị ego karịa ịhapụ ụlọ ọrụ nke na-adịghị enye anyị ego ọ bụla.’ O yiri ka ụfọdụ ndị ọchịchị nọ ná mba oké ọhịa bara ụba na ya hà na-enwe echiche yiri nke ahụ. Ebe ọ bụ na ndị nọ n’ụwa adịghị akwụ ụgwọ maka ọrụ ndị a oké ọhịa na-arụ, ọ bụ ihe ezi uche dị na ya n’ụzọ akụ̀ na ụba igbukpọsị oké ọhịa ndị ahụ (ibupụsị ngwá ọrụ nile dị n’ụlọ ọrụ ọkụ eletrik ahụ, dị ka a pụrụ isi kwuo ya) ma ree osisi ndị dị na ya (rekpọsịa ngwá ọrụ ndị ahụ) iji nweta nnukwu uru ego ngwa ngwa—ma ọ bụkwanụ ha na-eche ya otú ahụ.

Nanị ụzọ a pụrụ isi gbanwee omume a, ka Dourojeanni na-ekwu, bụ ime ka ichekwa oké ọhịa bụrụ ihe na-enye ego. Prọfesọ Dr. José Goldemberg, bụ́ onye Brazil bụ́ ọkà n’ihe ọmụmụ nuclear physics, onye bụbukwa onyeisi nke Mahadum São Paulo, chepụtara echiche bụ́ inwe “ụtụ isi zuru ụwa ọnụ maka carbon,” nke ndị na-eji mmanụ sitere n’osisi ndị rere ere ma ghọọ mmanụ ala eme ihe, ga na-atụ.

Dị ka ndị na-akwado echiche a si hụ ya, ego ole a ga na-atụ n’ụtụ isi a ga-adabere n’otú mmanụ ala mba ma ọ bụ steeti ji eme ihe haruru, nakwa n’otú ikuku ndị na-eme ka ọ̀tụ̀tụ̀ okpomọkụ na-arị elu n’ụwa bụ́ ndị ha na-emepụta, haruru. Dị ka ihe atụ, United States, nke ihe dị ka pasent 5 nke ụmụ mmadụ nọ n’ụwa bi n’ime ya, na-emepụta ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ pasent 24 nke ikuku ndị na-eme ka ọ̀tụ̀tụ̀ okpomọkụ na-arị elu n’ụwa. Ụfọdụ ndị bụ́ ndị na-atụpụta ụkpụrụ na-ekwu na a ga-ejizi ego ahụ mba dị otú ahụ ga-atụ n’ụtụ isi tie mba ndị na-ahapụ oké ọhịa ha n’egbughị osisi na ha iji nweta ego ngwa ngwa, aka n’obi. A na-atụ aro na, n’ụzọ dị otú a, ndị ahụ ji ọkụ eletrik eme ihe, dị ka a pụrụ isi kwuo ya, ga-akwụ ‘ụgwọ ọkụ’ ha, ndị ahụ a sịkwara na ọ bụ ha nwe ‘ụlọ ọrụ ọkụ eletrik’ ahụ ga-enwe ihe na-akpali ha n’ụzọ ego ichekwa ụlọ ọrụ ha.

Otú ọ dị, ònye ga-ekwu ego ole a ga na-akwụ maka ọrụ ndị a na-arụ na gburugburu ebe obibi? Ònyekwa ga-anakọta ma kesaa ego ndị ahụ?

Mgbanwe n’Akparamàgwà Dị Mkpa

Dourojeanni na-ekwu, sị: “Ebe kasị mma a pụrụ ịnọ lebara okwu ndị a anya bụ ná nnọkọ ụwa nile maka oké ọhịa.” Nnọkọ dị otú ahụ ga-ekwu ego ole a ga na-akwụ maka ọrụ oké ọhịa na-arụ na gburugburu ebe obibi. Mgbe ahụ, “a pụrụ iguzobe òtù maka oké ọhịa ụwa iji na-ahụ maka mgbalị a zuru ụwa ọnụ a na-eme.”

N’agbanyeghị na ọ pụrụ iyi ihe ezi uche dị na ya iji òtù mba nile na-achịkwa nsogbu mba nile, Dourojeanni na-ekweta, sị: “Njupụta nke ọtụtụ òtù ndị na-ahụ maka okwu ndị metụtara oké ọhịa enyebeghị aka.” Ọ na-agbakwụnye na ihe dị mkpa n’ezie bụ “ụmụ mmadụ ime mgbanwe dị ngwa n’akparamàgwà nakwa n’otú ha si ele akụ̀ na ụba anya.” N’ezie, ichekwa ọhịa na-achọ ihe karịrị mgbanwe iwu—ọ na-achọ mgbanwe àgwà.

Ọ̀ dị mgbe a ga-edozi nsogbu ndị dị otú ahụ? A ga-edozi ha, ka Onye Okike ụwa, bụ́ Jehova Chineke, na-ekwe ná nkwa. Bible na-egosi na o guzobewo ọchịchị nke ga-achị ụwa nile n’isi nso ma dozie nsogbu ụwa. “A gaghị emebi [ọchịchị ahụ] emebi ruo mgbe ebighị ebi.” (Daniel 2:44) Ọzọkwa, ọ ga-ahụ na e ji usoro njikọ nke ihe ndị dị ndụ n’ụwa na gburugburu ha mee ihe n’ụzọ kwesịrị ekwesị ka ndị bi n’ụwa ga-anọgide na-amụ banyere Onye Okike ha, bụ́ onye Bible na-ekwu na aha ya bụ Jehova. (Aịsaịa 54:13) Mmadụ nile bụ́ ndị ga-adị ndụ n’oge ahụ ga-aghọta uru ụwa, gụnyere oké ọhịa ndị dị na ya, bara.

[Ebe E Si Nweta Foto Ndị Dị na peeji 28]

Ricardo Beliel / SocialPhotos

© Michael Harvey/Panos Pictures