Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ụbọchị “Isi Obodo Ọhịa” Gbara Ọkụ

Ụbọchị “Isi Obodo Ọhịa” Gbara Ọkụ

Ụbọchị “Isi Obodo Ọhịa” Gbara Ọkụ

SITE N’AKA ONYE EDEMEDE TETA! N’AUSTRALIA

NA January 18, 2003, ndị bi n’isi obodo Australia, bụ́ Canberra, tetakwuuru oké ọkụ na-eyi egwu. Anwụrụ ọkụ nke kwụjuru ebe nile mere ka anyanwụ ụtụtụ ahụ yie bọl na-acha ọbara ọbara. Ikuku na-ekpo ọkụ, ma na-akpọ ahụ́ nkụ. Oké ọkọchị ji Australia aka ọjọọ, na-eme ka osisi, akwụkwọ ha, na ahịhịa ndị dị n’okpuru ha kpọọ nnọọ nkụ. Ruo ọtụtụ izu, ọkụ repịara nnukwu ọhịa osisi eucalyptus bụ́ nke gbara obodo a, bụ́ nke e ji mmasị akpọ Isi Obodo Ọhịa, gburugburu.

N’ehihie ụbọchị ahụ, oké ifufe na-efesi ike mere ka ihe dị egwu mee. Ọkụ ahụ si n’ụzọ ndị e gburu iji gbochie ọkụ gafere ma banye n’ọhịa osisi pine ndị na-eto n’ime nakwa na gburugburu ebe ndịda ọdịda anyanwụ Canberra.

Oké Ọhịa ahụ Enwuru Ọkụ

Elliot, bụ́ onye wepụtara onwe ya n’afọ ofufo maka ịgbanyụ ọkụ, na-ekwu, sị: “Ọhịa pine ahụ nwuuru ọkụ n’elekere 3:00 nke ehihie, ọ nọ na-agba nnọọ ọnwụ ọnwụ nke na ụmụ irighiri ihe ndị na-ada ọkụ bụ́ ndị si n’ọkụ ahụ bịara na-adasasị n’ahụ́ anyị nakwa n’ógbè ndị dị nso. Ọ bụ ihe na-eyi egwu ịhụ ka ọkụ ịdị elu ya dị mita 40 gbaara na-abịa ebe anyị nọ.” Oké okpomọkụ na oké ifufe ahụ gbanwere ọnọdụ ihu igwe, mee ka e nwee nnukwu ọkụ nke ji ọsọ dị egwu na-agbapịa ógbè Chapman, na-efopụ osisi, na-ebibikwa ebe obibi. Ọkụ ahụ gbaturu ọtụtụ osisi eletrik, na-eme ka waya ndị ọkụ eletrik dị na ha daa n’ala. N’ime awa nke mbụ, o bibiri ụlọ 230.

Otú ọkụ ahụ si bibie ihe riri ndị ọrụ mgbanyụ ọkụ ọnụ. Elliot na-ekwu, sị: “Ọ bụ ihe na-agbawa obi ịhụ ka ọkụ na-agba ụlọ ndị mmadụ, ebe ọ bụ na anyị aghaghị ịhọrọ ụlọ nke anyị ga-agbanyụ ọkụ na ya na nke anyị ga-ahapụrụ ọkụ. Nke ka njọ bụ ịhụ ndị na-ebe ákwá bụ́ ndị obi kooro n’elu ka ha na-alọghachi n’ebe bụbu ụlọ ha.”

Ihe Ndị Ọ Kpatara

Mmadụ anọ nwụrụ n’ọkụ ahụ, ọtụtụ narị ndị ọzọ merụkwara ahụ́. Otu onye so ná ndị ọkụ ahụ gbagburu bụ nwanyị dị afọ 36, bụ́ onye gbabaghachiri n’ụlọ ya iji wepụta foto ndị dị na ya. Elu ụlọ ahụ dara, na-eme ka ọ tọ n’ime ụlọ ahụ. A zọpụtalighị ya.

Mgbe ikuku dajụrụ, ọkụ ahụ anyụlatakwa, o bibiwo ụlọ 530, na-eme ka mmadụ 2,500 gharazie inwe ebe obibi. O bibiri ọkụ eletrik, gas, na ọwara mmiri nsị n’ụzọ dị ukwuu, na-eme ka e nwewa nchegbu banyere ahụ́ ike. Ndị nwere nsogbu iku ume jupụtara nnọọ ná ngalaba ọnọdụ mberede n’Ụlọ Ọgwụ Canberra. N’ụzọ dị mwute, ka ndị mmadụ gbagajuru n’ebe ndị e kwuru ka a gbaga maka nchebe, ndị omekome obi tara mmiri malitere izuru ihe ndị dị n’ụlọ ndị a gbahapụrụ agbahapụ. Ma a kọkwara banyere ịkpa ike na omume obiọma nke ọtụtụ ndị gosipụtara. Ndị agbata obi nyeere ibe ha aka, ndị mmadụ napụtara anụmanụ nke ndị ha na-amabughị, ụlọ akwụkwọ dị iche iche meghere ụlọ akwụkwọ ha ka ndị na-enweghịzi ebe obibi hụ ebe ha ga na-ehi, ndị wepụtara onwe ha n’afọ ofufo maka ịgbanyụ ọkụ chebere ụlọ nke ndị ọzọ, ebe ụlọ nke ha gbara ọkụ.

Ọ bụ ezie na osisi ndị ahụ ga-emesị tolite ọzọ, a ga-emesịkwa wughachi ụlọ ndị ahụ, Praịm Minista John Howard kwuru na mmetụta nke mbibi ahụ “abụghị ihe ga-apụ apụ . . . n’obi ndị Canberra.”

[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 21]

AP Photo/Fairfax, Pat Scala