Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ememe Ọha Bịa Lere nke Kwesịrị Ncheta

Ememe Ọha Bịa Lere nke Kwesịrị Ncheta

Ememe Ọha Bịa Lere nke Kwesịrị Ncheta

SITE N’AKA ONYE EDEMEDE TETA! NA MEXICO

NA March 15, 2003, ndị nnọchianya si ihe karịrị mba 40 gbakọrọ nnọọ ná mpụga Mexico City maka nraranye nke ụlọ ọhụrụ ndị a ị na-ahụ n’okpuru ebe a. Ụlọ obibi na ụlọ obibi akwụkwọ ndị a so n’ihe ndị e wusawanyere na nke ugbu a n’alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova dị na Mexico.

N’afọ 1974, bụ́ mgbe e nwere ihe dị ka Ndịàmà 65,000 na Mexico, a raara ihe owuwu mbụ nke alaka ahụ bụ́ nke a rụrụ n’otu ebe a nye. Ka ọnụ ọgụgụ Ndịàmà nọ na Mexico nọ na-amụba n’ike n’ike, a raara ụlọ ndị e wunyekwuru na ya nye n’afọ 1985, rarakwa ndị ọzọ e wunyekwuru na ya nye n’afọ 1989. Ihe ndị ahụ e wunyekwuru ọhụrụ, bụ́ ihe karịrị ụlọ ọhụrụ 12, na-agụnye nnukwu ụlọ obibi akwụkwọ nakwa ụlọ obibi ndị ga-aba ihe dị ka mmadụ 1,300 na-arụ ọrụ n’alaka ahụ.

Izu abụọ mgbe nraranye ahụ gasịrị, e mere ememe ọha bịa lere maka ndị bi nso n’alaka ahụ. Ndị ọchịchị ógbè ahụ, tinyere ụmụ akwụkwọ na ndị nkụzi nke otu mahadum a ka rụrụ ọhụrụ nke dị n’ofe nke ọzọ nke okporo ámá ahụ, so ná ndị e nyere akwụkwọ ịkpọ òkù. Ọtụtụ ndị nọ n’alaka ahụ nọ na-eche banyere mmadụ ole ga-aza òkù ahụ.

Ọzịza Òkù nke Kwụghachiri Ụgwọ

Ngụkọta nke mmadụ 272 zara òkù ahụ, gụnyere ụmụ akwụkwọ na ndị ọchịchị steeti na nke ime obodo. Ndị bịaranụ kwuru okwu banyere ịma mma na ịdị ọcha nke ihe owuwu ahụ ma kwupụta ekele ha nwere maka ọbịa e lere ha. Otu onye dere n’akwụkwọ ndị ọbịa, sị: “Ihe a bụ nke mbụ m na-eleta ihe owuwu unu. Ha mara nnọọ mma. Adị m mbụ enwe mmasị n’ebe unu nọ ma na-akwanyere unu ùgwù, ma ana m eme otú ahụ ugbu a ọbụna karị.”

Onye ọzọ bịaranụ kwuru, sị: “Anyị nwere echiche na-ezighị ezi banyere ihe a na-eme n’ebe a. A kọwo ọtụtụ akụkọ banyere unu. . . . Ma ihe m hụrụ ugbu a na-eme ka obi sie m ike. Aga m eji obi ụtọ na-anabata unu n’ụlọ m n’ihi na echere m na ihe unu na-eme kwesịrị ekwesị.”

Otu n’ime ndị nkụzi nke mahadum ahụ, onye nne ya bụ Onyeàmà, kpọ klas abụọ nke ụmụ akwụkwọ bịa nleta ahụ. O kwuru, sị: “Achọrọ m ka ndị ntorobịa ahụ mara ihe Ndịàmà Jehova na-eme gburugburu ụwa. E nwere ihe ndị ha pụrụ ịmụta site n’ileta ebe a.” Olee otú nleta ahụ si metụta ụmụ akwụkwọ ahụ?

Otu n’ime ha dere, sị: “Unu emeela maka ọbịa unu lere anyị. Mụ na ụmụ klas m agaghị echefu ụbọchị taa echefu.” Onye ọzọ kwuru na ndị na-adịghị ege Ndịàmà na-eleta ha ntị amatụghị otú ha dị n’ezie. “Anyị aghaghị ịbụ ndị na-eji obi ọcha anabata ihe ndị ọzọ,” ka o kwubiri. Otu nwa okorobịa kwuru, sị: “Enwere m echiche dị nnọọ iche, ma ahụwo m ugbu a na unu na-akwado ibe unu. Unu na-arụsi nnọọ ọrụ ike dị ka ndanda.”

Mmadụ anọ n’ime ndị uwe ojii na-arụ ọrụ n’ógbè ahụ so ná ndị bịaranụ. Otu n’ime ha, bụ́ nwanyị, kwuru, sị: “Nke a amaka. Enweghị ịkpa ókè ebe a. Ma onye na-eme ka ihe dị ọcha, ma onye na-elekọta okooko osisi, onye ọ bụla hà nhata. . . . Nke a amagbuola onwe ya.”

Ụmụntakịrị nwoke abụọ bi n’ógbè ahụ, ndị otu n’ime ha dị afọ itoolu, nke ọzọ adịrị afọ iri, kwuru, sị: “Nke a amaka—o buka.” “Ihe kasị masị m bụ ígwè ọrụ ndị ahụ. Ha na-agba nnọọ ọsọ. Enwere m mmasị karịsịa n’ígwè ọrụ ndị e ji achabi akwụkwọ.”

Otu ọkà n’ịgwọ ọnyá, nwunye ya, na ada ha nọ na mahadum, so ná ndị bịaranụ. N’oge a na-edugharị ha, nwunye dọkịta ahụ jụrụ ọtụtụ ajụjụ dabeere na Bible. O kwuru na a kpaliri mmasị ya mgbe Ndịàmà letara nna ya, bụ́ onye na-ekpe okpukpe evangelical. Iwe na-eju ya obi, ebe Ndịàmà na-anọ jụụ. “Ugbu a ka m maara ihe kpatara ya,” ka o kwuru.

Dọkịta ahụ na ezinụlọ ya kwuru na nleta ahụ emewo ka ha gbanwee echiche ha banyere Ndịàmà. N’ịchọpụta mmasị ha nwere, onye dugharịrị ha, bụ́ José, kpọrọ ha òkù ịbịa Ememe Ncheta nke ọnwụ Kraịst ma gwa ha ka ya duziere ha ọmụmụ Bible. Ha kwere, na-asị na obi ga-adị ha ụtọ ịbịa n’alaka ụlọ ọrụ ahụ maka ọmụmụ ihe ahụ.

N’izu na-esonụ, ha bịara, obi dịkwa José na nwunye ya, bụ́ Beatriz, ụtọ ịkpọbata ha n’ọnụ ụlọ ha. Ha jụrụ nnọọ ọtụtụ ajụjụ nke na ha nọrọ awa atọ na ọkara n’ọmụmụ ihe nke mbụ ha! Ezinụlọ ahụ gara Ememe Ncheta n’April 16—tinyere nna nwunye onye ọkà n’ịgwọ ọnyá ahụ—ee, onye ahụ na-ewesabu Ndịàmà iwe ma ha bịa na nke ya!

Otu ihe pụrụ iche a ga-eji nwee ọṅụ bụ akụkọ banyere ọnụ ọgụgụ akwụkwọ ndị e ji amụ Bible ndị ahụ bịara nleta ji laa—500, karịsịa Bible. Ụfọdụ n’ime ha kwuru na ha enwetụbeghị Bible.

Otu nwanyị bi nso gwara Armando, bụ́ onye na-enye ndị mmadụ akwụkwọ e ji amụ Bible, sị: “Site ugbu a gawa, aga m na-eso unu bụ́ Ndịàmà aga nzukọ unu, n’ihi na amaara m na nke a bụ eziokwu ahụ.” Izu ole na ole mgbe e mesịrị, obi dị Armando ụtọ ịhụ nwanyị a n’Ụlọ Nzukọ Alaeze. O kwuru, sị: “O ji akwụkwọ ahụ ọ natara n’ememe ọha bịa lere ahụ. Mgbe m kelere ya, ọ gwara m, sị: ‘Dị ka ị hụrụ, ana m eme ihe m gwara gị na m gaje ime.’”

Ụbọchị atọ nke ememe ọha bịa lere ahụ gwụrụ ngwa ngwa. Ma, ha bụ ihe na-ewuli elu karịsịa. Ịhụ ihe owuwu alaka ahụ site n’anya ndị bịara na ya na nke mbụ ha nyeere ndị na-arụ ọrụ n’alaka ahụ aka inwe ekele maka ihe ùgwù ha nke ije ozi n’otu n’ime alaka ụlọ ọrụ nke Ndịàmà Jehova.

[Foto ndị dị na peeji nke 26, 27]

1. Ụlọ a na-arụzi ụgbọala, 2. ụlọ ije ozi, 3. ụlọ a na-arụzi ígwè ọrụ dị iche iche, 4. ụlọ obibi, 5. ụlọ obibi akwụkwọ, 6. ụlọ mgbakọ, 7. ụlọ ndị ọbịa

[Foto ndị dị na peeji nke 27]

Ọtụtụ narị mmadụ, gụnyere ụmụ akwụkwọ na ndị uwe ojii na-arụ n’ógbè ahụ, zara òkù a kpọrọ ha ịbịa ememe ọha bịa lere ahụ