Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

‘Eziokwu Ndị Bara Uru Jupụtara na Ya’

‘Eziokwu Ndị Bara Uru Jupụtara na Ya’

‘Eziokwu Ndị Bara Uru Jupụtara na Ya’

Ọ bụ otú ahụ ka otu onyeisi nke otu ụlọ ọgwụ maka ndị na-arịa ọrịa ga-emesị gbuo ha bụ́ nke dị na Illinois, U.S.A., si kọwaa broshuọ bụ́ Mgbe Onye Ị Hụrụ n’Anya Nwụrụ. Otu n’ime Ndịàmà Jehova zigaara ya broshuọ ahụ na otu magazin Teta!, ebe ọ bụ na site n’ịgụ Teta!, Onyeàmà ahụ amụtawo na ọnụ ọgụgụ ndị agadi na-egbu onwe ha dị nnọọ ukwuu. Mgbe onyeisi ụlọ ọgwụ ahụ nwetara akwụkwọ ndị ahụ, o mere ihe ozugbo.

Mgbe onyeisi ụlọ ọgwụ ahụ chọpụtasịrị na eziokwu ndị bara uru jupụtara na broshuọ bụ́ Mgbe Onye Ị Hụrụ n’Anya Nwụrụ, o dere, sị: ‘Ọ ga-amasị m inye ya ezinụlọ dị iche iche bụ́ ndị ihe ọmụma bara uru dị n’ime ya na akụkụ Bible ndị e hotara na ya ga-akasi obi.’

Onyeàmà ahụ kpọrọ onyeisi ụlọ ọgwụ ahụ na fon ozugbo, ha eyiekwa oge Onyeàmà ahụ ga-aga ileta ya. Ọ rịọrọ ka e wetara ya broshuọ ahụ mkpụrụ 20 nakwa ka a na-abịa n’ụlọ ọgwụ ahụ n’ime ọnwa abụọ ma ọ bụ atọ ọ bụla iji na-ewetakwu broshuọ ahụ.

Ikekwe gị ma ọ bụ onye ị maara ga-enwetakwa nkasi obi site n’ịgụ broshuọ a dị peeji 32. Ọ bụrụ na ị ga-achọ inweta broshuọ a, biko kpọtụrụ Ndịàmà Jehova nọ n’ógbè gị. Ọ bụrụ na ị ga-enwe mmasị ka mmadụ kpọtụrụ gị, biko dejupụta akụkụ a pụrụ ịdọkapụta adọkapụta dị na peeji a ma zite ya n’adres e dere na ya ma ọ bụ n’adres nke kwesịrị ekwesị e depụtara na peeji nke 5 na magazin a.

□ Biko kpọtụrụnụ m iji duziere m ọmụmụ Bible ebe obibi n’efu.