Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gịnị Dị Nnọọ Njọ n’Isi na Telifon Akpali Agụụ Mmekọahụ?

Gịnị Dị Nnọọ Njọ n’Isi na Telifon Akpali Agụụ Mmekọahụ?

Ndị Na-eto Eto Na-ajụ Sị . . .

Gịnị Dị Nnọọ Njọ n’Isi na Telifon Akpali Agụụ Mmekọahụ?

“I SI NA FON AKPALI AGỤỤ MMEKỌAHỤ,” dị ka otu magazin America a ma ama si kwuo, “anọchiwo anya akwụkwọ ozi ịhụnanya dị ka ụzọ nwoke na nwanyị na-anọghị ibe ha nso na-ahọrọ isi na-enwe mkparịta ụka ndọrọ mmekọahụ.”

Gịnị bụ isi na telifon akpali agụụ mmekọahụ? Ọ na-agụnye iji fon na-ekwurịta ma ọ bụ na-ege ntị n’okwu ndị na-akpali agụụ mmekọahụ ndị e kwuru n’ezoghị ọnụ. * Ndị na-ekere òkè n’omume ahụ na-emetọkarị onwe ha iji mejụọ agụụ mmekọahụ ha. Ma ọ̀ bụ ndị na-eme mbedo na-ekwurịta okwu rụrụ arụ dị otú ahụ ma ọ̀ bụ nwoke na nwanyị na-amabughị onwe ha, isi na fon akpali agụụ mmekọahụ na-ewu nnọọ ewu n’ụzọ na-eju anya. N’ezie, ụfọdụ na-akwado ya n’ihu ọha.

“Ọ bụ mmekọahụ kasị bụrụ nke na-adịghị ize ndụ ị pụrụ inwe,” ka otu nwanyị na-ekwu. Ihe àmà na-egosi na ọtụtụ mmadụ kwenyere n’ihe ahụ o kwuru. Dị ka ihe atụ, n’October 2000, n’ihi mmụba nke nje HIV, otu ìgwè ndị ọkachamara n’ọrụ ahụ́ ike na Russia kpọsara ya n’akwụkwọ akụkọ na-agba ndị mmadụ ume isi na telifon akpali agụụ mmekọahụ.

Otú ọ dị, ndị ọzọ na-akwalite isi na telifon akpali agụụ mmekọahụ nanị n’ihi uru. Ebe ndị a na-eme ndokwa maka isi na fon akpali agụụ mmekọahụ—ebe ndị mmadụ na-akwụ ụgwọ iji nụrụ okwu ndị rụrụ arụ—aghọwo nnukwu ahịa na-enye ijeri kwuru ijeri dollar na United States nanị.

Gịnị kpọmkwem mere ka omume a ghọọ nnọọ ihe na-ewu ewu? Akwụkwọ bụ́ The Fantasy Factory si otú a kwuo ya: “Inwe mmekọ chiri anya n’ụzọ anụ ahụ́ nakwa n’ụzọ mmetụta uche dị ize ndụ. E nwere ihe ize ndụ anụ ahụ́ nke ibute ọrịa ndị na-esite ná mmekọahụ, ihe ize ndụ nke ịbụ onye ga-enwe aha ọjọọ ma ọ bụ onye ọ ga-emetụta ọrụ ya n’ụzọ na-adịghị mma, egwu nke ịbụ onye ndị mmadụ ga-akatọ na ihe ndị na-adịghị mma pụrụ isi n’inwe ọchịchọ ‘na-adịghị mma’ pụta. Isi na fon akpali agụụ mmekọahụ na-ebelata ihe ize ndụ ndị ahụ.”

N’eziokwu, isi na telifon akpali agụụ mmekọahụ achọghị mmadụ na onye ọzọ imetụ ahụ́. Ma nke a ọ̀ pụtara na ọ dịghị ihe dị njọ na ya, ma ọ bụkwanụ bụrụ nke na-enweghị ihe ize ndụ kpam kpam?

Isi na Telifon Akpali Agụụ Mmekọahụ Ọ̀ Bụ Ihe Na-adịghị Enwe Mmetụta Dị Njọ?

Agụụ mmekọahụ na-esi nnọọ ike karịsịa n’oge ntorobịa. Bible na-akpọ oge a mgbe agụụ mmekọahụ nọ n’ọ̀tụ̀tụ̀ ha kasị elu “ntoju ntorobịa.” (1 Ndị Kọrint 7:36) N’oge a dị oké mkpa ná ndụ, onye ntorobịa bụ́ Onye Kraịst kwesịrị ịmara “ụzọ isi chịkwaa arịa nke onwe ya n’ịdị nsọ na nsọpụrụ.” (1 Ndị Tesalonaịka 4:4) Nke bụ́ na ị ghaghị ịmara ụzọ ị ga-esi nagide ma na-achịkwa agụụ mmekọahụ ị na-enwe. Nke a dị nnọọ mkpa iji mee ka i nwee echiche kwesịrị ekwesị banyere mmekọahụ.

Otú ọ dị, isi na telifon akpali agụụ mmekọahụ na-akụziri mmadụ imejụ agụụ mmekọahụ ọ na-enwe kama ịchịkwa ya achịkwa. E wezụga nke ahụ, ọ na-eme ka mmadụ nwee echiche nleda anya na nke gbagọrọ agbagọ banyere onye na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwanyị ibe ya. Bible na-ekwu na mmekọahụ kwesịrị ịdị nanị n’etiti ndị lụrụ di na nwunye. (Ndị Hibru 13:4) Ma, isi na fon akpali agụụ mmekọahụ na-agba ndị na-eto eto ume inwe mmekọahụ mgbe ha na-alụbeghị di ma ọ bụ nwunye. Bible na-akụzi na a na-enwe ezi obi ụtọ n’inye ihe—ọ bụghị n’ịnara ihe. (Ọrụ 20:35) Ma isi na fon akpali agụụ mmekọahụ na-akụziri mmadụ iji ndị ọzọ na-emejụ agụụ nke ịchọ ọdịmma onwe onye nanị kpaliri. Bible na-akụziri ndị lụrụ di na nwunye ịzụlite mkpakọrịta chiri anya site n’inwerịta ịhụnanya na ntụkwasị obi. (Ndị Efesọs 5:22, 33) Otú ọ dị, isi na telifon akpali agụụ mmekọahụ na-akpata enweghị mmetụta na ọnọdụ nke mmadụ amaghị onye ya na ya na-emekọ ihe.

Ihe Na-eri Ahụ́ nke Na-enwe Mmetụta Dị Njọ

A maara Kọrint oge ochie dị ka obodo jupụtara nnọọ n’omume rụrụ arụ. N’ihi ya, e nwere ezi ihe mere Pọl onyeozi ji degara Ndị Kraịst nọ n’ebe ahụ akwụkwọ, sị: “Egwu ji m na n’ụzọ ụfọdụ, dị ka agwọ ahụ ji aghụghọ ya rafuo Iv, e nwere ike merụọ obi unu pụọ n’izi ezi na ịdị ọcha kwesịrị Kraịst ahụ.” (2 Ndị Kọrint 11:3) Isi na telifon akpali agụụ mmekọahụ bụ otu n’ime ụzọ ndị Setan bụ́ Ekwensu si na-emerụ ndị na-eto eto taa.

Nye ndị ntorobịa ụfọdụ, ịkpọ nọmba telifon ndị a nọ na ha akpali agụụ mmekọahụ aghọwo omume riri ha ahụ́ nke na-enweghịkwa nchịkwa. Otu nwa okorobịa anyị ga-akpọ Jim bụ ihe atụ nke otú ọ pụrụ isi nnọọ ‘rie ụfọdụ ndị ahụ́.’ Jim hụrụ nọmba telifon a na-anọ na ya akpali agụụ mmekọahụ na bọọdụ e ji eme mkpọsa ngwá ahịa. O buuru nọmba ahụ n’isi ma mesịa kpọọ ya nanị iji mara ihe ga-emenụ. Ọ kpọwaziri nọmba ahụ ọtụtụ ugboro. N’oge na-adịghị anya, ọ kpọtara ụgwọ ruru dollar 600 na fon!

Ịkpali agụụ mmekọahụ mgbe ị na-alụbeghị di ma ọ bụ nwunye na-emegide ndụmọdụ nke Okwu Chineke. Ọ na-agba ume, sị: “Ya mere, meenụ ka akụkụ ahụ́ unu ndị dị n’elu ụwa nwụọ n’ihe metụtara ịkwa iko, adịghị ọcha, agụụ mmekọahụ.”—Ndị Kọlọsi 3:5.

Ihe Ize Ndụ Ndị Dị na Ya n’Oge A Na-eme Mbedo

Gịnị banyere ndị na-akatabeghị ahụ́, bụ́ ndị nọ n’ezigbo mbedo? N’ezie, ọ bụ nnọọ ihe e bu pụta ụwa bụ́ ndị hụrụ onwe ha n’anya ịchọ ikwupụta mmetụta ha n’ebe otu onye na ibe ya nọ. Laa azụ n’oge Bible, otu nwa agbọghọ na-atụ egwu Chineke kwuru banyere onye na-achọ ịlụ ya, sị: “Mụ onwe m bụ nke onye ihe ya na-atọ m ụtọ, n’ahụ́ m ka ọchịchọ ya dịkwa.” (Abụ nke Abụ 7:10) Ka ụbọchị agbamakwụkwọ na-eru nso, ọ bụ ihe ziri ezi ma kwesị ekwesị bụ́ ndị ahụ kwere onwe ha nkwa ọlụlụ ikwurịta okwu nzuzo ụfọdụ. Otú ọ dị, isi na fon akpali agụụ mmekọahụ ọ̀ bụ ụzọ na-adịghị enwe mmetụta dị njọ nke isi gosipụta mmetụta ndọrọ mmekọahụ?

Ee e. Ọbụna iwu ji ndị kwere onwe ha nkwa ọlụlụ ịgbaso ndụmọdụ Pọl onyeozi nyere: “Ka a ghara ihotadị ịkwa iko na ụdị adịghị ọcha ọ bụla ma ọ bụ anyaukwu n’etiti unu, dị nnọọ ka o kwesịrị ndị nsọ, ma ọ bụ omume ihere ma ọ bụ okwu nzuzu ma ọ bụ okwu njakịrị rụrụ arụ, bụ́ ihe ndị na-ekwesịghị ekwesị, kama nke ahụ ịdị na-enye ekele. N’ihi na unu maara nke a, na-aghọta ya n’onwe unu, na ọ dịghị onye na-akwa iko ma ọ bụ onye na-adịghị ọcha ma ọ bụ onye anyaukwu—nke pụtara ịbụ onye na-ekpere arụsị—nwere ihe nketa ọ bụla n’alaeze nke Kraịst ahụ na nke Chineke.”—Ndị Efesọs 5:3-5; Ndị Kọlọsi 3:8.

Okwu nzuzo ndị e leziri anya kwuo iji kpalie echiche rụrụ arụ ma ọ bụ ndị na-akpali mmadụ imetọ onwe ya bụ ihe na-adịghị ọcha n’anya Jehova n’ezie. Ọ pụkwara iduba n’imebi ọbụna ụkpụrụ Chineke n’ụzọ dị njọ karị. Dị ka ihe atụ, otu nwoke na nwanyị nọ ibe ha n’ebe dị anya ka ha na-eme mbedo. Na mbụ, ha ji mkparịta ụka ha na-adị enwe na telifon mere ụzọ ha si na-amata onwe ha nke ọma. Otú ọ dị, n’oge na-adịghị anya, ha malitere ikwurịta okwu ndị rụrụ arụ. Mkparịta ụka ha bịara ghọọ nke a na-adịghịzi ezo ọnụ na ya. Mgbe ahụ, ọ bụghị ihe ijuanya na mgbe ọnọdụ ha mesịrị mee ka ha nwee ike ịnọkọta ọnụ, ha dabara n’omume na-adịghị ọcha ozugbo.

N’ezie, anyị bụ́ ndị chọrọ ime ihe na-atọ Chineke ụtọ ga-agbalịsi ike izere ịdaba n’ọnyà nke isi na telifon akpali agụụ mmekọahụ. Olee otú anyị pụrụ isi nwee ihe ịga nke ọma n’ime otú ahụ?

‘Na-etipụta Ahụ́ Gị Ọnyá’

Isi na telifon akpali agụụ mmekọahụ pụrụ iri mmadụ ahụ́. Ma ọ dị anyị mkpa ‘itipụta ahụ́ anyị ọnyá ma na-achịkwa ya dị ka ohu’ iji nweta ihu ọma Jehova. (1 Ndị Kọrint 9:27) Ọ bụrụ na ị ka na-esi na telifon akpali agụụ mmekọahụ, gịnị ma ị chọọ enyemaka ụfọdụ? Ịkọrọ ya ndị mụrụ gị bụ́ Ndị Kraịst bụ ụzọ dị mma isi malite. Ee, ha pụrụ iwesa gị iwe. Ma ha pụkwara ịnọ n’ọnọdụ kasị mma inyere gị aka ịdị na-enyocha àgwà gị ka i wee ghara ịlaghachi na ya ọzọ. Ndị okenye nọ n’ọgbakọ Ndịàmà Jehova dị n’ógbè gị ga-adịkwa njikere ma nwee ike inyere gị aka.

Ọ bụrụ na ị na-eme mbedo, kpebisie ike ịnọgide na-adị ọcha, ọbụna mgbe ị na-ekwu okwu na telifon. Otu nwa agbọghọ bụ́ Onye Kraịst aha ya bụ Leticia, bụ́ onye e kwere nkwa ọlụlụ kwuru, sị: “Mụ na onye chọrọ ịlụ m agụrịtawo isiokwu ndị dị n’akwụkwọ ndị dabeere na Bible banyere ụzọ anyị pụrụ isi dị ọcha. Anyị nwere ekele banyere ụzọ ha siworo nyere anyị aka ịnọgide na-enwe akọ na uche dị ọcha.” Nwee obi ike ịgbanwe isiokwu unu ma ọ bụrụ na ọ banye n’ihe ndị na-adịghị mma. Kwurịtanụ banyere mkpa ọ dị ime ka mkparịta ụka unu bụrụ ihe dị ọcha.

Ná mba ụfọdụ, a na-esi n’ihe omume telivishọn ndị a na-eme n’ime ime abalị akpọsa banyere isi na telifon akpali agụụ mmekọahụ. Ikekwe, ọ ga-akasị mma ka i zere nnọọ ịdị na-ekiri TV ruo n’ime ime abalị. Ebe ọ bụ na imetọ onwe gị ga-akpalikwa echiche rụrụ arụ, kama ime ka ọ nwụọ, ọ dị mkpa ka i zere omume a rụrụ arụ. * Ị pụrụ inwe ihe ịga nke ọma n’iwepụ ihe ndị rụrụ arụ n’uche gị site n’ịdị na-atụle ihe ndị ziri ezi. (Ndị Filipaị 4:8) Soro ndị enyi na-ekwu okwu dị mma na-akpakọrịta, na-agụkwa Okwu Chineke na akwụkwọ Ndị Kraịst kwa ụbọchị iji mee ka mkpebi gị sikwuo ike. N’ụzọ dị otú a, ị gaghị enye ohere maka echiche efu rụrụ arụ igbebata ma merụọ uche gị. Nke kasịnụ, kpegara Chineke ekpere maka enyemaka. Pita onyeozi dere, sị: “Ka unu na-atụkwasị nchegbu nile unu n’ebe ọ nọ, n’ihi na ọ na-eche banyere unu.”—1 Pita 5:6, 7.

“Nrụgide ndị na-eto eto na-enwe maka inwe mmekọahụ rụrụ arụ na-adị nnọọ ukwuu,” ka otu nwa agbọghọ bụ́ Onye Kraịst nke si Brazil na-ekwu. Otú ọ dị, Jehova maara ihe ịma aka ndị ị na-eche ihu. Jide n’aka na ọ ga-eweta enyemaka ọ bụla dị gị mkpa iji nọgide na-adị ọcha n’anya ya.—Ndị Efesọs 6:14-18.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 4 Omume rụrụ arụ nke yiri ya bụ isi n’Intanet akpali agụụ mmekọahụ.

^ par. 24 Iji nweta aro dị iche iche banyere ụzọ a pụrụ isi merie mmetọ onwe onye, lee akwụkwọ bụ́ Ajụjụ Ndị Na-eto Eto Na-ajụ—Azịza Ndị Na-adị Irè, peeji nke 198-211, nke Ndịàmà Jehova bipụtara.

[Foto ndị dị na peeji nke 10, 11]

Isi na telifon nakwa n’Intanet akpali agụụ mmekọahụ ewuwela ewu

[Foto ndị dị na peeji nke 10, 11]

Ndị kwere onwe ha nkwa ọlụlụ aghaghị ịkpachapụ anya ka okwu ha wee ghara ịghọ nke na-adịghị ọcha

[Foto dị na peeji nke 12]

Ịgụ Okwu Chineke nakwa akwụkwọ Ndị Kraịst pụrụ ime ka mkpebi gị ịnọgide na-adị ọcha sikwuo ike