Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa Leta Ahịa Azụ̀ Kasị Ukwuu n’Ụwa

Gaa Leta Ahịa Azụ̀ Kasị Ukwuu n’Ụwa

Gaa Leta Ahịa Azụ̀ Kasị Ukwuu n’Ụwa

SITE N’AKA ONYE EDEMEDE TETA! NA JAPAN

ỤZỤ a na-eme n’ahịa ọ̀ na-amasị gị? Otu ahịa nke pụrụ ịmasị gị ma n’ezie dọrọ mmasị ndị njem nleta si n’akụkụ nile nke ụwa bụ Tsukiji, bụ́ ahịa azụ̀ nke na-ewe nanị minit ole na ole iji jiri ụkwụ si n’etiti Tokyo ruo na ya. Ọ bụ ahịa azụ̀ kasị ukwuu n’ụwa.

Isi ụtụtụ ka e ji aga ebe ahụ. Ka ndị mmadụ ka na-ehi ụra n’ebe ndị ọzọ na Tokyo, ahịa ahụ na-amalite ịzụ. Ọtụtụ gwongworo na-ebute azụ̀ ruru puku tọn abụọ n’ụbọchị, a ghaghịkwa ibutu ha nile n’oge n’ihi na ka ọ na-erule elekere 3:00 nke abalị, ndị na-azụ ha na-amalite ịbịa. Ndị na-ere ha na-eji ọsọ ebupụtagasị igbe azụ̀ ha. N’igbe azụ̀ nke ọ bụla, ha na-amapawa mpempe akwụkwọ e dere nọmba, otú azụ̀ dị na ya dịruru n’arọ, na ebe e gbutere ha. O sighị ike ịmata ndị bịara ịzụ azụ̀. Ha na-eyi buutu e ji rọba mee na okpu ndị bu nọmba laịsensị ha. N’adịghị ka ndị bịara nleta bụ́ ndị na-eji nwayọọ na-aga, ndị bịara ịzụ ahịa na-agbagharị agbagharị, na-enyocha ọdịdị nke azụ̀ ndị ahụ iji mara ego ole ha ga-ekwe ha. Ndị na-eji nkò, tọọchị, na ákwà nhicha ahụ́ bụ ndị na-azụ azụ̀ tuna. Ngwá ọrụ ha dị nnọọ oké mkpa iji chọpụta ọdịdị nke nnukwu azụ̀ tuna, ákwà nhicha ahụ́ ahụ bụ maka ihicha aka ha mgbe ha metụsịrị azụ̀ aka.

N’elekere 5:30 nke isi ụtụtụ, ụzụ na-arị ibe ya elu, ndị mmadụ na-agbagharịkwa. A na-anụ ụda obere mgbịrịgba n’akụkụ nile ka ndị na-ere azụ̀ na-akpọ ndị ahịa ka ha bịa kwewa ọnụ. Ọ na-eyi ka ndị na-ere azụ̀ ha nọ ebe nile. Nke bụ́ eziokwu bụ na e nwere ụlọ ọrụ asaa na-ere azụ̀ n’ùkwù, bụ́ ndị na-ere ahịa n’otu oge, ma ụfọdụ n’ime ha nwere mmadụ abụọ ma ọ bụ karịa bụ́ ndị na-ere ụdị azụ̀ dịgasị iche n’otu oge. Ndị nile a na-ere ahịa na-eji oké olu akpọ nọmba azụ̀ ha n’ụda olu nke ha, ndị e nyere ikike ịzụ azụ̀ na-ejikwa mkpịsị aka ha ekwekarị ibe ha n’ọnụ ahịa. Ha na-ekwe ọnụ ahụ ngwa ngwa nke na ọnụ ahịa igbe azụ̀ nke ọ bụla na-ebi n’ime sekọnd ole na ole. Ụfọdụ ndị na-azụ ahịa na-ekwe mmadụ abụọ ọnụ ahịa n’otu mgbe. Nanị otu onye ka a na-ekwe ka ọ banye n’ụlọ ahịa nke ọ bụla, n’ihi ya, ndị na-azụ ahịa aghaghị iji ọsọ si n’otu ọdụ ahịa na-agbaga n’ọzọ iji nweta azụ̀ ha chọrọ. Ma eleghị anya, ọ bụ ndị na-azụ ụdị azụ̀ dịgasị iche iche n’ọ̀tụ̀tụ̀ buru ibu maka iresịgharị ha ụlọ ahịa dị iche iche ka ọ kasị adị ngwa.

Ozugbo ọnụ ahịa biri, ọ na-adị ndị ahịa ahụ ọkụ n’ahụ́ ibuga azụ̀ nke ọ bụla ozugbo o kwere mee n’ebe a chọrọ ha. Ndị trọk na-eji ọsọ esi n’okporo ámá ndị ahụ na-asaghị mbara ebupụ azụ̀ ndị ahụ. Oké mgbagharị, nnutụ ahụ́, na ụzụ na-adị ebe nile. Ọ na-adị onye na-ekiri ihe na-emenụ ka ọgba aghara ọ̀ dara. N’ezie, a na-achịkwa ma na-ahazi ihe nile a na-eme ebe ahụ. N’ime awa ole na ole, a na-ere ihe karịrị otu puku tọn azụ̀ ma bupụ ha. A na-ebuga ụfọdụ n’ime azụ̀ ndị ahụ n’obere ụlọ ahịa ndị dị n’akụkụ ọzọ nke ahịa ahụ, a na-eresikwa ya ọtụtụ puku ndị nwere mmasị ịzụ ha n’ụtụtụ.

Dị ka ị pụrụ iche n’echiche, Ahịa Tsukiji ebuka. E nyere nnukwu ụlọ ọrụ asaa ahụ na-ere ahịa n’ùkwù na ihe karịrị otu puku obere ụlọ ahịa ndị na-ere ahịa n’ebe ahụ akwụkwọ ikike maka ịnọ ebe ahụ na-ere ahịa. N’oge nile n’afọ, ha na-eji ọrụ n’aka n’iresị, ọ dịkarịa ala, ndị ahịa 40,000 na-aga ahịa ahụ kwa ụbọchị, ahịa.

Olee ndị na-azụ azụ̀ ndị ahụ? Ụfọdụ n’ime ha bụ ndị na-azụ n’ùkwù maka iji mee ihe ná nnukwu họtel, n’ụlọ nri, ná nnukwu ụlọ ahịa, nakwa n’obere ụlọ ahịa. Ndị ọzọ bụkwa ndị nwere obere ụlọ ahịa nri, ndị na-ere ahịa n’ahịa azụ̀ ndị dị n’ógbè ahụ, nakwa, ehee, ndị nwere ọmarịcha obere ụlọ ahịa ndị a na-ere sushi bụ́ ndị ahịa na-aga na ha. Ndị ahịa a nile na-azọ azụ̀ nke kasị mma. A na-eme atụmatụ na n’ozuzu, ha na-azụ ihe dị ka tọn 600,000 nke ihe ndị e gbutere na mmiri n’afọ, na-emefu ihe karịrị ijeri dollar 5.

N’ezie, Tsukiji abụghị nanị ahịa azụ̀. Ọ bụ ahịa a na-ere ihe n’ùkwù, nke a na-erekwa mkpụrụ osisi na akwụkwọ nri na ya. Ọ bụ otu n’ime ahịa ùkwù 11 ndị bụ́ isi na Tokyo, bụ́ ndị dị n’aka gọọmenti obodo Tokyo. Ahịa ebe ndị a na-ere ihe oriri ndị e wetara ọhụrụ malitere laa azụ n’afọ 1603. Iji jide n’aka na a na-eme ka ha dịkwuo ọcha ma ka mma, n’afọ 1877, ahịa ndị a bịara dịrị n’aka gọọmenti. Ala ọma jijiji nke mere na Tokyo n’afọ 1923 bibiri ahịa ndị dị na Tokyo, bụ́ nke mere ka a rụọ ahịa a a maara taa dị ka Ahịa Tsukiji, bụ́ nke malitere ịzụ n’afọ 1935.

Kemgbe ahụ, ahịa ahụ etoola nke ukwuu. Olee ebe ọzọ n’ụwa nke ị pụrụ ịhụ ọnụ ọgụgụ dị ukwuu nke azụ̀ dịgasị iche iche a na-ere kwa ụbọchị? A na-eme atụmatụ na, n’ebe ahụ, a na-ere azụ̀ ndị dị ka salmon, okporoko, sea bream, mackerel, sole, na herring, tinyere sea urchin, sea cucumber, na akịrịkọ—ihe dị ka ụdị azụ̀ 450 dịgasị iche iche bụ́ ndị si n’akụkụ nile nke ụwa. Ụfọdụ n’ime obere ụlọ ahịa ndị dị n’ahịa ahụ na-ere nanị otu ụdị azụ̀, dị ka octopus ma ọ bụ oporo.

Otú ọ dị, otu azụ̀ bụ eze n’ebe a. Ọ bụ nnukwu azụ̀ tuna, bụ́ nke a na-eji ụgbọelu esi n’ebe ndị dị anya dị ka Oké Osimiri Mediterenian nakwa n’Ebe Ugwu America ebute. Ọ dịghị azụ̀ ọzọ na-aha ka ya n’ibu ma ọ bụ na-adaru ọnụ ka ya. Otu nnukwu azụ̀ tuna pụrụ ịdaru ọtụtụ puku dollar. N’ebe a, kwa ụbọchị, a na-ere ọtụtụ narị azụ̀ tuna e gbutere ọhụrụ na ndị e tinyere na friji. Ndị ahụ na-azụ ha na-eberi azụ̀ tuna ndị ahụ otú ga-adị ndị na-azụ ahịa n’ógbè ahụ mma. Akụkụ ahụ́ ya a na-achọsi ike nke a na-akpọ toro, bụ́ nke na-adị abụba abụba, nke a na-enweta gburugburu agịrịga ya, ga-emesị, ma eleghị anya, bụrụ nke a ga-ekunye n’elu sushi iji mee ka ọ tọọ ụtọ.

Ọ bụghị ihe ijuanya na ọ bụ na Japan ka ahịa azụ̀ kasị ukwuu n’ụwa dị. Oké osimiri anọ gbara mba ahụ gburugburu, ọ dịwokwa anya ndị Japan malitere inwe mmasị n’ihe ndị e gbutere n’oké osimiri. Azụ̀ na-abụkarịkwa ihe bụ́ isi ná nri ụtọ nke ndị Japan. Kwa afọ, onye Japan na-akpata afọ ya na-eri ihe dị ka kilogram 70 nke azụ̀ na ihe ndị ọzọ e gbutere ná mmiri, ọ bụkwa n’Ahịa Tsukiji ka a na-azụ ihe ka ukwuu n’ime ha. Ya mere, ọ bụrụ na ị gaa Tokyo, gịnị ma i soro n’ọnụ ọgụgụ na-arịwanye elu nke ndị njem nleta bụ́ ndị na-aga n’ahịa azụ̀ kasị ukwuu n’ụwa?

[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 18]

Azụ̀ e sere ese: Site n’akwụkwọ bụ́ L’Art Pour Tous, Encyclopedie de l’Art Industriel et Decoratif, Mpịakọta nke 31, 1861-1906

[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 19]

James L. Stanfield/NGS Image Collection

[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 19]

© Jeff Rotman/www.JeffRotman.com

[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 20]

Site n’ikike nke Tokyo Metropolitan Central Wholesale Market