Iṅụbiga Mmanya Ókè Ọ̀ Dị Nnọọ Njọ n’Ezie?
Echiche nke Bible
Iṅụbiga Mmanya Ókè Ọ̀ Dị Nnọọ Njọ n’Ezie?
RUO ọtụtụ afọ, ndị aṅụrụma ihe ha na-amasị ndị mmadụ, bụ́ ndị na-eme ya n’ihe nkiri iji kpaa ndị mmadụ ọchị, abụwo ihe a na-ahụkarị n’ọgbọ ihe nkiri nakwa n’ihe ngosi telivishọn. N’agbanyeghị na ndị na-eme ihe ngosi dị otú ahụ pụrụ ịnọ na-eme ya nnọọ dị ka ihe nkiri, ụdị ịkpa ọchị ha na-egosi echiche megidere onwe ya ọtụtụ ndị nwere banyere ịṅụbiga mmanya ókè, ha na-ele ya anya dị ka adịghị ike, ee, ma bụrụ ihe na-adịchaghị emerụ ahụ́.
N’ezie, ịṅụbiga mmanya ókè abụghị ihe ọchị. Òtù Ahụ́ Ike Ụwa kwuru na ịṅụbiga ihe ọṅụṅụ na-aba n’anya ókè bụ otu n’ime ihe ndị kasị emebi ahụ́ ike n’ụwa nile. A sịrị na e wezụga iri ahụ́ nke ụtaba, ịṅụbiga ihe ọṅụṅụ na-aba n’anya ókè na-akpatara ndị mmadụ ọnwụ na ọrịa karịa ka iji ihe ọ bụla ọzọ na-eri ahụ́ eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi si akpata, ọ na-efukwa nanị America ihe karịrị ijeri dollar 184 n’afọ.
N’agbanyeghị eziokwu ndị a, ọtụtụ ndị nọgidere na-ewere ịṅụbiga mmanya ókè dị ka ihe na-adịghị oké njọ. Ọ bụ ezie na ha pụrụ ikweta na ịṅụbiga ya ókè ruo ogologo oge na-enwe mmetụta na-adịghị mma, ha ahụghị ihe ọjọọ ọ bụla dị n’ịṅụ oké mmanya n’oge ụfọdụ. N’akụkụ ụfọdụ nke ụwa, ndị na-eto eto na-ele ịṅụbiga mmanya ókè anya dị ka ihe e ji ama na mmadụ etoola. N’agbanyeghịkwa ịdọ aka ná ntị siri ike òtù ahụ́ ike dị iche iche na-enye, ịṅụ oké mmanya na-arịwanye elu n’ụzọ dị ịrịba ama n’etiti ndị nọ n’afọ ndụ nile. N’ihi ya, o kwere nghọta na ọtụtụ ndị na-eche ma ịṅụ oké mmanya ọ̀ dị nnọọ njọ n’ezie. Gịnị ka Bible na-ekwu?
Mmanya na Ihe Ọṅụṅụ Na-aba n’Anya —Onyinye Si n’Aka Chineke
E nwere ọtụtụ ebe e zoro aka banyere mmanya na ihe ọṅụṅụ na-aba n’anya n’ime Bible. Eze Solomọn Eklisiastis 9:7) Ọbụ abụ ahụ kwetara na Jehova Chineke bụ Onye na-enye “mmanya [vaịn] nke na-eme ka obi mmadụ ṅụrịa.” (Abụ Ọma 104:14, 15) O doro anya na mmanya so n’onyinye ndị Jehova ji gọzie ihe a kpọrọ mmadụ.
dere, sị: “Jee, were ọṅụ rie nri gị, werekwa obi dị mma ṅụọ mmanya [vaịn] gị; n’ihi na ọrụ gị nile atọwo Chineke ụtọ na mgbe dị anya gara aga.” (N’ụzọ doro anya, Jizọs kwadoro ịṅụ mmanya. N’ezie, ọrụ ebube mbụ ọ rụrụ bụ ime mmiri ka ọ ghọọ mmanya bụ́ ịgba n’otu ememe alụmdi na nwunye. (Jọn 2:3-10) O jikwa mmanya mee ihe dị ka ihe nnọchianya kwesịrị ekwesị nke ọbara ya mgbe ọ na-eguzobe Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị. (Matiu 26:27-29) Ọbụna Bible kwuru na mmanya nwere ihe ndị na-agwọ ọrịa, n’ihi na Pọl onyeozi gbara Timoti ume ka ọ “na-eji obere mmanya eme ihe maka afọ [ya].”—1 Timoti 5:23; Luk 10:34.
Ihe Bụ́ Isi Bụ Ịṅụru Ya n’Ókè
Rịba ama na Pọl tụrụ aro ịṅụ nanị “obere mmanya.” N’ụzọ doro anya, Bible na-akatọ ụdị nile nke ịṅụbiga ihe ọṅụṅụ na-aba n’anya ókè. Ndị nchụàjà bụ́ ndị Juu nweere onwe ha ịṅụru mmanya n’ókè mgbe ha na-anọghị n’ọrụ. Otú ọ dị, a machibidoro ha iwu ịṅụ ihe ọṅụṅụ ọ bụla na-aba n’anya mgbe ha na-arụ ọrụ nchụàjà. (Levitikọs 10:8-11) Ọtụtụ afọ mgbe e mesịrị, a dọrọ Ndị Kraịst narị afọ mbụ aka ná ntị na ndị aṅụrụma “agaghị eketa alaeze Chineke.”—1 Ndị Kọrint 6:9, 10.
Ọzọkwa, ná ntụziaka o nyere Timoti, Pọl kwuru na ndị na-edu ndú n’ọgbakọ apụghị ịbụ ‘ndị aṅụrụma na-ese okwu’ ma ọ bụ bụrụ “ndị na-aṅụ oké mmanya.” * (1 Timoti 3:3, 8) N’ezie, Bible nyere iwu ka a chụpụ ndị aṅụrụma na-enweghị nchegharị n’ọgbakọ Ndị Kraịst. (1 Ndị Kọrint 5:11-13) Dị ka Akwụkwọ Nsọ si kwuo ya n’ụzọ dabara adaba, “onye na-akwa emo ka mmanya [vaịn] bụ.” (Ilu 20:1) Ịṅụbiga ihe ọṅụṅụ na-aba n’anya ókè pụrụ ime ka onye na-aṅụ ya gharazie inwe ike ịchịkwa onwe ya na ime mkpebi ndị dị mma.
Ihe Mere Okwu Chineke Ji Katọọ Ịṅụbiga Mmanya Ókè
Jehova, bụ́ ‘Onye na-ezi anyị ime ihe na-aba uru,’ maara na mgbe anyị ji ihe ọ bụla mee ihe n’ụzọ na-ezighị ezi, anyị ga-emerụ onwe anyị na ndị ọzọ ahụ́. (Aịsaịa 48:17, 18) Otú ahụ ka ọ dị ma a bịa n’ịṅụ ihe ọṅụṅụ na-aba n’anya. Okwu Chineke na-ajụ, sị: “Ònye nwere ahụhụ? ònye nwere iru újú? ònye nwere ise okwu? ònye nwere ntamu? ònye nwere ogbugbu mma n’efu? ònye nwere anya na-acha ọbara ọbara?” Ọ na-aza, sị: “Ọ bụ ndị na-anọ ná mmanya [vaịn] ogologo mgbe; ndị na-aba n’ụlọ ịchọpụta mmanya a gwara agwa.”—Ilu 23:29, 30.
Ndị mmadụ emewo ọtụtụ ihe nzuzu na ihe ndị dị ize ndụ mgbe ha ṅụbigara ihe ọṅụṅụ na-aba n’anya ókè: ịkwọ ụgbọala mgbe mmanya na-egbu ha na itinye onwe ha na ndị ọzọ n’ihe ize ndụ, igosi di ma ọ bụ nwunye onye ọzọ ịhụnanya gabiga ókè na ibibi nnọọ mmekọrịta, ikwu okwu na ime ihe nzuzu ma ọ bụkwanụ ihe rụrụ arụ. (Ilu 23:33) E kwuwo n’ụzọ ziri ezi na ịṅụbiga ihe ọṅụṅụ na-aba n’anya ókè bụ otu n’ime nsogbu ndị kasị ebibi ihe n’ime nsogbu nile nke ọha bụ́ ndị na-akpa ihe a kpọrọ mmadụ aka ọjọọ taa. Ka a sịkwa ihe mere Chineke ji na-agba ume, sị: “Anọla n’etiti ndị na-aṅụbiga mmanya [vaịn] ókè”!—Ilu 23:20.
Ná Ndị Galeshia 5:19-21, Pọl depụtara ịṅụ oké mmanya na oriri oké mkpọtụ dị ka “ọrụ nke anụ ahụ́” bụ́ ndị na-emegide mkpụrụ nke mmụọ nsọ Chineke. Ịṅụbiga ihe ọṅụṅụ na-aba n’anya ókè ga-emebi mmekọrịta mmadụ na Chineke. Ya mere, n’ụzọ doro anya, Ndị Kraịst kwesịrị izere iji ihe ọṅụṅụ na-aba n’anya eme ihe n’ụzọ ọ bụla na-ezighị ezi.
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
^ par. 11 Ebe ọ bụ na ndị nlekọta kwesịrị ịbụ ndị nlereanya nye ìgwè atụrụ ahụ n’ụzọ ha si eme mkpebi nakwa n’akparamàgwà, na-egosipụta ụkpụrụ dị elu nke Jehova ruo ókè ha nwere ike, ọ bụ ihe ezi uche dị na ya na a ga-achọkwa otu ihe ahụ n’aka Ndị Kraịst ndị ọzọ.