Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Uwe na Ejiji Bụụrụ M Ihe Mgbochi

Uwe na Ejiji Bụụrụ M Ihe Mgbochi

Uwe na Ejiji Bụụrụ M Ihe Mgbochi

DỊ KA EILEEN BRUMBAUGH SI KỌỌ

A ZỤLITERE m n’okpukpe Old Order German Baptist Brethren, bụ́ nke yiri okpukpe Amish na Mennonite. Okpukpe Brethren ahụ malitere na Germany n’afọ 1708 dị ka akụkụ nke okpukpe a kpọrọ Pietism, bụ́ nke na-akwalite iji ihe ime mmụọ akpọrọ ihe. Akwụkwọ bụ́ The Encyclopedia of Religion na-ekwu na ihe e ji mara okpukpe Pietism bụ “nkwenye ha kwenyere na oziọma nke Kraịst dị ụmụ mmadụ mkpa.” Nke ahụ mere ka okpukpe ahụ malite iziga ndị ozi ala ọzọ n’ala dịgasị iche iche bụ́ nke gaara ha nke ọma.

N’afọ 1719, otu ìgwè nta nke Alexander Mack nọ n’isi ya bịara n’ebe bụzi Pennsylvania, nke dị na United States. Kemgbe ahụ, e hiwekwuola ìgwè ndị ọzọ, ọtụtụ ìgwè ndị ọzọ esiwokwa n’ìgwè ndị ahụ kewara. Nke ọ bụla n’ime ha nwere nkọwa nke ha banyere ozizi Alexander Mack. Obere chọọchị anyị nwere ndị òtù 50. E kwusiri okwu ike banyere ịgụ Bible na ịgbasochi mkpebi nke ndị chọọchị ahụ nakweere, anya.

Ọ dịkarịa ala, ezinụlọ m ekpewo okpukpe a, gbasookwa ụzọ ndụ a kemgbe oge ndị nna nna m hà. Esonyeere m chọọchị ahụ ma bụrụ onye e mere baptizim mgbe m dị afọ 13. A zụlitere m ikwenye na ọ dị njọ inwe ma ọ bụ iji ụgbọala, traktọ, telifon, ma ọ bụ ọbụna redio ma ọ bụ ngwá eletrik ọ bụla ọzọ eme ihe. Ụmụ nwanyị chọọchị anyị adịghị eyi uwe ọgbara ọhụrụ, anyị adịghịkwa akpụ isi ma ọ bụ ghewe isi anyị oghe. Ụmụ nwoke anyị na-ahapụ afụ ọnụ ha. N’ụzọ anyị si eche echiche, abụghị akụkụ nke ụwa gụnyere ịghara iyi uwe ọgbara ọhụrụ, ite ihe ntecha, ma ọ bụ ịgba ọla, bụ́ ndị anyị chere na ha na-egosipụta ịdị mpako.

A kụziiri anyị inwe nsọpụrụ miri emi maka Bible, bụ́ nke anyị weere dị ka nri ime mmụọ anyị. N’ụtụtụ ọ bụla tupu anyị erie nri ụtụtụ, anyị na-anọkọta ọnụ n’ime palọ ma na-ege papa anyị ntị ka ọ na-agụ otu isiakwụkwọ site na Bible ma kọwaa ihe ọ gụrụ. Mgbe ahụ, anyị nile na-esekpuru ala mgbe papa anyị na-ekpe ekpere. Mgbe nke ahụ gasịrị, mama anyị ga-agụgharị Ekpere Onyenwe Anyị. Oge ọ bụla, ana m elepụ anya maka ekpere ụtụtụ anyị, bụ́ ebe ezinụlọ anyị nile na-anọkọta ọnụ, na-etinye uche n’ihe ime mmụọ.

Anyị biri n’otu ugbo nke dị nso na Delphi, Indiana, bụ́ ebe anyị na-akọ ụdị ihe ọkụkụ dị iche iche. Anyị na-eji trọk ịnyịnya na-adọkpụ ebuga ha n’ime obodo mepere emepe, ma rezie ha n’okporo ámá ma ọ bụ site n’ụlọ ruo n’ụlọ. Anyị chere na ọrụ ike bụ akụkụ nke ozi anyị na-ejere Chineke. N’ihi ya, anyị tinyere nnọọ oge anyị na ya, e wezụga ụbọchị Sunday, bụ́ mgbe anyị na-agaghị arụ “ọrụ ike.” Otú ọ dị, mgbe ụfọdụ, ezinụlọ anyị na-emikpu nnọọ n’ọrụ ugbo nke na ọ na-esiri anyị ike ịgbaso usoro ihe ime mmụọ anyị.

Ịlụ Di na Inwe Ezinụlọ

Na 1963, mgbe m dị afọ 17, alụrụ m James, bụ́kwa onye òtù okpukpe Old Brethren. Ezinụlọ ha malitere ikpe okpukpe Old Brethren kemgbe oge nna nna nna ya hà. Anyị abụọ nwere ọchịchọ siri ike nke ijere Chineke ozi, anyị kwetakwara na chọọchị anyị bụ nanị ezi chọọchị e nwere.

Ka ọ na-erule afọ 1975, anyị amụọla ụmụ isii, n’afọ 1983 kwa, anyị mụrụ nwa anyị nke asaa, nke bụ́kwa nke ikpeazụ. Rebecca, bụ́ nwa nke abụọ, bụ nanị nwanyị anyị mụrụ. Anyị rụsiri ọrụ ike, anyị emefughị oké ego, anyị ebighịkwa ndụ ọgbara ọhụrụ. Anyị gbalịsiri ike ịkụnye n’ime ụmụ anyị ụkpụrụ Bible ndị ahụ anyị mụtara site n’aka ndị mụrụ anyị na ndị ọzọ na-ekpe okpukpe Old Brethren.

Ndị Old Brethren ejighị ọdịdị elu ahụ́ egwu egwu. Anyị chere na ebe ọ bụ na ọ dịghị onye pụrụ inyocha obi, ejiji mmadụ na-ekpughe ihe onye ahụ bụ n’ime. N’ihi ya, ọ bụrụ na onye òtù anyị achọọ isi ya mma nke ukwuu, a na-ele nke a anya dị ka ihe na-egosi ịdị mpako. Ọ bụrụ na a sụrụ uwe anyị, bụ́ nke a na-adịghị achọ mma, asụ̀ nke ukwuu, nke ahụ bụkwa ihe ọzọ na-egosi ịdị mpako. Mgbe ụfọdụ, a na-etinyekarị anya n’ihe ndị metụtara ejiji karịadị ka a na-etinye n’Akwụkwọ Nsọ.

Ịnọ Mkpọrọ

Ná ngwụsị nke afọ 1960, a tụrụ nwanne di m nke nwoke bụ́ Jesse, bụ́ onye a zụlitekwara na chọọchị Old Brethren, mkpọrọ, n’ihi na ọ jụrụ ịga agha. Mgbe ọ nọ n’ebe ahụ, o zutere Ndịàmà Jehova, bụ́ ndị na-echekwa na ịlụ agha ekwekọghị n’ụkpụrụ Bible. (Aịsaịa 2:4; Matiu 26:52) Jesse sooro Ndịàmà ahụ nwee ọtụtụ mkparịta ụka dabeere na Bible ma jiri anya ya hụ ụzọ ha si akpa àgwà. Mgbe e duzisịịrị ya ọmụmụ Bible ọtụtụ ugboro, e mere ya baptizim dị ka otu n’ime Ndịàmà Jehova—bụ́ nke wutere anyị hie nne.

Jesse kọọrọ di m banyere ihe ndị ọ mụtara. O mekwara ndokwa ka James na-enweta magazin Ụlọ Nche na Teta! mgbe nile. Ịgụ akwụkwọ ndị a mere ka James nwekwuo mmasị na Bible. Ebe ọ bụ na James anọwo na-achọ ijere Chineke ozi ma bụrụ onye na-enwe mmetụta nke ịnọ Ya n’ebe dị anya, o nwere nnọọ mmasị n’ihe ọ bụla pụrụ inyere ya aka ịbịarukwu Chineke nso.

Ndị okenye nke chọọchị anyị gbara anyị ume ịdị na-agụ magazin ndị okpukpe Amish, Mennonite, na chọọchị ndị ọzọ nke Old Brethren, n’agbanyeghị na anyị na-ele okpukpe ndị ahụ anya dị ka akụkụ nke ụwa. Otú ọ dị, papa m nwere ajọ mbunobi megide Ndịàmà. O chere na anyị ekwesịghị ịgụ Ụlọ Nche na Teta! ma ọlị. N’ihi ya, obi mapụrụ m mgbe m hụrụ James ka ọ na-agụ ha. Ụjọ tụrụ m na ọ ga-anakwere ozizi ụgha.

Ma, James anọwo na-agbagha nkwenkwe ụfọdụ nke ndị Old Brethren bụ́ ndị o chere na ha ekwekọghị na Bible—karịsịa ozizi bụ́ na ịrụ “ọrụ ike” n’ụbọchị Sunday bụ mmehie. Dị ka ihe atụ, okpukpe Old Brethren na-akụzi na ị pụrụ inye ụmụ anụmanụ gị mmiri n’ụbọchị Sunday ma ị pụghị ifopụ otu ahịhịa. Ndị okenye ha apụghị ịgwa ya site n’Akwụkwọ Nsọ, ihe mere ha ji nye iwu a. Nke nta nke nta, amalitekwara m inwe obi abụọ banyere ozizi ndị dị otú ahụ.

Ebe ọ bụ na ọ dịwo anya anyị kweere na chọọchị anyị bụ nke Chineke, marakwa ihe anyị ga-eche ihu ma anyị hapụ ya, o siiri anyị ike isi n’okpukpe Old Brethren pụọ. N’agbanyeghị nke ahụ, akọ na uche anyị ekweghịzi ka anyị nọgide n’okpukpe anyị chere na ọ dịghị agbaso ihe Bible na-ekwu. N’ihi ya, n’afọ 1983, anyị degaara ha akwụkwọ ozi, na-akọwa ihe ndị mere anyị ji apụ ma gwa ha ka ha gụọrọ ọgbakọ akwụkwọ ozi ahụ. A chụpụrụ anyị na chọọchị ahụ.

Ịchọ Ezi Okpukpe

Mgbe nke a gasịrị, anyị malitere ịchọ ezi okpukpe ahụ. Anyị nọ na-achọ ebe e nwere nkwekọ, okpukpe nke ndị nọ na ya na-amịpụta ụdị mkpụrụ ha na-akụziri ndị ọzọ ka ha mịa. Anyị bu ụzọ gụpụ okpukpe ọ bụla na-ekere òkè n’agha. Okpukpe ndị na-adịghị ebi ndụ ọgbara ọhụrụ ma na-eyi uwe a na-achọghị mma ka nọkwa na-adọrọ mmasị anyị, ebe ọ bụ na anyị chere na ịghara ibi ndụ ọgbara ọhụrụ na iyi uwe ndị a na-achọghị mma bụ ihe ndị na-egosi na okpukpe abụghị akụkụ nke ụwa. Malite n’afọ 1983 ruo n’afọ 1985, anyị wepụtara oge gagharịa United States, na-enyocha okpukpe otu otu—ndị Mennonite, ndị Quaker, na okpukpe ndị ọzọ na-adịghị ebi ndụ ọgbara ọhụrụ.

N’oge ahụ, Ndịàmà Jehova kpọtụụrụ anyị n’ugbo anyị, nke dị nso na Camden, Indiana. Anyị na-ege ha ntị, ma na-agwa ha ka ha jiri nanị nsụgharị Bible nke King James na-eme ihe. Akwanyeere m nguzo Ndịàmà ùgwù n’ihe banyere agha. Ma o siiri m ike ige ha ntị n’ihi na ọ bụrụ na ha apụghị ịhụ mkpa ọ dị ịnọpụ iche n’ụwa site n’ịdị na-eyi uwe ndị a na-achọghị mma, echere m na ha apụghị ịbụ ezi okpukpe ahụ. Dị ka m chere, ọ bụ mpako na-eme ka ndị mmadụ na-eji ejiji ndị dị iche na nke anyị na-eji. Ekweere m na ihe onwunwe na-eme ka mmadụ dị mpako.

James malitere ịkpọrọ ụfọdụ n’ime ụmụ anyị ndị nwoke na-aga n’Ụlọ Nzukọ Alaeze nke Ndịàmà Jehova. Ewere m iwe nke ukwuu. Di m gbara m ume iso ya na-aga, ma ekweghị m. Ma otu ụbọchị, o kwuru, sị, “Ọ bụrụgodị na ị chọghị ikwenye n’ozizi nile ha, gagodị hụ n’onwe gị otú ha si emesorịta onwe ha.” Nke a amasịwo James.

N’ikpeazụ, ekpebiri m isoro ya gaa, ma aghaghị m ịkpachara anya. Eyi m uwe na okpu a na-achọghị mma banye n’Ụlọ Nzukọ Alaeze ahụ. Ụfọdụ n’ime ụmụ anyị ndị nwoke gba ụkwụ ọtọ, uwe ha bụkwa nke a na-achọghị mma. N’agbanyeghị nke ahụ, Ndịàmà ahụ bịakwutere anyị ma mesoo anyị ihe n’ịhụnanya. Echere m, sị, ‘Anyị dị iche, ma ha na-anabatakwarị anyị.’

Omume ịhụnanya ha masịrị m nke ukwuu, ma aka m kpebisiri ike ịnọ na-ekiri nanị nkiri. Ekweghị m eguzo ọtọ ma ọ bụ ọbụna gụọ abụ ha. Mgbe a gbasara nzukọ ahụ, ajụkasịrị m ha ajụjụ ahụ́, na-ajụ banyere ihe ndị m chere na ha adịghị eme nke ọma na ha ma ọ bụ ihe akụkụ Akwụkwọ Nsọ ụfọdụ pụtara. N’agbanyeghị na adịchaghị m edowe ọnụ nke ọma, onye ọ bụla m jụrụ ajụjụ nwere ezi mmasị n’ebe m nọ. Ọ masịkwara m na m jụrụ ọtụtụ mmadụ otu ajụjụ ma nweta otu azịza ahụ. Mgbe ụfọdụ, ha na-edetu azịza ahụ edetu, bụ́ nke nyeere m aka nke ukwuu, ebe ọ bụ na m pụrụ ịmụ ihe ahụ ha dere n’onwe m mgbe e mesịrị.

N’oge okpomọkụ nke afọ 1985, ezinụlọ anyị gara mgbakọ nke Ndịàmà Jehova na Memphis, Tennessee—nanị iji kirie ihe ga-emenụ. James ka bukwa afụ ọnụ ya, anyị ka yikwa uwe anyị ndị a na-achọghị mma. N’oge nkwụsịtụ, ọ fọrọ nnọọ nke nta ka ọ bụrụ na ọ dịghị mgbe mmadụ na-anọghị na-eleta anyị. Ịhụnanya, nlebara anya, na nnabata a nabatara anyị masịrị anyị. Ịdị n’otu ha dọkwaara mmasị anyị n’ihi na n’ebe nile anyị gara nzukọ, ozizi ha bụ otu.

N’ịbụ onye mmasị onwe onye Ndịàmà ahụ gosiri ya kwaliri, James nakweere ọmụmụ Bible. O nyochara ihe nile, na-achọ ijide ihe ndị ọ na-amụta n’aka. (Ọrụ 17:11; 1 Ndị Tesalọnaịka 5:21) Ka oge na-aga, James chere na ọ chọtawo eziokwu ahụ. Otú ọ dị, anọ m na-enwe obi abụọ. Achọrọ m ime ihe ziri ezi, ma achọghị m “ibi ndụ ọgbara ọhụrụ” ka e wee ghara ile m anya dị ka “onye ụwa.” Mgbe mbụ m kwetara ịbịa nọdụ ala ka ha na-amụ Bible, edebere m King James Version n’otu ikpere, debekwa nsụgharị nke ka bụrụ nke ọgbara ọhụrụ bụ́ New World Translation, n’ikpere nke ọzọ. Atụlere m amaokwu ọ bụla ná nsụgharị abụọ ahụ iji jide n’aka na e duhieghị m.

Otú E Si Mee Ka M Kwenye

Ka anyị so Ndịàmà ahụ na-amụ ihe, anyị mụtara na Nna anyị nke eluigwe bụ otu Chineke, ọ bụghị atọ n’ime otu, nakwa na anyị onwe anyị bụ mkpụrụ obi, na anyị enweghị mkpụrụ obi nke na-adịghị anwụ anwụ. (Jenesis 2:7; Deuterọnọmi 6:4; Ezikiel 18:4; 1 Ndị Kọrint 8:5, 6) Anyị mụtakwara na hel bụ ili nkịtị nke ihe nile a kpọrọ mmadụ, ọ bụghị ebe e ji ọkụ ata ụmụ mmadụ ahụhụ. (Job 14:13; Abụ Ọma 16:10; Eklisiastis 9:5, 10; Ọrụ 2:31) Ịmụta eziokwu banyere hel bụ otu ihe mere m ji malite ichegharị echiche, ebe ọ bụ na ndị Old Brethren ekwekọrịtaghị n’ihe ọ pụtara.

N’agbanyeghị nke ahụ, aka m nọ na-eche otú Ndịàmà ga-esi bụrụ ezi okpukpe ebe ọ bụ na, n’obi m, ha ka bụ akụkụ nke ụwa. Ha na-ebi ndụ ọgbara ọhụrụ, bụ́ nke m chere na ọ dịghị mma. Otú ọ dị, n’otu oge ahụkwa, aghọtara m na ha na-emezu iwu Jizọs nyere, nke bụ́ ikwusa ozi ọma nke Alaeze ahụ nye mmadụ nile. Ọ gbagwojuru m nnọọ anya!—Matiu 24:14; 28:19, 20.

N’oge a siri ike obibi, ịhụnanya nke Ndịàmà nyeere m aka ịga n’ihu ná nnyocha m. Ọgbakọ ahụ nile nwere mmasị n’ebe ezinụlọ anyị nọ. Ka ọtụtụ n’ime ndị nọ n’ọgbakọ ahụ na-abịa ileta anyị—mgbe ụfọdụ na-eme ka à ga-asị na ihe mere ha ji bịa na nke anyị bụ iji zụrụ ákwá na mmiri ara ehi anyị—anyị malitere ịhụ ha dị ka ezigbo ndị. Ha ezereghị ịbịa n’ụlọ anyị maka na otu Onyeàmà na-amụrụ anyị ihe. Kama nke ahụ, mgbe ọ bụla ndị nọ n’ọgbakọ ahụ rutere nso ụlọ anyị, ha na-abata. Ohere a dị anyị nnọọ mkpa iji wee mata Ndịàmà nke ọma, anyị bịakwara nwee ekele maka ezi mmasị na ịhụnanya ha.

Ọ bụghị nanị Ndịàmà nọ n’ọgbakọ ahụ dị anyị nso gosiri anyị mmasị onwe onye. Ka mụ na okwu metụtara uwe na ejiji kwesịrị ekwesị nọ na-alụ, Kay Briggs, bụ́ Onyeàmà nke nọ n’ọgbakọ dị nso n’ebe ahụ, onye ji ọchịchọ obi ya họrọ ịdị na-eyi uwe a na-achọghị mma na ịghara ịdị na-ete ihe ntecha, bịara leta m. Obi ruru m nnọọ ala iso ya nọrọ na iso ya kwurịta okwu. E mesịa, otu ụbọchị, Lewis Flora, bụ́ onye a zụlitekwara n’okpukpe na-abụghị nke ọgbara ọhụrụ bịara leta m. O lere m anya n’ihu ma chọpụta na m nọ n’ọnọdụ nke amaghị ihe m ga-eme, o detakwaara m akwụkwọ ozi dị peeji iri, iji mee ka obi m dajụọ. Obiọma ya gbara m anya mmiri, agụkwara m akwụkwọ ozi ya ọtụtụ ugboro.

Agwara m otu onye nlekọta na-ejegharị ejegharị, bụ́ Nwanna O’Dell, ka ọ kọwaara m Aịsaịa 3:18-23 na 1 Pita 3:3, 4. “Ọ̀ bụ na amaokwu ndị a adịghị egosi na iyi uwe ndị a na-achọghị mma dị mkpa iji mee Chineke obi ụtọ?” ka m jụrụ. O mere ka m tụgharịa uche site n’ịjụ m, sị: “Ò nwere ihe ọjọọ dị n’ikpu okpu? Ịkpa isi ọ̀ dị njọ?” N’okpukpe Old Brethren, anyị na-akpa ụmụntakịrị nwanyị isi, ụmụ nwanyị na-ekpukwa okpu. Apụrụ m ịhụ na ihe abụọ ahụ ekwekọrịtaghị, ndidi na obiọma nke onye nlekọta ahụ na-ejegharị ejegharị masịkwara m nke ukwuu.

Nke nta nke nta, e mere ka m kwenyekwuo, ma ọ dị otu ihe ka na-enye m nsogbu n’obi nke ukwuu—ụmụ nwanyị na-akpụtulata isi ha. Ndị Kraịst bụ́ ndị okenye sooro m tụgharịa uche na-ekwu na ntutu isi nke ụmụ nwanyị ụfọdụ adịchaghị eto ogologo, ebe nke ndị ọzọ na-eto nnọọ ogologo. Nke a ọ̀ na-eme ka ntutu isi nke otu nwanyị dị mma karịa nke ibe ya? Ha nyekwaara m aka ịhụ òkè akọ na uche na-ekere n’ihe banyere uwe na ejiji ma nye m ihe odide m ga-agụ ma m laruo n’ụlọ.

Ime Ihe Anyị Mụtara

Anyị nọ na-achọ ezi mkpụrụ, anyị chọtakwara ya. Jizọs kwuru, sị: “Mmadụ nile ga-eji nke a mara na unu bụ ndị na-eso ụzọ m, ma ọ bụrụ na unu enwee ịhụnanya n’etiti onwe unu.” (Jọn 13:35) Anyị kwenyesiri ike na Ndịàmà Jehova bụ ndị na-egosipụta ezi ịhụnanya. N’agbanyeghị nke ahụ, ụmụ anyị nke diọkpara na nke ada, bụ́ Nathan na Rebecca, nọ na-enwe mgbagwoju anya, ebe ọ bụ na ha anakwerewo okpukpe Old Brethren, e meekwa ha baptizim na ya. N’ikpeazụ, eziokwu Bible anyị kụziiri ha, ya na ịhụnanya nke Ndịàmà ahụ kpaliri ha.

Dị ka ihe atụ, ọ nọwo na-agụ Rebecca agụụ mgbe nile iso Chineke na-enwe ezi mmekọrịta. Ọ dịkwuuru ya mfe ikpegara ya ekpere mgbe ọ mụtara na ọ kaghị ihe ga-abụ àgwà mmadụ ma ọ bụ ihe ga-abụ ọdịnihu mmadụ aka. Ọ bịarukwara Chineke nso karị mgbe ọ mụtara na kama Chineke ịbụ akụkụ nke Atọ n’Ime Otu dị omimi, ọ bụ onye dị adị n’ezie, onye ya onwe ya pụrụ iṅomi. (Ndị Efesọs 5:1) Obi tọkwara ya ụtọ na ọ dịghị ya mkpa iji asụsụ ochie ndị dị ná nsụgharị King James Version eme ihe mgbe ọ na-ekpegara ya ekpere. Ka ọ mụtara ihe ndị Chineke chọrọ banyere ekpere, mụtakwa banyere nzube ya dị ebube bụ́ ka ụmụ mmadụ biri n’elu ala paradaịs ruo mgbe ebighị ebi, ọ bịara nwee mmetụta ọhụrụ nke ịnọkwu Onye Okike ya nso.—Abụ Ọma 37:29; Mkpughe 21:3, 4.

Ihe Ùgwù Anyị Nile Nwere

E mere mụ na James na ụmụ anyị ndị nke okenye ise—Nathan, Rebecca, George, Daniel, na John—baptizim dị ka Ndịàmà Jehova n’oge okpomọkụ nke 1987. E mere Harley baptizim n’afọ 1989, meekwa Simon n’afọ 1994. Onye ọ bụla nọ n’ezinụlọ anyị nọgidere na-emikpu onwe ya n’ọrụ ahụ Jizọs Kraịst nyere ụmụazụ ya ịrụ, nke bụ́ ikwusa ozi ọma Alaeze Chineke.

Ụmụ anyị ndị nwoke ise metụrụla okenye—Nathan, George, Daniel, John, na Harley—nakwa nwa anyị nwanyị bụ́ Rebecca—ejewo ozi n’alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova dị na United States. George ka nọkwa ebe ahụ eri afọ 14 gara aga, n’oge n’adịbeghịkwa anya, simon, bụ́ onye gụsịrị akwụkwọ n’afọ 2001 aghọọla onye òtù nke otu alaka ụlọ ọrụ ahụ. Ụmụ anyị ndị nwoke nile bụcha okenye ma ọ bụ ohu na-eje ozi n’ọgbakọ nke Ndịàmà Jehova. Di m na-eje ozi dị ka okenye n’Ọgbakọ Thayer nke dị na Missouri, ana m agachikwa ozi anya.

Anyị nwere ụmụ ụmụ atọ ugbu a—Jessica, Latisha, na Caleb—anyị nwekwara obi ụtọ ịhụ ka ndị mụrụ ha na-akụnye ịhụnanya maka Jehova n’ime obi ha ka dị ọhụrụ. Dị ka ezinụlọ, anyị na-aṅụrị ọṅụ na Jehova dọtara anyị n’ebe ọ nọ ma nyere anyị aka ịmata ndị a kpọkwasịrị aha ya site n’ịhụnanya ha na-egosipụta.

Anyị na-emetara ndị ọzọ ebere bụ́ ndị nwere ọchịchọ siri ike ime ihe na-atọ Chineke ụtọ ma bụrụ ndị ọ pụrụ ịbụ na e jiwo ihe ndị na-eme gburugburu ha zụọ akọ na uche ha kama iji Bible n’onwe ya. Anyị nwere olileanya na ha ga-achọta ụdị ọṅụ anyị nwere ugbu a n’ịga site n’ụlọ ruo n’ụlọ, na-eji, ọ bụghị ihe ndị anyị kọtara n’ugbo anyị kama, ozi banyere Alaeze Chineke na ihe ndị dị ebube ọ ga-arụzu. Anya mmiri nke obi ekele na-eju m anya mgbe m chetara ndidi na ịhụnanya nke ndị na-aza aha Jehova gosiri anyị!

[Foto ndị dị na peeji nke 13]

Mgbe m dị ihe dị ka afọ asaa, na mgbe m mere okenye

[Foto dị na peeji nke 14]

James, George, Harley, na Simon, ka ha yi uwe ndị a na-achọghị mma

[Foto dị na peeji nke 15]

Foto a nke na-egosi ebe m na-ebuga ihe m kọtara n’ugbo n’ahịa gbara n’akwụkwọ akụkọ a na-ebipụta n’ógbè anyị

[Ebe E Si Nweta Foto]

Journal and Courier, Lafayette, Indiana

[Foto dị na peeji nke 17]

Mụ na ezinụlọ anyị taa