Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ị̀ Maara?

Ị̀ Maara?

Ị̀ Maara?

(A pụrụ ịchọta azịza nye ajụjụ ndị a n’akụkụ Bible ndị e zoro aka na ha, e bipụtakwara ndepụta zuru ezu nke azịza ha na peeji nke 23. Iji nwetakwuo ihe ọmụma, lee akwụkwọ bụ́ “Insight on the Scriptures,” nke Ndịàmà Jehova bipụtara.)

1. Olee ihe Ebreham ji shekel ọlaọcha 400 zụọ n’aka ụmụ Het? (Jenesis 23:16-20)

2. Olee ihe ndị e ji mee ihe n’ihe àmà abụọ ahụ Gidiọn rịọrọ iji mata na Chineke kwadoro ya ịlụso ndị Midian agha? (Ndị Ikpe 6:36-40)

3. Ihe owuwu dị aṅaa ka e hotara nanị n’akwụkwọ Bible bụ́ Ihe E Mere, Nehemaịa, Esta, na Daniel? (Daniel 8:2)

4. Olee nnọọ ihe dọọrọ mmasị Ekan nke na o leghaara iwu Chineke anya ma kpata ihe mere ka e merie ụmụ Izrel n’agha na E-aị? (Joshua 7:21)

5. Mgbe Chineke kesịrị nwunye nye Adam, gịnị ka O nyere n’iwu na ndị lụrụ di na nwunye ga-aghọ site mgbe ahụ gaa n’ihu? (Jenesis 2:24)

6. Olee omume mgbaasị ndị Bible katọrọ? (Deuterọnọmi 18:10, 11)

7. Olee otú Eze Ahazọrọs si mee ememe o ji mee Esta eze nwanyị ya? (Esta 2:18)

8. Olee ihe Jizọs buru n’amụma na ndị na-eso ụzọ ya ga-abụ n’ihi aha ya? (Matiu 10:22)

9. Ònye bụ nwanyị Midian ahụ Finihas gburu mgbe Zimri kpọbatara ya n’ọmụma ụlọikwuu ụmụ Izrel maka inwe mmekọahụ rụrụ arụ? (Ọnụ Ọgụgụ 25:15)

10. Ònye ka a kọwara n’Ilu isi 31? (Ilu 31:10)

11. Olee okwu nke ọ bụla n’ime akụkụ atọ nke ihe ndị ahụ Maịka kwuru megide Sameria na Jeruselem ji malite? (Maịka 1:2; 3:1; 6:1)

12. Ònye gburu diọkpara Devid, bụ́ Amnọn, n’agbanyeghị nke ahụ, Devid emesịa gbaghara ya? (2 Samuel 13:32, 33)

13. N’ihi gịnị ka nwunye Devid bụ́ Maịkal ji “ledaa ya anya n’obi ya,” bụ́ ihe mere o ji nwụọ n’amụtaghị nwa? (2 Samuel 6:14-16, 20-23)

14. Olee ihe omume Bible na-ejikọta ya na Amagedọn? (Mkpughe 16:14, 16)

15. Na Listra, n’ihi gịnị ka ìgwè mmadụ ahụ ji gbanwee obi ha ozugbo site n’ịchụrụ Pọl àjà gaa n’ịtụ ya nkume? (Ọrụ 14:19)

16. Gịnị ka Pita mere ka ọ na-anwa ichebe Jizọs pụọ n’aka ndị agha ahụ bịara ijide ya? (Jọn 18:10)

17. Olee ihe Ekwensu gbalịsiri ike ka Jizọs mee n’ọnwụnwa nke atọ ahụ ọ nwara ya n’ala ịkpa? (Matiu 4:9)

18. Olee ihe e ji eme ihe n’ime Bible iji gosi mmehie ma ọ bụ ire ure? (Matiu 16:6)

19. Olee ndị ọzọ e kwuru na amamihe Solomọn karịrị nke ha? (1 Ndị Eze 4:31)

Azịza Nye Ajụjụ

1. Ebe ili ozu nke ezinụlọ

2. Igirigi na ajị anụ

3. Ụlọukwu eze

4. “Otu ezi uwe mwụda nke Shaịna” tinyekwara ụfọdụ ọlaọcha na ọlaedo

5. “Otu anụ ahụ́”

6. Ịjụ ase, iji igwe ojii tụọ isi ọma ma ọ bụ isi ọjọọ, ịgba afa, mgbaasị, ịgakwuru dibịa nrafu, ịgakwuru dibịa afa, ịjụ ndị mmụọ ihe, nakwa ọtụtụ ndị ọzọ

7. O mere oké ọṅụṅụ mmanya vaịn, meekwa ka ala nile a na-achị achị zuru ike n’ịtụ ụtụ, o nyekwara onyinye

8. ‘Ndị a kpọrọ asị’

9. Kozbi, bụ́ ada Zua

10. “Nwanyị nke na-ejide onwe ya nke ọma”

11. “Nụrụnụ”

12. Nwa nwoke Devid nke atọ, bụ́ Absalọm

13. Ọ katọrọ Devid n’ihi na ọ “na-awụli, na-etekwa egwu, n’ihu Jehova” ná ngosipụta nke ọṅụ o nwere

14. ‘Agha nke oké ụbọchị nke Chineke Onye Pụrụ Ime Ihe Nile’

15. Ndị Juu si Antiọk na Aịkoniọm bịarutere ma rụgide ha ime otú ahụ

16. Ọ mịịrị mma agha ya gbuo ya onye ohu ahụ bụ́ Malkọs, wee bepụ ntị aka nri ya

17. ‘Ịkpọ isiala’ nye ya

18. Ihe iko achịcha (yisti)

19. Itan, Himan, Kalkol, na Dada