Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Anyasị A Ga-echeta—Sunday, April 4, 2004

Anyasị A Ga-echeta—Sunday, April 4, 2004

Anyasị A Ga-echeta—Sunday, April 4, 2004

N’anyasị ahụ tupu ọnwụ ya, Jizọs Kraịst guzobere Ememe Ncheta ọnwụ ya. N’otu oge ya na ndịozi ya nọ na-eri nri dị mfe bụ́ nke o ji mmanya na achịcha na-ekoghị eko mee ihe nnọchianya, Jizọs nyere iwu, sị: “Nọgidenụ na-eme nke a iji na-echeta m.”—Luk 22:19.

Ndịàmà Jehova ji obi ụtọ na-akpọ gị òkù ka i soro ha mee Ememe Ncheta a a na-eme kwa afọ. N’afọ a, a ga-eme ya mgbe anyanwụ dasịrị na Sunday, April 4, n’ụbọchị kwekọrọ na Nisan 14 na kalenda Bible nke e ji ọnwa agụ. Biko jụọ Ndịàmà Jehova nọ n’ógbè gị ebe na oge a ga-ezukọ kpọmkwem.