Mozis—Otú Ndụ Ya Si Emetụta Gị
Mozis—Otú Ndụ Ya Si Emetụta Gị
NYE ọtụtụ ndị ọkà mmụta na ndị nkatọ, Mozis bụ nanị onye a kọrọ n’akụkọ ifo. Ha adịghị ekwere ihe ndekọ Bible banyere ya, ihe ndị ha na-eji agbagha ya ga-emekwa ka e were ndị ikom dị ka Plato na Socrates dị ka ndị a kọrọ n’akụkọ ifo.
Otú ọ dị, dị ka anyị hụworo, e nweghị ezi ihe mere a ga-eji jụ ihe ndekọ Bible banyere Mozis. N’ụzọ megidere nke ahụ, nye ndị nwere okwukwe, e nwere ọtụtụ ihe àmà ndị na-egosi na Bible dum bụ “okwu Chineke.” * (1 Ndị Tesalọnaịka 2:13; Ndị Hibru ) Nye ndị dị otú ahụ, ịmụ banyere ndụ Mozis abụghị nanị iji kponye ihe ọmụma n’ụbụrụ, kama ọ bụ ụzọ isi wulite okwukwe. 11:1
Mozis nke Bụ́ Ezigbo Ya
Ndị na-emepụta ihe nkiri na-egosipụtakarị ike ndị Mozis kpara na obi ike o nwere—àgwà ndị na-adọrọ mmasị nke ndị na-ekiri ya. N’eziokwu, Mozis nwere obi ike. (Ọpụpụ 2:16-19) Ma n’ụzọ bụ́ isi, ọ bụ nwoke okwukwe. Chineke dịrị adị n’ezie nye Mozis—ọ dịrị nnọọ adị nye ya nke na mgbe e mesịrị, Pọl onyeozi kwuru na Mozis “nọgidere na-eguzosi ike dị ka ọ na-ahụ Onye ahụ a na-apụghị ịhụ anya.”—Ndị Hibru 11:24-28.
Mozis si otú a na-akụziri anyị mkpa ọ dị iso Chineke na-enwe mmekọrịta. Ná ndụ anyị na-adị kwa ụbọchị, anyị onwe anyị pụkwara ịkpa àgwà dị ka ànyị na-ahụ Chineke! Ọ bụrụ na anyị emee otú ahụ, anyị agaghị eme ihe ọ bụla na-akpasu Ya iwe ma ọlị. Rịbakwa ama na a zụlitere okwukwe n’ime Mozis n’oge ọ bụ nnọọ obere nwa. Okwukwe ya siri nnọọ ike nke na ‘amamihe nile nke ndị Ijipt’ emeghị ka ọ daa. (Ọrụ 7:22) Lee agbamume nke ahụ bụụrụ ndị nne na nna ịmalite ịkụziri ụmụ ha banyere Chineke n’oge ha bụ ụmụ ọhụrụ!—Ilu 22:6; 2 Timoti 3:15.
Ihe ọzọ kwesịkwara nrịba ama bụ ịdị umeala n’obi Mozis. Ọ “dị umeala n’obi nke ukwuu, karịa mmadụ nile ndị nọ n’elu ala.” (Ọnụ Ọgụgụ 12:3) N’ihi ya, Mozis dịịrị njikere ịnabata ihe ndị o mejọrọ. O dere banyere emezighị emezi ya nke ịhapụ ibi nwa ya nwoke úgwù. (Ọpụpụ 4:24-26) Ọ kọrọ n’ezoghị ọnụ banyere ọdịda ọ dara inye Chineke otuto n’otu oge nakwa ntaramahụhụ siri ike Chineke nyere ya. (Ọnụ Ọgụgụ 20:2-12; Deuterọnọmi 1:37) Ọzọkwa, Mozis dịrị njikere ịnara aro ndị ọzọ tụụrụ ya. (Ọpụpụ 18:13-24) Ọ̀ bụ na ọ gaghị amagbu onwe ya ma ọ bụrụ na ndị bụ́ di, nna, na ndị ikom ndị ọzọ nwere ikike, ana-eṅomi Mozis?
N’eziokwu, ụfọdụ ndị nkatọ na-arụ ụka ma Mozis ọ̀ bụ n’ezie onye dị umeala n’obi, ha na-ezo aka n’ihe ike ndị o mere. (Ọpụpụ 32:26-28) Onye edemede bụ́ Jonathan Kirsch na-ekwu, sị: “Mozis ahụ a kọrọ banyere ya n’ime Bible adịchaghị umeala n’obi, ọ dịghịkwa nwayọọ ma ọlị, a pụghịkwa ile àgwà ya anya mgbe nile dị ka nke ziri ezi. N’oge ụfọdụ dị egwu, . . . Mozis gosipụtara na ya dị mpako, bụrụ onye ọ na-agụ agụụ ịkwafu ọbara, na onye obi tara mmiri.” N’ụzọ dị mwute, a tụleghị ihe dị iche iche mee nkatọ dị otú ahụ. A tụleghị eziokwu ahụ bụ́ na ọ bụghị obi ịta mmiri kpaliri Mozis ime ihe ndị ahụ, kama ọ bụ mmasị dị ukwuu o nwere n’ikpe ziri ezi nakwa ọjụjụ ọ jụrụ ajọ omume. N’ụbọchị ndị a, bụ́ mgbe ịnabata omume rụrụ arụ na-ewu ewu, Mozis bụ ihe nlereanya nke na-echetara anyị mkpa ọ dị inwe ụkpụrụ omume ndị a na-apụghị imebi emebi.—Abụ Ọma 97:10.
Ihe Odide Ndị Mozis Hapụrụ
Mozis hapụrụ ihe odide ndị dị ịtụnanya. Ha na-agụnye abụ uri (Job, Abụ Ọma 90), akụkọ ihe mere eme (Jenesis, Ọpụpụ, Ọnụ Ọgụgụ), usoro ọmụmụ (Jenesis, isi nke 5, 11, 19, 22, 25), nakwa usoro iwu dị ịrịba ama nke a kpọrọ Iwu Mozis (Ọpụpụ, isi nke 20-40; Levitikọs; Ọnụ Ọgụgụ; Deuterọnọmi). Iwu a Chineke nyere n’ike mmụọ nsọ nwere echiche, iwu, na ụkpụrụ ịchịisi bụ́ ndị were ọtụtụ narị afọ tupu a matachaa uru ha.
N’ala ebe onyeisi ala na-ejekwa ozi dị ka onyeisi Chọọchị, ihe ọ na-arụpụta na-abụkarị ekweghị okpukpe ọzọ dịrị, mmegbu okpukpe, na iji ike eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi. Iwu Mozis gụnyere ụkpụrụ nke na-ekewapụ Chọọchị n’ebe Ọchịchị dị. E kweghị ka eze na-arụ ọrụ ndị nchụàjà.—2 Ihe E Mere 26:16-18.
Iwu Mozis nwekwara echiche ndị metụtara ịdị ọcha na ịchịkwa ọrịa, dị ka ịkpọpụ ndị ọrịa iche n’ebe ndị mmadụ nọ, ikpofu nsị mmadụ, bụ́ ihe ndị kwekọrọ na nkà mmụta sayensị oge a. (Levitikọs 13:1-59; 14:38, 46; Deuterọnọmi 23:13) Nke a dị ịrịba ama, ebe ọ bụ na ihe dị ukwuu n’ọgwụ ndị Ijipt nke oge Mozis bụ ngwakọta dị ize ndụ nke ọgwụ òké rie ọ nwụọ na nkwenkwe ụgha. N’ala ndị ka na-emepe emepe taa, ọtụtụ nde mmadụ pụrụ izere ibute ọrịa na ọnwụ ma ọ bụrụ na a na-agbaso ụkpụrụ idebe ihe ọcha bụ́ ndị Mozis kụziri.
Ndị Kraịst anọghị n’okpuru Iwu Mozis. (Ndị Kọlọsi 2:13, 14) Ma ịmụ banyere ya ka bara uru dị ukwuu. Iwu ahụ gbara Izrel ume inye Chineke ofufe a na-ekewaghị ekewa nakwa izere ikpere arụsị. (Ọpụpụ 20:4; Deuterọnọmi 5:9) O nyere ụmụ iwu ịsọpụrụ nne na nna ha. (Ọpụpụ 20:12) Iwu ahụ katọkwara igbu mmadụ, ịkwa iko, izu ohi, ịgha ụgha, na anya mmadụ ịdị n’ebe ihe onye ọzọ dị. (Ọpụpụ 20:13-17) Ndị Kraịst na-eji ụkpụrụ ndị ahụ a kpọrọ oké ihe taa.
Onye Amụma nke Dị Ka Mozis
Anyị bi n’oge nsogbu. Ihe a kpọrọ mmadụ chọrọ n’ezie onye ndú nke dị ka Mozis—onye nwere ọ bụghị nanị ikike, kamakwa onye na-eguzosi ike n’ezi ihe, onye nwere obi ike, ọmịiko, nakwa ezi mmasị maka ikpe ziri ezi. Mgbe Mozis nwụrụ, ụmụ Izrel aghaghị ichewo, sị, ‘À ga-ahụ onye dị ka ya ọzọ n’ụwa?’ Mozis n’onwe ya zara ajụjụ ahụ.
Ihe ndekọ Mozis na-akọwa otú ọrịa na ọnwụ si malitedị amalite nakwa ihe mere Chineke ji kwere ka ajọ omume dịgide. (Jenesis 3:1-19; Job, isi nke 1, 2) Na Jenesis 3:15, e dekọrọ amụma mbụ sitere n’aka Chineke—nkwa bụ́ na a ga-emesị wepụ ihe ọjọọ kpam kpam! N’ụzọ dị aṅaa? Amụma ahụ gosiri na ọ dị onye a ga-amụ bụ́ onye a ga-esi n’aka ya nweta nzọpụta. Ọ bụ n’amụma a ka e si nwee olileanya bụ́ na Mezaịa ga-ebilite ma napụta ihe a kpọrọ mmadụ. Ma ònye ka Mezaịa ahụ ga-abụ? Mozis na-enyere anyị aka ịmata ya n’ụzọ obi abụọ na-adịghị na ya.
Ka ọ na-eru ọgwụgwụ nke ndụ ya, Mozis kwuru okwu amụma ndị a, sị: “Jehova, bụ́ Chineke gị, ga-eme ka onye amụma, nke dị ka mụ onwe m, biliere gị site n’etiti gị, site n’ụmụnne gị; onye ahụ ka unu ga-ege ntị.” (Deuterọnọmi 18:15) E mesịa, Pita onyeozi ji okwu ndị ahụ mee ihe kpọmkwem n’ebe Jizọs nọ.—Ọrụ 3:20-26.
Ihe ka ọtụtụ ná ndị Juu na-enye nkọwa na-ekwusi nnọọ ike na ọ dịghị mgbe e ji Mozis tụnyere Jizọs. Ha na-ekwu na ihe ndị e kwuru n’akụkụ Bible a metụtara ezi onye amụma ọ bụla nke pụtara n’oge Mozis nwụsịrị. Otú ọ dị, na Bible bụ́ Tanakh—The Holy Scriptures, nke Òtù Ndị Juu Na-ebipụta Akwụkwọ dere, otú a ka e si dee Deuterọnọmi 34:10: “Ọ dịghị mgbe ọ bụla ọzọ onye amụma dị ka Mozis—onye ya na ONYENWE anyị kwuru okwu ihu na ihu—bilitere n’Izrel.”
Ee, ọtụtụ ndị amụma kwesịrị ntụkwasị obi, dị ka Aịzaịa na Jeremaịa, pụtara mgbe Mozis nwụsịrị. Ma ọ dịghị nke ọ bụla n’ime ha nwere ụdị mmekọrịta pụrụ iche Chineke na Mozis nwere—isoro ya kwurịta okwu “ihu na ihu.” N’ihi ya, nkwa Mozis kwere banyere onye amụma nke ‘dị ka ya onwe ya,’ aghaghị imetụtawo otu onye—Mezaịa ahụ! Ọ bụ ihe dị ịrịba ama na tupu mmalite nke Iso Ụzọ Kraịst—na mkpagbu okpukpe nke na-esite n’aka Ndị Kraịst ụgha—ndị ọkà mmụta ndị Juu lere ihe anya n’ụzọ yiri nke ahụ. A pụrụ ịhụ echiche a n’ihe odide ndị Juu, dị ka Midrash Rabbah, bụ́ nke na-akọwa Mozis dị ka onye obu ụzọ nke “Onye Mgbapụta nke bịara mgbe e mesịrị,” ma ọ bụ Mezaịa.
A pụghị ịgọpụ na Jizọs dị ka Mozis n’ọtụtụ ụzọ. (Lee igbe bụ́ “Jizọs—Onye Amụma nke Dị Ka Mozis.”) Jizọs nwere ikike. (Matiu 28:19) Jizọs nwere ‘obi dị nwayọọ, dịkwa umeala n’obi.’ (Matiu 11:29) Jizọs kpọrọ mmebi iwu na ikpe na-ezighị ezi asị. (Ndị Hibru 1:9) Ya mere, ọ pụrụ inye anyị nduzi ahụ dị anyị nnọọ mkpa! Ọ bụ ya ga-ekpochapụ ajọ omume ma mee ka ụwa ghọọ Paradaịs ahụ Bible na-akọwa. *
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
^ par. 3 Lee akwụkwọ bụ́ The Bible—God’s Word or Man’s? nke Ndịàmà Jehova bipụtara.
^ par. 20 Ọ bụrụ na ị chọrọ ịmụtakwu banyere nkwa Bible maka ụwa paradaịs n’okpuru Alaeze Kraịst, biko kpọtụrụ Ndịàmà Jehova. Obi ga-adị ha ụtọ iso gị mụọ Bible n’anaghị ego.
[Igbe dị na peeji nke 12]
Mozis—Ihe Ndị Bụ́ Eziokwu Nakwa Ihe Ndị Bụ́ Ụgha
Ebe ndị a na-egosi Mozis n’ihe nkiri anọgidewo na-egosipụta ihe ndị na-emeghị eme na ndị na-abụghị eziokwu banyere ya. Ndị a bụ nanị ole na ole n’ime ha:
Ụgha: Mozis amaghị na ọ bụ onye Juu.
Eziokwu: Ọ bụ nne Mozis, bụ́ onye Juu, nyere ya ara ma lekọta ya, ihe àmà na-egosi na o mere nke a ruo afọ ole na ole. Ọrụ 7:23-25 na-egosi na Mozis lere ndị Juu ahụ bụ́ ndị ohu anya dị ka “ụmụnne ya.”
Ụgha: Mozis so na-azọ ocheeze Ijipt.
Eziokwu: Bible ekwughị otú ahụ. Akwụkwọ bụ́ Daily Bible Illustrations, nke John Kitto dere, na-ekwu na ọ dịghị ihe mere a ga-eji kwere na Mozis “site ná nkuchi a e kuchiri ya, ghọrọ onye ga-anọchi eze ma ọ bụrụ na ọ nwụọ. . . . O yighị ka ọ̀ dị mgbe nwoke nke ga-anọchi eze kọrọ ụkọ.”
Ụgha: Mozis laghachiri n’Ijipt iji zute ndị iro ya.
Eziokwu: Bible na-ekwu na ndị iro ya nile anwụchaala n’oge ọ laghachiri.—Ọpụpụ 4:19.
Ụgha: Mgbe mbụ Chineke kwupụtara Iwu Iri ahụ bụ mgbe Mozis rịgosịworo Ugwu Saịnaị.
Eziokwu: Chineke si n’ọnụ mmụọ ozi ya gwa mba Izrel dum Iwu Iri ahụ. Mgbe nke ahụ gasịrị, ụmụ Izrel ahụ egwu jidere rịọrọ Mozis ka ọ rịgoo n’ugwu ahụ ma kwuchitere ha ọnụ ha.—Ọpụpụ 19:20–20:19; 24:12-14; Ọrụ 7:53; Ndị Hibru 12:18, 19.
Ụgha: Fero lanahụrụ mbibi e bibiri usuu ndị agha ya n’Oké Osimiri Uhie.
Eziokwu: “Fero na usuu ndị agha ya” lara n’iyi n’Oké Osimiri Uhie ahụ.—Ọpụpụ 14:28; Abụ Ọma 136:15.
[Igbe dị na peeji nke 13]
Jizọs—Onye Amụma nke Dị Ka Mozis
Lee ụfọdụ n’ime ụzọ ndị Jizọs si dị ka Mozis:
▲ Ma Mozis ma Jizọs lanahụchara mgbukpọ e gbukpọrọ ụmụ ọhụrụ ndị nwoke, dị ka onye na-achị oge ha nyere n’iwu.—Ọpụpụ 1:22; 2:1-10; Matiu 2:13-18.
▲ E si n’Ijipt kpọpụta Mozis na “ọkpara” Jehova, bụ́ mba Izrel. E si n’Ijipt kpọpụta Jizọs dị ka Ọkpara Chineke.—Ọpụpụ 4:22, 23; Hosea 11:1; Matiu 2:15, 19-21.
▲ Mozis na Jizọs buchara ọnụ ụbọchị 40 n’ọzara.—Ọpụpụ 34:28; Matiu 4:1, 2.
▲ Mozis na Jizọs dịchara nwayọọ na obi umeala n’ụzọ na-enweghị atụ.—Ọnụ Ọgụgụ 12:3; Matiu 11:28-30.
▲ Ma Mozis ma Jizọs rụrụ ọrụ ebube.—Ọpụpụ 14:21-31; Abụ Ọma 78:12-54; Matiu 11:5; Mak 5:38-43; Luk 7:11-15, 18-23.
▲ Ma Mozis ma Jizọs jechara ozi dị ka ndị ogbugbo nke ọgbụgba ndụ n’etiti Chineke na ndị Ya.—Ọpụpụ 24:3-8; 1 Timoti 2:5, 6; Ndị Hibru 8:10-13; 12:24.
[Foto ndị dị na peeji nke 10, 11]
Ọ bụ nanị Jizọs bụ onye amụma nke dịrị n’ezie ka Mozis
[Foto dị na peeji nke 12]
Ụkpụrụ ịdị ọcha ndị a kụziri n’Iwu Mozis pụrụ inyere anyị aka igbochi ọrịa