Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ọ̀ Bụ Nanị Iji Dị Mma n’Anya?

Ọ̀ Bụ Nanị Iji Dị Mma n’Anya?

Ọ̀ Bụ Nanị Iji Dị Mma n’Anya?

SITE N’AKA ONYE EDEMEDE TETA! NA SPEN

Ị̀ CHỌPỤTATỤWO na o yiri ka nnụnụ hà na-eji oge dị ukwuu atụchasị onwe ha? Ruo ọtụtụ awa kwa ụbọchị, ọ na-eyi ka ọ dịghị ihe ọzọ ha ji oge ha eme ma ọ́ bụghị ifeghasị ábụ́bà ha. Ma hà bụ icheoku ma ọ bụ okwolo, nza ma ọ bụ alinirene, ha nile na-emecha ihe a kwa ụbọchị. N’ihi gịnị? Ọ̀ bụ nanị iji hụ na ha dị mma n’anya?

Ha nwere n’ezie ihe karịrị nke ahụ mere ha ji eme ya. Ọ dị nnụnụ mkpa ịtụchasị onwe ha otú a, dị nnọọ ka o si dị mkpa ka a na-edozi ụgbọelu nke ọma. N’ezie, ábụ́bà nnụnụ ịnọgide na-adị n’ọnọdụ dị nnọọ mma bụ ihe metụtara ọnwụ na ndụ. Ábụ́bà ha na-esekasịkarị, ịtụchakwa ha abụghị nanị na ọ na-eme ka ha dị ọcha ma gharakwa inwe ụmụ nje, kamakwa ọ na-eme ka ha dị mma maka ife efe.

Ihe ndị ha na-eme kwa ụbọchị iji dị mma n’anya na-agụnye “ịrachi” ábụ́bà ha ndị ọ pụrụ ịbụwo na ha jagasịrị ajagasị. Mgbe ábụ́bà ya rachiri nke ọma, ọ na-aka eme ka nnụnụ nwee ike ifeli elu. “E nwere ụdị ábụ́bà abụọ ndị chọrọ nlebara anya pụrụ iche,”

ka akwụkwọ bụ́ Book of British Birds na-akọwa, “ábụ́bà ndị e ji efe efe bụ́ ndị dị na nku na ábụ́bà ndị e ji atụgharị n’elu bụ́ ndị dị n’ọdụ.”

Nnụnụ na-anọkwa n’ọgụ na mgba mgbe nile iji hụ na ụmụ nje adịghị ha n’ahụ́. Tụkwasị n’ime ka nnụnụ daa ọrịa, ụmụ nje na-erichasị ábụ́bà nnụnụ. Ndị ọkà mmụta ihe ndị si n’okike achọpụtawo na nnụnụ ndị ọnụ ha nwere nsogbu apụghị ịtụchasị onwe ha nke ọma, n’ihi ya kwa, ha na-enwe nje ndị na-adị n’ábụ́bà karịa nnụnụ ndị ọnụ ha dị mma. Iji mee ka ha nwee ike iwepụ nje n’ahụ́ ha ngwa ngwa, ụdị nnụnụ ụfọdụ ọbụna na-eji ụmụ ahụhụ ekpuchi onwe ha, bụ́ ndị ọnụ mmiri ha yiri ka hà na-arụ ọrụ nke ọma dị ka ọgwụ nje.

N’ikpeazụ, ọ dị mkpa ite ábụ́bà ndị ahụ mmanụ. Maka nnụnụ mmiri, mmanụ dị n’ábụ́bà ha na-eme ka mmiri ghara ịba ha ahụ́, nnụnụ nile na-enwetakwa nchebe ka mma pụọ n’ọnọdụ ihu igwe ma ọ bụrụ na mmanụ dị n’ábụ́bà ha nke ọma. Olee ebe ha si enweta mmanụ ahụ? Ọ bụ n’otu ebe pụrụ iche nke na-emepụta mmanụ, bụ́ nke dị nnọọ nso n’ebe ọdụ ha malitere. Ọ na-emepụta mmanụ na wax, bụ́ nke ihe àmà na-egosi na nnụnụ na-eji ndidi atụrụ ma na-ete n’ábụ́bà ha. Ọzọkwa, a bịa na nke a, ha na-elebara ábụ́bà ndị ha ji efe efe anya n’ụzọ pụrụ iche.

Ya mere, ọ dịghị anyị mkpa ilewe nnụnụ anya na ọ na-egbu oge ya mgbe ọ na-atụchasị ábụ́bà ya. N’eziokwu, ọ na-enyere nnụnụ aka ịdị mma n’anya, ma ọ na-emekwa ka o nwee ezi ahụ́ ike. N’ụwa ụmụ nnụnụ, ịtụchasị onwe onye bụ ihe a ga-emerịrị iji dị ndụ.

[Foto dị na peeji nke 24]

Site n’ịtụchasị onwe ha, nnụnụ na-eme ka ábụ́bà ha rachie

[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 23]

Cortesía del Zoo de la Casa de Campo, Madrid

[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 24]

Okwolo: Foto nke: Loro Parque, Puerto de la Cruz, Tenerife; icheoku: Cortesía del Zoo de la Casa de Campo, Madrid