Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ebe Ọrụ Ka Ọ̀ Bụ Ọgbọ Agha?

Ebe Ọrụ Ka Ọ̀ Bụ Ọgbọ Agha?

Ebe Ọrụ Ka Ọ̀ Bụ Ọgbọ Agha?

SITE N’AKA ONYE EDEMEDE TETA! NA GERMANY

“Apụghịzi m ịnọ nnọọ na-edi ya. Arụrụ m ọrụ n’ụlọ ọrụ ahụ ruo ihe karịrị afọ 30. Eruru m n’ọkwá onye nlekọta ọrụ. Mgbe ahụ, e zite onyeisi ọhụrụ. Ọ ka bụ nwa okorobịa, gbasie ike, ma bụrụ onye ụbụrụ na-aghọ nkọ. O chere na m na-aghanyere ya ájá na garị, n’ihi ya, ọ malitere imekpọ m ọnụ. Mgbe m diri mkparị, ebubo ụgha, na mweda n’ala ruo ọtụtụ ọnwa, abịara m nwee nkụda mmụọ. Mgbe ụlọ ọrụ ahụ kwụrụ m ụgwọ maka ịla ezumike nká, ekwere m ịla.”—Peter. *

P ETER bụ onye e mekpọrọ ọnụ n’ebe ọrụ. Na Germany, bụ́ ebe Peter bi, a na-eme atụmatụ na nde mmadụ 1.2 bụ ndị a na-emekpọ ọnụ n’ebe ọrụ. Na Netherlands, 1 onye n’ime mmadụ 4 ọ bụla ga-abụ ndị a ga-emekpọ ọnụ n’oge ụfọdụ ná ndụ ha dị ka ndị ọrụ. Akụkọ e sikwa n’aka Òtù Mba Ụwa nke Na-ahụ Maka Ọrụ nweta na-ekwu na mmekpọ ọnụ bụ nsogbu na-arịwanye elu n’Australia, Austria, Britain, Denmark, Sweden, na United States. Gịnịdị bụ mmekpọ ọnụ ahụ?

‘Agha A Na-alụso Uche’

Dị ka magazin na-ebu akụkọ na Germany bụ́ Focus si kwuo, ụdị mmekpọ ọnụ ahụ bụ “mmaja a majara mmadụ ugboro ugboro n’esepụghị aka.” N’ịbụ nke karịrị ịma njakịrị n’ebe ọrụ—bụ́ nke pụrụ ịgụnye okwu mkparị, nkatọ, ịkọ ọnụ, na iji mmadụ eme ihe ọchị—ụdị mmekpọ ọnụ a bụ ihe a na-akpachara anya eme iji yie mmadụ egwu. Nzube e ji eme ya bụ iji mee ka onye ahụ bụrụ onye a jụrụ ajụ. *

Ụzọ ndị e si eme mmaja na-agụnye site n’ịchọ okwu dị ka ụmụaka gaa n’imerụ mmadụ ahụ́ n’ụzọ ime mpụ. A na-emebi aha onye dị otú ahụ, na-akparị ya, na-emesokwa ya ihe ike, ma ọ bụ ọbụna na-ajụ ịtụpụrụ ya ọnụ. A na-akpachara anya eme ka ụfọdụ ndị a na-emegbu na-arụgbu onwe ha n’ọrụ ma ọ bụkwanụ na-enye ha mgbe nile, ọrụ kasị taa akpụ nke ọ na-adịghị onye ọzọ chọrọ ịrụ ya. Ndị ọrụ ibe ya pụrụ ime ka mgbalị ndị ọ na-eme ịrụpụta ihe kụọ afọ n’ala, ikekwe site n’ịjụ inye ya ihe ọmụma ndị kwesịrịnụ. N’ọnọdụ ụfọdụ, ndị na-emekpọ mmadụ ọnụ achapuwo taya ụgbọala ya ma ọ bụ bibie ihe na kọmputa ya.

Ụfọdụ bụ ndị otu onye na-amaja. Ma mgbe mgbe, ụfọdụ ndị na-abụkarị ndị ọtụtụ n’ime ndị ọrụ ibe mmadụ na-agbakọta aka amaja.

Ikekwe, ihe kasị eju anya bụ na, n’ọtụtụ ọnọdụ, onyeisi na-akwado ka a na-amaja onye ọrụ. Ná nnyocha ụfọdụ e mere na Europe, onye nlekọta ọrụ keere òkè dị ukwuu n’ihe dị ka pasent 50 nke ndị e mekpọrọ ọnụ, mgbe mgbe kwa, ọ bụdị nanị ya na-eweta mmekpọ ọnụ ahụ. Ihe a nile na-eme ka ahụmahụ a na-enwe n’ebe ọrụ ghọọ nke akwụkwọ akụkọ a na-ebipụta kwa ụbọchị na Germany bụ́ Frankfurter Allgemeine Zeitung kọwara dị ka “agha tara akpụ a na-alụte aka, bụ́ nke a na-alụso uche.”

Mmetụta Ya Abụghị Nanị n’Ebe Ọrụ

Mgbe mgbe, ọ dịghị abụ nanị n’ebe ọrụ ka mmetụta nke mmaja na-ejedebe. Ọtụtụ ndị a na-amaja na-enwe ajọ nsogbu ahụ́ ike n’ihi mmeso obi ọjọọ. Ịda mbà n’obi, nsogbu ihi ụra, na obi mmapụ so n’ihe ndị mmaja na-akpata. Gịnị banyere Peter, bụ́ onye a kpọtụrụ aha ná mmalite? Ọ ghọrọ onye na-enweghịzi ùgwù onwe onye. Otu nwanyị aha ya bụ Margaret, onye sikwa Germany, ka dọkịta ya gwara ka ọ gaa nara ọgwụgwọ n’ụlọ ọgwụ na-ahụ maka ọrịa uche. N’ihi gịnị? N’ihi mmaja a na-amaja ya n’ebe ọrụ. Mmekpọ ọnụ pụkwara imetụta alụmdi na nwunye ma ọ bụ ndụ ezinụlọ nke mmadụ n’ụzọ dị oké njọ.

Na Germany, ịmaja mmadụ n’ebe ọrụ aghọwo ihe a na-ahụkarị nnọọ nke na otu ụlọ ọrụ inshọransị nke na-ahụ maka ahụ́ ike ewepụtala nọmba fon bụ́ nke ndị a na-emekpọ ọnụ pụrụ ịkpọ iji nweta enyemaka. Ụlọ ọrụ ahụ chọpụtara na ihe karịrị ọkara nke ndị kpọrọnụ arụlighị ọrụ ruo izu isii, ihe dị ka otu ụzọ n’ụzọ atọ arụlighị ọrụ ruo ọnwa atọ, ihe karịkwara pasent 10 arụlighị ọrụ ruo ihe karịrị ọnwa atọ. Otu akwụkwọ ahụ́ ike a na-ebipụta na Germany na-eme atụmatụ na “mmekpọ ọnụ na-akpata ihe ruru pasent 20 nke igbu onwe onye.”

N’ụzọ doro anya, mmaja pụrụ ime ka ebe ọrụ bụrụ ebe na-emenye ụjọ. Ọ̀ dị ụzọ ọ bụla a pụrụ isi gbochie ya? Olee otú a pụrụ isi chụsoo udo n’ebe ọrụ?

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 3 A gbanwewo aha ndị dị n’usoro isiokwu ndị a.

^ par. 6 Ihe ndekọ ndị e nwere na-egosi na ọnụ ọgụgụ ụmụ nwanyị a na-amaja n’ebe ọrụ karịrị nke ụmụ nwoke, ọ bụ ezie na nke a pụrụ ịbụ n’ihi na o yikarịrị ka ụmụ nwanyị hà na-aka ekwupụta nsogbu ahụ ma na-achọ enyemaka.

[Foto ndị dị na peeji nke 4]

Mmaja na-eme ka ọrụ ghọọ agha a na-alụso uche