Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gịnị Banyere Klọb Ịgba Egwú nke Ndị Ntorobịa?

Gịnị Banyere Klọb Ịgba Egwú nke Ndị Ntorobịa?

Ndị Na-eto Eto Na-ajụ Sị . . .

Gịnị Banyere Klọb Ịgba Egwú nke Ndị Ntorobịa?

“E nwere ihe mere m ji gaa—ikpori nnọọ ndụ.”—Shawn.

“Aghaghị m ikwu eziokwu, ọ dị ụtọ—ọ tọgburu nnọọ onwe ya! Anyị gbagidere egwú, gbagide egwú ruo chi ọbụbọ.”—Ernest.

KLỌB ịgba egwú nke ndị ntorobịa aghọwo nnọọ ihe na-ewu ewu n’afọ ndị na-adịbeghị anya. Ọtụtụ ndị ntorobịa bụ́ ndị na-achọ ebe ha ga-ekpori ndụ na-agakarị klọb ịgba egwú ndị dị otú ahụ.

N’eziokwu, anyị nile na-enwe mmasị n’ikpori ndụ. Bible na-ekwukwa na e nwere “mgbe ịchị ọchị” nakwa ọbụna “mgbe ite egwú.” (Eklisiastis 3:4) Otú ọ dị, à pụrụ inwe ntụrụndụ na-ewuli elu na klọb ịgba egwú nke ndị ntorobịa? Ka è nwere ezi ihe mere mmadụ ga-eji chesie echiche ike tupu ọ̀ gaa ya?

“Oriri A Na-achịkwaghị Achịkwa”

Ọ bụ ezie na Bible akatọghị nnọkọ ntụrụndụ há otú dị mma, ọ na-adọ aka ná ntị megide “oriri oké mkpọtụ,” ma ọ bụ “oriri a na-achịkwaghị achịkwa.” (Ndị Galeshịa 5:19-21; Byington) N’oge Bible, oriri oké mkpọtụ na-akpatakarị ịkpa àgwà n’ụzọ a na-achịkwaghị achịkwa. Aịzaịa onye amụma dere, sị: “Ahụhụ ga-adịrị ndị na-ebili n’isi ụtụtụ ịgbaso ihe ọṅụṅụ na-aba n’anya; ndị na-anọ ogologo mgbe n’anyasị, mmanya vaịn ewee mee ka ahụ́ nwuru ha ọkụ. Ụbọ akwara na une na egwú otiti na ọ̀jà na mmanya vaịn dịkwa n’ọṅụṅụ mmanya vaịn ha nile: ma ha adịghị elegide ọrụ Jehova anya.”—Aịsaịa 5:11, 12.

Ná nnọkọ ndị a, a na-aṅụ “ihe ọṅụṅụ na-aba n’anya,” na-akụkwa egwú aghara. Ha na-amalite n’isi ụtụtụ nọgide ruo mgbede. Rịbakwa àgwà nke ndị mere oriri oké mkpọtụ ahụ ama—ha kpara àgwà ka à ga-asị na Chineke adịghị! Ka a sịkwa ihe mere Chineke ji katọọ nnọkọ ndị dị otú ahụ. Otú ọ dị, olee otú Chineke si ele ihe ndị a na-eme n’ọtụtụ klọb ịgba egwú nke ndị ntorobịa taa anya?

Tụlee ihe ndị bụ́ eziokwu. Otu ihe bụ na, na klọb egwú ụfọdụ, a na-anọgide na-agba ụdị egwú na-akpali ime ihe ike. Otu akwụkwọ na-ekwu na ụdị ịgba egwú a “malitere n’etiti afọ ndị 1980 n’oge e nwesịrị klọb ndị ntorobịa a kpọrọ punk na United States. Ọ malitere dị ka ‘ịgba egwú ịkwa nku’ bụ́ nke ndị na-agba ya na-eburu onwe ha kwagide ibe ha.” Ụdị ịgba egwú a na-agụnye ịwụli elu, iji ike na-efufe isi, na ịsọ mpi ka ụmụ anụmanụ, nakwa iburu onwe onye na-akwagide ndị ọzọ na-agba egwú. Ndị mmadụ na-agbajikarị aka na ụkwụ ma ọ bụ na-enwe mmerụ ahụ́ ndị ọzọ, e nwewokwa ndị merụrụ ahụ́ n’ọkpụkpụ azụ nakwa n’isi. E nwewo ọbụna ndị nwụrụ na ya. Tụkwasị na nke ahụ, na klọb ụfọdụ, ìgwè mmadụ na-ebuli otu onye elu, mee ka o dinara n’elu aka ha weliri elu, ma na-ebugharị ya site n’aka otu ndị gaa n’ọzọ, dị ka à ga-asị na ọ na-agba n’elu ebili mmiri. Ọtụtụ ndị e buru otú ahụ adawo, merụọ ahụ́. Ọ bụghị ihe ọhụrụ ụmụ agbọghọ ịbụ ndị a pịrị aka ma ọ bụ kpaa aka n’ahụ́ n’ụzọ ndị na-ekwesịghị ekwesị.

N’ụzọ doro anya, Chineke na-akatọ àgwà ndị dị otú ahụ. E kwuwerị, Okwu ya na-enye Ndị Kraịst iwu “ịjụ asọpụrụghị Chineke na ọchịchọ nke ụwa na ibi ndụ n’uche zuru okè.”—Taịtọs 2:12.

Egwú na Ọgwụ

Tụleekwa ụdị egwú ndị a na-akụ n’ihe kasịnụ na klọb ịgba egwú ndị ahụ. Ụfọdụ na-abụ ọkà n’ụdị egwú rock ndị na-ada oké ụda bụ́ ndị e ji ụda kpum kpum na okwu ndị rere ure mara. Ma n’ọtụtụ klọb, egwú rap ma ọ bụ egwú a na-eyi uwe awantịrọ akụ, bụ ihe na-ewu ewu. Ọ bụkwa egwú a na-ejikarị mmekọahụ, ime ihe ike, na nnupụisi amara. Ịnọ n’ebe na-adịghị mma agba ụdị egwú ndị dị otú ahụ ọ̀ pụrụ inwe mmetụta n’ahụ́ gị? David Hollingworth, bụ́ onye na-enye ndị nwere ụlọ oriri na nkwari abalị ndụmọdụ, kwuru, sị: “Egwú na-enwe mmetụta dị ukwuu n’uche ndị mmadụ. Mgbe ị kpọnyere ya n’ebe ìgwè mmadụ nọ, ọ pụrụ ime ka ha kpawa àgwà ike ike.” Ọ bụghị ihe ijuanya na e mewo ihe ike na klọb ịgba egwú nke ndị ntorobịa n’ọtụtụ obodo ndị dị na United States. Ọtụtụ ndị na-eche na ọ bụ egwú ndị na-akwalite omume rụrụ arụ na ime ihe ike kpatara ya kpọmkwem. *

N’afọ ndị na-adịbeghị anya gara aga, iji ọgwụ eme ihe bụzi otu n’ime ihe ndị a na-eme na klọb ịgba egwú nke ndị ntorobịa. Otu onye nnyocha kwuru na “e kwuwo na ọ bụ onwunwe e nwere ụdị dị iche iche nke ọgwụ ọjọọ, na ojiji e ji ha eme ihe . . . na-eme ka klọb egwú na-ewu ewu.” N’eziokwu, e nwere ọgwụ ndị a na-akpọkarị ọgwụ ịgba egwú. Ụfọdụ ndị na-ejekarị klọb ịgba egwú na-ejikarị ọbụna ọgwụ ndị a gwakọtara agwakọta eme ihe. Otu n’ime ọgwụ ndị a kasị agwakọta bụ ketamine (nke a na-akpọkwa K nke pụrụ iche), bụ́ nke pụrụ ịkpata uche mkpasasị, nsogbu iku ume, na mbibi akwara. Ọgwụ bụ́ Methamphetamine pụrụ ịkpata mmadụ ịdị na-echezọ ihe, ime ihe ara ara, ime ihe ike, na ma eleghị anya mmebi nke akwara ozi na obi. Nke na-ewu ewu karịsịa bụ ọgwụ e si na amphetamine nweta, nke a na-akpọ ecstasy. Ọ pụrụ ime ka mmadụ na-enwe mgbagwoju anya, nchekasị, obi ịkụsi ike, ọbara mgbali elu, na oké ahụ́ ọkụ. Ọbụna ụfọdụ ndị na-eji ọgwụ bụ́ ecstasy eme ihe anwụwo.

Iji ọgwụ ọjọọ eme ihe na-emegide iwu Bible bụ́ ka anyị “sachapụ onwe anyị mmerụ ọ bụla nke anụ ahụ́ na mmụọ.” (2 Ndị Kọrint 7:1) Ọ̀ bụ ihe amamihe dị na ya ịnọ n’ebe e ji ọgwụ eme ihe aghara aghara?

Mkpakọrịta Ọjọọ

Cheta ịdọ aka ná ntị ahụ a na-ehotakarị: “Mkpakọrịta ọjọọ na-emebi àgwà bara uru.” (1 Ndị Kọrint 15:33) Dịkwa ka ọ dị n’ebe ndị mere oriri oké mkpọtụ n’oge Bible nọ, ihe ka ọtụtụ ná ndị ntorobịa bụ́ ndị na-ejekarị klọb ịgba egwú eyighị ka hà na-eche banyere ime ihe na-atọ Chineke ụtọ. N’eziokwu, a pụrụ ịkọwa ihe ka n’ọnụ ọgụgụ n’ime ha dị ka “ndị hụrụ ihe ụtọ n’anya kama ịbụ ndị hụrụ Chineke n’anya.” (2 Timoti 3:4) Ị̀ chọrọ n’ezie ka gị na ìgwè ndị dị otú ahụ na-akpachi anya?

Ụfọdụ pụrụ iche na ha na ndị ntorobịa ndị ọzọ bụ́ Ndị Kraịst iso na-aga klọb egwú na-ebelata ihe ize ndụ ndị dị na ya. Otú ọ dị, ndị ntorobịa bụ́ Ndị Kraịst, ndị bụ́ n’ezie “ihe nlereanya nye ndị na-ekwesị ntụkwasị obi . . . n’omume,” agaghị nnọọ enwe mmasị ịga. (1 Timoti 4:12) Ọ bụrụgodị na ìgwè ndị na-eto eto bụ́ Ndị Kraịst ejee klọb ịgba egwú ma jisie nnọọ ike nọkọta ọnụ, a ga-enwerịrị egwú rụrụ arụ nakwa gburugburu ebe rụrụ arụ. A pụrụ itinye ha n’ọnọdụ tara akpụ ma ọ bụrụ na ndị ọzọ akpọọ ha iso ha gbaa egwú. Ọbụna ụfọdụ ndị ntorobịa esonyewo n’ịlụ ọgụ n’ebe ndị dị otú ahụ! Lee nnọọ ka okwu Bible si bụrụ eziokwu: “Na-ejeso ndị maara ihe, ị ga-amakwa ihe: ma enyi ndị nzuzu ka a ga-emejọ.”—Ilu 13:20.

Ịgba Egwú Ndị Na-akpali Agụụ Mmekọahụ

Ihe ọzọ a ga-atụle bụ otú e si agba egwú ahụ n’onwe ya. Ịgba egwú n’ụzọ gbapụrụ nnọọ iche aghọwo ihe na-ewu ewu, karịsịa n’etiti ndị nọ n’afọ iri na ụma na United States. Dị ka ọ na-adịkarị, ọ bụ egwú rap nke a na-ejikarị okwu ndị na-akpali agụụ mmekọahụ e kwuru n’ezoghị ọnụ eme ihe na ya, ka a na-esi otú ahụ agba. Ọzọkwa, ụzọ e si agba egwú ahụ n’onwe ya na-adị ka ebe a na-enwe mmekọahụ. N’ihi ya, a kọwawo ụzọ e si emegharị ahụ́ ma a na-agba ụdị egwú a dị ka ‘iyi uwe enwe mmekọahụ.’

Onye ntorobịa bụ́ Onye Kraịst, ọ̀ ga-achọ ikere òkè n’ụdị ịgba egwú a? Ọ gaghị achọ ma ọ bụrụ na ọ chọrọ ime ihe na-atọ Chineke ụtọ, bụ́ onye na-enye anyị iwu ‘ịgbanahụ ịkwa iko.’ (1 Ndị Kọrint 6:18) Ụfọdụ ndị pụrụ iche, sị, ‘Ọ bụrụ na mmadụ nile na-eme ya, ọ gaghị adịcha njọ nke otú ahụ.’ Otú ọ dị, ìgwè mmadụ pụrụ ime ihe na-adịghị mma. (Ọpụpụ 23:2) Nwee obi ike iguzogide ndị ọgbọ gị ma nọgide na-enwe ezi akọ na uche n’ihu Chineke!—1 Pita 4:3, 4.

Ime Mkpebi Ahụ

Nke a apụtaghị na ụdị ịgba egwú nile dị njọ. Bible na-agwa anyị na mgbe Eze Devid bugotasịrị igbe ọgbụgba ndụ ahụ dị nsọ na Jeruselem, o nwere ọṅụ dị ukwuu nke na o weere “ike ya nile . . . tee egwú.” (2 Samuel 6:14) N’ilu Jizọs banyere nwa mmefu, “egwú otiti na ịgba egwú” so n’ihe ndị e mere iji gosipụta ọṅụ e nwere n’ihi nlọta nwa ahụ lọtara.—Luk 15:25.

N’otu aka ahụ, ụdị egwú ụfọdụ a na-agba n’ógbè gị pụrụ ịdị mma nye Ndị Kraịst. Ọbụnakwa na nke ahụ, ọ dị mkpa imeru ihe n’ókè na inwe ezi uche. Ọ dị nnọọ nchebe karị ịkụ egwú na ịgba egwú ná nnọkọ Ndị Kraịst bụ́ ebe e nwere nchịkwa na nduzi zuru ezu karịa na klọb egwú nke ndị nọ n’afọ iri na ụma. Ná nnọkọ Ndị Kraịst a haziri nnọọ nke ọma, ndị na-eto eto adịghị ekewapụ onwe ha iche, kama ọ na-adị ha ụtọ iso Ndị Kraịst nọ n’afọ ndụ dị iche iche enwe ezi mkpakọrịta.

N’eziokwu, a pụrụ inwe ebe a na-akụ ma na-agba egwú ndị dị mma n’ụfọdụ ụlọ nri dị n’ógbè gị. Ma tupu i kwere ịga ebe dị otú ahụ, i kwesịrị ịjụ ajụjụ ndị dị ka ndị a: Olee ụdị aha ebe dị otú ahụ nwere? Ọ̀ bụ nanị ndị ntorobịa na-aga ebe ahụ? Ọ̀ bụrụ otú ahụ, olee ohere e nwere na a ga-enwe ọnọdụ ndị dị mma n’ebe ahụ? Olee ụdị egwú a ga-akụ n’ebe ahụ? Olee ụdị egwú a na-agba ebe ahụ? Olee otú ndị mụrụ m ga-esi lee mụ ịga ebe ahụ anya? Ịjụ ajụjụ ndị dị otú ahụ ga-eme ka ị ghara ịba ná nsogbu.

Shawn, bụ́ onye e hotara ihe o kwuru n’elu chịkọtara ya nke ọma. Tupu ọ ghọọ Onye Kraịst, ọ naara ejekarị klọb ịgba egwú. Ọ na-echeta, sị: “A na-enwe ọtụtụ omume rụrụ arụ n’ụlọ oriri na nkwari abalị. Egwú a na-akụ n’ebe ahụ na-emerụkarị emerụ, egwú a na-agba na ya na-arụ nnọọ arụ, ihe ka ọtụtụ ná ndị na-aga n’ebe ahụ nwere nzube ha ji aga—ha chọrọ isi na klọb egwú kpọrọ onye ha na ha ga-enwe mmekọahụ.” Shawn kwụsịrị ịga klọb egwú mgbe ya na Ndịàmà Jehova mụsịrị Bible. O si n’ahụmahụ ọjọọ o nwetara na-ekwu uche ya, sị: “Klọb ndị ahụ abụghị maka Ndị Kraịst.”

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 13 Lee isiokwu bụ́ “Ihe Mere Egwú Ji Emetụta Anyị,” ná mbipụta Teta! nke October 8, 1999.

[Foto dị na peeji nke 26]

Ụfọdụ ndị ntorobịa achọtawo onwe ha n’ọnọdụ ndị na-adịghị mma na klọb ịgba egwú