Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

‘Ha Jupụtara Nnọọ n’Ihe Mmụta’

‘Ha Jupụtara Nnọọ n’Ihe Mmụta’

‘Ha Jupụtara Nnọọ n’Ihe Mmụta’

EBE a nọ kwuo okwu a banyere ihe osise ndị dị n’akwụkwọ Ndịàmà Jehova, bụ n’ihe ngosi nkà nke mba nile e mere na Kassel, Germany. Katja, bụ́ onye dị afọ 16 na-akọ ihe mere mgbe ya na ụmụ akwụkwọ ibe ya letara ihe ngosi nkà ahụ ma na-ekiri ọrụ nkà ụfọdụ nke okpukpe:

“Onye na-edugharị anyị jụrụ ụmụ akwụkwọ ahụ ma hà atụletụla magazin Ndịàmà Jehova. Mgbe mmadụ nile sịrị mba, ọ malitere ito ihe osise ndị dị n’Ụlọ Nche nakwa na Teta! O kwuru na e sere ihe osise ndị dị na ha nke ọma, ma jiri nlezianya họrọ foto ndị e ji mee ihe na ha, kwuokwa na ‘ha jupụtakwara nnọọ n’ihe mmụta.’

“Ọ gwara anyị na anyị kwesịrị iji nlezianya nyochaa ihe osise ndị a na-adọrọ adọrọ,” na-ekwu na ụzọ ọgbara ọhụrụ e si see ihe ndị a kọrọ banyere ha n’ime Bible na-eme ka ọ dị mfe ịhụ otú ha si metụta oge anyị. O wee gbaa ụmụ akwụkwọ ahụ ume ịnara magazin ndị ahụ mgbe ọ bụla e chere ha n’ihu ha, na-ekwu na ha ekwesịghị ikiri nanị ihe osise ndị dị n’ime ha, kama na ha kwesịrị ịgụ isiokwu ndị dị na ha bụ́ ndị na-enye nnọọ ihe ọmụma ma na-adọrọ mmasị.