Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Iji Nnwere Onwe Ndị Kraịst Eme Ihe n’Ụzọ Kwesịrị Ekwesị

Iji Nnwere Onwe Ndị Kraịst Eme Ihe n’Ụzọ Kwesịrị Ekwesị

Iji Nnwere Onwe Ndị Kraịst Eme Ihe n’Ụzọ Kwesịrị Ekwesị

NDỊ Kraịst e nyere ike mmụọ nsọ ide ihe, n’ịghọta nzube Chineke ji gosipụta obiọma na-erughịrị mmadụ site na Kraịst (“Otú ọ dị, ụmụnna m, a kpọrọ unu maka nnwere onwe”), dụrụ Ndị Kraịst ọdụ ugboro ugboro ichekwa nnwere onwe ha, na ịghara iji nnwere onwe ahụ mere ihe nkụgide aka ma ọ bụ ihe mgbakwasị ụkwụ maka imikpu onwe ha n’ọrụ nke anụ ahụ (Galeshia 5:13) ma ọ bụ jiri ya mere ihe mkpuchi maka ihe ọjọọ. (1 Pita 2:16) Jems kwuru banyere ‘inyonye anya n’iwu ahụ zuru okè nke dịịrị nnwere onwe’ ma mee ka ọ pụta ìhè na onye na-echefughị ihe ọ nụrụ, kama nọgide na ya dị ka onye na-eme ya eme, ga-enwe obi ụtọ.—Jems 1:25.

Pọl onyeozi nụrụ ụtọ nnwere onwe o nwetara n’aka Kraịst ma zere iji nnwere onwe ya mee ihe dị ya onwe ya mma ma ọ bụ iji ya mee ihe ruo n’ókè nke ịkpasu ndị ọzọ iwe. N’akwụkwọ ozi o degaara ọgbakọ dị na Kọrint, o gosiri na ya agaghị egbu akọ na uche nke onye ọzọ site n’ime ihe Akwụkwọ Nsọ nyere ya ohere ime ma ya abụrụ ihe onye na-enwechaghị ihe ọmụma pụrụ inyo enyo, bụ́ onye ihe Pọl mere pụrụ igbu akọ na uche ya. O hotara ihe atụ nke iri anụ a chụrụ n’àjà nye arụsị tupu e bute ya n’ahịa maka ire ya ere. Iri anụ dị otú ahụ pụrụ ime ka onye akọ na uche ya na-esighị ike katọọ Pọl banyere otú o si eji nnwere onwe ya eme ihe, ma si otú ahụ na-ekpe Pọl ikpe, bụ́ nke na-agaghị adị mma. N’ihi ya, Pọl kwuru, sị: “Gịnị mere ọ ga-eji bụrụ na akọ na uche onye ọzọ na-ekpe nnwere onwe m ikpe? Ọ bụrụ na m ji ekele na-eri, n’ihi gịnị ka a ga-eji na-ekwujọ m n’ihe ahụ nke m na-enye ekele maka ya?” Otú o sina dị, onyeozi ahụ kpebisiri ike iji nnwere onwe ya mee ihe n’ụzọ na-ewuli elu, ọ bụghị n’ụzọ na-emebi ihe.—1 Ndị Kọrint 10:23-33.