Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Mgbe Nwa Gị Na-ebe Ákwá n’Akwụsịghị Akwụsị

Mgbe Nwa Gị Na-ebe Ákwá n’Akwụsịghị Akwụsị

Mgbe Nwa Gị Na-ebe Ákwá n’Akwụsịghị Akwụsị

SITE N’AKA ONYE EDEMEDE TETA! NA CANADA

IHE onye dọkịta ahụ kwuru kwadoro ihe nne nwatakịrị ahụ burịị n’uche. Afọ na-egbu nwa ya oké mgbu. Nsogbu a na-emetụta “ihe ruru otu nwatakịrị n’ime ụmụaka anọ ọ bụla,” ka akwụkwọ akụkọ bụ́ Globe and Mail nke Canada na-ekwu. Ihe mgbaàmà nke nsogbu ahụ na-agụnye ibe ákwá ọtụtụ awa ruo ma ọ dịkarịa ala ụbọchị atọ n’izu. Olee ihe nne ma ọ bụ nna nke a na-enye nsogbu n’obi pụrụ ime? Ndị ọkà n’ọrịa ụmụaka na-ekwu na n’ọtụtụ ọnọdụ, ndị nne na nna—na nwatakịrị ahụ—enweghị ihe ọzọ ha ga-eme ma ọ́ bụghị ichere ruo mgbe nsogbu ahụ belatara. Ma ọ̀ bụ ruo oge há aṅaa?

Nnyocha ọhụrụ e mere na Canada banyere ndị nne nwere ụmụ afọ na-egbu mgbu na-egosi na ihe karịrị pasent 85 nke afọ mgbu ndị e nwere belatara ka ọ na-erule n’oge ụmụ ọhụrụ dị ọnwa atọ. Nnyocha ahụ nke Dr. Tammy Clifford, bụ́ onye ntụzi ọrụ nke ngalaba na-achịkwa mgbasa ọrịa na Children’s Hospital of Eastern Ontario Research Institute, malitere, kpughekwara na inwe nwa afọ na-egbu oké mgbu adịghị enwe mmetụta na-adịgide adịgide n’ịdị mma nke uche nne ya. “Ka ọ na-erule ọnwa isii ha mụsịrị nwa, ha na-adị kpọmkwem ka ndị nne mụrụ ụmụ ndị na-enweghị oké afọ mgbu,” ka Dr. Clifford na-ekwu. “Ọ na-afọ nke nta ka ọ dị ka hà na-echezọ ihe banyere ya mgbe nwa ha kwụsịrị ibe ákwá.”

Akwụkwọ akụkọ bụ́ Globe na-ekwu na nnyocha ọhụrụ a Dr. Clifford na ndị ọrụ ibe ya bipụtara “na-enyekwu ihe ọmụma dị mkpa nke nkà mmụta sayensị banyere afọ mgbu n’ihi na ọ na-egosi na e nwere ụdị atọ dịgasị iche iche nke ụmụaka ndị na-enwe oké afọ mgbu: ụmụaka afọ mgbu ha na-amalite ma kwụsị n’ime ọnwa atọ; ụmụaka ndị afọ mgbu ha na-adịgide ruo ọtụtụ ọnwa n’akwụsịghị akwụsị; na ọnụ ọgụgụ na-ebughị ibu nke ụmụaka ndị afọ mgbu ha na-adịghị amalite n’oge, na-amalite ọnwa ole na ole mgbe a mụsịrị ha.” E mewala nnyocha ọzọ iji chọpụta otú ụmụaka ndị nwere oké afọ mgbu na-esi eto, ọ bụkwa ìgwè nke ikpeazụ a kasị adọrọ mmasị.

E kweere na nwatakịrị ibe ákwá n’akwụsịghị akwụsị pụrụ ịbụ n’ihi na o nwere nsogbu nke na-abịa site n’ifegharị nwatakịrị efegharị. Dị ka a kọrọ na Globe, “ibe ákwá n’onwe ya agaghị emerụ nwatakịrị ahụ́, ma ifegharị nwatakịrị n’ụzọ dị njọ, ọbụnadị ruo obere oge, pụrụ ibibi usoro akwara ozi ya n’ụzọ na-adịgide adịgide, ọbụnakwa gbuo nwa ahụ.”

N’aka nke ọzọ, a pụrụ inwe abamuru dị na nwatakịrị ibe ákwá, a sịgodị na ọ bụ mgbe nile. “Nnyocha e mere egosiwo na ụmụ ọhụrụ ndị na-ebekarị ákwá na-adịkarị enweta nlebara anya nke ndị na-elekọta ha,” ka Globe na-ekwu, bụ́ nke na-eme ka a “na-emetụkwu ha aka, na-achịkwuru ha ọchị, na-ekwunyekwuru ha okwu ma na-ekukwu ha n’ahụ́.”