Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

N’ihi Gịnị Ka A Ga-eji Na-ele Alụmdi na Nwunye Anya Dị Ka Ihe Dị Nsọ?

N’ihi Gịnị Ka A Ga-eji Na-ele Alụmdi na Nwunye Anya Dị Ka Ihe Dị Nsọ?

Echiche nke Bible

N’ihi Gịnị Ka A Ga-eji Na-ele Alụmdi na Nwunye Anya Dị Ka Ihe Dị Nsọ?

IHE ka ọtụtụ ná ndị mmadụ taa ga-azọrọ ma eleghị anya na ha kweere n’ịdị nsọ nke alụmdi na nwunye. Gịnịzi mere ọtụtụ alụmdi na nwunye ji ejedebe n’ịgba alụkwaghịm? Nye ụfọdụ ndị, alụmdi na nwunye bụ nnọọ nkwa mmadụ na-ekwe onye o nwere ndọrọ mmekọahụ́ n’ahụ́ ya nakwa nkwekọrịta iwu kwadoro. Ma a pụrụ imebi nkwa ndị e kwere ekwe. Ọ na-adịrị nnọọ ndị na-ele alụmdi na nwunye anya n’ụzọ dị otú a mfe itisa alụmdi na nwunye ha mgbe ihe na-agazighị otú ha si chee ya.

Olee otú Chineke si ele ndokwa alụmdi na nwunye anya? A na-achọta azịza ya n’ime Okwu ya, bụ́ Bible, ná Ndị Hibru 13:4: “Ka alụmdi na nwunye bụrụ ihe kwesịrị nsọpụrụ n’etiti mmadụ nile.” Okwu Grik a sụgharịrị ịbụ “kwesịrị nsọpụrụ” na-enye echiche nke ihe dị oké ọnụ ahịa na ihe e ji kpọrọ nnọọ oké ihe. Mgbe anyị ji ihe kpọrọ oké ihe, anyị na-akpachapụ anya ichebe ya ka o wee ghara ifunahụ anyị, ọbụnadị na mberede. Otú ahụ ka o kwesịrị ịdị n’ihe banyere ndokwa alụmdi na nwunye. Ndị Kraịst kwesịrị ile ya anya dị ka ihe kwesịrị nsọpụrụ—dị ka ihe dị oké ọnụ ahịa nke ha ga-achọ ichebe.

N’eziokwu, Jehova Chineke mere ka alụmdi na nwunye bụrụ ndokwa dị nsọ nke dị n’etiti di na nwunye. Ma olee otú anyị pụrụ isi gosi na anyị na-ele alụmdi na nwunye anya n’ụzọ ahụ o si ele ya anya?

Ịhụnanya na Nkwanye Ùgwù

Ịsọpụrụ ndokwa alụmdi na nwunye na-achọ ka ndị di na nwunye na-asọpụrụ ibe ha. (Ndị Rom 12:10) Pọl onyeozi degaara Ndị Kraịst narị afọ mbụ akwụkwọ, sị: “Ka onye ọ bụla n’ime unu n’otu n’otu sikwa otú ahụ hụ nwunye ya n’anya dị ka o si hụ onwe ya n’anya; n’aka nke ọzọ, onye bụ́ nwunye kwesịrị inwe nkwanye ùgwù miri emi maka di ya.”—Ndị Efesọs 5:33.

N’eziokwu, mgbe ụfọdụ, di ma ọ bụ nwunye nwere ike ghara iji ịhụnanya ma ọ bụ nkwanye ùgwù kasịnụ mee ihe. N’agbanyeghị nke ahụ, Ndị Kraịst aghaghị igosipụta ịhụnanya na nkwanye ùgwù dị otú ahụ. Pọl dere, sị: “Nọgidenụ na-anagiderịta ibe unu ma na-agbaghara ibe unu kpam kpam ma ọ bụrụ na onye ọ bụla nwere ihe mere ọ ga-eji mee mkpesa megide ibe ya. Ọbụna dị ka Jehova gbaghaara unu kpam kpam, na-emekwanụ otú ahụ.”—Ndị Kọlọsi 3:13.

Oge na Nlebara Anya

Ndị di na nwunye, bụ́ ndị na-ele alụmdi na nwunye ha anya dị ka ihe dị nsọ na-ewepụta oge iji mezuo mkpa na-akpa ibe ha n’anụ ahụ́ nakwa n’uche. Nke a na-agụnye ihe banyere mmekọahụ. Bible na-ekwu, sị: “Ka di na-enye nwunye ya ihe ruuru ya; ma ka nwunye na-emekwara di ya otú ahụ.”—1 Ndị Kọrint 7:3.

Otú ọ dị, ụfọdụ di na nwunye ahụwo mkpa ọ dị ka di gaa biri n’ebe ọzọ ruo nwa oge iji kpatakwuo ego. Mgbe ụfọdụ, ibi iche iche otú ahụ na-adịte aka karịa otú a tụrụ anya ya. Mgbe mgbe, ibigasị iche iche otú ahụ na-etinye alụmdi na nwunye n’ọnọdụ dị njọ, mgbe ụfọdụ na-eduga di ma ọ bụ nwunye n’ịkwa iko nakwa n’ịgba alụkwaghịm. (1 Ndị Kọrint 7:2, 5) N’ihi nke ahụ, ọtụtụ ndị di na nwunye bụ́ Ndị Kraịst ekpebiwo ịhapụ uru ihe onwunwe ndị ha gaara erite kama itinye alụmdi na nwunye ha, nke ha weere dị ka ihe dị nsọ, n’ihe ize ndụ.

Mgbe Nsogbu Bilitere

Mgbe nsogbu bilitere, Ndị Kraịst, bụ́ ndị na-asọpụrụ alụmdi na nwunye ha, adịghị agbara ngwa ngwa kewaa ma ọ bụ gbaa alụkwaghịm. (Malakaị 2:16; 1 Ndị Kọrint 7:10, 11) Jizọs kwuru, sị: “Onye ọ bụla nke na-agba nwunye ya alụkwaghịm, ma ọ́ bụghị n’ihi ịkwa iko, na-eme ya ka ọ bụrụ onye nwere ike ịdaba n’ịkwa iko, onye ọ bụla nke lụkwara nwanyị a gbara alụkwaghịm na-akwa iko.” (Matiu 5:32) Di ma ọ bụ nwunye ịhọrọ ịgba alụkwaghịm ma ọ bụ nkewa n’ụzọ Akwụkwọ Nsọ na-akwadoghị na-eme ka alụmdi na nwunye ghara ịbụ ihe kwesịrị nsọpụrụ.

A na-esikwa na ndụmọdụ anyị na-enye ndị nwere nnukwu nsogbu alụmdi na nwunye ahụ otú anyị si ele alụmdi na nwunye anya. Ànyị na-adị ngwa n’ịtụ aro ka ha kewaa ma ọ bụ gbaa alụkwaghịm? N’eziokwu, mgbe ụfọdụ, a pụrụ inwe ezi ihe mere a ga-eji kewaa, dị ka mgbe di na-eti nwunye ya ihe n’ụzọ gabigara oké ma ọ bụ di ịma ụma jụ inye nkwado. * Ọzọkwa, dị ka e kwuru n’elu, Bible nyere ohere maka ịgba alụkwaghịm nanị mgbe di ma ọ bụ nwunye kwara iko. N’agbanyeghị nke ahụ, Ndị Kraịst ekwesịghị, n’ụzọ na-enweghị isi, ịdị na-agwa ndị ọzọ nọ n’ọnọdụ dị otú ahụ ihe ha ga-ekpebi. E kwuwerị, ọ bụ onye ahụ nwere nsogbu alụmdi na nwunye—ọ bụghị onye na-enye ya ndụmọdụ—ka ihe ndị ga-esi ná mkpebi ahụ pụta ga-adị n’isi.—Ndị Galeshịa 6:5, 7.

Zere Echiche nke Ọ Gbasaghị M

N’ebe ụfọdụ, ọ ghọwo ihe a na-ahụkarị bụ ụfọdụ mmadụ isi n’alụmdi na nwunye nweta nkwado iwu ibi ná mba ọzọ. Otú a na-esikarị eme ya bụ na onye dị otú ahụ na-ekwe ịkwụ nwa amaala nke mba ahụ ụgwọ iji lụọ ya. Mgbe mgbe, ndị a, ọ bụ ezie na ha alụwo di na nwunye, adịghị ebikọta ọnụ, ikekwe ha adịtụghị enwe ọbụna mmekọrịta enyi na enyi. Ngwa ngwa ha nwetasịrị ihe ahụ ha na-achọ, ha na-agba alụkwaghịm. Ha na-ele alụmdi na nwunye ha anya dị ka nkwekọrịta azụmahịa nkịtị.

Bible adịghị akwado echiche ọ gbasaghị m dị otú ahụ. Ihe ọ sọrọ ya bụrụ ebumnobi ha, ndị lụrụ di na nwunye na-abanye ná ndokwa dị nsọ nke Chineke weere dị ka nke ga-adịgide ruo ogologo ndụ ha nile. Iwu ka kegidere ndị mere nkwekọrịta dị otú ahụ dị ka di na nwunye, ha apụghị ịlụgharị di ma ọ bụ nwunye n’abụghị n’ụzọ Bible kwadoro maka ịgba alụkwaghịm.—Matiu 19:5, 6, 9.

Di nnọọ ka ọ dị n’ihe ọ bụla ọzọ bara uru, alụmdi na nwunye nke nwere ihe ịga nke ọma na-achọ mgbalị na nnọgidesi ike. Ndị hapụrụ ile ya anya dị ka ihe dị nsọ na-esikarị na ya apụta ngwa ngwa. Ma ọ bụkwanụ ha pụrụ iwere ya na ọ dịghịzi ihe ọzọ ha pụrụ ime ma ọ́ bụghị ịnọgide n’alụmdi na nwunye obi ụtọ na-adịghị na ya. N’aka nke ọzọ, ndị weere alụmdi na nwunye dị ka ihe dị nsọ maara na Chineke na-atụ ha anya n’aka ibikọta ọnụ. (Jenesis 2:24) Ha na-aghọtakwa na site n’ịgbakọ aka mee ka alụmdi na nwunye ha na-aga nke ọma, ha na-asọpụrụ ya dị ka Onye guzobere ndokwa alụmdi na nwunye. (1 Ndị Kọrint 10:31) Inwe echiche a na-akpali ha ịnọgidesi ike na ịrụ ọrụ iji hụ na ha nwere ihe ịga nke ọma n’alụmdi na nwunye ha.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 14 Lee Ụlọ Nche, November 1, 1988, peeji nke 22-23.