Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Okwukwe nke Otu Ezinụlọ n’Okpuru Ihe Isi Ike

Okwukwe nke Otu Ezinụlọ n’Okpuru Ihe Isi Ike

Okwukwe nke Otu Ezinụlọ n’Okpuru Ihe Isi Ike

INDIA, bụ́ ọmarịcha nwatakịrị nwanyị dị afọ itoolu, nke si Wisconsin, United States, arịawo ọtụtụ ọrịa. N’ezie, a waworị ya ahụ́ siri ike ugboro atọ, waakwa ya ahụ́ ndị na-esichaghị ike ọtụtụ ugboro. “Ruo afọ isii,” ka nne ya, bụ́ Lori, na-ekwu, “ma ọ́ bụghị na India nọ n’ọnụ ụlọ ọnọdụ mberede nke ụlọ ọgwụ, ọ bụrụ na e nyere ya àkwà n’ụlọ ọgwụ, ma ọ bụkwanụ na a kpọ ya na-aga ahụ dọkịta.”

Ihe a nile malitere mgbe India dị ọnwa 18. Ọ malitere inwe ihe mgbaàmà ndị a na-adịghị ahụkebe, gụnyere afọ ọsịsa na-ekweghị ala ala, oké ahụ́ ọkụ, afọ okuko, na ịta ahụ́. Afọ na-egbukwa ya mgbu. Kwa abalị ruo afọ abụọ, obere nwa bụ́ India na-eteta n’ụra ugboro ugboro na-ebe ákwá, na-asụ udè, nakwa ọbụna na-eti mkpu mgbe ụfọdụ n’ihi ihe mgbu.

Ka ndị dọkịta nọ na-achọ ịmata ihe bụ́ nsogbu ya, India nọgidere na-ahụsi anya. “Nri ekweghị nwa anyị oriri ruo n’ókè nke na agụụ chọrọ igbu ya,” ka Lori na-ekwu. “Ruo ihe karịrị otu afọ,” ka Mark, bụ́ nna India na-ekwu, “anyị nọ na-ekiri obere nwa anyị nwanyị ka ọ nọ na-amịkpọ, anyị amaghịkwa otú anyị ga-esi nyere ya aka. Echetara m otu abalị m nwere nnọọ mmetụta nke ịbụ onye na-enweghịzi enyemaka ka mụ na Lori nọ na-ekwurịta banyere olili India, bụ́ nke anyị chere n’oge ahụ na ọ bụ ihe a na-apụghị izere ezere.”

Ka oge na-aga, a chọpụtara na India nwere ọnyá afọ—ọrịa nke na-ericha eriri afọ nke nnukwu. O nwekwara ọrịa sclerosing cholangitis nke ka na-amalite amalite, bụ́ nke na-emetụta opi mgbailu nke dị n’imeju. A pụrụ ịgwọ ọrịa ndị a agwọ. Otú ọ dị, a ga-achọ ịwa ya ahụ́, ọ dịkwa mkpa na a ga-enye ya ọgwụgwọ maka ọnyá afọ ahụ. Ọnọdụ abụọ ndị a ga-achọ ịdị na-elegide ya anya nakwa ịdị na-elekọta ya n’oge mgbake ya.

Ọ karịala afọ asaa ugbu a kemgbe India malitere ịrịa ọrịa. N’ihi nlekọta ndị dọkịta ji obi ha nile na-enye ya, ọ gbakewala. Dị ka Ndịàmà Jehova ha bụ, Mark na Lori chere na okwukwe ha nwere n’Okwu Chineke—karịsịa n’ihe o kwuru banyere ọrịa, ọnwụ, na olileanya mbilite n’ọnwụ a ga-enwe n’ọdịnihu—enyeworo ha aka ịtachi obi. O nyewokwara India aka ịtachi obi. “India na-ekwu okwu mgbe nile n’ezoghị ọnụ banyere olileanya mbilite n’ọnwụ dị ka a kọwara ya na Bible,” ka Lori na-ekwu. “Ọ dị nnọọ adị n’ezie nye ya.”

N’otu oge mgbe India nọ n’ọnụ ụlọ ebe a na-anọ egwuri egwu n’ụlọ ọgwụ, ọ hụrụ otu nwa agbọghọ nke nwanne ya nwanyị na-arịa ọrịa leukemia. Lori na-akọ ihe merenụ: “Nwa agbọghọ ahụ gwara India na ya na-atụ ụjọ na nwanne ya nwanyị nwere ike ịnwụ. Mgbe ahụ, India gwara ya ihe ọnwụ bụ dị ka Bible si kwuo ya, nakwa na ya anaghị atụ ụjọ ọnwụ. N’echi ya, nne nwa ahụ bịara jụọ m ọtụtụ ajụjụ. Ọ tụrụ ya n’anya na India pụrụ ikwu nnọọ ihe ndị dị otú ahụ n’ezoghị ọnụ, n’atụghịkwa ụjọ.”

Mark na Lori achọpụtawo na ekpere ndị kwere ekwe ibe ha na-ekpere ha enyeworo ha aka ebe ọ dị ukwuu. “N’oge gara aga,” ka Mark na-ekwu, “ọ bụrụ na m agwa ndị mmadụ na m ga-etinye ha n’ekpere ma ọ bụ ọ bụrụ na m esoro ha na-ekpe ekpere, ọ na-adịkarị m ka ya bụrụ na m pụrụ imere ha ihe karịrị nke ahụ. Ugbu a ka m matara mkpa ekpere ndị ahụ mụ na ndị ọzọ so kpee na ndị m kpeere ndị ọzọ dị. Ikpere anyị ekpere bụ ihe kasị mkpa e meere anyị n’oge ndị anyị nọ n’ihe isi ike. Lee nnọọ òtù ụmụnna na-ahụ n’anya anyị nwere!”

Mark na-echekwa na ọrịa India na-arịa enyeworo ha aka inyocha ihe ndị ha na-ebute ụzọ. “Otú anyị si ele ihe onwunwe anya agbanwewo kpam kpam,” ka ọ na-ekwu. “Lee nnọọ otú ha si eyi ihe na-abaghị uru mgbe nwa gị na-arịa ọrịa! Ihe ndị bara uru ná ndụ bụ mmekọrịta anyị na Jehova Chineke na nke anyị na òtù ụmụnna anyị na-ahụ n’anya.”

Mark na Lori, tinyekwara India na ụmụnne ya ndị ọzọ, na-atụ anya oge ahụ Aịzaịa onye amụma bụrụ n’amụma mgbe “onye obibi ya agaghị asị, Ana m arịa ọrịa.”—Aịsaịa 33:24; Mkpughe 21:4.

[Foto dị na peeji nke 10]

India Erickson

[Foto dị na peeji nke 11]

Ụlọ ọgwụ San Diego Children’s Hospital

[Foto dị na peeji nke 11]

India na ezinụlọ ya