Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Otú E Si Elekwasị Mmadụ Anya Maka Mmekpọ Ọnụ

Otú E Si Elekwasị Mmadụ Anya Maka Mmekpọ Ọnụ

Otú E Si Elekwasị Mmadụ Anya Maka Mmekpọ Ọnụ

Monika ka gụsịrị nnọọ akwụkwọ mgbe ọ malitere ịmụ ọrụ dị ka odeakwụkwọ nke ndị ọkà iwu. Monika tụrụ anya na ọ gaghị enwe nsogbu n’isi ná ndụ nwata akwụkwọ gazie ná ndụ onye ọrụ.

Horst bụ dọkịta nke nọ n’agbata afọ 34 na afọ 36. O nwere nwunye, nweekwa ụmụ, ihe àmà na-egosikwa na ọ ga-abụ onye a ma ama na onye a ga na-akwụ ụgwọ ọnwa buru ibu.

Ma Monika ma Horst ghọrọ ndị a na-amaja.

IHE mere Monika na Horst na-akụziri anyị otu ihe bara uru: Ọ dịghị kpọmkwem ihe a na-eji amata onye a pụrụ imekpọ ọnụ. N’ezie, a pụrụ ilekwasị onye ọ bụla nke nọ n’ụdị ọrụ ọ bụla anya maka mmaja. Oleezi otú ị pụrụ isi chebe onwe gị? Otu ụzọ bụ ịmụta otú gị na ndị mmadụ, ọbụna ndị ọrụ ibe gị bụ́ ndị ihe na-adịghị adabara gị na ha, ga-esi na-adị n’udo.

Iso Ndị Ọrụ Ibe Gị Na-adị ná Mma

Nye ọtụtụ ndị, inweta ọrụ na-achọ ha iso ìgwè ndị ọrụ na-arụkọ ọrụ nakwa inyere ìgwè ahụ aka ịdị na-arụkọ ọrụ n’udo. Ọ bụrụ na ndị ọrụ na ibe ha dị ná mma, ọrụ na-aga aga. Ma, ọ bụrụ na ha adịghị ná mma, ọrụ adịghị aga aga, ohere e nwere na a ga na-amaja mmadụ ga na-arịwanyekwa elu.

Olee ihe pụrụ ime ka ìgwè ndị ọrụ ghara ịrụkọ ọrụ n’udo? Otu bụ na ọ pụrụ ịbụ na a na-agbanwe ndị ọrụ ugboro ugboro. N’ọnọdụ dị otú ahụ, ọ na-esi ike iso ndị ọzọ na-adị ná mma. Tụkwasị na nke ahụ, ndị ọrụ ọhụrụ adịghị ama usoro e jikarị arụ ọrụ, bụ́ nke na-ebelata ihe mmadụ nile ga-arụpụta. Ọ bụrụ na ọrụ a na-arụ na-amụbakwu, o yikarịrị ka ìgwè ahụ hà ga na-enwe nrụgide n’esepụghị aka.

Ọzọkwa, ọ bụrụ na ìgwè ndị ọrụ enweghị ihe mgbaru ọsọ doro anya, ha agachaghị enwe mmetụta nke ịdị n’otu. Dị ka ihe atụ, ọ pụrụ ịdị otú a mgbe onyeisi obi na-erughị ala na-etinye oge dị ukwuu n’ịzọ ọkwá ya karịa ka ọ na-etinye n’iduzi ọrụ. Ọ pụrụ ọbụna ịnwa igosi na ọ bụ ya nọ n’isi site n’ịrakọta otu onye ọrụ na ibe ya. Iji mee ka ihe ka njọ, nhazi nke ndị ọrụ ahụ pụrụ ịbụ nke na-edoghị anya nke na ụfọdụ n’ime ha adịghị ama ebe ibu ọrụ ha bidoro na ebe o jedebere. Dị ka ihe atụ, esemokwu pụrụ ibilite mgbe ndị ọrụ abụọ chere na ha nwechara ibu ọrụ nke ịbịanye aka n’akwụkwọ e ji akwụ ụgwọ mgbe onye nke ọzọ bịanyesịworo.

N’ọnọdụ dị otú ahụ, ọ na-esi ike inwe nkwurịta okwu, a na-anọgidekarị na-ebu iwe n’obi. Anyaụfụ na-abịa mebie ọnọdụ e nwere n’ebe ọrụ, ndị ọrụ na ibe ha asọrịtawakwa mpi iji soro onyeisi na-adị ná mma. A na-abịa lewe obere nghọtahie anya dị ka oké mkparị. Dị ka a pụrụ isi kwuo ya, obere agwọ na-aghọ eke. Mmaja pụrụ iwere ọnọdụ n’ebe e nwere ọnọdụ dị otú a.

Ilekwasị Mmadụ Anya Maka Mmaja

Ruo oge ụfọdụ, a pụrụ ilekwasị otu onye ọrụ anya maka mmaja. Olee ụdị onye o yiri ka à ga-eme otú ahụ? Ọ pụrụ ịbụ onye gbapụrụ iche. Dị ka ihe atụ, ọ pụrụ ịbụ nwoke nke na-arụ ọrụ n’ebe e nwere nanị ụmụ nwanyị ma ọ bụ nwanyị nke na-arụ ọrụ n’ebe e nwere nanị ụmụ nwoke. A pụrụ iwere onye nwere obi ike dị ka onye na-eme ike ike, ebe a pụrụ iwere onye na-adịghị ekwukebe okwu dị ka onye aghụghọ. Onye a pụrụ imekpọ ọnụ pụkwara ịgbapụ iche n’echiche bụ́ na ọ tọchara ndị ọzọ ma ọ bụ na ọ bụ ya ka a tọchara, ma ọ bụkwanụ ọbụna na ọ bụ ya kasị mara ọrụ ahụ.

Onye ọ sọrọ ya bụrụ ya ka e lekwasịrị anya na-amaja, ndị ọrụ ibe ya “na-emegbu ya ma si otú ahụ na-enweta ahụ́ efe pụọ ná nrụgide ndị ha onwe ha na-enwe,” ka akwụkwọ ahụ́ ike ndị Germany bụ́ mta na-ekwu. Mgbalị ndị onye ahụ a na-amaja na-eme iji dozie ọnọdụ ahụ adịchaghị enwe ihe ịga nke ọma, ọ pụkwara ọbụna ime ka ihe ka njọ. Ka mmaja ahụ na-aghọ nke a na-eme ugboro ugboro n’esepụghị aka, onye ahụ na-aghọwanye onye na-enweghị onye ya na ya kwụ. O ruo nke otú a, ma eleghị anya onye ahụ a na-amaja agaghị achịkwali ọnọdụ ahụ nanị ya.

N’ezie, ọ dịla anya ebe ọrụ bụ ebe a na-anọkarị emegbu ndị mmadụ. Ma ọtụtụ ndị pụrụ icheta oge o yiri ka ndị ọrụ na ibe ha hà dị ná mma karị. A hụkebeghị ebe ndị mmadụ gbakọtara aka na-amaja mmadụ. Ma n’afọ ndị gafeworonụ, e nweela ihe otu dọkịta kọwara dị ka “ndalata zuru ebe nile nke mmụọ nke ịdị n’otu na mbelata dị ukwuu nke ịsọ ihere.” Isu ọkpọ n’ebe ọrụ adịchaghịzi eme ndị mmadụ ihere.

N’ihi ya, ndị nile e were n’ọrụ chọrọ ịmata, n’ụzọ ziri ezi, azịza nye ajụjụ ndị a: À pụrụ igbochi mmaja? Olee otú a pụrụ isi na-achụso udo n’ebe ọrụ?

[Foto dị na peeji nke 6]

Nzube e ji amaja mmadụ bụ iji mee ka onye ahụ bụrụ onye a jụrụ ajụ