Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ị̀ Maara?

Ị̀ Maara?

Ị̀ Maara?

(A pụrụ ịchọta azịza nye ajụjụ ndị a n’akụkụ Bible ndị e zoro aka na ha, e bipụtakwara ndepụta zuru ezu nke azịza ha na peeji nke 15. Iji nwetakwuo ihe ọmụma, lee akwụkwọ bụ́ “Insight on the Scriptures” nke Ndịàmà Jehova bipụtara.)

1. Gịnị ka e ji rụọ ụkwụ ntọala nke ụlọikwuu ahụ? (Ọpụpụ 26:19-32)

2. Gịnị ka a na-akpọ nnapụta a napụtara ụmụ Izrel pụọ n’ohu n’Ijipt? (Ndị Hibru 11:22)

3. Ugboro ole ka Jizọs buru n’amụma na Pita ga-agọnahụ ya? (Matiu 26:75)

4. Olee àgwà atọ e ji mara ọgbakọ Ndị Kraịst mgbe onyinye ịrụ ọrụ ebube nke mmụọ nsọ gasịrị? (1 Ndị Kọrint 13:13)

5. N’ihi gịnị ka ikpere arụsị ji bụrụ ihe nzuzu? (Abụ Ọma 115:4-8)

6. Olee ndụmọdụ Pọl nyere ndị inyom bụ́ Ndị Kraịst banyere uwe? (1 Timoti 2:9, 10)

7. N’ihi gịnị ka Pọl ji were onwe ya dị ka “onye kasị nta n’ime ndịozi”? (1 Ndị Kọrint 15:9)

8. Olee ihe Samsin ji gbuo 1,000 ndị ikom Filistia? (Ndị Ikpe 15:15)

9. Olee ụdị ụkpara ndị bi n’Etiti Ebe Ọwụwa Anyanwụ Ụwa jiworo mere nri kemgbe ọtụtụ narị afọ? (Levitikọs 11:22)

10. Gịnị ka Jọn Onye Na-eme Baptizim nọgidere na-ekwusa banyere Jizọs ruo ụbọchị abụọ? (Jọn 1:29, 35, 36)

11. N’ihi ọdịdị ha dị n’ime ime ahụ́, olee akụkụ ahụ́ nke Bible na-eji eme ihe dị ka ihe na-anọchite anya echiche na mmetụta uche kasị mie emi nke mmadụ? (Mkpughe 2:23)

12. Ná mkpughe e nyere Jọn, olee ndị a hụrụ ka ha nọkwasịrị n’ocheeze ndị gbara ocheeze Jehova gburugburu? (Mkpughe 4:4)

13. Olee mkpụrụ osisi Jizọs kọwara dị ka “mkpụrụ kasị nta n’ime mkpụrụ nile dị n’ụwa”? (Mak 4:31)

14. Olee ndị ikom abụọ Pọl rịọrọ ka ha “bịakwute ya ngwa ngwa o kwere omume” mgbe o rutere n’Atens na njem nke abụọ nke ozi ala ọzọ ya? (Ọrụ 17:15)

15. Ònye bụ Onye Iro ukwu nke Chineke? (Job 1:6)

16. Ònye, na-amaghị ama, baara onye ezi omume bụ́ Hana mba na ọ ṅụbigara mmanya ókè? (1 Samuel 1:12-16)

17. Ònye bụ “nwoke jọgburu onwe ya” nke nupụụrụ Devid isi ma mee ka ndị Izrel nile, ma ewepụ ebo Juda, sonyere ya n’inupụ isi? (2 Samuel 20:1, 2)

18. Kama mana ahụ e nyere ha n’ụzọ ọrụ ebube, olee ihe oriri ndị ụmụ Izrel riri n’Ijipt nke ha chọsịrị ike iri n’ọzara? (Ọnụ Ọgụgụ 11:5)

Azịza Nye Ajụjụ

1. Ọlaọcha

2. Ọpụpụ

3. Atọ

4. Okwukwe, olileanya, na ịhụnanya

5. Ha adịghị ndụ, ha bụ ọrụ aka mmadụ

6. Na o kwesịrị ịbụ uwe a haziri nke ọma n’imeru ihe n’ókè, “n’ụzọ kwesịrị ụmụ nwanyị ndị na-ekwupụta na ha na-asọpụrụ Chineke”

7. N’ihi na ọ ‘kpagburu ọgbakọ Chineke’

8. “Ọkpụkpụ agba ọhụrụ nke ịnyịnya ibu”

9. Igurube

10. “Lee, Nwa Atụrụ Chineke!”

11. Akụrụ

12. Jọn hụrụ ndị okenye 24, nke na-anọchi anya ụmụazụ Jizọs etere mmanụ n’ọnọdụ ha n’eluigwe

13. “Mkpụrụ nke osisi mọstad”

14. Saịlas na Timoti

15. Setan

16. Nnukwu Onye Nchụàjà bụ́ Ịlaị

17. Sheba

18. Azụ̀, kukumba, wọtamelọn, lik, yabasị, na galik