Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ịchịkwa Ịnyịnya Na Ire

Ịchịkwa Ịnyịnya Na Ire

Ịchịkwa Ịnyịnya Na Ire

“Ịnyịnya bụ ihe a na-edoziri ụbọchị agha,” ka Eze Solomọn maara ihe nke Izrel oge ochie kwuru. (Ilu 21:31) Ọ dịla anya ndị agha bụ́ ndị nọkwasịrị n’ịnyịnya na-atụnye ụtụ n’imeri n’agha. Eri oge ochie, ndị agha ejiwo bridle na-achịkwa àgwà na ikike nke ịnyịnya.

Bridle ịnyịnya, ka akwụkwọ bụ́ Encyclopædia Britannica na-akọwa, “bụ eriri ndị na-eme ka ọla e tinyere n’ọnụ anụmanụ ahụ dịgidesie ike, ma si otú ahụ na-eme ka mmadụ nwee ike isi n’ụdọ ya na-achịkwa ya.” Bridle oge ochie adịchaghị iche na nke oge a, ha bakwara uru dị ukwuu n’ịchịkwa nakwa n’ịgba ịnyịnya.

Nna Solomọn, bụ́ Eze Devid, zoro aka ná mkpa bridle dị, mgbe o dere, sị: “Unu adịla ka ịnyịnya, ma ọ bụ dị ka ịnyịnya mule, nke ọ dịghị nghọta ha nwere: a ga-ejikwa bit na bridle, dị ka ihe ekike, ijide ha.” (Abụ Ọma 32:9) Ozugbo e nyere ịnyịnya ọzụzụ, ọ pụrụ ịghọ enyi na-ekwesị ntụkwasị obi. Alekzanda Onye Ukwu ji ịnyịnya ya bụ́ Bucephalus kpọrọ ihe nke ukwuu nke na o nyere otu obodo dị n’India aha ịnyịnya ahụ iji na-echeta ya.

Ọ bụ ezie na ụmụ mmadụ enwewo ike ịzụ ịnyịnya ruo ọtụtụ puku afọ, ịchịkwa ọdịdị anyị na-ezughị okè bụ okwu ọzọ. “Anyị nile na-asụ ngọngọ ọtụtụ ugboro,” ka Onye Kraịst na-eso ụzọ bụ́ Jems kwuru. “Ọ bụrụ na onye ọ bụla adịghị asụ ngọngọ n’okwu, onye a bụ nwoke zuru okè, nke nwere ike ịchịkwa ahụ́ ya dum.” (Jems 3:2) N’ezie, ọ̀ dị onye n’ime anyị ga-ekwu na ya ekwutụbeghị okwu n’echeghị eche, okwu ọjọọ, ma ọ bụ okwu iwe?

Gịnịzi mere anyị ga-eji na-agba mbọ ịchịkwa ire anyị siri ike nchịkwa, bụ́ nke ‘na-adịghị otu n’ime ihe a kpọrọ mmadụ pụrụ ịzụta ya’? (Jems 3:8) Ọ bụ n’ihi na ndị mmadụ na-adị njikere itinye oge na mgbalị iji na-azụ ịnyịnya n’ihi na ha maara na anụmanụ ahụ ga-abara ha uru ma ọ bụrụ na ha azụta ya. N’ụzọ yiri nke ahụ, ka anyị na-achịkwa, ma ọ bụ na-akwa ire anyị nga, otú ahụ ka ọ ga na-abakwuru anyị uru.

Okwu e chere eche kwuo pụrụ ime ka obi jụrụ ndị enyi anyị, ndị ọrụ ibe anyị, na ndị ikwu anyị, ma gbaa ha ume. (Ilu 12:18) Okwu ndị dị otú ahụ pụrụ ime ka ndụ dịkwuo ụtọ nye ndị nọ anyị gburugburu. Otú ọ dị, ire a na-achịkwaghị achịkwa na-akpata nsogbu. ‘Kwaa ire gị nga ma gbanahụ nsogbu,’ ka Bible na-adọ aka ná ntị. (Ilu 21:23, The New English Bible) Ruo ókè anyị nweruru ihe ịga nke ọma n’ịchịkwa ire anyị, anyị ga-enyere ma onwe anyị ma ndị na-ege anyị ntị aka. *

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 7 N’ụzọ na-akpali mmasị, Bible na-echetara Ndị Kraịst na okwu ha na ofufe ha nwere njikọ chiri anya. Ọ na-ekwu, sị: “Ọ bụrụ na o yiri onye ọ bụla ka ya bụ onye nwere ụdị ofufe nke ya ma ọ dịghị achịkwa ire ya, kama na-aga n’ihu na-aghọgbu obi nke ya, ụdị ofufe nke onye a bụ ihe efu.”—Jems 1:26.

[Foto dị na peeji nke 31]

Alekzanda Onye Ukwu

[Ebe E Si Nweta Foto]

Alinari/Art Resource, NY