Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ịnagide Owu Ọmụma

Ịnagide Owu Ọmụma

Ịnagide Owu Ọmụma

ỊNAGIDE owu ọmụma adịghị mfe. Mmetụta ya na-eru n’ọkpụkpụ. Olee otú mmadụ pụrụ isi nagide owu ọmụma? Gịnị ka ụfọdụ ndị meworo iji merie mmetụta a siri ike?

Ịlụso Owu Ọmụma Ọgụ

Ọ na-amasị Helen * ịnọ nanị ya mgbe ọ na-eme mkpebi ụfọdụ, ma ọ na-eche na owu ọmụma pụrụ ịdị ize ndụ. Mgbe ọ bụ nwatakịrị, ya na ndị mụrụ ya adịghị enwe nkwurịta okwu. N’amaghị otú ọ ga-esi mee ka ha gee ya ntị, ọ kpọchibidoro onwe ya n’ọnụ ụlọ ya. Ọ na-akọ, sị: “Amalitere m inwe nsogbu iri nri. Abịara m daa nnọọ mbà n’obi. Ana m agwa onwe m, sị, ‘Gịnị ka m na-echegburu onwe m banyere nsogbu nke ndị mụrụ m mgbe ha na-adịghị echegbu onwe ha banyere nsogbu m?’ Mgbe ahụ, abịara m chee na ịlụ di ga-eme ka owu na-ama m kwụsị. Achọrọ m ịlụ di iji gbanahụ ọnọdụ ahụ. Ma, n’oge na-adịghị anya, abịara m chee, sị: ‘N’ihi gịnị ka m ga-eji mebiere onye ọzọ ndụ ya? Ọ dị m mkpa ibugodị ụzọ kpakọọ echiche m ọnụ!’ Abịara m chọọ enyemaka Jehova site n’ekpere, kọọrọ ya ahụhụ nile m na-ata.

“N’ime Bible, achọtara m okwu ndị na-akasi nnọọ obi, dị ka ndị nke dị n’Aịsaịa 41:10: ‘Atụla egwu, gị ka M nọnyeere: elela anya gburugburu n’ụjọ, n’ihi na Mụ onwe m bụ Chineke gị: M ga-agba gị ume; ee, M ga-enyere gị aka; ee, M ga-eji aka nri nke ezi omume m kwagide gị.’ Okwu ndị a nyeere m aka nke ukwuu n’ihi na ọ dị m ka enweghị m nna. Taa, ana m agụchi Bible anya ma na-ekpegara Nna m nke eluigwe ekpere. Amụtawo m imeri owu ọmụma m.”

Mmadụ ịbụ onye onye ọ hụrụ n’anya nwụnahụrụ na-akpata obi ilu, bụ́ nke pụrụ iduga n’owu ọmụma. Luisa, bụ́ onye dị afọ 16, na-ekwupụta ahụhụ ọ tara, sị: “E gburu papa m mgbe m dị afọ ise. Agakwuuru m nne m ochie maka nkasi obi, ma ọ dịghị mgbe ọ dị m ka ọ̀ hụrụ m n’anya. E gosichaghị m ịhụnanya n’oge m bụ nwata, bụ́ oge ọ kasị dị m mkpa. N’oge m dị agbata afọ asatọ na afọ itoolu, anwara m igbu onwe m ugboro atọ. Echere m na ọ bụ ya ga-akara ezinụlọ m mma n’ihi na mama m nọ na-adọgbu onwe ya n’ọrụ iji na-akpa afọ mụ na ụmụnne m ndị nwanyị atọ. E mesịa, anyị malitere iso Ndịàmà Jehova na-akpakọrịta. Otu di na nwunye bịara nwee ezi mmasị n’ebe m nọ. Ha na-agwa m, sị: ‘Anyị nwere mmasị n’ebe ị nọ, ị dịkwa anyị mkpa.’ Okwu ahụ bụ́ ‘Ị dị anyị mkpa’ nyere m ume dị ukwuu. Mgbe ụfọdụ, anaghị m enwe ike ịkọrọ onye ọzọ otú obi dị m, ma mgbe m gụrụ isiokwu ndị e bipụtara n’Ụlọ Nche na Teta!, ana m ekele Jehova, n’ihi na site n’ịgụ akwụkwọ ndị a, enwewo m mmetụta na ọ hụrụ m n’anya. Emewo m ọtụtụ mgbanwe. Taa, apụrụ m ịmụmụ ọnụ ọchị, ana m enwekwa ike ime ka nne m mara mgbe iwe na-ewe m na mgbe obi dị m mma. Mgbe ụfọdụ, ana m echeta ihe ndị mere m n’oge gara aga, ma ọ dịghịzi ka oge mbụ bụ́ mgbe m nwara igbu onwe m ma ọ bụ mgbe m kwụsịrị ịtụpụrụ ndị m hụrụ n’anya ọnụ. Ana m echeta mgbe nile, ihe ọbụ abụ bụ́ Devid kwuru: ‘N’ihi ụmụnne m na ndị enyi m, biko, ka m kwuo okwu, sị, Ka udo dị n’ime gị.’”—Abụ Ọma 122:8.

Martha abụwo onye a gbara alụkwaghịm ruo afọ 22, bụ́ nke ọ nọ na ya zụlite otu nwa. “Ana m amaliteghachi inwe mmetụta nke ịbụ onye na-abaghị uru na onye owu na-ama mgbe ọ bụla m chere na emetaghị m ihe,” ka ọ na-ekwu. Olee otú o si anagide mmetụta ndị a? Ọ na-akọwa, sị: “Achọpụtawo m na ụzọ kasị mma isi nagide ha bụ ịgwa Jehova Chineke banyere ha ozugbo. Mgbe m na-ekpe ekpere, ana m ama na anọghị m nanị m. Jehova na-aghọta m karịa ka m na-aghọta onwe m. Ana m agbalịkwa ịchọpụta ụzọ ndị m ga-esi na-enwe mmasị n’ebe ndị ọzọ nọ. Ozi oge nile m na-eje bụ ngwá ọrụ dị ike karịsịa bụ́ nke m ji alụso mmetụta na-adịghị mma ọgụ. Mgbe ị na-agwa ndị ọzọ banyere ngọzi nke Alaeze Chineke ma chọpụta na ndị na-ege gị ntị enwetụghị olileanya, nakwa na ha na-ele nsogbu ha anya dị ka nke na-adịgide adịgide, ị na-achọpụta na i nwere ezigbo ihe mere ị ga-eji nọrọ ndụ ma nọgide na-alụso mmetụta ọjọọ ndị ahụ ọgụ.”

Elba, bụ́ onye dị afọ 93, onye nanị otu nwa ọ mụrụ na-eje ozi ala ọzọ, na-agwa anyị banyere ụzọ o si na-anagide owu ọmụma: “Mgbe a kpọrọ nwa m nwanyị na di ya ịga ụlọ akwụkwọ Watchtower Bible School of Gilead, ahụrụ m ka ihu ha gbukepụrụ n’ọṅụ, esokwa m ha ṅụrịa. Ka e mesịrị, mgbe e kenyere ha ọrụ ije ozi ná mba ọzọ, amalitere m inwetụ ọchịchọ onwe onye nanị. Amaara m na ha agajeghị ịnọ m nso ọzọ, o wutetụkwara m. Ọnọdụ ahụ bịara dị m ka nke Jefta na nanị otu nwa nwanyị ọ mụrụ bụ́ nke a kọrọ ná Ndị Ikpe isi nke 11. Abịara m jiri anya mmiri kpegara Jehova ekpere, na-arịọ ya mgbaghara. Ụmụ m na-ezitere m ozi mgbe nile. Ama m na ha ji nnọọ ọrụ n’aka, ma n’ebe ọ bụla ha nọ na-eje ozi, ha na-ewepụta oge iji detara m akwụkwọ, na-akọrọ m ahụmahụ ndị ha nwetaworo n’ozi ubi. Ana m agụ akwụkwọ ozi ha ugboro ugboro. Ọ na-adị ka à ga-asị na ha na-agwa m okwu kwa izu, ana m enwekwa nnọọ ekele maka nke ahụ. Ọzọkwa, Ndị Kraịst bụ́ ndị okenye nọ n’ọgbakọ m na-elebara anyị bụ́ ndị agadi na ndị ahụ́ na-adịghị ike anya nke ọma, na-abịa iji hụ na e nwere ụgbọ ga-ebuga anyị nzukọ ọgbakọ, na-egbokwara anyị mkpa ndị ọzọ. Ana m ewere ụmụnna ndị nwoke na ndị nwanyị ime mmụọ m dị ka ngọzi sitere n’aka Jehova.”

Gị Onwe Gị Pụkwara Ịnagide Owu Ọmụma

Ma ị̀ bụ onye na-eto eto ma ị̀ bụ okenye, onye na-alụbeghị di ma ọ bụ nwunye ma ọ bụkwanụ onye lụrụla alụ, nwatakịrị nne ya na nna ya nọ ma ọ bụ nwa mgbei, ma ndị ị hụrụ n’anya hà anwụnahụla gị ma ọ bụkwanụ na ihe ọ bụla ọzọ na-eme ka owu na-ama gị, e nwere ụzọ ndị ị ga-esi na-anagide mmetụta gị. Jocabed, bụ́ nwa agbọghọ dị afọ 18 nke nna ya hapụrụ ezinụlọ ha nke mmadụ isii mejupụtara ma laa ná mba ọzọ, na-ekwu, sị: “Kwupụta ya! Ọ dị mkpa ka anyị na-ekwupụta otú obi dị anyị. Ọ bụrụ na anyị emeghị otú ahụ, ọ dịghị onye gaje ịghọta anyị.” Ọ na-atụ aro, sị: “Kwụsị ichebiga echiche ókè banyere onwe gị. Chọọ enyemaka n’aka ndị tozuworo okè, ọ bụghị n’aka ndị ntorobịa bụ́ ndị ọnọdụ ha pụrụ ịka nke gị njọ.” Luisa, bụ́ onye a kpọtụrụ aha na mbụ, na-ekwu, sị: “Ikpegara Jehova ekpere sitere n’ala ala obi na-enyere anyị aka n’ụzọ dị anyị mkpa iji pụta n’ọnọdụ a pụrụ ịkpọ ebe ọkụ nyụrụ.” Jorge, bụ́ onye nwunye ya nwụnahụrụ, na-ekwu banyere otú o si anagide owu ọmụma, sị: “Ọ na-achọ nnọgidesi ike. Igosi mmasị n’ebe ndị ọzọ nọ na-enyere m aka nke ukwuu. ‘Igosi mmetụta maka onye ọzọ’ mgbe anyị na ndị ọzọ na-ekwurịta okwu pụrụ ime ka mkparịta ụka anyị baa uru, ọ pụkwara inyere anyị aka ịchọpụta àgwà ọma ndị ọzọ nwere.”—1 Pita 3:8.

E nwere ọtụtụ ihe a pụrụ ime iji lụsoo owu ọmụma ọgụ. Ma ọ̀ dị oge mgbe owu ọmụma ga-abụ ihe mgbe ochie? Ọ bụrụ otú ahụ, olee otú nke a ga-esi mee? Isiokwu na-esonụ ga-aza ajụjụ ndị a.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 4 A gbanwewo ụfọdụ n’ime aha ndị ahụ.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 8]

“Ikpegara Jehova ekpere sitere n’ala ala obi na-enyere anyị aka n’ụzọ dị anyị mkpa iji pụta n’ọnọdụ a pụrụ ịkpọ ebe ọkụ nyụrụ.”—Luisa

[Igbe/Foto ndị dị na peeji nke 7]

Ihe Ị Pụrụ Ime Banyere Owu Ọmụma

▪ Buru n’uche na a pụrụ ịgbanwe ọnọdụ gị, na ọ bụghị nke na-adịgide adịgide, kama na ọ bụ ahụmahụ a na-ahụkarị bụ́ nke ndị ọzọ nwekwara.

▪ Abụla onye na-atụ anya ime ihe ndị karịrị ike gị.

▪ Nwee afọ ojuju banyere onwe gị n’ozuzu.

▪ Zụlite àgwà nke iri nri nke ọma na inwe ezi mmega ahụ́, ma na-ehi ụra nke ọma.

▪ Jiri oge nanị gị nọ na-echepụta ihe ma na-amụ nkà ndị ọhụrụ.

▪ Kpachara anya ka ị ghara iji ihe mere gị n’oge gara aga na-ekwubi otú mmadụ ndị ọzọ dị.

▪ Jiri ndị enyi gị na àgwà ha ndị magburu onwe ha kpọrọ ihe. Gbalịa inwe ezigbo ndị enyi. Chọọ ihe ọmụma n’aka ndị tọrọ gị bụ́ ndị nweworo ahụmahụ.

▪ Na-emere ndị ọzọ ihe—na-amụmụrụ ha ọnụ ọchị, na-agwa ha okwu ọma, na-akọrọ ha ihe ị gụtara na Bible. Inwe mmetụta nke ịbụ onye dị ndị ọzọ mkpa bụ ọgwụ owu ọmụma.

▪ Zere ịrọ nrọ efu banyere iso ndị na-eme ihe nkiri vidio ma ọ bụ TV ma ọ bụkwanụ ndị a hụrụ n’Intanet ma ọ bụ ndị a kọrọ banyere ha n’akwụkwọ ọgụgụ, na-enwe mmekọrịta.

▪ Ọ bụrụ na ị lụrụ di ma ọ bụ nwunye, atụla anya na di ma ọ bụ nwunye gị ga-egbo mkpa mmetụta uche gị nile. Mụtanụ inwe nkwekọrịta, inyerịtara ibe unu aka na ịkwadorịta ibe unu.

▪ Mụta iso ndị ọzọ na-ekwurịta okwu ma bụrụ onye na-ege ntị nke ọma. Lekwasị anya n’ebe ndị ọzọ nọ nakwa n’ihe ndị na-amasị ha. Nwee mmetụta ọmịiko.

▪ Kweta na owu na-ama gị, ma kọsara ya enyi gị tozuru okè, onye ị tụkwasịrị obi. Anọla na-ahụsi anya n’ekwupụtaghị ya.

▪ Zere ịṅụbiga mmanya ókè, ma ọ bụkwanụ aṅụla aṅụ ma ọlị. Ihe ọṅụṅụ na-aba n’anya adịghị erikpu nsogbu gị—ka oge na-aga, ha ga-ese n’elu ọzọ.

▪ Zere mpako. Gbaghara ndị kpasuru gị iwe, ma dozie nsogbu gị na ha nwere. Dịrị njikere ịtụkwasị ndị mmadụ obi.

[Foto dị na peeji nke 6]

Olee otú mmadụ pụrụ isi nagide owu ọmụma?