Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ọgụ A Lụwara Kemgbe Ụwa Maka Ahụ́ Ike Ka Mma

Ọgụ A Lụwara Kemgbe Ụwa Maka Ahụ́ Ike Ka Mma

Ọgụ A Lụwara Kemgbe Ụwa Maka Ahụ́ Ike Ka Mma

JOANNE bi na New York, o nwekwara ụkwara nta. Ma ọrịa ya abụghị ụdị ụkwara nta a na-ahụkarị. O nwere ụdị nje nke na-eguzogide ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ọgwụ nile ma na-egbu ọkara nke ndị ọ dị n’ahụ́ ha. Otú ọ dị, Joanne anaraghị ọgwụgwọ ugboro ugboro, ka ọ dịgodị, o bunyewo ndị ọzọ ụkwara nta, ọ dịkarịa ala otu ugbo. ‘E kwesịrị ịkpọchibido ya ụzọ,’ ka dọkịta ya ike gwụrụla kwuru.

Ọ dịla anya ụkwara nta gbuwere ndị mmadụ. N’ezie, ọtụtụ nde mmadụ arịawo ụkwara nta ma nwụọ na ya. A hụwo ọrịa ahụ n’ozu ndị a gbasiri agbasi sitere n’Ijipt na Peru. Taa, nje ụkwara nta ndị na-apụtaghachi na-egbu ihe dị ka nde mmadụ abụọ kwa afọ.

Ajịrịja na-agba Carlitos n’egedege ihu, bụ́ onye dina n’ute n’otu ụlọ akịrịka dị n’Africa. Ọrịa ịba emewo ka ọ gharatụdị inwe ume ọbụnadị nke iji bee ákwá. Nne na nna ya, bụ́ ndị nọ ná nchegbu, enweghị ego ọgwụ, ọ dịghịkwanụ ụlọ ọgwụ dị nso ha pụrụ ịga ka e lebara ahụ́ ike nke obere nwa ha anya. Ahụ́ ọkụ ahụ siri ọnwụ, n’ime awa 48, ọ nwụrụ.

Ọrịa ịba na-egbu ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ otu nde ụmụaka dị ka Carlitos kwa afọ. N’ime ime obodo ndị dị n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ Africa, anwụnta ndị na-ebunye ọrịa ịba na-ata ụmụaka site ugboro 50 ruo ugboro 80 n’ọnwa. Anwụnta ndị a na-agbasakwa gaa n’ebe ndị ọhụrụ, ọgwụ ịba dị iche iche adịchaghịzi arụ ọrụ. Kwa afọ, a na-eme atụmatụ na ihe dị ka nde mmadụ 300 na-arịasi ịba ike.

Kenneth, bụ́ nwoke dị afọ 30 nke bi na San Francisco, California, gakwuuru dọkịta ya na nke mbụ ya n’afọ 1980. O kwuru na afọ na-asa ya nakwa na ya na-enwe ike ọgwụgwụ. Mgbe otu afọ gasịrị, ọ nwụrụ. N’agbanyeghị ọgwụgwọ ndị ọkachamara n’ọrụ ahụ́ ike nyere ya, ọ nọgidere nnọọ na-ata ahụ́, oyi nke bara ya n’ahụ́ mesịkwara gbuo ya.

Afọ abụọ mgbe e mesịrị, n’ebe dịkwa kilomita 16,000 site na San Francisco, otu nwa agbọghọ nọ n’ebe ugwu Tanzania malitere inwe ihe mgbaàmà ndị yiri nke ahụ. N’ime izu ole na ole, o nweghịzi ike ịga ije, n’oge na-adịghịkwa anya mgbe e mesịrị, ọ nwụrụ. Ndị obodo ahụ kpọrọ ọrịa ahụ a na-amaghị ama ọrịa Juliana, ebe ọ bụ na o yiri ka ọ̀ bụ otu nwoke na-ere ákwà e dere Juliana na ya bunyere ya na ụmụ nwanyị ndị ọzọ bi n’ógbè ahụ ọrịa ahụ.

Ma Kenneth ma nwanyị Tanzania ahụ bu otu ụdị ọrịa: AIDS. Ná mmalite nke afọ ndị 1980, bụ́ mgbe o yiri nnọọ ka sayensị ọgwụ na ahụ́ ike ọ̀ kpachiwo nje ndị kasị ize ndụ, ọrịa ọhụrụ a na-efe efe selitere isi ma malite imekpọ ụmụ mmadụ ọnụ. N’ime iri afọ abụọ, ọnụ ọgụgụ ndị nwụrụ n’ọrịa AIDS bịara hawa ka nke ndị nwụrụ n’ihe otiti ahụ kpara Eurasia aka ọjọọ na narị afọ nke 14—ọrịa nke ndị bi na Europe na-adịghị echefu echefu.

Ọnwụ Ojii Ahụ

A pụrụ ikwu na ọrịa ahụ a kpọrọ Ọnwụ Ojii malitere n’afọ 1347, mgbe otu ụgbọ mmiri si Crimea kwụsịrị na Messina, n’àgwàetiti Sicily. E wezụga ibu ndị ọ na-ebukarị, ụgbọ mmiri ahụ bukwa ọrịa. * N’oge na-adịghị anya, Ọnwụ Ojii ahụ gbasazuru Ịtali.

N’afọ sochirinụ, Agnolo di Tura, nke bi na Siena, Ịtali, kọwara ihe egwu na-eme n’obodo ya, sị: ‘Na May, ndị mmadụ malitere ịnwụ na Siena. Ọ bụ ihe na-akpata obi mgbawa ma na-eyi egwu. Ọ fọrọ nnọọ nke nta ka ọ bụrụ na ndị ọ bụla butere ọrịa ahụ na-anwụ ozugbo. Ọtụtụ narị mmadụ nọ na-anwụ ehihie na abalị.’ Ọ gbakwụnyere, sị: ‘Eji m aka m lie ụmụ m ise, otú ahụ ka ọtụtụ ndị ọzọ mekwara. Ọ dịghị onye bere ákwá n’agbanyeghị onye ọ bụ ya nwụnahụrụ ya n’ihi na ọ fọrọ nke nta ka ọ bụrụ na onye ọ bụla nọ na-atụ anya ọnwụ. Ọtụtụ mmadụ nwụrụ nke na mmadụ nile kweere na ụwa agwụla.’

N’ime afọ anọ, ka ụfọdụ ndị ọkọ akụkọ ihe mere eme na-ekwu, ọrịa ahụ gbasazuru Europe nile, ihe dịkwa ka otu ụzọ n’ụzọ atọ nke ndị bi na ya nwụrụ—ikekwe ihe dị ka agbata nde mmadụ 20 na nde mmadụ 30. Ndị mmadụ nwụsịsịrị ọbụna n’obodo Iceland dịpụrụ nnọọ adịpụ. A na-ekwu na n’Ime Ime Ebe Ọwụwa Anyanwụ Ụwa, ọnụ ọgụgụ ndị bi na China si na nde 123 ọ dị ná mmalite nke narị afọ nke 13 dalata gaa na nde 65 na narị afọ nke 14, ma eleghị anya ọ bụ n’ihi ọrịa ahụ na ụnwụ nri so ya bịa.

Ọ dịghị ntiwapụ ọrịa, agha, ma ọ bụ ụnwụ nri ọ bụla bu ya ụzọ nke kpatatụworo ụdị nhụsianya zuru ebe nile otú ahụ. “Ọ bụ ọdachi na-enweghị atụ n’akụkọ ihe mere eme nke mmadụ,” ka akwụkwọ bụ́ Man and Microbes (Mmadụ na Ụmụ Nje) na-ekwu. “Agbata otu ụzọ n’ụzọ anọ na otu ụzọ n’ụzọ abụọ nke ndị bi na Europe, n’Ebe Ugwu Africa, nakwa n’akụkụ ụfọdụ nke Eshia lara n’iyi.”

Ndị America gbanahụrụ ọdachi nke Ọnwụ Ojii ahụ n’ihi na ha bipụrụ iche n’ebe ndị ọzọ bi n’ụwa nọ. Ma ụgbọ mmiri ndị na-agba n’oké osimiri wetara mbipụ iche ahụ ná njedebe. Na narị afọ nke 16, ọrịa ndị na-egbu egbu ọbụna karịa Ọnwụ Ojii ahụ, mekpọrọ America ọnụ.

Kịtịkpa Emerie America

Mgbe Columbus bịarutere West Indies n’afọ 1492, ọ kọwara ndị obodo ahụ dị ka ndị ‘dị mma n’anya ma nwee ezi ọdịdị ahụ́, ndị na-etochaghị ogo ma gbaa agba.’ Otú ọ dị, ezigbo ọdịdị ahụ́ ha mere ka a ghara ịma na ha pụrụ ibute ọrịa ndị ahụ nọ na-akpa Europe aka ọjọọ.

N’afọ 1518, kịtịkpa tiwapụrụ n’àgwàetiti Hispaniola. Ndị American Indian arịatụbeghị kịtịkpa mbụ, ebelebe gbukwara n’ebe ahụ. Otu onye Spen nke hụrụ ebelebe ahụ gburunụ kwuru na ọ bụ nanị ihe dị ka 1000 mmadụ nwụfọrọ n’àgwàetiti ahụ. N’oge na-adịghị anya, ọrịa ahụ gbasaruru Mexico na Peru, ọ kpakwara mkpamkpa n’otu ụzọ ahụ.

Na narị afọ sochirinụ, mgbe ndị Bekee kwatara akwata bịarutere n’ógbè Massachusetts nke dị n’Ebe Ugwu America, ha chọpụtara na ọ fọrọ nke nta ka kịtịkpa gbukpọchaa ndị nile bi n’ala ahụ. “Ọ fọrọ nke nta ka kịtịkpa gbuchapụ ndị nile nọ n’obodo ahụ,” ka onye ndú nke ndị Bekee ahụ kwatara akwata, bụ́ John Winthrop, dere.

Ntiwapụ ọrịa ndị ọzọ sochiri kịtịkpa. Dị ka otu akwụkwọ si kwuo, ka ọ na-erule otu narị afọ kemgbe Columbus bịarutesịrị, ọrịa ndị si esi bịa bubatara kpochapụrụ pasent 90 nke ndị bi n’America. Ọnụ ọgụgụ ndị bi na Mexico dalatara site na nde 30 gaa na nde 3, nke ndị Peru si na nde 8 dalata gaa n’otu nde. Otú ọ dị, ọ bụghị nanị ndị American Indian ka kịtịkpa kpara aka ọjọọ. “N’akụkọ ihe mere eme nke mmadụ, kịtịkpa gburu ọtụtụ narị nde ụmụ mmadụ, bụ́ nke karịrị nnọọ ndị ihe otiti ọrịa . . . na agha nile ndị a lụrụ na narị afọ nke iri abụọ gburu ma a gụkọta ha ọnụ,” ka akwụkwọ bụ́ Scourge—The Once and Future Threat of Smallpox, na-ekwu.

E Meribeghị n’Agha Ahụ

N’oge ndị a, mkpamkpa na-eyi egwu nke ihe otiti ọrịa na kịtịkpa kpara pụrụ iyizi ihe ndị mere n’oge gboo. Na narị afọ nke 20, ihe a kpọrọ mmadụ meriri n’ọtụtụ agha a lụsoro ọrịa na-efe efe, karịsịa ná mba ndị mepere emepe. Ndị dọkịta chọpụtara ihe na-akpata ihe ka n’ọtụtụ ọrịa, ha chọpụtakwara ụzọ ndị e si agwọ ha. (Lee igbe dị na peeji nke 16.) Ọgwụ mgbochi ọrịa na ọgwụ nje ndị ọhụrụ bịara dị ka ọgwụ a ṅụsịa okwu ebie bụ́ ndị nwere ike ikpochapụ ọbụna ọrịa ndị kasị taa akpụ.

Otú ọ dị, dị ka Dr. Richard Krause, onye bụbu onye ntụzi ọrụ nke Ụlọ Ọrụ Na-ahụ Maka Ihe Ndị Ahụ́ Na-adịghị Anabata na Ọrịa Ndị Na-efe Efe na United States, na-ekwu, “ihe otiti ọrịa bụ ihe a na-apụghị ịgbanahụ agbanahụ dị ka a na-apụghị ịgbanahụ ọnwụ na ụtụ isi.” Ụkwara nta na ọrịa ịba alabeghị. Ntiwapụ nke ọrịa AIDS e nwere na nso nso a bụkwa ihe ncheta dị mwute na ọrịa na-efe efe ka na-akpa ụwa aka ọjọọ. “Ọrịa ndị na-efe efe ka bụ ihe kasị akpata ọnwụ n’ụwa; ha ga-adịkwa otú ahụ ruo ogologo oge na-abịanụ,” ka akwụkwọ ahụ bụ́ Man and Microbes na-ekwu.

Ụfọdụ ndị dọkịta na-atụ ụjọ na n’agbanyeghị ihe ịga ọma pụtara ìhè e nweworo n’ịlụso ọrịa ọgụ, ihe ndị a rụzuru n’ime iri afọ ole na ole gara aga pụrụ nanị ịdịru nwa oge. “Ihe ize ndụ ọrịa ndị na-efe efe na-eweta alabeghị—ọ na-aka njọ,” ka ọkachamara n’ihe banyere mgbasa na nchịkwa nke ọrịa, bụ́ Robert Shope, na-adọ aka ná ntị. Isiokwu na-esonụ ga-akọwa ihe kpatara ya.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 10 Ntiwapụ nke ọrịa ahụ bịara n’ụdị dịgasị iche iche, bụ́ ndị gụnyere ọrịa bubo na nsogbu nke oyi ịba n’ahụ́. Akpịrị bụ́ flea, nke na-adị n’ahụ́ òké karịsịa, busara ọrịa bubo, ebe ihe ndị bu ọrịa ahụ kwapụtara n’ụkwara busakarịrị nsogbu nke oyi ịba mmadụ n’ahụ́.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 15]

N’ime iri afọ abụọ, ọnụ ọgụgụ ndị nwụrụ n’ọrịa AIDS bịara hawa ka nke ndị nwụrụ n’ihe otiti ahụ kpara Eurasia aka ọjọọ na narị afọ nke 14

[Igbe/Foto ndị dị na peeji nke 16]

Ọdịiche Dị n’Etiti Ihe Ọmụma na Nkwenkwe Ụgha

Na narị afọ nke 14, mgbe Ọnwụ Ojii yiri ezinụlọ popu egwu n’Avignon, dọkịta ya gwara ya na isi ihe kpatara ihe otiti ọrịa ahụ bụ njikọ e jikọrọ mbara ala atọ—Saturn, Jupiter, na Mars—n’akara nke Aquarius.

Ihe dị ka narị afọ anọ mgbe e mesịrị, George Washington bu ọnyá akpịrị lakpuo ụra. Ndị dọkịta atọ a ma ama nwara ịgwọ ọrịa ahụ site n’ịmịpụ ihe dị ka lita ọbara 2 n’akwara ya. N’ime awa ole na ole, onye ọrịa ahụ nwụrụ. Ịmịpụ mmadụ ọbara n’ahụ́ bụụrụ usoro ọgwụgwọ e ji mee ihe ruo afọ 2,500—site n’oge Hippocrates ruo n’etiti narị afọ nke 19.

N’agbanyeghị na nkwenkwe ụgha na ọdịnala mere ka a ghara inwe ọganihu ngwa ngwa na nkà ọgwụ na ahụ́ ike, ndị dọkịta, bụ́ ndị tinyere uche ha n’ọrụ ha, rụsiri ọrụ ike iji chọpụta ihe ndị na-akpata ọrịa ndị na-efe efe na ọgwụ ha. N’okpuru ebe a, e depụtara ọganihu ole na ole dị ịrịba ama ha nwere.

Kịtịkpa. N’afọ 1798, Edward Jenner mepụtara ọgwụ kịtịkpa n’ụzọ gara nke ọma. N’ime narị afọ nke 20, ụdị dị iche iche nke ọgwụ mgbochi ọrịa rụrụ ọrụ nke ọma n’igbochi ọrịa ndị ọzọ, dị ka polio, ịba anya odo, na arụbara.

Ụkwara nta. N’afọ 1882, Robert Koch chọpụtara nje bacteria na-akpata ụkwara nta, o mepụtakwara ụzọ a ga-esi na-ele ahụ́ iji chọpụta onye bu ọrịa ahụ. Ihe dị ka afọ 60 mgbe e mesịrị, a chọpụtara streptomycin, bụ́ ọgwụ nje dị irè n’ịgwọ ụkwara nta. Ọgwụ a bakwara uru n’ịgwọ ọrịa bubo.

Ọrịa ịba. Site na narị afọ nke 17 gaa n’ihu, quinine—nke e nwetara n’ụgbụgbọ osisi cinchona—zọpụtara ndụ nke ọtụtụ nde ndị na-arịa ọrịa ịba. N’afọ 1897, Ronald Ross chọpụtara na ọ bụ ụdị anwụnta bụ́ Anopheles na-ebufe ọrịa ahụ, e mesịkwara kwalite usoro nchịkwa anwụnta iji belata ọnụ ọgụgụ ndị na-anwụ ná mba ndị dị n’ebe okpomọkụ ụwa.

[Foto]

Chaatị Zodiac (n’elu) nakwa usoro nke ịmịpụ mmadụ ọbara n’ahụ́

[Ebe E Si Nweta Foto]

Ha abụọ: Biblioteca Histórica “Marqués de Valdecilla”

[Foto ndị dị na peeji nke 13]

Taa, nje ụkwara nta ndị na-apụtaghachi na-egbu ihe dị ka nde mmadụ abụọ kwa afọ

[Ebe E Sigasị Nweta Foto]

X ray: Ụlọ Akwụkwọ Ahụ́ Ike nke New Jersey–Ụlọ Ọrụ Mba Na-ahụ Maka Ụkwara Nta; nwoke: Foto: WHO/Thierry Falise

[Foto dị na peeji nke 14]

Ihe osise ndị Germany a tụrụ n’ahụ́ ájá n’ihe dị ka afọ 1500, nke na-egosi dọkịta nke kpu ihu nnụnụ iji chebe onwe ya pụọ n’Ọnwụ Ojii. Ọnụ ya nwere ihe na-esi isi ụtọ

[Ebe E Si Nweta Foto]

Godo-Foto

[Foto dị na peeji nke 14]

Nje “bacteria” nke kpatara ntiwapụ nke ọrịa “bubo” ahụ

[Ebe E Si Nweta Foto]

© Gary Gaugler/Visuals Unlimited