Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Mgbe Ọ Na-adịghị Onye Owu Ga-ama Ọzọ

Mgbe Ọ Na-adịghị Onye Owu Ga-ama Ọzọ

Mgbe Ọ Na-adịghị Onye Owu Ga-ama Ọzọ

IHE ndekọ dị na Jenesis 2:18 na-ekwu na mgbe e kere mmadụ mbụ ahụ, “Jehova, bụ́ Chineke, wee sị, Ọ dịghị mma ka mmadụ ahụ nọọ nanị ya; M ga-emere ya onye inyeaka kwesịrị ya.” E kere ụmụ mmadụ iso ndị ọzọ na-anọ na ịdabere n’ebe ha nọ.

Enyi kasị mma anyị pụrụ inwe bụ Jehova Chineke. Pọl onyeozi na-akọwa Jehova dị ka “Nna nke obi ebere na Chineke nke nkasi obi nile, bụ́ onye na-akasi anyị obi ná mkpagbu nile anyị.” (2 Ndị Kọrint 1:3, 4) Jehova n’onwe ya na-egosipụta mwute maka ahụhụ onye nke ọ bụla n’ime ndị ohu ya na-ata. Ọ bụ Chineke nke nwere mmetụta ọmịiko. “Ya onwe ya maara otú a kpụworo anyị; Ọ na-echeta na ájá ka anyị bụ.” (Abụ Ọma 103:14) Ị́ naghị enwe mmetụta nke ịbụ onye a na-adọta n’ebe Jehova Chineke nọ ma na-enwe ekele maka nlekọta o ji ịhụnanya, obiọma, na nghọta na-elekọta gị?

Jehova Na-enye Ndị Owu Na-ama Nkwado

N’oge ndị gara aga, ọtụtụ n’ime ndị ohu Chineke dabara n’ọnọdụ ndị mere ka owu maa ha. Jehova bụụrụ ha isi iyi nke nkwado na nkasi obi. Were, dị ka ihe atụ, Jeremaịa, bụ́ onye a kpọrọ ịbụ onye amụma mgbe ọ ka bụ nwa okorobịa. N’ime mmadụ 40 dere Akwụkwọ Nsọ, ikekwe ọ bụ Jeremaịa kasị kwupụta mmetụta ya. Mgbe ọ natara ọrụ mbụ ya site n’aka Chineke, ụjọ tụrụ ya, o chekwara na ya erughị eru. (Jeremaịa 1:6) Iji rụzuo ya, ọ ghaghị ịdabere kpam kpam n’ebe Jehova nọ. N’eziokwu, Jehova nọnyeere ya “dị ka dike nke na-eme ka a maa jijiji.”—Jeremaịa 1:18, 19; 20:11.

Ihe dị ka afọ 300 tupu a mụọ Jeremaịa, mgbe Eze Nwanyị Jezibel nụrụ banyere ọnwụ nke ndị amụma Bel ya, ọ ṅụrụ iyi na ya ga-egburịrị Ịlaịja. Ịlaịja gbagara ebe dị ihe dị ka kilomita 450 bụ́ Horeb nke dị n’Ọwara Oké Osimiri Saịnaị. N’ebe ahụ, ọ banyere n’ọgba iji nọọ ọnọdụ abalị, Jehova Chineke wee jụọ ya ajụjụ a: “Gịnị ka ị na-eme n’ebe a, Ịlaịja?” Ịlaịja kọwara na ya chere na ọ bụ nanị ya bụ onye na-efe Jehova ofufe n’Izrel nile, onye amụma nanị ya fọdụrụ nke na-anụrụ ozi Chineke ọkụ n’obi. Jehova mesiri ya obi ike na ọ bụghị nanị ya nọ. Jehova nọnyeere ya, ndị Izrel 7,000 ha na Ịlaịja na-efe Chineke nọkwa ya, ọ bụ ezie na ọ maghị. Jehova kasiri Ịlaịja obi ma wusikwuo okwukwe ya ike. Ọ kpaliri Ịlaịja ime ihe, na-agba onye amụma ahụ ume ka ọ ghara ịda mbà n’ọrụ e nyere ya. (1 Ndị Eze 19:4, 9-12, 15-18) Ọ bụrụ na, dị ka Ịlaịja, anyị enwee mmetụta nke ịbụ ndị owu na-ama ma ọ bụ ndị na-abaghị uru mgbe ọ bụla, anyị onwe anyị pụkwara ikpegara Jehova ekpere ka o nye anyị ume. Ọzọkwa, site n’iji nghọta na-eme ihe, Ndị Kraịst bụ́ ndị okenye pụrụ ịgụgụ ndị na-ekwesị ntụkwasị obi, na-enyere ha aka ịhụ òkè ha na-ekere ná mmezu nke nzube Chineke.—1 Ndị Tesalonaịka 5:14.

Site n’ihe atụ ndị a nakwa ndị ọzọ, anyị pụrụ ịghọta njikere Jehova dị n’ịkwado nakwa n’iji ịhụnanya na-akasi ndị owu na-ama obi. Ee, “Jehova bụkwaara onye a na-azọpịa ụlọ elu, bụ́ ụlọ elu nke dịịrị mgbe nile nke mkpa.”—Abụ Ọma 9:9; 46:1; Nehum 1:7.

Nwoke nke Nwere Mmetụta Miri Emi na Ọmịiko

Jizọs Kraịst bụ ihe atụ nke onye e kwesịrị inwe mmasị n’ebe ọ nọ n’ihi mmetụta dịziri nnọọ adịzi o nwere, bụ́ nke ọ mụtara n’aka Jehova. Luk na-akọwa ihe Jizọs mere mgbe ọ hụrụ ìgwè mmadụ bu ozu na-aga ili n’obodo Nen: “E nwere onye nwụrụ anwụ a na-ebupụ, bụ́ nanị nwa nwoke nne ya mụrụ. . . . Mgbe Onyenwe anyị hụkwara ya, o nwere ọmịiko n’ebe ọ nọ, o wee sị ya: ‘Kwụsị ịkwa ákwá.’ Mgbe nke ahụ mere, ọ garuru nso ma bitụ ihe ahụ e ji ebu ozu aka, ndị bu ya wee guzoro n’otu ebe, o wee sị: ‘Nwa okorobịa, asị m gị, Bilie!’ Onye ahụ nwụrụ anwụ wee bilie nọrọ ọdụ ma malite ikwu okwu, o wee kpọnye ya nne ya.” (Luk 7:12-15) A kpaliri mmetụta uche Jizọs. Ọ bụ nwoke ọmịiko. Chegodị echiche banyere obi ụtọ Jizọs wetaara nwanyị ahụ di ya nwụrụ nke owu na-ama mgbe ọ kpọliteere ya nwa ya n’ọnwụ! Owu amaghịzi ya ọzọ.

Anyị pụrụ ịbụ ndị e mesighachiri obi ike na Jizọs bụ onye pụrụ “imetara anyị ebere n’adịghị ike anyị.” Ọ na-emetara ndị ụzọ ha ziri ezi, bụ́kwa ndị owu na-ama, ebere n’ezie. N’eziokwu, site n’aka ya, ‘anyị pụrụ ịbụ ndị e meere ebere, anyị enwetakwa obiọma na-erughịrị mmadụ maka enyemaka n’oge kwesịrị ekwesị.’ (Ndị Hibru 4:15, 16) Site n’iṅomi Jizọs, anyị pụrụ ịmalite imetara ndị na-eru újú, ndị na-ata ahụhụ, na ndị owu na-ama, ebere. Ọ bụrụ na anyị na-enyere ndị ọzọ aka, o yikarịghị ka owu ọ̀ ga-ama anyị. Ma, a ka nwere ụzọ ọzọ anyị pụrụ isi nweta enyemaka n’imeri mmetụta na-adịghị mma nke owu ọmụma.

Okwu Jehova Pụrụ Inyere Anyị Aka Imeri Owu Ọmụma

Ọtụtụ ndị achọpụtawo na ‘site ná nkasi obi sitere n’Akwụkwọ Nsọ, anyị na-enwe olileanya.’ Ndụmọdụ ndị dị irè bụ́ ndị pụrụ inyere anyị aka imeri owu ọmụma jupụtara n’Okwu Chineke. (Ndị Rom 15:4; Abụ Ọma 32:8) Dị ka ihe atụ, Okwu Chineke na-adụ anyị ọdụ ‘ịghara iche banyere onwe ya karịa ka ọ dị mkpa iche.’ (Ndị Rom 12:3) Iji tinye ndụmọdụ a n’ọrụ, ọ pụrụ ịdị anyị mkpa ime mgbanwe n’ụzọ anyị si eche echiche. Ịdị umeala n’obi na ịma ebe ike anyị ruru ga-enyere anyị aka n’ezie inwe atụmanya kwesịrị ekwesị na ndị ezi uche dị na ha. Okwu Chineke na-adụkwa anyị ọdụ ịzụlite ezi mmasị n’ebe ndị ọzọ nọ. (Ndị Filipaị 2:4) Nke a bụ egwuregwu nkịta, ị daara m, mụ adaara gị. Ka ị na-agbalị inwe ezi mmasị n’ebe ndị ọzọ nọ, ha ga-agbalịkwa inwe ezi mmasị n’ebe ị nọ. Ezi mmekọrịta a na-enye aka eme ka a gharazie inwe echiche nke ịtọgbọ chakoo, ọ na-emekwa ka ndụ anyị nwee nzube.

Bible na-agba anyị ume dị ka Ndị Kraịst ‘ịghara ịdị na-ahapụ nzukọ nke anyị onwe anyị.’ (Ndị Hibru 10:24, 25) Ya mere, na-eme ihe ndị dị mma, dị ka ịgachi nzukọ nke Ndịàmà Jehova anya. Ihe ịrụ ụka adịghị ya na nzukọ Ndị Kraịst pụrụ iso mee ka ahụ́ gbasie anyị ike n’ụzọ ime mmụọ, n’ụzọ mmetụta uche, nakwa n’ụzọ anụ ahụ́. Izi ndị ọzọ ozi ọma Alaeze Chineke bụ ụzọ dị ụtọ isi mee ka ndụ anyị jupụta n’ihe ndị na-ewuli elu. Ọ na-eme ka uche anyị dịgide n’ihe ndị kwesịrị ekwesị, na-ewusi okwukwe anyị ike, na-echebekwa olileanya anyị.—Ndị Efesọs 6:14-17.

Bịaruo Jehova nso n’ekpere. Devid gbara ume, sị: “Tụkwasị Jehova ihe O nyeworo gị dị ka ibu, Ya onwe ya ga-anagidekwa gị.” (Abụ Ọma 55:22) Site n’ịmụ Okwu Chineke, ị ga-enwe obi ụtọ. (Abụ Ọma 1:1-3) Ọ bụrụ na owu ọmụma ejichie gị, tụgharịa uche ná nlekọta ịhụnanya Jehova dị ka e gosipụtara ya n’Okwu ya. Ọbụ abụ ahụ dere, sị: “Mkpụrụ obi m na-arapara n’ájá: dị ka okwu Gị si dị, mee ka m dị ndụ.”—Abụ Ọma 119:25.

Mgbe Ọ Na-adịghị Onye Ga-asị, “Owu Na-ama M”

Jehova Chineke ekwewo anyị nkwa ụwa ọhụrụ nke nchekasị, obi nkoropụ, na mmetụta ọjọọ na-agaghị adị na ya. Bible na-ekwu, sị: “Ọ ga-ehichapụkwa anya mmiri ọ bụla n’anya ha, ọnwụ agaghị adị ọzọ, iru újú ma ọ bụ mkpu ákwá ma ọ bụ ihe mgbu agaghịkwa adị ọzọ. Ihe mbụ agabigawo.” (Mkpughe 21:4) Ee, ụfọdụ n’ime ihe mbụ ndị ga-agabiga bụ nsogbu anụ ahụ́, nke uche, na nke mmetụta uche ndị anyị na-enwe taa.

Ndị ga-ejupụta n’ụwa ga-abụ ndị nwere omume enyi, bụ́ ndị ga-eme ka ndụ anyị ka mma. Jehova, site n’Alaeze eluigwe ya nke dị n’aka Jizọs Kraịst, ga-eme ka owu na-ama anyị laa ruo mgbe ebighị ebi. Ọ ga-enye anyị ihe ọhụrụ ndị dị ebube anyị ga na-eme n’ụwa paradaịs. Oge na-abịa n’isi nso mgbe anyị na-agaghị asịkwa ọzọ, “Owu na-ama m.”

[Foto dị na peeji nke 8, 9]

Site ná nkwado Jehova, owu agaghị ama anyị, ọbụna mgbe anyị nọ nanị anyị

[Foto ndị dị na peeji nke 10]

Gịnị ka ihe ndekọ Bible banyere Jeremaịa na Ịlaịja na-akụziri anyị?