Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Nchegbu Ọ̀ Na-egosi Enweghị Okwukwe?

Nchegbu Ọ̀ Na-egosi Enweghị Okwukwe?

Echiche nke Bible

Nchegbu Ọ̀ Na-egosi Enweghị Okwukwe?

“A MACHIBIDORO INWE NCHEGBU IWU.” Ná mmalite narị afọ nke 20, otu onye pastọ dere n’okpuru isiokwu a na inwe nchegbu maka ihe onwunwe abụghị nanị na o zighị ezi, kama na “ọ bụ mmehie dị oké njọ.” N’oge na-adịbeghị anya, otu onye na-ekiri ihe na-emenụ dere banyere imeri nchegbu na nchekasị, sị, “Inwe nchegbu na-egosi na anyị atụkwasịghị Chineke obi.”

Ebe ndị edemede abụọ ahụ gbakwasịrị ụkwụ wee ruo nkwubi okwu ha bụ n’Ozizi Elu Ugwu Jizọs, mgbe ọ sịrị: “Kwụsịnụ ichegbu onwe unu.” (Matiu 6:25) Ebe ọ bụ na nchegbu na-emetụta nnọọ ọtụtụ mmadụ taa, anyị pụrụ ịjụ, sị: Onye Kraịst ò kwesịrị inwe obi amamikpe n’ihi ichegbu onwe ya? Mmadụ ichegbu onwe ya, ọ̀ na-egosi enweghị okwukwe?

Chineke Na-aghọta Ezughị Okè Anyị

Bible adịghị akụzi na ọ bụ enweghị okwukwe na-akpata nchegbu nile. Ebe ọ bụ na anyị na-ebi ‘n’oge pụrụ iche nke siri ike obibi,’ ọ fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ihe na-agaghị ekwe omume ịnọ n’echegbughị onwe anyị ruo n’ókè ụfọdụ. (2 Timoti 3:1) Kwa ụbọchị, Ndị Kraịst na-ekwesị ntụkwasị obi na-anagide nchegbu ndị ahụ́ esighị ike, ịka nká, ajọ ọnọdụ akụ̀ na ụba, nsogbu ezinụlọ, ime mpụ, na nsogbu ndị ọzọ na-akpata. Ọbụna n’oge ochie, ndị ohu Chineke tụkwara egwu ma nwee nchekasị.

Tụlee ihe ndekọ Bible banyere Lọt. Chineke dụrụ ya ọdụ ịgbaga n’ugwu iji zere ịbụ onye e bibiri ná mbibi nke Sọdọm na Gọmọra. Otú ọ dị, Lọt malitere ichegbu onwe ya. O kwuru, sị: “Ee e, biko, onyenwe m.” N’ịbụ onye obi na-akaghị, ọ gara n’ihu ikwu, sị: “Mụ onwe m apụghịkwa iwepụga onwe m jee ugwu, ka ihe ọjọọ ahụ wee ghara ịrapara n’ahụ́ m, m wee nwụọ.” N’ihi gịnị ka Lọt ji tụọ ụjọ ịgbaga n’ugwu? Bible ekwughị ihe kpatara ya. Ihe ọ sọrọ ya bụrụ ya kpatara ya, Lọt tụrụ nnọọ ụjọ. Olee otú Chineke si meghachi omume? Ọ̀ baara Lọt mba n’ihi enweghị okwukwe ma ọ bụ atụkwasịghị Ya obi? Ọ dịghị ma ọlị. N’ụzọ megidere nke ahụ, Jehova chebaara Lọt echiche, ma kwere ka ọ gbaga n’obodo dị nso.—Jenesis 19:18-22.

E nwere ihe atụ Bible ndị ọzọ kwuru banyere ndị ji ikwesị ntụkwasị obi fee ofufe, bụ́ ndị chegburu nnọọ onwe ha n’oge ụfọdụ. Ịlaịja onye amụma tụrụ egwu ma gbaa ọsọ ndụ mgbe e yisịrị ya egwu ọnwụ. (1 Ndị Eze 19:1-4) Mozis, Hana, Devid, Habakọk, Pọl, na ndị nwoke na ndị nwanyị ndị ọzọ okwukwe ha siri ike, kwupụtara nchegbu ha nwere. (Ọpụpụ 4:10; 1 Samuel 1:6; Abụ Ọma 55:5; Habakuk 1:2, 3; 2 Ndị Kọrint 11:28) N’agbanyeghị nke ahụ, Chineke gosiri ha ọmịiko ma nọgide jiri ha na-eme ihe n’ozi ya, si otú ahụ na-egosipụta na ya ghọtara ụmụ mmadụ na-ezughị okè nke ọma.

“Mmehie ahụ nke Na-ekegide Anyị n’Ụzọ Dị Mfe”

Otú ọ dị, ịnọgide na-echegbu onwe anyị pụrụ ime ka ike gwụ anyị ma mee ka anyị gharazie ịtụkwasị Chineke obi. Pọl onyeozi zoro enweghị okwukwe aka dị ka “mmehie ahụ nke na-ekegide anyị n’ụzọ dị mfe.” (Ndị Hibru 12:1) Site n’ịgụnye onwe ya, Pọl ma eleghị anya, na-ekweta na ya nwekwara ike ịbụ onye ịda mbà nke okwukwe pụrụ ‘ikegide n’ụzọ dị mfe’ n’oge ụfọdụ.

Ikekwe, otú ahụ ka ọ dị n’ebe Zekaraịa nọ mgbe ọ na-ekwetaghị n’ihe mmụọ ozi gwara ya na nwunye ya ga-atụrụ ime. N’otu oge, ndịozi Jizọs agwọlighị otu onye ọrịa n’ihi “okwukwe nta” ha. Otú ọ dị, ndị a nile nọgidere na-enweta ihu ọma Chineke.—Matiu 17:18-20; Luk 1:18, 20, 67; Jọn 17:26.

N’aka nke ọzọ, Bible nwekwara ihe atụ nke ndị kwụsịrị ịtụkwasị Chineke obi ma taa ahụhụ si n’ime ya pụta. Dị ka ihe atụ, e gbochiri ọtụtụ ndị Izrel so hapụ Ijipt ịbanye n’Ala Nkwa ahụ n’ihi enweghị okwukwe ha. N’otu mgbe, ha kwuru okwu ọbụna megide Chineke kpọmkwem, na-asị: “N’ihi gịnị ka unu meworo ka anyị si n’Ijipt rịgota ịnwụ n’ọzara nke a? n’ihi na achịcha adịghị, mmiri adịghịkwa.” Iji gosi na nke ahụ were Chineke iwe, e ziteere ha agwọ ọjọọ iji taa ha ahụhụ.—Ọnụ Ọgụgụ 21:5, 6.

Ndị bi n’obodo Jizọs, bụ́ Nazaret, enwetaghị ihe ùgwù nke ịbụ ndị a rụrụ ọrụ ebube ka ukwuu n’obodo ha n’ihi enweghị okwukwe ha. Ọzọkwa, ajọ ọgbọ nke oge ahụ natara okwu ọmụma ikpe siri ike site n’aka Jizọs, n’ihi enweghị okwukwe. (Matiu 13:58; 17:17; Ndị Hibru 3:19) N’ụzọ dabara adaba, Pọl onyeozi dọrọ aka ná ntị, sị: “Lezienụ anya, ụmụnna m, ka ajọ obi nke na-enweghị okwukwe ghara ibilite n’ime onye ọ bụla n’ime unu site n’iwezụga onwe ya n’ebe Chineke ahụ nke dị ndụ nọ.”—Ndị Hibru 3:12.

Ee, n’ọnọdụ ndị gabigara ókè, enweghị okwukwe pụrụ isite n’ajọ obi. Ma ọ dịghị otú ahụ n’ebe Zekaraịa na ndịozi Jizọs nọ, bụ́ ndị a kpọtụrụ aha n’ihe atụ ndị ahụ e nyere na mbụ. Enweghị okwukwe ha sitere n’adịghị ike nke dịruru nanị nwa oge. Ụzọ ndụ ha n’ozuzu gosiri na ha dị “ọcha n’obi.”—Matiu 5:8.

Chineke Maara Ihe Ndị Na-akpa Anyị

Akwụkwọ Nsọ na-enyere anyị aka ịghọta ọdịiche dị n’etiti nchegbu nkịtị na mmehie nke enweghị okwukwe. E kwesịghị ile nchegbu a na-enwe kwa ụbọchị ma ọ bụ ọbụna enweghị okwukwe ruo nwa oge n’ihi adịghị ike nke mmadụ anya dị ka enweghị ntụkwasị obi n’ebe Chineke nọ kpam kpam, bụ́ nke na-esite n’ajọ obi na-adịghị anabata ihe. Ya mere, ọ dịghị mkpa ka Ndị Kraịst na-enwe obi amamikpe nanị n’ihi na ha na-enwe nchegbu site n’oge ruo n’oge.

Otú o sina dị, ọ dị anyị mkpa ịkpachara anya ka nchegbu anyị ghara ịgabiga ókè ma na-achịkwazi ndụ anyị. N’ihi ya, Jizọs ji amamihe kwuo, sị: “Ya adịla mgbe unu ga-echegbu onwe unu wee sị, ‘Gịnị ka anyị ga-eri?’ ma ọ bụ, ‘Gịnị ka anyị ga-aṅụ?’ ma ọ bụ, ‘Gịnị ka anyị ga-eyikwasị?’” O ji okwu nkasi obi sochie nke a, sị: “N’ihi na Nna unu nke eluigwe maara na ihe ndị a nile dị unu mkpa. Ya mere, nọgidenụ buru ụzọ na-achọ alaeze ahụ na ezi omume ya, a ga-atụkwasịkwara unu ihe ọzọ ndị a nile.”—Matiu 6:25-33.

[Foto dị na peeji nke 24]

Pọl onyeozi chegburu onwe ya