Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

N’ihi Gịnị Ka Ọtụtụ Mmadụ Ji Enwe Azụ̀zụ̀ Hay?

N’ihi Gịnị Ka Ọtụtụ Mmadụ Ji Enwe Azụ̀zụ̀ Hay?

N’ihi Gịnị Ka Ọtụtụ Mmadụ Ji Enwe Azụ̀zụ̀ Hay?

Site n’aka onye edemede Teta! na Spen

ANYA na-akọ gị ọkọ ma na-agba mmiri, gị ana-eze uzere kwa ụbọchị, imi ana-arịkwa gị mgbe nile, iku ume ana-esikwara gị ike. Ọ̀ bụ gịnị na-eme gị? Ọ pụrụ ịbụ na i nwere azụ̀zụ̀ nkịtị. Ma, ọ bụrụ na ị na-enwe ihe mgbaàmà ndị a mgbe ị nọ n’ebe e nwere ntụ okooko osisi, ọ pụrụ ịbụ na ihe na-eme gị bụ azụ̀zụ̀ hay. Ọ bụrụ otú ahụ, i nwere ọtụtụ ndị ibe. Ọnụ ọgụgụ ndị a na-achọpụta na ha nwere azụ̀zụ̀ hay anọgidewo na-amụba kwa afọ.

“Azụ̀zụ̀ hay adịghị ihe ọzọ ọ bụ karịa mmeghachi omume gabigara ókè nke ahụ́ anyị na-emeghachi mgbe ihe ndị o weere dị ka ihe ndị dị ize ndụ batara n’ime ya,” ka magazin bụ́ Mujer de Hoy na-akọ. “N’ahụ́ nke ndị ahụ́ ha na-asọ ihe, usoro ahụ́ ji alụso ọrịa ọgụ na-ajụ ihe nile o weere dị ka ihe batara abata—gụnyere ntụ okooko osisi—n’agbanyeghị na ha adịghị ize ndụ n’ezie.” Mgbe usoro ahụ́ ji alụso ọrịa ọgụ meghachikwara omume n’ụzọ gabigara ókè otú a, ọ na-akpata ihe mgbaàmà ndị ahụ na-akpasu iwe a kọwara ná mmalite.

N’afọ 1819, otu dọkịta England bụ́ John Bostock kọwara azụ̀zụ̀ hay. Ọ bụ ya bụ onye mbụ kọwara ya. Bostock depụtara ihe mgbaàmà ndị na-agbakasị ahụ́ ọ na-enwe n’oge ndị azụ̀zụ̀ a na-eme ya. O kweere na ihe kpatara ihe mgbaàmà ndị ahụ bụ ahịhịa ndị e gbutere ọhụrụ, n’ihi ya, a kpọrọ nsogbu ahụ azụ̀zụ̀ hay (ahịhịa). Mgbe e mesịrị, a chọpụtara na ihe ndị na-akpata nsogbu ahụ bụ n’ezie ụdị dịgasị iche iche nke ntụ okooko osisi. Ná mmalite narị afọ nke 19, Bostock chọpụtara na ndị nwere nsogbu ahụ dị nnọọ ole na ole n’England nile.

Otú ọ dị, n’ihi gịnị ka e ji enwe ọtụtụ ndị azụ̀zụ̀ hay na-eme taa? Dr. Javier Subiza, bụ́ onye ntụzi ọrụ nke Ụlọ Ọrụ Na-ahụ Maka Ụkwara Ume Ọkụ na Ihe Ahụ́ Na-asọ Nsọ bụ́ nke dị na Madrid, Spen, kwupụtara echiche abụọ ndị nchọpụta na-eme nnyocha na ha. Otu echiche na-ekwu na ọ bụ injin ndị na-eji mmanụ diesel eme ihe na-akpata ya. A na-eche na ụmụ irighiri ihe ndị na-apụta mgbe mmanụ diesel na-ere n’injin pụrụ ime ka ihe ndị na-akpali ahụ́ ịsọ ihe malite ọrụ. Dị ka ọkà mmụta banyere ihe ahụ́ na-asọ nsọ bụ́ Dr. Juan Kothny Pommer, si kwuo, “ná mba ndị e ji nkà na ụzụ mara, azụ̀zụ̀ hay na-eme ihe ruru pasent 20 nke ndị bi na ha, ọ na-aka eme ndị nọ n’obodo ukwu.”

Echiche nke abụọ na-egosi na ihe na-akpata ya bụ nnọọ idewebiga ihe ọcha ókè. ‘A na-amụ anyị n’ụlọ ọgwụ, anyị na-eri nri ndị e ji ọgwụ chekwaa, a na-agba anyị ọgwụ iji gbochie ọtụtụ ọrịa, anyị na-aṅụkwa ọgwụ nje ozugbo ma anyị daa ọrịa. N’ihi ya, site n’oge anyị dị obere, e mere ka ikike ahụ́ anyị ji alụso ọrịa ọgụ bụrụ nke na-asọ ihe,’ ka Dr. Subiza na-akọwa.

Ọ bụrụ na ahụ́ gị na-asọbiga ihe ókè otú a, enwela nkụda mmụọ! Ọ bụrụ na a chọpụta ya ma nye gị ọgwụ ya, ọ ga-ekwe omume ịchịkwa na ibelata ugboro ole azụ̀zụ̀ hay na-adị eme gị na ókè ihe mgbaàmà ya ndị na-agbakasị ahụ́ na-esiru n’ike.