Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

N’ihi Gịnị Ka E Ji Nwee Ọtụtụ Ndị Owu Na-ama?

N’ihi Gịnị Ka E Ji Nwee Ọtụtụ Ndị Owu Na-ama?

N’ihi Gịnị Ka E Ji Nwee Ọtụtụ Ndị Owu Na-ama?

N’ỤWA taa, owu na-ama ọtụtụ mmadụ. Ọ na-emetụta ndị nọ n’afọ ndụ nile na ndị si n’agbụrụ nile, ndị nọ n’ọkwá nile, na ndị nọ n’okpukpe nile. Owu ọ̀ matụla gị? Owu ọ̀ na-ama gị ugbu a? N’ezie, anyị nile, n’otu oge ma ọ bụ n’oge ọzọ, anọtụla ná mkpa nke inwe enyi—mmadụ ige anyị ntị, imesighachi anyị obi ike, ma ọ bụ ikekwe ikwupụta na ọ ghọtara otú obi dị anyị, nakwa ịghọta anyị dị ka mmadụ. Ọ dị anyị mkpa inwe onye na-echebara mmetụta anyị echiche.

Otú ọ dị, anyị ịnọ nanị anyị adịchaghị apụta na owu na-ama anyị. Mmadụ pụrụ ịnọ nanị ya ruo ogologo oge, na-anụ ụtọ ihe ọ na-eme, n’enwetụghị mmetụta nke ịbụ onye owu na-ama. N’ụzọ dị iche, e nwere ndị na-agatụghị anọli nanị ha. Akwụkwọ bụ́ The American Heritage Dictionary na-ekwu, sị: ‘Mmadụ ịnọ nanị ya na-egosi ịnọ n’ebe ndị ọzọ na-anọghị, ma ọ dịchaghị egosi na obi adịghị ya ụtọ. Owu ọmụma na-enyekarị echiche nke mmadụ ichegbu onwe ya n’ihi na ọ nọ nanị ya, ọ na-agụnyekwa ọchịchọ mmadụ ji mwute achọ onye ya na ya ga na-akpakọrịta,’ ya bụ, ọnọdụ nke iru újú, ahụhụ, ma ọ bụ obi ilu. Ọ na-adị onye ahụ mkpa ka a kasie ya obi site n’iji ezi obi na ịhụnanya soro ya na-akpakọrịta iji mee ka obi dịghachi ya ụtọ. N’ikpeazụ, a na-akọwa mmadụ ịnọrọ onwe ya dị ka ọnọdụ nke ‘ya na owu ọmụma na-apụtakarị otu ihe. Otú ọ dị, ọ na-egosikarị mmadụ iji aka ya kpebie ịnọpụ iche.’

Owu ọmụma bụ mmetụta siri ike, ọ pụkwara ịbụ nnọọ ihe na-ewute ewute. Ọ bụ mmetụta nke ịtọgbọ chakoo. Onye ahụ na-enwe mmetụta nke ịnọ nanị ya, nke ịbụ onye e kewapụrụ n’ebe mmadụ ndị ọzọ nọ. Anyị pụrụ ịghọ ndị obi na-esighị ike na ndị ụjọ na-atụ. Ì nwetụla ụdị mmetụta a? Gịnị na-akpata owu ọmụma?

Nsogbu na ọnọdụ dị iche iche na-enwe mmetụta dịgasị iche iche n’ahụ́ ndị mmadụ. Ikekwe, ọ na-adị gị ka ndị ọgbọ gị hà jụrụ gị n’ihi ọdịdị elu ahụ́ gị, agbụrụ gị, ma ọ bụ okpukpe gị. Ịgbanwe gburugburu ebe ị nọ—dị ka ịbanye ụlọ akwụkwọ ọhụrụ, ịmalite ọrụ ọhụrụ, ma ọ bụ ịkwaga n’ógbè, n’obodo, ma ọ bụ ná mba ọhụrụ—pụrụ ime ka owu mawa gị n’ihi na ị ghaghị ịhapụ ndị enyi ochie gị. Mmadụ ịbụ onye nne ma ọ bụ nna ya ma ọ bụkwanụ di ma ọ bụ nwunye ya nwụnahụrụ pụrụ ịkpata owu ọmụma, ikekwe ruo ọtụtụ afọ. Ọzọkwa, ka anyị na-emekwu okenye, ndị enyi na ndị anyị na ha dị ná mma na-agbanwe, na-ebelata, ma ọ bụkwanụ na-anwụsị.

Mmadụ ịlụ di ma ọ bụ nwunye adịghị eme ka e jide n’aka mgbe nile na ọ ga-enwere onwe ya pụọ n’owu ọmụma. Ịghọtahie ibe ha ma ọ bụ enweghị nkwekọrịta pụrụ ịkpata nrụgide bụ́ nke pụrụ ime ka e nwewa obi abụọ, ọ pụkwara ọbụna ime ka di na nwunye na ụmụ ha na-anọpụrụ onwe ha iche. Ma, e wezụga owu ọmụma nke ọnwụ onye a hụrụ n’anya, ịgba alụkwaghịm, nnọpụ iche, ma ọ bụ nkụda mmụọ kpatara, e nwere ụdị owu ọmụma ọzọ nke pụrụ imetụta anyị n’ụzọ dị ukwuu. Nke a na-eme mgbe anyị na Chineke na-adịghịzi enwe ezi mmekọrịta, ya adịkwa anyị ka è kewapụrụ anyị n’ebe ọ nọ.

Ọ̀ dịtụla nke ọ bụla ị nọrọla na ya n’ime ọnọdụ ndị ahụ e kwuru banyere ha n’elu? Ọ̀ ga-ekwe omume ịnagide owu ọmụma?

[Foto ndị dị na peeji nke 4]

Mgbanwe ndị a na-enwe ná ndụ, site n’ịbanye ụlọ akwụkwọ ọhụrụ ruo n’ịbụ onye di ma ọ bụ nwunye ya nwụnahụrụ, pụrụ ịkpata owu ọmụma