Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ọṅụ na Ihe Ịma Aka Ndị A Na-enwe n’Oge Uto

Ọṅụ na Ihe Ịma Aka Ndị A Na-enwe n’Oge Uto

Ọṅụ na Ihe Ịma Aka Ndị A Na-enwe n’Oge Uto

OGE uto pụrụ ịbụ oge magburu onwe ya ná ndụ. N’ezie, otú ahụ ka ọ dị nye ọtụtụ ndị. Ọtụtụ ndị okenye na-ejikwa obi ụtọ echeta oge ha dị afọ iri na ụma.

N’otu mgbe ahụ, anyị aghaghị ịghọta na anyị na-ebi ‘n’oge pụrụ iche nke siri ike obibi.’ (2 Timoti 3:1) Nke a emewo ka ndị ntorobịa na-enwekwu nrụgide, nrụgide ndị dị iche na nke ọgbọ ndị bu ụzọ nwetara. Ikekwe, ọ bụ nke a mere Sabrina Solin Weill, bụ́ onyeisi ndị editọ nke otu magazin na-ekwu banyere ndị nọ n’afọ iri na ụma, ji na-akọwa oge uto dị ka oge na-eweta nnọọ ihe ịma aka. Ọ dị ka mmadụ ịnọ na-aga ije n’elu eriri dị n’elu n’enweghị ihe ọ bụla ọ ga-aghọde aka ma ọ dawa. N’ezie, oge ndụ a pụrụ ịbụ nke na-agbagwoju anya, nke mmadụ pụrụ ịdị na-eche nnọọ na ya gbapụrụ iche, na nke na-eweta nchekasị. “N’ịbụ ndị banyerela n’afọ ndụ dị n’agbata oge ịbụ nwata na oge ịbụ okenye,” ka Weill na-ede, “ndị nọ n’afọ iri na ụma aghaghị ịnagide akụkụ ndị kasị njọ nke oge ndụ abụọ ahụ.”

Ọ bụrụ na ị nọ n’oge uto, olee otú ị pụrụ isi na-anagide ihe ịma aka ndị ị na-enweta? Ọ bụrụ na ị bụ nne ma ọ bụ nna nke onye nọ n’oge uto, olee otú a pụrụ isi nyere gị aka icheta ihe afọ ndị a dị mgbagwoju anya dịịrị ka ya, ma si otú ahụ ghọta, n’ụzọ ka mma, ihe nwa gị nwoke ma ọ bụ nwa gị nwanyị na-agabiga? N’usoro isiokwu a, anyị na-agba ma ndị ntorobịa ma ndị okenye ume ilebakwu anya n’oge uto. Ọ bụghị nanị na ime nke a ga-enyere ndị ntorobịa aka ịnagide ọnọdụ ha, kamakwa ọ ga-enyere ha aka inwe ihe ịga nke ọma.