Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

“Ọchịchị Ime Obodo Ekwesịghị Ime Onwe Ya Onye Nchịkwa nke Ndụ Ndị Ọzọ”

“Ọchịchị Ime Obodo Ekwesịghị Ime Onwe Ya Onye Nchịkwa nke Ndụ Ndị Ọzọ”

“Ọchịchị Ime Obodo Ekwesịghị Ime Onwe Ya Onye Nchịkwa nke Ndụ Ndị Ọzọ”

SITE N’AKA ONYE EDEMEDE TETA! NA CANADA

AKWỤKWỌ Iwu Canada Banyere Ihe Ndị Ruuru Mmadụ na Nnwere Onwe na-echebe nnwere onwe nke ụmụ amaala nile nke Canada. Iwu obodo ahụ kwadoro nnwere onwe ikwu okwu, ibipụta akwụkwọ, na ikpe okpukpe, ụlọikpe na-ahụkwa na a gbasoro ya.

N’ihi ya, mgbe obodo Blainville, bụ́ ógbè dị n’ebe ugwu ọdịda anyanwụ nke Montreal, chọrọ idezigharị iwu ha iji mee ka ọ bụrụ iwu na mmadụ ga-anatarịrị ikike iji mee ‘nleta ụlọ n’ụlọ maka ihe ọ bụla metụtara okpukpe,’ ọ dọọrọ mmasị Ndịàmà Jehova. Iwu ahụ e mere atụmatụ iti ga-emetụta kpọmkwem ozi ụlọ n’ụlọ ha. (Ọrụ 20:20, 21) Ma n’ihi gịnị ka e ji welite ndezigharị ahụ? Ndị ọchịchị obodo ahụ zọọrọ na e nwere ọtụtụ mkpesa banyere ọgịga Ndịàmà Jehova na-aga site n’ụlọ ruo n’ụlọ. Otú ọ dị, dị ka ihe ndekọ nke ngalaba ndị uwe ojii si egosi, n’ime afọ ise ndị gara aga, e mebeghị otu mkpesa banyere ihe omume nke Ndịàmà Jehova!

Ka o sina dị, ndezigharị ahụ ghọrọ iwu n’afọ 1996. Ndị ọkàiwu na-ekpechitere Ndịàmà Jehova nọ na Blainville mere ka obodo ahụ mara na n’ihi nkwado iwu kwadoro nnwere onwe okpukpe, ọ ga-abụ ihe megidere iwu bụ́ obodo ahụ iji iwu ahụ na-aghanye ájá n’ihe omume Ndịàmà Jehova. Ndị ọchịchị obodo ahụ leghaara okwu a anya ma gaa n’ihu n’ịkpụpụ mmadụ 17 n’ụlọikpe. Ndị ọkàiwu na-ekpechitere Ndịàmà meghachiri omume site n’ịgba akwụkwọ n’ụlọikpe iji gbochie obodo Blainville ịmachibido nnwere onwe okpukpe na nnwere onwe ikwu okwu—ihe ndị ruuru ụmụ amaala nile nke Canada.

E tinyere okwu ahụ ọnụ n’Ụlọikpe Ka Elu nke Quebec n’ihu Ọkàikpe Ukwu bụ́ Jean Crépeau n’October 3 nakwa n’October 4, n’afọ 2000. Mgbe a tụlesịrị okwu ahụ, ọkàikpe ahụ kpelaara Ndịàmà Jehova. Ọkàikpe Ukwu bụ́ Crépeau kwetara “na ndị gbara akwụkwọ ahụ na-agbaso nzọụkwụ nke ọgbakọ Ndị Kraịst mbụ n’ịga site n’ụlọ ruo n’ụlọ nke ndị bi n’ógbè ha iji gbaa ndị mmadụ ume ịnọgide na-enwe àgwà na ọnọdụ ime mmụọ dị nnọọ mma. . . . Ime nleta n’ebe obibi ndị mmadụ so n’ozi Ndị Kraịst na-ejere obodo. Ndịàmà Jehova na-eleta ndị bi na Blainville ihe dị ka otu ugbo n’ime ọnwa anọ ọ bụla iji soro ha kwurịta isiokwu ndị na-ewuli elu na ndị baara mmadụ nile uru.” Ná mkpebi ikpe ya, Ọkàikpe Ukwu ahụ bụ́ Crépeau kwuru, sị: “[Ụlọikpe a] na-ekwupụta na Ndịàmà Jehova agaghị eso ná ndị ga-anata akwụkwọ ikike iji jee ozi ha.”

Blainville tinyere akwụkwọ n’Ụlọikpe Mkpegharị Ikpe nke Quebec ka e kpegharịa ikpe ahụ Ọkàikpe Ukwu bụ́ Crépeau kpebiri. E tinyere ọnụ ná mkpegharị ikpe ahụ na June 17, 2003, e kpebikwara ikpe ahụ n’August 27, 2003, na-akwado mkpebi nke ọkàikpe mbụ ahụ. N’izo aka n’Akwụkwọ Iwu Canada Banyere Ihe Ndị Ruuru Mmadụ na Nnwere Onwe, bụ́ nke na-echebe nnwere onwe okpukpe ma na-agụnye oruru o ruuru mmadụ igosipụta nkwenkwe okpukpe ya site n’ịkụzi na ikesa ihe ọmụma, Ụlọikpe ahụ kwupụtara, sị: “Iwu ahụ na-ese okwu machibidoro nnọọ nnwere onwe okpukpe nke Ndịàmà Jehova na nnwere onwe nke echiche, nke nkwenkwe, nakwa nke ikwu okwu nke ụmụ amaala Blainville . . . Ihe àmà na-egosi na ndị bi na Blainville adịghị eme mkpesa na nleta Ndịàmà Jehova na-eleta ha ezighị ezi kama mkpesa ha na-eme bụ banyere ndị ahịa ngagharị. E nweghị mkpa dị ukwuu nke chọrọ ka e mee ihe ngwa ngwa n’ịchịkwa ọgịga a na-aga n’ụlọ n’ụlọ n’ịkpọsa ihe ndị metụtara okpukpe. Ọzọkwa, e jighị nlezianya depụta iwu ahụ e tiri, ọ bụkwa nke e ji ọkụ ọkụ mee ka ọ ghọọ iwu n’ebughị ụzọ jụọ ase, ezi uche adịghịkwa na ya, ọ gabigakwara ókè ma a bịa n’ihe e kwuru na ọ bụ nzube e ji tie ya, nke bụ́ ichebe ihe ndị dịịrị nanị onwe onye. . . . N’obodo ebe mmadụ nweere onwe ya ma na-ekwu uche ya, ọchịchị ime obodo ekwesịghị ime onwe ya onye nchịkwa nke ndụ ndị ọzọ site n’ịnwa ikpebi ndị ndị obodo pụrụ ịnabata n’ebe obibi ha ná mgbede ma ọ bụ ná ngwụsị izu. Ọkàikpe nke mbụ ahụ ziri ezi n’ikwu na iwu ahụ na-ese okwu enweghị ikike n’ebe Ndịàmà Jehova nọ.”

Ndịàmà Jehova na-aṅụrị ọṅụ na ụlọikpe ndị dị na Quebec etinyewo Akwụkwọ Iwu Banyere Ihe Ndị Ruuru Mmadụ n’ọrụ n’okwu a iji chebe nnwere onwe okpukpe nke ụmụ amaala nile nke Quebec pụọ ná mmegbu na-enweghị isi.

[Map dị na peeji 10]

(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)

CANADA

Blainville

Montreal

U.S.A.

[Foto dị na peeji nke 10]

Akwụkwọ Iwu Canada Banyere Ihe Ndị Ruuru Mmadụ na Nnwere Onwe na-echebe nnwere onwe nke ụmụ amaala nile nke Canada

[Foto ndị dị na peeji nke 11]

Ndịàmà pụziri ikere òkè n’ozi ihu ọha na Blainville n’enweghị nsogbu. Foto nke obere: Ka ha zukọrọ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze ha