Gịnị Ka Ịbụ Onyeisi Ezinụlọ Pụtara?
Echiche nke Bible
Gịnị Ka Ịbụ Onyeisi Ezinụlọ Pụtara?
DỊ KA Bible si kwuo, “isi nke nwanyị bụ nwoke.” (1 Ndị Kọrint 11:3; Ndị Efesọs 5:23) Ma ọtụtụ, bụ́ ndị na-azọrọ na ha na-akwanyere Bible ùgwù na-eche na ụkpụrụ a nke mere di onyeisi abụghị nanị na ọ bụzi ihe mgbe ochie kamakwa na ọ dị ize ndụ. “Ozizi bụ́ na ụmụ nwanyị kwesịrị ‘iji obiọma na-edo onwe ha n’okpuru’ [di ha], ọ bụrụ na e mesie ya ike gabiga ókè, pụrụ iduga ná mmekpọ ọnụ, ma n’ụzọ anụ ahụ́ ma n’ụzọ mmetụta uche,” ka otu di na nwunye na-ekwu. N’ụzọ dị mwute, iji ịbụisi eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi jupụtara nnọọ ebe nile. Otu onye edemede na-ede, sị: “N’ọtụtụ mba, a na-ewere mmadụ iti nwunye ya ihe dị ka ihe na-adịghị ihe o mere—ihe ruuru ndị ikom bụ́ nke a na-aja mma n’abụ, n’ilu, nakwa n’ememe agbamakwụkwọ.”
Ụfọdụ na-atụ aro na ọ bụ ụkpụrụ Bible nke metụtara ịbụisi kpatara mmekpọ ọnụ ndị a. Ozizi Bible nke ịbụisi ọ̀ na-ewetu ụmụ nwanyị ala ma na-akwado ime ihe ike n’ebe obibi? Gịnị n’ezie ka ịbụ onyeisi ezinụlọ pụtara? *
Ịbụisi Abụghị Ọchịchị Aka Ike
Ịbụisi nke Bible kwuru banyere ya bụ ndokwa ịhụnanya, ọ pụtaghị ọchịchị aka ike. Ọ bụ ileghara ịbụisi nke Chineke setịpụrụ anya mere ndị ikom na-ejikarị achị ndị inyom n’aka ike. (Jenesis 3:16) Kemgbe a chụpụsịrị mmadụ n’ogige Iden, ndị ikom ejiwo ike ha mee ihe ugboro ugboro n’ụzọ na-ezighị ezi, jiri obi ịta mmiri na-emegbu ndị ọzọ, nke na-agụnye ndị inyom na ụmụaka.
Otú ọ dị, ọ dịghị mgbe nke ahụ so ná nzube Chineke. Jehova na-akpọ ndị na-eji ikike ha eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi asị. Ọ katọrọ ndị ikom Izrel bụ́ ndị “ghọgbuworo” nwunye ha. (Malakaị 2:13-16) Ọzọkwa, Chineke na-ekwu na “onye na-ahụ ihe ike n’anya ka mkpụrụ obi Ya na-akpọ asị.” (Abụ Ọma 11:5) Ya mere, ndị na-eti nwunye ha ihe na ndị na-emegbu nwunye ha n’ụzọ ndị ọzọ apụghị n’ụzọ ọ bụla iji Bible kwadoo omume ihe ike ha.
Gịnị Ka Ịbụisi n’Ụzọ Kwesịrị Ekwesị Na-agụnye?
Ịbụisi bụ ndokwa bụ́ isi nke Chineke na-eji eme ka ihe na-aga n’usoro n’eluigwe na ala. Onye ọ bụla, e wezụga Chineke, nwere onye ha na-edo onwe ha n’okpuru ya. Ndị ikom na-edo onwe ha n’okpuru Kraịst, ụmụ na-edo onwe ha n’okpuru nne na nna ha, Ndị Kraịst nile na-edo onwe ha n’okpuru ndị ọchịchị. Ọbụna Jizọs na-edo onwe ya n’okpuru Chineke.—Ndị Rom 13:1; 1 Ndị Kọrint 11:3; 15:28; Ndị Efesọs 6:1.
Ido onwe onye n’okpuru ndị na-edu ndú dị mkpa iji nwee obodo na-aga nke ọma, nke kwụsiri ike. N’otu aka ahụ, ido onwe onye n’okpuru onyeisi ezinụlọ dị oké mkpa iji mee ka e nwee ezinụlọ kwụsịrị ike, nke obi ụtọ na nke dị n’udo. Enweghị di ma ọ bụ nna n’ime ezinụlọ adịghị agbanwe eziokwu a. N’ezinụlọ ndị dị otú ahụ, nne na-aghọ onyeisi ezinụlọ. Mgbe ma nne ma nna na-anọghị, nwa mbụ ma ọ bụ onye ikwu ọzọ pụrụ ịrụ ọrụ dị ka onyeisi ezinụlọ. N’ọnọdụ nile, ndị òtù ezinụlọ na-erite uru mgbe ha na-akwanyere onye ahụ e nyere ikike ịbụ onyeisi ezinụlọ ùgwù kwesịrị ekwesị.
Ya mere, ihe dị mkpa abụghị ịjụ ụkpụrụ ịbụisi, kama, ịmụ otú e si abụ isi nakwa ile ya anya n’ụzọ kwesịrị ekwesị. Pọl onyeozi na-agba Ndị Kraịst bụ́ di ume ịbụ isi n’ezinụlọ ha “dị ka Kraịst bụkwa isi nke ọgbakọ ahụ.” (Ndị Efesọs 5:21-23) N’ụzọ dị otú a, Pọl na-ezo ụzọ Kraịst si mesoo ọgbakọ ya aka dị ka ihe nlereanya nke ịbụisi zuru okè. Gịnị bụ ihe nlereanya nke Kraịst setịpụrụ?
Ọ bụ ezie na dị ka Mezaịa na Eze ọdịnihu, Jizọs nwetara ikike site n’aka Chineke n’onwe ya, nweekwa nnọọ ọgụgụ isi na ahụmahụ ná ndụ karịa ndị na-eso ụzọ ya, o nwere ịhụnanya na ọmịiko. Ọ dịghị mgbe ọ bụla ọ dị aka ike, ọ dịghịkwa mgbe ọ bụ onye na-adịghị ekwenyere ndị ọzọ, ma ọ bụ onye na-achọbiga ihe ókè n’aka ndị mmadụ. Ọ dịghị mgbe ọ bụla o mere ihe iji gosi na ya bụ onye dị ike, na-echetara onye ọ bụla mgbe nile na ya bụ Ọkpara Chineke. Jizọs dị umeala n’obi. Ya mere, ‘yok ya adịghị egbu mgbu, ibu ya dịkwa mfe.’ (Matiu 11:28-30) N’ihi ya, ọ bụ onye na-adị mfe njekwuru na onye nwere ezi uche. N’eziokwu, Pọl na-ekwu na Jizọs hụrụ ọgbakọ ahụ n’anya nke ukwuu nke na o ‘nyefere onwe ya maka ya.’—Ndị Efesọs 5:25.
Olee Otú Mmadụ Pụrụ Isi Ṅomie Ịbụisi Jizọs?
Olee otú ndị isi ezinụlọ pụrụ isi ṅomie àgwà Kraịst? Onyeisi ezinụlọ nke ji ihe akpọrọ ihe na-enwe nchegbu maka ọdịmma anụ ahụ́ nakwa nke ime mmụọ nke ezinụlọ ya. Ọ na-ewepụta onwe ya site n’itinye oge kwesịrị ekwesị n’ilebara mkpa ndị ezinụlọ ya n’otu n’otu nakwa n’ozuzu anya. Ọ na-ebute ọdịmma nke nwunye na ụmụ ya ụzọ karịa nke ya. * (1 Ndị Kọrint 10:24; Ndị Filipaị 2:4) Site n’itinye ụkpụrụ na ozizi Bible n’ọrụ ná ndụ ọ na-adị kwa ụbọchị, di ahụ ga-enweta nkwanye ùgwù na nkwado nke nwunye ya na ụmụ ya. Site n’iji ịhụnanya na-abụ isi, mgbalị ha jikọtara aka na-eme iji nagide nsogbu pụrụ inwe ihe ịga nke ọma. Ya mere, site n’ịbụ isi ya n’ụzọ Akwụkwọ Nsọ kwadoro, di ahụ na-ewulite ezinụlọ obi ụtọ, nke na-enwe ihe ịga nke ọma ma na-ewetara Chineke otuto.
Onyeisi ezinụlọ nke maara ihe na-adịkwa umeala n’obi. Mgbe ọ dị mkpa, ọ na-adịrị ya mfe ịrịọ mgbaghara, ọ bụ ezie na ọ pụrụ isiri ya ike ikweta na ya mejọrọ ihe. Bible na-ekwu na nzọpụta dị “n’ọtụtụ ndị na-adụ ọdụ.” (Ilu 24:6) Ee, ịdị umeala n’obi ga-akwali onyeisi ezinụlọ ịṅa nwunye na ụmụ ya ntị ma na-achọsi arọ ha ike mgbe ọ dị mkpa. Site n’iṅomi Jizọs, Onye Kraịst bụ́ onyeisi ezinụlọ ga-ahụrịrị na ịbụisi ya abụghị nanị na ọ ga-ewetara ezinụlọ ya obi ụtọ na nchebe, kama ọ ga-ewetakwara Jehova Chineke, bụ́ Onye ezinụlọ nile sitere n’aka ya, nsọpụrụ na otuto.—Ndị Efesọs 3:14, 15.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
^ par. 4 Ọ bụ ezie na isiokwu a na-ekwu kpọmkwem banyere ọrụ dịịrị di na nna n’ime ezinụlọ, ndị nne nanị ha na-azụ ụmụ na ụmụ mgbei ndị na-aghaghị ilekọta ụmụnne ha anya pụkwara irite uru n’ụkpụrụ ndị ahụ e nyere ndị isi ezinụlọ.
^ par. 14 Akwụkwọ bụ́ Isi Ihe Na-akpata Obi Ụtọ Ezinụlọ, nke Ndịàmà Jehova bipụtara na-atụ aro ndị bara uru banyere otú a pụrụ isi jiri ịhụnanya na-elekọta ezinụlọ.
[Foto dị na peeji nke 22]
Di nke nwere ezi uche na-elebara aro nke nwunye na ụmụ ya anya