‘Gịnị Na-eme M?’
‘Gịnị Na-eme M?’
“O yiri nnọọ ka m tetara ụra otu ụbọchị ihe nile agbanwee. Abịara m yie nnọọ onye ọzọ, ahụ́ m adịkwa m ka ọ bụghịzi ahụ́ m.”—Sam.
GỊNỊ bụ oge uto? N’ikwu ya n’ụzọ dị mfe, ọ bụ oge ndụ dị n’agbata oge ịbụ nwata na oge ịbụ okenye. Ọ bụ oge ị na-enwe mgbanwe ndị dị ịrịba ama—n’ụzọ anụ ahụ́, n’ụzọ mmetụta uche, nakwa ọbụna ná mmekọrịta gị na ndị ọzọ. N’otu echiche, ịbanye n’oge uto bụ ihe na-akpali akpali. E kwuwerị, ọ pụtara na ị ghọwala okenye. N’aka nke ọzọ, a na-amalite inwe mmetụta ndị ọhụrụ n’oge ndụ nke a, ụfọdụ n’ime ha pụkwara ịdị mgbagwoju anya—ọbụna na-emenye ụjọ.
Otú ọ dị, ọ dịghị gị mkpa ịtụwa oge uto ụjọ. N’eziokwu, ọ na-akpata nhụjuanya n’ụdị nke ya. Ma, ọ na-emekwa ka i nwee ohere magburu onwe ya nke isi n’ịbụ nwata gaa n’ịbụ okenye n’ụzọ na-enye afọ ojuju. Ka anyị hụ otú a pụrụ isi mee nke a—nke mbụ, site n’ịtụle ụfọdụ n’ime ihe ịma aka ndị nọ n’oge uto na-enwe.
Mmalite nke Mgbanwe n’Ahụ́ Onye Na-etolite Etolite
N’oge uto, mgbanwe dị iche iche na-ewere ọnọdụ n’ahụ́ gị iji kwadebe gị maka ọmụmụ nwa. Nke a na-ewe ọtụtụ afọ, ọ bụghịkwa nanị akụkụ ahụ́ i ji bụrụ nwoke ma ọ bụ nwanyị ka ọ na-emetụta, dị ka anyị ga-ahụ.
Ahụ́ ụmụ nwanyị na-amalitekarị ịgbanwe mgbe ha nọ n’agbata afọ 10 na afọ 12, ebe nke ọtụtụ ụmụ nwoke na-amalite mgbe ha nọ n’agbata afọ 12 na afọ 14. Otú ọ dị, ọ pụrụ ịmalite tupu afọ ndị a ma ọ bụ mgbe ha gasịrị, na-adabere n’otú ahụ́ onye ahụ dị. Dị ka akwụkwọ bụ́ The New Teenage Body Book si kwuo, “onye ọ bụla nwere oge nke ya pụrụ iche mgbe mgbanwe dị iche iche ji ewere ọnọdụ n’ahụ́ ya.” Ọ na-agbakwụnye, sị: “Ihe a na-ele anya dị ka oge ndị dị mma iji malite inwe mgbanwe ndị ahụ dịgasị nnọọ
iche iche.” N’ihi ya, ọ bụghị nsogbu ma ọ bụrụ na ahụ́ gị eburu nke ndị ọgbọ gị ụzọ—ma ọ bụkwanụ nke ha eburu nke gị ụzọ—malite ịgbanwe.Mgbe ọ bụla mgbanwe ndị a malitere, ha pụrụ imetụta ọdịdị ahụ́ gị, mmetụta ndị ị na-enwe, na otú i si ele ihe anya. Tụlee ụfọdụ n’ime akụkụ ndị na-akpali akpali, bụ́kwa ndị na-eweta ihe ịma aka, nke oge ndụ a pụrụ iche.
‘Gịnị Na-eme n’Ahụ́ M?’
Ahụ́ onye na-etolite etolite na-amalite ịgbanwe mgbe e nwere ịrị elu nke mmiri ọgwụ ahụ́, karịsịa estrogen n’ahụ́ ụmụ nwanyị nakwa testosterone n’ahụ́ ụmụ nwoke. Mgbanwe ndị a na-enwe ná mmiri ọgwụ ahụ́ so akpata mgbanwe na-esochinụ a na-enwe n’ahụ́ bụ́ ndị na-eyi ka hà na-ewere ọnọdụ n’ụzọ ọrụ ebube. N’ezie, mgbe mgbanwe ndị a malitesịrị, ahụ́ gị na-eto n’ọ̀tụ̀tụ̀ ya kasị ngwa kemgbe a mụrụ gị.
N’oge a, akụkụ ahụ́ ndị i ji bụrụ nwoke ma ọ bụ nwanyị na-amalite itoju etoju, ma nke ahụ bụ nanị otu akụkụ nke uto anụ ahụ́. Ị pụkwara ịmalite ito ogo ngwa ngwa. Ọ bụ ezie na mgbe ị dị obere, ị pụrụ ịdị na-atụkwasị ihe dị ka sentimita 5 kwa afọ n’ogo gị, ọ gaghị abụ ihe na-adịghị otú o kwesịrị ịtụkwasị ihe há otú ahụ okpukpu abụọ n’oge a ahụ́ gị na-eto ngwa ngwa.
N’oge a nile, ọ pụrụ ịdị gị ruo n’ókè ụfọdụ ka ahụ́ gị ọ̀ gbapụrụ iche. Nke a bụ ihe dị otú kwesịrịnụ. Cheta, akụkụ ahụ́ gị dị iche iche pụrụ ịdị na-eto n’ọ̀tụ̀tụ̀ dịgasị iche iche. Ọ pụrụ ime ka ahụ́ gị gbapụ iche ruo n’ókè ụfọdụ. Ma nwee ndidi—ị tọghị atọ ná ndụ nke ịbụ onye ahụ́ ya gbapụrụ iche. Ihe ndị na-eme ka ahụ́ gbapụ iche n’oge uto ga-emesị kwụsị.
N’oge a ahụ́ onye na-etolite etolite na-agbanwe, ụmụ agbọghọ na-amalite ịhụ nsọ, bụ́ nrupụta nke ọbara na ụmụ irighiri ihe ndị sitere n’akpa nwa, bụ́ nke na-ewere ọnọdụ kwa ọnwa. * Ụkwụ ntajisị nakwa mbelata nke mmiri ọgwụ ahụ́ na-esokarị oge ịhụ nsọ. Ebe ọ bụ na nke a na-emetụta mmadụ ma n’ụzọ anụ ahụ́ ma n’ụzọ mmetụta uche, mmalite nke oge ịhụ nsọ pụrụ ịbụ ihe na-emenye ụjọ. “Na mberede, abịara m nwe ahụmahụ dị nnọọ ọhụrụ nye m,” ka Teresa, bụ́ onye dị afọ 17 ugbu a, na-echeta. “Ọ kpasasịrị m uche, o gbukwara m mgbu. Ọ bịakwara na-eme m kwa ọnwa!”
Ọ dịghị mkpa ịtụwa ụjọ ma ị malite ịhụ nsọ. E kwuwerị, ọ bụ ihe na-egosi na ahụ́ gị na-arụ ọrụ nke ọma. Ka oge na-aga, ị ga-amụta otú ị ga-esi na-anagide akụkụ ndị na-adịghị enye gị ọṅụ n’oge ị na-ahụ nsọ. Dị ka ihe atụ, ụfọdụ ndị na-achọpụta na imega ahụ́ mgbe nile na-eme ka ihe mgbu nke ụkwụ ntajisị belata. Ma, mmadụ nile abụghị otu. Ị pụrụ ịchọpụta na ọ dị gị mkpa ibelata nnọọ mmega ahụ́ n’oge ị na-ahụ nsọ. Mụta ‘ige ahụ́ gị ntị’ ma na-enye ya ihe dị ya mkpa.
N’oge uto, ma ụmụ nwanyị ma ụmụ nwoke na-etinyekarị anya n’ala banyere ọdịdị ahụ́ ha. “Nke ahụ bụ oge m malitere n’ezie ịchọpụta—na ịchọ ịma—banyere otú ndị ọzọ na-eche na m dị n’ile anya,” ka Teresa na-ekwu. “Achọpụtakwara m na, n’ihe ka ukwuu n’oge ndị ahụ, ọdịdị ahụ́ m na-ewe m iwe,” ka ọ gara n’ihu ikwu. “Ntutu isi m anaghị adị otú m chọrọ ka ọ dị, uwe m anaghị ekwesị m, o yikwara ka m naghịdị ahụ uwe na-amasị m!”
Ahụ́ gị pụrụ imechu gị ihu n’ụzọ ndị ọzọ kwa. Dị ka ihe atụ, akụkụ ahụ́ gị nke na-emepụta ọsụsọ
na-arụkwu ọrụ n’oge a ị na-enwe mgbanwe n’ahụ́ gị, bụ́ nke pụrụ ime ka ọsụsọ na-agba gị karị. Ịsa ahụ́ mgbe nile, nakwa ịhụ na uwe ị na-eyi bụ nke ị ka sara asa, pụrụ inyere gị aka ịchịkwa ísìsì ahụ́. Otú ahụkwa ka ịgba senti ma ọ bụ ihe na-esi ísì ụtọ n’ahụ́ gị pụrụ ime.Ọzọkwa, n’oge a ị na-enwe mgbanwe n’ahụ́, akụkụ ahụ́ na-emepụta mmanụ n’ahụ́ gị na-arụkwu ọrụ, bụ́ nke pụrụ ime ka i nwee pịmpụl. “O yiri ka m na-enwekarị pịmpụl mgbe m chọrọ nnọọ ịma ezigbo mma,” ka otu nwa agbọghọ aha ya bụ Ann kwara n’arịrị. “Ọ̀ bụ ihe m na-eche n’echiche ka è nwere ihe na-agwa pịmpụl ka ha na-apụta mgbe a na-achọtụghị ha?” Pịmpụl bụụrụ Teresa n’onwe ya nsogbu. “Ọ na-eme ka onwe m jọọ m njọ n’anya, ahụ́ agharakwa iru m ala,” ka ọ na-ekwu, “n’ihi na mgbe ọ bụla ndị mmadụ lere m anya, ọ na-adị m ka ọ̀ bụ ya ka ha na-ele!”
N’ezie, ụmụ nwoke pụkwara inwe nsogbu akpụkpọ ahụ́. Ụfọdụ ndị ọkachamara na-ekwu n’ezie na ụmụ okorobịa na-akadị ụmụ agbọghọbịa enwe ya. Ma ị̀ bụ nwa okorobịa ma ị̀ bụ nwa agbọghọbịa, ị pụrụ irite uru site n’ịdị na-asa, mgbe nile, akụkụ ahụ́ gị ndị na-aha mmanụ, gụnyere ihu gị, olu gị, ubu gị, azụ gị, na obi gị. Tụkwasị na nke ahụ, ịdị na-eji ncha asa ntutu isi gị mgbe mgbe pụrụ inye aka mee ka mmanụ ghara ịsọrọ ruo n’akpụkpọ ahụ́ gị. Ọzọkwa, e nwere ọgwụ ndị dịnụ bụ́ ndị e mepụtara iji na-agwọ pịmpụl. “Ndị mụrụ m nyeere m aka inweta ọgwụ pịmpụl,” ka Teresa na-ekwu. “Ha nyekwara aka mee ka m ghara ịdị na-eri nri ratụ ratụ hie nne. Ọ bụrụ na erighị m nri ratụ ratụ kama na-aṅụ mmiri buru ibu, pịmpụl m na-alakarị.”
Mgbanwe ọzọ a na-enwe n’ahụ́, bụ́ nke na-emetụta ụmụ okorobịa kpọmkwem, bụ ụda olu. Ikekwe akwara ụda olu gị ga-ekwedo ekwedo ma gbatịa n’oge a ahụ́ gị na-agbanwe, na-eme ka olu gị jiri nwayọọ nwayọọ na-eyikwu olu okenye. Mgbe nke a mere Bill, ọ chọpụtadịghị ya. “Amaghị m na olu m agbanweela,” ka ọ na-ekwu, “ọ gwụla na ndị mmadụ kwụsịrị iche na ọ bụ mama m ma ọ bụ nwanne m nwanyị na-ekwu ma m na-aza fon.”
Mgbe ụfọdụ, ụda olu nke nọ n’usoro mgbanwe pụrụ ịdị na-ada aghara aghara—na-adagharị site n’olu òké gaa n’olu awọ. “Ọ bụ ihe kasị mee m ihere,” ka Tyrone na-ekwu, ka ọ na-echeta oge ọ na-eto eto. “Ọ na-eme m mgbe ọ bụla ụjọ tụrụ m nakwa mgbe ọ bụla m nwere nnọọ obi ụtọ. Agbalịrị m ịghara ịdị na-egosipụta mmetụta m gabiga ókè, ma n’ezie, m nọgidere na-egosipụta ya.” Tyrone na-agbakwụnye, sị, “Mgbe otu afọ gasịrị, ka ọ̀ bụdị afọ abụọ, ọ kwụsịrị ime m.” Ọ bụrụ na nke a na-eme gị, adala mbà n’obi! N’oge na-adịghị anya, olu nke gị kwa ga-emesị nọrọ n’ọnọdụ ọhụrụ ya nke iyitụ olu okenye.
‘N’ihi Gịnị Ka M Ji Enwe Mmetụta Dị Otú A?’
Ọ bụghị ihe ọhụrụ ndị nọ n’oge uto inwe mmetụta dịgasị iche iche na-ewute ewute. Dị ka ihe atụ, ị pụrụ ịchọpụta na gị na onye gị na ya bụwara ezigbo enyi site na nwata amalitela ịgbasa. Ọ bụghị na unu sere okwu. Ikekwe ihe unu abụọ na-enwekọ mmasị na ya ehitụghị nne. Ọbụna ndị mụrụ gị—bụ́ ndị ị nabu agbakwuru maka nkasi obi na nchebe—pụrụ na mberede iyi gị ndị na-eme ihe aka ekpe aka ekpe na ndị na-adịghị mfe ngakwuru.
Ihe a nile pụrụ ime ka onye nọ n’afọ iri na ụma nwewa mmetụta nke ịbụ onye nọ nanị ya. “Ụfọdụ ndị nchọpụta ekwuwo na a na-aka enwe owu ọmụma ugboro ugboro nakwa n’ụzọ kpụ ọkụ n’ọnụ n’oge uto karịa n’oge a bụ nwata ma ọ bụ n’oge e merela okenye,” ka otu akwụkwọ e ji
eme nchọpụta na-ekwu. N’ịbụ onye na-atụ ụjọ na ndị ọzọ ga-elewe gị anya dị ka onye gbapụrụ iche, ị pụrụ ịchọ ịghara ime ka ndị ọzọ mara echiche na mmetụta gị. Ma ọ bụkwanụ, ikekwe ị na-ala azụ n’igosipụta mmasị n’ebe ndị ọzọ nọ, na-eche nnọọ na ọ dịghị onye ga-achọ n’ezie ka ị bụrụ enyi ya.Ihe ka ọtụtụ ná ndị nọ n’oge uto na-enwe oge ndị owu na-ama ha, otú ahụ ka ọ dịkwa ọtụtụ ndị merela okenye. Ihe dị mkpa iburu n’uche bụ na ka oge na-aga, mmetụta ndị a pụrụ ịkwụsị. * Cheta, ebe ọ bụ na ị nọ n’oge uto, ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ihe nile banyere gị na-agbanwe agbanwe. Otú i si ele ndụ, ndị ọzọ, na ọbụna onwe gị anya na-anọgide na-agbanwe. N’ezie, mgbe ị na-ele onwe gị n’enyo, onye ị na-ahụ pụrụ, mgbe ụfọdụ, iyi gị onye ị na-ahụtụbeghị mbụ! Ọ pụrụ ịdị gị otú ọ dị Steve, nke dị afọ 17, bụ́ onye na-ekweta, sị, “O sigburu onwe ya n’ike ikwu na ị maara onwe gị mgbe ahụ́ gị na-agbanwe nnọọ ngwa ngwa.”
Otu n’ime ụzọ ndị kasị mma isi mee ka owu ọmụma kwụsị bụ igosipụta mmasị n’ebe ndị ọzọ nọ. Nke a pụrụ ịpụta gị ịga mata ndị ọzọ na-abụghị ndị ọgbọ gị. Ọ̀ dị ndị merela okenye ị maara bụ́ ndị ọ pụrụ ịmasị ma i leta ha dị ka enyi? Ị̀ pụrụ ịgara ha ozi, karịsịa ma ọ bụrụ na ha nọ ná mkpa enyemaka? Bible na-agba mmadụ nile—ndị ntorobịa na ndị okenye—ume ‘ịgbasapụ’ n’ịhụnanya ha na-enwe n’ebe ndị ọzọ nọ. (2 Ndị Kọrint 6:11-13) Ime otú ahụ pụrụ imeghere gị ohere ndị magburu onwe ha.
Akụkụ Bible ahụ e hotara n’elu bụ nanị otu n’ime ọtụtụ ụkpụrụ ndị nyewooro ndị ntorobịa bụ́ Ndị Kraịst aka ịnagide ihe ịma aka nke oge uto. Ka ị na-agụ isiokwu na-esonụ, tụlee otú Okwu Chineke pụrụ isi nwee mmetụta dị ike ná ndụ gị ka ị na-eto ịghọ okenye.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
^ par. 13 Ná mmalite ya, a pụrụ ịhụ nsọ ihe karịrị otu ugboro n’ọnwa. Ókè ihe na-erupụta na-aharu pụkwara ịdịgasị nnọọ iche. Ọ dịghị nke ọ bụla n’ime ọnọdụ ndị a kwesịrị ime ka ụjọ tụwa gị. Otú ọ dị, ọ bụrụ na ị nachaghị ahụ nsọ gị otú kwesịrịnụ ruo otu afọ ma ọ bụ abụọ, ọ pụrụ ịdị mkpa ka ị gaa hụ dọkịta.
^ par. 24 Ọ bụrụ na owu na-ama gị adịghị akwụsị akwụsị ma ọ bụkwanụ na ị na-eche banyere igbu onwe gị, i kwesịrị ịchọ enyemaka. Egbula oge ịkọsara ya ndị mụrụ gị ma ọ bụ onye tozuru okè bụ́ onye ị pụrụ ịkọsara izu nzuzo gị.
[Igbe dị na peeji nke 6]
Ndị Nne na Nna Ezughị Okè
“Mgbe m dị obere, echere m na nne m na nna m zuru okè. N’ụzọ ụfọdụ, mgbe m nọ n’afọ iri na ụma, ha bịara yie m nnọọ, emm, ndị na-adịghị emetacha ihe. Ihe m na-ekwu bụ na abịara m ghọta na nne m na nna m ezughị okè, nke a mekwara ka ahụ́ ghara iru m ala. N’ụzọ dị mwute, ihe a m ghọtara bịara mee ka m nwewe obi abụọ banyere echiche na mkpebi ha. Otú ọ dị, n’ịbụ onye mụtaworo ihe site n’ahụmahụ ndị tara akpụ, amaliteghachiwo m inwe nsọpụrụ zuru ezu n’ebe ha nọ. Ee, ha ezughị okè, ma ihe ha na-ekwu na-ezi ezi mgbe mgbe. A sịgodị na ha ezighị ezi, ha ka bụ nne na nna m. Anyị ejirila nke nta nke nta na-aghọwanye enyi, nke bụ́, dị ka m na-eche, ihe a na-ahụkarị n’etiti ụmụaka na ndị mụrụ ha.”—Teresa, bụ́ onye dị afọ 17.
[Foto dị na peeji nke 7]
Ọtụtụ ndị ntorobịa esorowo ndị merela okenye bụrụ ezigbo enyi