Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ikiri Ụwa

Ikiri Ụwa

Ikiri Ụwa

Ihe Mgbe Ochie Ndị E Nwetara n’Ihi Mgbaze nke Ice Kpụkọrọ Akpụkọ

Mgbaze nke ice kpụkọrọ akpụkọ na-eme ka a hụ ọtụtụ ihe mgbe ochie ndị ọkọ akụkọ ihe mere eme nwere nnọọ mmasị na ha, ka magazin na-ebu akụkọ na Germany bụ́ Der Spiegel na-ekwu. N’afọ 1999, n’Ugwu Rocky nke Canada, a hụrụ n’ime ice dị otú ahụ, nwoke India nke nwụrụ kemgbe afọ 550 gara aga. Otú ọ dị, a chọtawo ọtụtụ ihe mgbe ochie n’Ugwu Alps. Dị ka ihe atụ, n’oge na-adịbeghị anya, a hụrụ ihe fọdụrụ n’ozu nke otu nwoke e chere na ọ gbahapụrụ enyi ya nwanyị na nwa ha kwatara n’iko n’afọ 1949. Ọ dabara n’òkòkòrò, ọla ndị ha ji kwe onwe ha nkwa ọlụlụ dịkwa n’akpa ya. Dị ka Harald Stadler, bụ́ onyeisi ndị na-ahụ maka ihe mgbe ochie ndị a chọtara na ice na Mahadum Innsbruck, nke dị n’Austria, si kwuo, atụmanya nke ọkọ akụkọ ihe mere eme ahụ bụ inweta ihe ndị metụtara Hannibal, bụ́ ọchịagha Carthage nke kpọ enyí 37 gafee Alps. “Ọ ga-ehi ụdụ ma ọ bụrụ na a hụ ọkpụkpụ enyí,” ka o kwuru.

Ịgba Chaa Chaa nke Ndị Nọ n’Afọ Iri na Ụma

Dị ka Ngalaba Na-ahụ Maka Ịgba Chaa Chaa nke Ndị Ntorobịa nke dị na Mahadum McGill si kwuo, “a na-ele ihe karịrị ọkara nke ndị na-eto eto bụ́ ndị Canada nọ n’agbata afọ 12 ruo afọ 17 anya dị ka ndị ji ịgba chaa chaa emere ihe ntụrụndụ, a na-ele pasent 10 ruo 15 n’ime ha anya dị ka ndị nọ n’ihe ize ndụ nke inwe nsogbu siri ike, ebe a na-ele pasent 4 ruo 6 anya dị ka ‘ndị ịgba chaa chaa riri ahụ́,’” ka akwụkwọ akụkọ bụ́ National Post nke Toronto na-akọ. Ndọrọ ahụ na-ebidokarị na nwata mgbe ụmụaka ụfọdụ na-enweta tiketi lọtrị dị ka onyinye ma ọ bụ mgbe ha na-eti ebe n’Intanet. Ndị nnyocha ahụ na-ekwu na ihe si na ya apụta bụ na ọtụtụ ndị Canada nọ n’afọ iri na ụma na-agbazi chaa chaa karịa ka ha na-eme n’ihe ọ bụla ọzọ na-eri ahụ́, dị ka ise siga ma ọ bụ iji ọgwụ ọjọọ eme ihe. Ndị ọkà nkụzi na-enwe olileanya na ihe ọmụmụ maka igbochi ịgba chaa chaa nke ndị nọ n’afọ iri na ụma n’ụlọ akwụkwọ sekọndrị ndị dị na Canada, ga-adị irè n’ibelata nsogbu ahụ.

Okpomọkụ Akpaa France Aka Ọjọọ

N’ime ụbọchị 12 ndị mbụ nke August 2003, ọ̀tụ̀tụ̀ okpomọkụ e nwere na France rịrị elu ruo n’ókè ọ na-arịtụbeghị mbụ. Kemgbe a malitere idekọ ọ̀tụ̀tụ̀ okpomọkụ n’afọ 1873, e nwetụbeghị ọkọchị okpomọkụ ya dị otú ahụ na Paris. “Dị ka [ụlọ ọrụ na-ahụ maka ọnọdụ ihu igwe na France] si kwuo, okpomọkụ ahụ kpụrụ ọkụ n’ọnụ ma nọtee aka karịa nke ọ bụla ọzọ e nwetụworo n’ebe ahụ,” ka magazin na-akọ banyere okike bụ́ Terre sauvage na-akọ. Nanị n’ime ọnwa abụọ, ice ndị dị n’otu ebe ice kpụkọrọ na Pyrenees, nke dị n’ebe France sọtụrụ n’ebe ndịda, ji ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ mita 50 gbazelata. “N’ime afọ 150, ice nile kpụkọrọ n’ógbè Pyrenees esila n’ebe dị square kilomita 25 ruo 30 o kpuchiburu belata gaa na square kilomita 5,” ka ọkà n’ihe banyere mkpụkọ ice bụ́ Pierre René kwuru. Nke a ọ̀ bụ ihe àmà na-egosi na e nwekwuola okpomọkụ n’ụwa? Ndị ọkachamara ekwekọrịtabeghị banyere ya. Otú ọ dị, ụfọdụ ndị ọkà mmụta banyere ọnọdụ ihu igwe na-eche na o yiri ka okpomọkụ ọ̀ ga-abụ ihe a ga na-ahụkarị n’ime afọ ndị na-abịanụ—ihe na-akpata nchegbu n’ihi eziokwu bụ́ na oké okpomọkụ e nwere n’oge ọkọchị nke afọ gara aga gburu ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ mmadụ 15,000 na France.

Ịda Mbà n’Obi nke Ndị Ikom

“Otu n’ime ihe ndị kasị dị mwute banyere ịda mbà n’obi bụ echiche ụgha ahụ bụ́ na ọ kasị bụrụ ‘nsogbu ụmụ nwanyị’ nke ‘ndị bụ́ ezigbo ndị ikom’ na-adịghị enwe n’ihi ụdị mkpụrụ ndụ ihe nketa ha nwere,” ka akwụkwọ akụkọ bụ́ The Star nke Johannesburg na-ekwu. “Ndị ọkachamara na-ekwu na a dịghị achọpụta ịda mbà n’obi n’ebe ndị ikom nọ n’ihi na ha adịkebeghị aga ahụ ndị dọkịta otú ndị inyom si aga, nke a na-emekwa ka ha ghara inwecha ohere ikwu banyere nsogbu ha,” ha adịchaghịkwa enwe ike “ekwu banyere nsogbu mmetụta uche ha.” N’ihi ya, ndị dọkịta ka mara banyere ihe mgbaàmà ndị a na-ahụkarị n’ebe ụmụ nwanyị dara mbà n’obi nọ. Magazin bụ́ JAMA na-akọwa na “ihe mgbaàmà ndị inyom na-enwe ma ha daa mbà n’obi na-adịwaga nnọọ iche n’ebe nke ndị ikom dị.” Olee ụfọdụ n’ime ihe mgbaàmà ndị a na-ahụkarị n’ebe ndị ikom dara mbà n’obi nọ? Ọ bụ iwe, ike ọgwụgwụ, ahụ́ mgbakasị, ime ike ike, arụpụtalighị ihe otú ha sibu arụpụta, na àgwà nke ịchọ ịnọpụ iche n’ebe ndị a hụrụ n’anya na ndị enyi nọ. “Obi ilu,” ka Reader’s Digest nke a na-ebipụta na South Africa na-ekwu, “adịchaghị eso ịda mbà n’obi—karịsịa n’ebe ndị ikom nọ.”

Ndị Ụkọchukwu Katọlik na Ihe Ọmụma Bible

“Ruo ókè há aṅaa ka ndị ụkọchukwu maara Bible?” Onye jụrụ ajụjụ a bụ Andrea Fontana, bụ́ ụkọchukwu n’onwe ya, bụrụkwa onye ntụzi ọrụ nke Ngalaba Na-ahụ Maka Katkizim na Dayọsis Turin. Ka ọ na-ede ihe n’akwụkwọ akụkọ ndị Katọlik bụ́ Avvenire nke a na-ebipụta n’Ịtali, Fontana kwuru na ajụjụ ahụ batara ya n’uche mgbe “onye aghasa bịakwutere [ya] ịjụ ya ma à na-enwe ọmụmụ Bible na dayọsis ahụ.” Na parish nke onye aghasa ahụ, “e kwutetụbeghị banyere Akwụkwọ Nsọ.” Ná nzaghachi, Fontana dere, sị: “N’eziokwu, mgbe [ndị ụkọchukwu] gasịrị seminarị, ọ bụ ihe dị mwute na ọ bụ ole na ole n’ime ha na-anọgide na-amụ Bible. . . . Okwuchukwu a na-ekwu na Sunday na-abụkarị nanị oge ọtụtụ n’ime ndị na-eje ụka ji enwe ohere ịnụ banyere ihe odide Bible ma bịaruo ya nso.” Onye aghasa ahụ kwuru na “ya onwe ya na-eso Ndịàmà Jehova akpakọrịta iji mụtakwuo ihe.”

Nsogbu Ndị E Jikọrọ Ha na Oké Ibu

Ọnụ ọgụgụ ndị na-ebu oké ibu n’America na-arịwanye elu. Dị ka atụmatụ Ụlọ Ọrụ Na-ahụ Maka Nchịkwa na Mgbochi Ọrịa na United States mere si dị, ọnụ ọgụgụ ndị okenye America buru oké ibu esiwo na pasent 12.5 nke ndị bi ná mba ahụ n’afọ 1991 rịa elu gaa na pasent 20 n’afọ 2003. Ịrị elu a emetụtawo ọtụtụ ụlọ ọrụ achụmnta ego. “Dị ka ụlọ ọrụ ụgbọelu, bụ́ ndị a dọrọ aka ná ntị na May [2003] na ndị njem na-adịzi arọ karịa otú ha dịbu, gwakwa ha ka ha mee mgbanwe n’atụmatụ ịdị arọ nke ihe ụgbọelu ha na-ebu, ụlọ ọrụ na-ahụ maka olili ozi na-arụgharịzi ngwá ọrụ ha iji kwekọọ n’ọnọdụ nke ndị America na-ebuwanye ibu,” ka akwụkwọ akụkọ bụ́ The New York Times na-ekwu. Ọ bụ ezie na igbe ozu há otú kwesịrịnụ na-adị sentimita 61 n’obosara, ugbu a, e nwere igbe ozu ndị dị sentimita 124 n’obosara, bụ́kwa ndị e mere ka ha sikwuo ike otú kwesịrịnụ. “Ili, ụgbọala e ji ebu ozu, na ọbụna shọvel na-adị n’ihu katapila e ji egwu ili n’ebe a na-eli ozu” abụrụwokwa ndị a na-aghaghị ime ka ha sakwuo mbara. “Ndị mmadụ na-ebuwanye ibu, ha na-anwụkwa n’ibu, ụlọ ọrụ dị iche iche aghaghịkwa ime mgbanwe iji kwekọọ n’ọnọdụ ahụ,” ka Allen Steadham, bụ́ ọga kpata kpata nke otu ụlọ ọrụ na-akwado ndị buru oké ibu, na-ekwu.

“Oké Osimiri Nwụrụ Anwụ Anwụwala”

“Oké Osimiri Nwụrụ Anwụ anwụwala, a pụrụ ịzọpụta ya nanị ma e jiri ngwá nkà na ụzụ rụọ ọrụ dị ukwuu na ya,” ka akụkọ e si n’ụlọ ọrụ Associated Press nweta na-ekwu. Oké Osimiri Nwụrụ Anwụ—nke e nyere aha a n’ihi na nnukwu nnu dị na ya mere ka ọ ghara ikwe mee ihe ndị na-ebi na mmiri ịdị ndụ na ya—bụ mmiri kasị dakpuo adakpu n’ụwa, bụ́ nke ji mita 400 dị ala karịa ọ̀tụ̀tụ̀ ịdị elu nke oké osimiri. “Ruo ọtụtụ puku afọ, mmiri nanị ya na-asọbata n’Oké Osimiri Nwụrụ Anwụ, bụ́ Osimiri Jọdan, mere ka [mmiri anwụ na-amịkọrọ na mmiri na-abata abata] hara nhata,” ka akụkọ ahụ na-ekwu. “Otú ọ dị, n’iri afọ ndị na-adịbeghị anya, ma Izrel ma Jọdan anọwo na-esi n’osimiri ahụ adọrọ mmiri ha na-agba ná nnukwu ala ubi ha ndị dị n’akụkụ osimiri ahụ na-asaghị mbara bụ́ nke kewara mba abụọ ahụ, na-eme ka Oké Osimiri Nwụrụ Anwụ ghara ịdị na-enweta mmiri ọ ga-eji na-edochi mmiri ndị anwụ na-amịkọrọ.” Ọ bụrụ na ọ dịghị ihe e mere, ka otu nnyocha e mere n’Izrel na-ekwu, mmiri ahụ ga na-eji ihe ruru 1 mita na-atalata kwa afọ, ihe ga-esi na ya apụta ga-adịkwa njọ nye ala ndị gbara ya gburugburu, gụnyere ụmụ anụmanụ na akụ́kụ́. Oké ọkọchị werela afọ ise anọworị na-akwanye ọkụ n’ọnọdụ ọjọọ Oké Osimiri Nwụrụ Anwụ nọ na ya.