Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ị̀ Maara?

Ị̀ Maara?

Ị̀ Maara?

(A pụrụ ịchọta azịza nye ajụjụ ndị a n’akụkụ Bible ndị e zoro aka na ha, e bipụtakwara ndepụta zuru ezu nke azịza ha na peeji nke 18. Iji nwetakwuo ihe ọmụma, lee akwụkwọ bụ́ “Insight on the Scriptures” nke Ndịàmà Jehova bipụtara.)

1. Olee onyeisi nchụàjà nọ ndụ mgbe Samuel ghọrọ onye amụma? (1 Samuel 3:10-13)

2. Olee aha ndị Amọn na-akpọ ugwu Hemọn? (Deuterọnọmi 3:9)

3. Ònye ka Ebreham lụrụ dị ka nwunye ya nke abụọ, ụmụ nwoke ole ka ọ mụtakwaara ya? (Jenesis 25:1, 2)

4. N’ihi gịnị ka a na-adịghị agbanye mmanya ọhụrụ n’ime akpụkpọ mmanya meworo ochie? (Luk 5:37)

5. Olee ihe mere mma agha ahụ Ihud ji gbuo Eze Eglon nke Moab obi tara mmiri? (Ndị Ikpe 3:16-22)

6. N’ihi gịnị ka e ji kpọọ Jizọs “Onye Nnọchiteanya Ukwu nke ndụ”? (Ọrụ 3:15; 4:12)

7. N’ihi gịnị ka a pụrụ iji kpọọ nanị Jehova onye zuru okè n’ụzọ kasị zuo ezu? (2 Samuel 22:31; Mak 10:18)

8. Banyere àjà e ji ụmụ anụmanụ achụ, n’ihi gịnị ka o ji bụrụ na “abụba nile bụ ihe Jehova nwere”? (Levitikọs 3:9-16)

9. Olee nnụnụ dị ike nke na-eri anụ bụ́ nke a maara na ọ pụrụ ịnọ n’ebe dị nnọọ anya hụ ihe? (Job 39:27, 29)

10. Olee utu aha Bible ji mee ihe iji zoo aka n’ebe Jehova, ndị ọzọ a na-efe ofufe, nakwa n’ebe ndị ikom nọ? (Ọpụpụ 7:1)

11. Olee onye amụma Jehova si n’aka ya kwuo otú a ga-esi kewaa alaeze Solomọn ụzọ abụọ? (1 Ndị Eze 11:29-32)

12. Mgbe Jizọs na-akọwa otú o si nwee ọchịchọ ịchịkọta ndị Jeruselem na-akpọ ekwe nkụ, olee anụ ụlọ nke o zoro aka na ya? (Luk 13:34)

13. Olee ihe Jizọs kpọrọ “oriọna nke ahụ́”? (Matiu 6:22)

14. Olee oge e mesiri Daniel obi ike na ọ bụ mgbe a ga-aghọta amụma ya? (Daniel 12:4)

15. Olee otú Pọl si gbanahụ nkata ndị Juu nọ na Damaskọs kpara igbu ya? (Ọrụ 9:25)

16. Olee ihe ‘duhieworo ụfọdụ pụọ n’okwukwe’ ma wetara ha “ọtụtụ ihe mgbu”? (1 Timoti 6:10)

17. Ná nduzi Jehova, ndị nledo ole ka Mozis zigara ala Kenan, ma ole ndị nanị wetara akụkọ ọma? (Ọnụ Ọgụgụ 13:2; 14:6-9)

18. Ònye bụ Siza ahụ a kpọtụrụ aha n’Ọrụ 25:11, bụ́ onye Pọl rịọrọ ka o kpegharịa ikpe ya mgbe Festọs na-ekpe ya ikpe?

Azịza Nye Ajụjụ

1. Ilaị

2. Senịa

3. Ketura; isii

4. N’ihi na ka mmanya ahụ na-eko, ọ ga-agbawa akpụkpọ mmanya ochie ahụ kwedoro ekwedo

5. Eglon buru ibu nke ukwuu nke na mma agha ahụ banyere kpam kpam n’afọ ya

6. N’ihi na “nzọpụta adịghị n’onye ọ bụla ọzọ.” Ọ bụ n’aka Jizọs ka e si weta ihe mgbapụta ahụ, ọ bụ Onyeikpe a họpụtara

7. Nanị Jehova bụ onye ọ na-adịghị ihe karịrị ya, onye ịdị mma ya na-enweghị atụ, onye e kwesịrị inye otuto nile, na onye kasị nwee àgwà ndị magburu onwe ha na ike

8. N’ịbụ nke e weere dị ka akụkụ kasị mma n’anụ, ọ na-ese onyinyo eziokwu ahụ bụ́ na akụkụ ndị kasị mma bụ nke Jehova

9. Ugo

10. Chi

11. Ahaịja

12. Nnekwu ọkụkọ

13. Anya

14. “Mgbe ọgwụgwụ ihe ndị a”

15. N’abalị, ndị na-eso ụzọ ya kpọọrọ ya ma si n’oghere dị ná mgbidi buda ya

16. “Ịhụ ego n’anya”

17. Iri na abụọ; Jọshụa na Keleb

18. Nero