Ụzọ Ị Ga-esi Chebe Onwe Gị Pụọ n’Ịbụ Onye E Gwuru Wayo
Ụzọ Ị Ga-esi Chebe Onwe Gị Pụọ n’Ịbụ Onye E Gwuru Wayo
Ị PỤRỤ ịnụwo okwu ahụ bụ́, “Ị gaghị egwuli onye na-akwụwa aka ọtọ wayo.” Dị nnọọ ka ọtụtụ okwu ndị e kwuworo, nke ahụ abụghị eziokwu. Kwa ụbọchị, a na-egwu ndị na-akwụwa aka ọtọ wayo; ịkwụwa aka ọtọ nanị adịghị echebe ha. Ụfọdụ n’ime ndị kasị dị akọ n’ụwa na-echepụta ma na-eme atụmatụ igwunara ndị mmadụ ego ha. Ihe karịrị otu narị afọ gara aga, otu onye edemede kwuru, sị: “E nwere ụfọdụ wayo ndị a sara anya na mmiri chepụta, nke na ọ ga-abụ nzuzu ma ọ bụrụ na e nwetaghị gị na ya.”
Aghụghọ amaliteghị taa, ọ malitererịị n’ogige Iden. (Jenesis 3:1-5) Wayo ndị ochie dị n’ụdị n’ụdị, a na-echepụtakwa ụzọ ndị ọhụrụ e si egwu wayo mgbe nile. Ya mere, olee otú ị pụrụ isi chebe onwe gị? Ọ dịghị gị mkpa ịga mụwa banyere ụzọ nile ndị omempụ na-esi egwu ndị mmadụ wayo. Ime ihe ole na ole bụ́ isi ga-aba uru dị ukwuu n’ichebe gị pụọ n’ịbụ onye e gwuru wayo.
Na-echekwa Ihe Ọmụma Banyere Onwe Gị
Ọ bụrụ na mmadụ ezuru akwụkwọ ndekọ ego gị ma ọ bụ kaadị i ji azụrụ ihe n’aka, ọ pụrụ iji ha zụrụ ihe. Ọ bụrụ na o zuru akwụkwọ ihe ọmụma banyere ego i nwere n’ụlọ akụ̀ ma nweta ihe ọmụma zuru ezu banyere gị, ọ pụrụ ime ka à ga-asị na ya onwe ya bụ gị. Ozugbo onye omempụ zuuru ihe e ji amata gị, ọ pụrụ ịdọrọ ego gị n’ụlọ akụ̀, zụrụ ihe n’aka ma denyere gị ya, gbazirikwa ego n’aha gị. * Ọbụna a pụrụ ijide gị maka mpụ ị na-emeghị!
Iji chebe onwe gị pụọ n’ụdị wayo a, kpachara anya maka akwụkwọ nile ndị na-enye ihe ọmụma banyere gị, gụnyere akwụkwọ ndekọ ego na akwụkwọ i ji adọrọ ego n’ụlọ akụ̀, laịsensị ịkwọ ụgbọala, na kaadị e ji amata nwa amaala. Jụ inye ndị ọzọ ihe ọmụma banyere onwe gị ma ọ bụ banyere ego gị, ọ gwụla ma è nwere ezi ihe mere ị ga-eji nye ha ya. Ọ dị otú ahụ karịsịa ma a bịa na nọmba kaadị i ji azụ ihe n’aka na ihe ọmụma banyere akwụkwọ ndekọ ego gị. Nanị mgbe i kwesịrị inye mmadụ nọmba kaadị i ji azụ ihe n’aka bụ mgbe ị chọrọ iji ya zụrụ ihe.
Ụfọdụ ndị wayo na-abọghasị ebe mkpofu ihe iji chọta ihe ọmụma dị otú ahụ. Kama ịtụfu nnọọ akwụkwọ ndị nwere ihe ọmụma banyere onwe gị, ọ ga-abụ ihe amamihe dị na ya ịkpọ ha ọkụ ma ọ bụ dọrie ha adọri. Ndị a na-agụnye akwụkwọ ndọrọ ego e jisịrịla mee ihe, akwụkwọ e ji zụọ ahịa, kaadị e ji zụọ ihe n’aka, laịsensị ịkwọ ụgbọala, na akwụkwọ ikike e ji aga mba ọzọ bụ́ ndị na-abaghịzi uru. Ọ bụkwa ihe amamihe dị na ya ibibi fọm ndejupụta maka kaadị ịzụ ihe n’aka ndị e ziteere gị bụ́ ndị ị na-ekwughị ka e zitere gị, ebe ọ bụ na ha nwere ihe ọmụma banyere gị bụ́ nke onye ọzọ pụrụ iji mee ihe n’ụzọ na-ezighị ezi.
Jiri Ezi Uche Mee Ihe
Otu ihe bụ́ isi e ji mara ọtụtụ wayo bụ nkwa a na-ekwe na a ga-enweta uru ego karịrị akarị maka ego e tinyere n’achụmnta ego. Otu atụmatụ zụọ taa baa echi a na-ahụkarị bụ atụmatụ achụmnta ego ndị yiri pyramid. Ọ bụ ezie na e nwere ụdị dị iche iche nke atụmatụ achụmnta ego a, usoro e si emekarị ya bụ na ndị banyere na ya na-akpọbata ndị ọzọ, a na-akwụkwa ha ụgwọ maka ịkpọbata ndị ọzọ. * Usoro akwụkwọ ozi a na-ezigara ọtụtụ ndị na-arụkwa ọrụ n’otu ụzọ ahụ site n’ịgwa gị ka i zigara ndị aha ha nọ n’elu elu ego. Nkwa a na-ekwe bụ na ị ga-enweta ọtụtụ puku dollar ma aha gị ruo n’elu elu.
Atụmatụ achụmnta ego ndị yiri pyramid na-adakpọkarị n’ihi na ọ dịghị ekwe mee ịnọgide na-akpọbata ndị ọhụrụ. Tụlee mgbakọ a na-esonụ. Ọ bụrụ na mmadụ ise amalite atụmatụ achụmnta ego yiri pyramid, onye nke ọ bụla akpọbatakwa mmadụ ise, ọnụ ọgụgụ ndị ọhụrụ nọ na ya ga-abụ 25. Ọ bụrụ na onye ọ bụla n’ime ha, n’aka nke ha, akpọbata mmadụ 5, nke ahụ ga-apụta mmadụ 125 ọzọ. Mgbe a kpọbatagidere ndị mmadụ ruo n’ogo nke itoolu, a ga-enwe ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ nde mmadụ abụọ bụ́ ndị na-aghaghị ịkpọbata ihe karịrị nde mmadụ itoolu ndị ọzọ! O doro ndị na-ahazi atụmatụ achụmnta ego ndị yiri pyramid anya na o nwere ebe ọkụ ga-anọ nyụọ e wee wụsa ọwa. Mgbe ọ dịwara ha ka è ruwela ebe ahụ, ha na-eburu ego ahụ rie mbọmbọ. Ma eleghị anya ego gị ga-efunahụ gị, ndị ị kpọbatakwara ga na-anwazi inwetaghachi ego ha furu efu n’aka gị. Chetakwa, ka gị onwe gị wee nwee ike inweta ego n’atụmatụ achụmnta ego ndị yiri pyramid, ego aghaghị ifunahụ onye ọzọ.
Ọ̀ dị onye na-ekwu na ya ga-eme ka i nweta ego n’adọgbughị onwe gị n’ọrụ ma ọ bụ na ị ga-enweta uru ego buru nnọọ ibu maka ego ị ga-etinye n’achụmnta ego? Ịdọ aka ná ntị e nwere bụ nke a: Ọ bụrụ na ihe a sịrị na ị ga-enweta adaa nnọọ mma
mma nke na o yiri ihe na-agaghị ekwe omume, mgbe mgbe ọ naghị ekwe omume. Adịla ngwa n’ikwere ihe ndị mkpọsa ngwá ahịa na-azọrọ nakwa uru ụfọdụ ndị na-azọrọ na ha riteworo na ha, na-eche, sị, “Nke a dị iche.” Buru n’uche na ndị mmadụ adịghị abanye n’achụmnta ego iji nyetụ ndị ọzọ ego ma ọ bụ iji tụpenye gị azụ̀ ka i wee baa ọgaranya. Ọ bụrụ na mmadụ azọrọ na ya nwere ihe ọmụma pụrụ iche nke ga-eme ka i nweta nnukwu ego, jụọ onwe gị, sị: ‘Gịnị mere o jighị ya mee onwe ya ọgaranya? Gịnị mere o ji egbu oge ya n’ịnwa iresị m ya?’Gịnị ma ọ bụrụ na a gwa gị na i meriwo n’asọmpi ma ọ bụ nweta ihe nrite? Isi ebula gị—ọ pụrụ ịbụ wayo, bụ́ nke e gwuworo ọtụtụ ndị. Dị ka ihe atụ, otu nwanyị nọ n’England nwetara akwụkwọ ozi si Canada bụ́ nke gwara ya na o nwetara ihe nrite ma na a chọrọ ka o zite dollar 25 a ga-eji hụ na ihe nrite ahụ rutere ya aka. Mgbe o zigasịrị ego ahụ, e si Canada kpọọ ya na fon na-agwa ya na o nwetara ihe nrite nke atọ n’otu lọtrị ruru ihe dị ka dollar 245,000, ma ọ ghaghị ịkwụ otu pasent nke ego ahụ bụ́ ego ọzọ a ga-eji hụ na ihe nrite ahụ rutere ya aka. O zigara dollar 2,450 n’enwetaghị ihe ọ bụla. Ọ bụrụ na ị ghaghị ịkwụ ụgwọ maka “onyinye” ma ọ bụ ihe nrite, ọ bụ wayo ka a chọrọ igwu gị. Jụọ onwe gị, sị, ‘Olee otú ọ ga-esi bụrụ na m eritewo ihe n’asọmpi m na-esoghị na ya?’
Soro Nanị Ndị Nwere Ezi Aha Na-emekọ Ihe n’Achụmnta Ego
Ì kweere na ị pụrụ ịmata mgbe ndị mmadụ chọrọ igwu gị wayo? Kpacharakwa anya! Ndị wayo maara otú e si enweta obi ndị ọzọ. Ha nwere nkà n’ime ka ndị ha chọrọ igwu wayo tụkwasị ha obi. Ndị na-ere ahịa, ma ndị na-akwụwa aka ọtọ ma ndị na-adịghị akwụwa aka ọtọ, maara na tupu ha erepụ ahịa, ha aghaghị ime ka mmadụ kwenye na ihe ha na-agwa ha bụ eziokwu. N’ezie, nke a apụtaghị na i kwesịrị ịbụ onye na-enweghị ntụkwasị obi n’ebe mmadụ nile nọ, ma inyotụ ihe enyo ruo n’ókè ezi uche dị na ya dị mkpa iji chebe onwe gị pụọ n’ịbụ onye e gwuru wayo. Kama ịnwa ịmata ma mmadụ ọ̀ bụ onye na-eguzosi ike n’ezi ihe site n’ịdabere n’amamihe i bu pụta ụwa, leruo anya ala n’ihe abụọ e ji amata ọtụtụ wayo: Nke mbụ, ihe a sịrị na ị ga-enweta ọ̀ na-ada nnọọ mma mma nke na o yiri ihe na-apụghị
ikwe omume, nke abụọ kwa, onye ahụ ọ̀ na-anwa ime ka i mee mkpebi ọkụ ọkụ?Nkwa ndị na-ada nnọọ mma mma juru n’Intanet. Ọ bụ ezie na Intanet bara nnọọ uru, ọ na-emekwa ka ndị omempụ nwee ike igwu ndị mmadụ wayo n’ụzọ dị ngwa, nakwa n’ụzọ a na-agaghị amata ndị ha bụ. Ì nwere adres E-mail? Ọ bụrụ otú ahụ, ị pụrụ ịdị na-enweta ozi E-mail ndị metụtara azụmahịa bụ́ ndị ị na-ekwughị ka e zitere gị. Ọ bụ ezie na a na-enweta imerime ozi na ngwá ahịa a na-akpọsa site na E-mail, ọtụtụ n’ime ha bụ wayo. Ọ bụrụ na ị zaghachi ozi E-mail ị na-ekwughị ka e zitere gị site n’izipụ ego maka ngwá ahịa ma ọ bụ ozi ụfọdụ, ma eleghị anya ọ dịghị ihe ị ga-enweta. Ọ bụrụkwanụ na inwetadị enweta, o yikarịrị ka ị gaghị nnọọ enweta ihe ruru ego ole i tinyere na ya. Ndụmọdụ kasị mma bụ, Ya adịkwala mgbe ị ga-azụ ihe n’aka onye ahịa si na E-mail zitere gị ozi azụmahịa ndị ị na-ekwughị ka e zitere gị.
Otú ahụ ka ọ dịkwa n’ebe ndị na-akpọ gị na fon iji resị gị ihe nọ. Ọ bụ ezie na ụlọ ahịa ndị bụ́ ezigbo ya na-esi na telifon na-akpọsa ọtụtụ ngwá ahịa ha, ndị wayo bụ́ ndị na-esi na telifon ezi ozi azụmahịa na-egwunara ndị mmadụ ọtụtụ ijeri dollar kwa afọ. Ọ dịghị ụzọ ị ga-esi mata ma mkpọsa e si na telifon kpọsaara gị ahịa ọ̀ bụ ezigbo ya nanị site n’isoro onye kpọrọ gị na fon kwurịta okwu. Onye wayo pụdịrị ime ka à ga-asị na ọ bụ onye nnọchiteanya nke otu ụlọ akụ̀ ma ọ bụ ụlọ ọrụ na-echebe kaadị e ji azụ ihe n’aka. E nwere ezi ihe mere i kwesịrị iji nyoo ihe enyo ma ọ bụrụ na mmadụ akpọọ gị na fon ma na-azọrọ na ya si n’otu ụlọ akụ̀ ma ọ bụ ụlọ ọrụ bụ́ ebe i nwere ihe ndekọ ego ma na-agwa gị ka i nye ya ihe ọmụma ha kwesịrị inweworị. Ọ bụrụ na nke ahụ emee, ị pụrụ ịgwa onye ahụ ka o nye gị nọmba fon ya. Mgbe ahụzi, kpọghachi mgbe ị chọpụtasịworo na nọmba ahụ bụ nke ụlọ akụ̀ ma ọ bụ ụlọ ọrụ ahụ.
Ihe dị mma ime bụ ịghara inye onye ị na-amabughị, bụ́ onye kpọrọ gị na fon, nọmba kaadị i ji azụ ihe n’aka ma ọ bụ ihe ọmụma onwe onye ọzọ. Ọ bụrụ na mmadụ akpọọ gị iji resị gị ihe ị na-achọghị, ị pụrụ iji ọnụ ọma kwuo, sị, “Ewela iwe, adịghị m esi na fon azụ ihe n’aka ndị m na-amaghị.” Mgbe ahụ, dewezie fon. Ọ dịghị ihe ọ bụla mere ị ga-eji soro onye ị na-amaghị nke pụrụ ịdị na-anwa igwu gị wayo na-enwe nkwurịta okwu ị na-achọghị.
Soro ndị mmadụ na ụlọ ahịa ndị nwere ezi aha na-emekọ ihe. E nwere ọtụtụ ụlọ ọrụ iwu kwadoro bụ́ ndị ị pụrụ isoro zụọ ahịa na fon ma ọ bụ n’Intanet n’enweghị nsogbu ọ bụla. Ọ bụrụ na o kwe mee, si n’aka ụlọ ọrụ ọzọ nweta ihe ọmụma banyere onye ahụ na-agwa gị okwu ahịa, ụlọ ọrụ ọ na-erere ahịa, na ụdị ngwá ahịa ọ na-agwa gị okwu ya. Rịọ ka e nye gị ihe ọmụma banyere ngwá ahịa ahụ, ma gụọ ya nke ọma iji jide n’aka na ọ bụ nke ezigbo ya. Abụla onye a kwanyere ọkụ n’ike ma ọ bụ rụgide gaa n’ime mkpebi ọkụ ọkụ.
Dee Ya Ede
Ọ bụghị wayo nile na-amalite dị ka wayo. Achụmnta ego e ji ezi obi malite pụrụ ịkụ afọ n’ala. Mgbe nke ahụ mere, obi pụrụ ịlọ ndị
nwe ya mmiri, ha ewee mezie ihe n’ụzọ aghụghọ iji nwetaghachi ihe funahụrụ ha. Obi abụọ adịghị ya na ị nụtụwo akụkọ banyere ndị ọga kpata kpata n’achụmnta ego bụ́ ndị ghara ụgha banyere ego ha na-enweta n’achụmnta ego na uru ha na-erite na ya, ma e mesịa, mgbe achụmnta ego ahụ dara, ha ebukọrọ ego fọdụrụnụ gbafuo.Iji chebe onwe gị pụọ ma na wayo ma ná nghọtahie, i kwesịrị ide akụkụ nile nke achụmnta ego ọ bụla ede tupu i tinye ọkpụrụkpụ ego na ya. Ná nkwekọrịta achụmnta ego ọ bụla ị ga-abịanye aka na ya, e kwesịrị idepụta usoro nile achụmnta ego ahụ ga-esi aga na nkwa nile e kwere na ya. Ghọtakwa na n’agbanyeghị ókè achụmnta ego nwere ike iyi nke a pụrụ ịdabere na ya, ọ dịghị onye pụrụ ijide n’aka na ihe ga-aga otu e si chee ya. (Eklisiastis 9:11) E kwuwerị, e nweghị ihe dị ka achụmnta ego nke ọghọm na-adịghị na ya n’ezie. Ya mere, nkwekọrịta ọ bụla kwesịrị ịkapị okwu ọnụ banyere ihe ga-abụ ọrụ na ibu ọrụ onye nke ọ bụla ma ọ bụrụ na achụmnta ego ahụ akụọ afọ n’ala.
Site n’ịmara banyere nakwa n’itinye ụkpụrụ ndị a bụ́ isi anyị tụleworo ná nkenke n’ọrụ, ị ga-eme ka ọ ghara ịdị mfe igwu gị wayo. Otu ilu oge ochie nke Bible na-enye ndụmọdụ bara uru. Ọ na-ekwu, sị: “Onye na-enweghị uche na-ekwere okwu nile ọ bụla: ma onye nwere ezi uche na-aghọta ije ụkwụ ya.” (Ilu 14:15) Onye wayo na-ahọrọ ndị ọ ga-aghọgbuteli n’ụzọ dị mfe, ndị o yiri ka hà ga-ekwere ihe ọ bụla o kwuru. N’ụzọ dị mwute, e nwere ọtụtụ ndị na-adịghị eme ihe ọ bụla iji zere ịbụ ndị e gwuru wayo.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
^ par. 5 Lee Teta! nke April 8, 2001, peeji nke 26-28.
^ par. 9 A na-akọwa atụmatụ achụmnta ego ndị yiri pyramid dị ka “usoro achụmnta ego na-adị n’ogo n’ogo bụ́ nke ndị mmadụ na-akwụ ụgwọ mbata iji nwee ohere nke ịkpọbata ndị ọzọ ime otu ihe ahụ.” Ọ dịghị ihe a na-azụ ma ọ bụ na-ere n’achụmnta ego ndị dị otú ahụ.
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 21]
Ọ bụrụ na ihe a sịrị na ị ga-enweta adaa nnọọ mma mma nke na o yiri ihe na-agaghị ekwe omume, mgbe mgbe ọ naghị ekwe omume
[Igbe/Foto dị na peeji nke 20]
Ndụmọdụ Dịịrị Ndị E Gwuru Wayo
Ndị e gwuru wayo na-emekarị ihere, na-enwekarị obi amamikpe, ma na-eweso onwe ha iwe. Atala onwe gị ụta. Ọ bụ gị ka e gwuru wayo; onye ụta dịịrị bụ onye nke gwuru gị wayo. Ọ bụrụ na i mehiere ihe, kweta n’obi gị na i mehiere ihe, ndụ agawakwa. Ekwubila na ị bụ onye iberibe. Cheta na ndị wayo na-egwucha ndị maara nnọọ ihe—ndị isi ala, ndị manịja ụlọ akụ̀, ndị isi oche ụlọ ọrụ, ndị ọkàiwu, na ndị ọzọ—wayo n’ụzọ gara nke ọma.
Ndị e gwuru wayo na-abụ ndị a napụrụ ọ bụghị nanị ego ma ọ bụ ihe onwunwe kamakwa obi ike na ùgwù onwe onye. Ọ bụrụ na “enyi” mmadụ egwuo ya wayo, ọ na-emebi ntụkwasị obi onye ahụ nwere n’ebe ọ nọ. Ọ na-ewute mmadụ ma e gwuo ya wayo. Wepụta oge iji ruo újú. Ọ na-enyekarị aka isoro onye ị pụrụ ịkọrọ izu nzuzo gị kwurịta banyere ya. Ekpere pụkwara iwetara gị nkasi obi dị ukwuu. (Ndị Filipaị 4:6-8) Otú ọ dị, ghọta na o nwere oge ọ ga-eru gị echefuo banyere ya. Gịnị mere ị ga-eji nọgide na-enwe mwute? Setịpụ ihe mgbaru ọsọ ndị dị mma, ma rụọ ọrụ iru ha.
Kpachara anya banyere wayo nke ndị na-ekwu na ha ga-enyere gị aka nwetaghachi ego e gwunaara gị. Ndị wayo na-akpọ onye e gwuru wayo na fon ma kwuo na ha ga-enye aka n’inwetaghachi ego ahụ furu efu. Nzube ha bụ igwu onye ahụ wayo ọzọ.
[Igbe/Foto dị na peeji nke 22, 23]
Wayo Ndị Metụtara Achụmnta Ego—Ụzọ Isii Ndị E Sikarị Egwu Wayo na E-mail
1. Atụmatụ achụmnta ego ndị yiri pramid: Ndị a na-eyikarị ohere ndị e nwere ịkpata ego dị ukwuu n’arụghị oké ọrụ, n’emefughịkwa oké ego. N’otu ụdị nke atụmatụ achụmnta ego ahụ, a na-ekwu na a ga-enye mmadụ kọmputa ma ọ bụ ngwá electronic ọzọ ma ọ bụrụ na onye ahụ akwụọ ụgwọ iji sonyere otu klọb ma kpọbatakwuo ndị ọzọ. Ụdị ọzọ bụ usoro akwụkwọ ozi a na-ezigara ọtụtụ ndị. Usoro akwụkwọ ozi a na-ezigara ọtụtụ ndị na-abụkarịkwa nke megidere iwu. Ego nke ihe ka ọtụtụ ná ndị na-etinye ego na ha na-efunahụ ha.
2. Atụmatụ nke ịrụ ọrụ n’ụlọ: N’otu ụdị nke wayo a, a na-agwa gị ka ị rụpụta ihe ndị dị ka ọla, ihe ụmụaka ji egwuri egwu, ma ọ bụ akụkụ ngwá ọrụ dị iche iche. Gị etinye ego n’ịzụ ngwá ọrụ ndị ị ga-eji rụpụta ya, tinyekwa oge n’ịrụpụta ya, mgbe ị rụsịrị ya, ndị nyere gị ọrụ ahụ agwa gị na ha agaghị azụ ya n’ihi na ị rụtaghị ya otú a chọrọ.
3. Wayo ndị metụtara ahụ́ ike na ihe oriri: N’Intanet, a na-enwe ọtụtụ ozi ndị na-ekwu banyere ọgwụ ndị ga-enyere gị aka ifelata n’emegaghị ahụ́ ma ọ bụ n’agbanweghị otú i si eri nri, ọgwụ ndị na-agwọ nwoke na-adịghị enwe ike idina nwanyị, na mmanụ ndị na-egbochi ndasị nke ntutu. Nkwa ndị a na-abụkarị nke a gbakwụnyere akaebe sitere n’aka ndị ahịa nwere afọ ojuju ná ngwa ahịa ahụ. Nkebi ahịrịokwu ndị a na-ahụkarị n’ozi ndị a na-agụnye ndị dị ka “ọganihu nke nkà mmụta sayensị,” “a ṅụọ ọ laa,” “ọ gwọ na nzuzo,” na “ọgwụ mgbe ochie.” Nke bụ́ eziokwu bụ na ihe ka ọtụtụ n’ọgwụ ndị a adịghị arụ ọrụ.
4. Ohere achụmnta ego dị iche iche: N’atụmatụ achụmnta ego a, a na-ekwekarị nkwa na a ga-erite uru dị ukwuu n’enweghị ihe ize ndụ dị ukwuu. Ụdị ya a na-ahụkarị bụ atụmatụ achụmnta ego metụtara itinye ego n’ụlọ akụ̀ nke dị ná mba ọzọ. A na-arata ndị na-etinye ego ha na ya site n’imesi ha obi ike na ndị ego ha dị n’aka ha bụ ndị ha na ụlọ akụ̀ ndị dị elu na-emekọ ihe nakwa na ha nwere ihe ọmụma ndị ọzọ na-enweghị.
5. Inweghachi ọnọdụ dị mma n’ịzụ ihe n’aka: Na wayo ndị a, a na-ekwu na a ga-ewepụ aha ọjọọ i nwerela n’ihe ndekọ banyere kaadị ịzụ ihe n’aka, ka i wee nwee ike iru eru inweta kaadị e ji azụ ihe n’aka, ego mgbazinye maka ịzụ ụgbọala, ma ọ bụ ọrụ. N’agbanyeghị mmesi obi ike ndị a na-emesi ndị mmadụ, ndị na-eme atụmatụ ahụ adịghị emezu ihe ha kwere ná nkwa.
6. Ihe nrite ịga ezumike: Ị na-enweta ozi E-mail nke na-ekele gị maka inweta ihe nrite ịga ezumike n’ọnụ ego e gburu ná ntụ. Ụfọdụ na-ekwu na a họpụtara gị n’ụzọ pụrụ iche. Buru n’uche na a pụrụ izigaworo ọtụtụ nde ndị ọzọ otu ozi ahụ nakwa na ebe obibi ị ga-enweta agaghịdị eru nnọọ otú ha sịrị na ọ ga-adị.
Ebe e si nweta ya: Ụlọ Ọrụ Mba United States Na-ahụ Maka Azụmahịa
[Ebe E Si Nweta Foto]
Source: U.S. Federal Trade Commission
[Foto dị na peeji nke 21]
Atụmatụ achụmnta ego ndị yiri “pyramid” na-akụkarị afọ n’ala
[Foto dị na peeji nke 23]
Ná nkwekọrịta achụmnta ego ọ bụla ị ga-abịanye aka na ya, e kwesịrị idepụta usoro nile achụmnta ego ahụ ga-esi aga na nkwa nile e kwere na ya