“Apụghị M Idoru Ya Edoru”
“Apụghị M Idoru Ya Edoru”
Nke ahụ bụ ihe Lenita, bụ́ onye gụrụ akwụkwọ bụ́ Ṅaa Ntị n’Amụma Daniel! kwuru. N’akwụkwọ ozi ekele ya, Lenita kwuru, sị: “Chei! Akwụkwọ ahụ riri m nnọọ isi nke na apụghị m idoru ya edoru. Mmalite ya yiri akwụkwọ na-akọ akụkọ ndụ, n’oge nile m na-agụkwa akwụkwọ ahụ, ọ dị m ka à ga-asị na m so Daniel nọrọ n’oge ya. Amabughị m akwụkwọ Daniel nke ọma otú a.”
Ọ gbakwụnyere, sị: “Ọzọkwa, ọ bụ nnukwu akwụkwọ akụkọ ihe mere eme—nke na-akọwa ike ọchịchị ụwa dị iche iche, agha dị iche iche a lụrụ na ndị lụrụ ha. Nwa anyị nwanyị amalitewo ịgụ ya, ebu m n’uche ịgba ya ume ịgụcha ya na iji ya na-eme ihe maka ihe ọmụmụ akụkọ ihe mere eme.”
Ọ bụrụ na ị ga-enwe mmasị inweta otu akwụkwọ a bụ́ Ṅaa Ntị n’Amụma Daniel! biko kpọtụrụ Ndịàmà Jehova nọ n’ógbè gị. Ọ bụrụ na ị ga-enwe mmasị ka mmadụ kpọtụrụ gị, biko dejupụta akụkụ a pụrụ ịdọkapụta adọkapụta dị na peeji a ma zite ya n’adres e dere na ya ma ọ bụ n’adres nke kwesịrị ekwesị e depụtara na peeji nke 5 na magazin a.
□ Biko kpọtụrụnụ m iji duziere m ọmụmụ Bible ebe obibi n’efu.