Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Igwu Wayo—Nsogbu Zuru Ụwa Ọnụ

Igwu Wayo—Nsogbu Zuru Ụwa Ọnụ

Igwu Wayo—Nsogbu Zuru Ụwa Ọnụ

N’ỊBỤ onye na-adọrọ mmasị ma na-ekwu okwu nwayọọ nwayọọ, Wayne yiri kpọmkwem ụdị onye Karen nọ na-achọ ka ọ bụrụ di ya. “Ọ bụ kpọmkwem ụdị nwoke m kpeworo ekpere ma nwee olileanya ịlụ,” ka Karen kwuru. “Onye ọ bụla hụrụ anyị chere na anyị kwesịrị nnọọ onwe anyị. O mere ka m kwenye na ọ hụrụ m n’anya ọbụna ruo n’ụkwụ m zọrọ n’ala.”

Otú ọ dị, e nwere otu nsogbu dịnụ. Wayne gwara Karen na ya bụ osote onye na-esote onyeisi n’Ụlọ Ọrụ Nzuzo Na-enweta Ihe Ọmụma Banyere Ndị Iro n’Australia. Ọ chọrọ ịgba arụkwaghịm, ma ha ekweghị. Ọ maara ihe dị ukwuu banyere ihe omume ha. Ha ga-egbu ya! Mmadụ abụọ ahụ jikọrọ aka chepụta otu atụmatụ. Ha ga-alụ, tụkọta ihe ha nwere ọnụ, hapụ Australia, ma gbaga Canada. Karen rere ụlọ ya na ihe ọ bụla ọzọ o nwere ma were ego o retara nye Wayne ka o jide.

Agbamakwụkwọ ahụ weere ọnọdụ dị ka ha mere atụmatụ ya. Wayne gbapụrụ ná mba ahụ, Karen ewee bụrụ onye a hapụrụ, onye a gbahapụrụ, nke nwere ihe na-erughị dollar isii n’ụlọ akụ̀. N’oge na-adịghị anya, ọ bịara chọpụta na ya abụrụwo onye e ji ụgha ndị katara ahụ́ a sara anya mmiri ghaa, ghọgbute. Dị nnọọ ka onye na-eme ihe nkiri, Wayne mere ka à ga-asị na ọ bụ ụdị onye ọ na-abụghị—ụdị onye Karen ga-enwe nnọọ mmasị n’ebe ọ nọ. Nzụlite ya, ihe ndị na-amasị ya, ụdị onye ọ bụ, na anya ọ sịrị na ọ hụrụ ya bụcha ntò e leziri anya fụọ iji mee ka Karen tụkwasị ya obi—ntụkwasị obi nke furu Karen ihe karịrị dollar 200,000. Otu onye uwe ojii kwuru, sị: “E mewo ya ihe mgbawa obi. Hapụgodị ego e gwunaara ya—ókè ndị mmadụ pụrụ iru n’ime mmadụ ihe mgbawa obi dị nnọọ egwu.”

“Isi na-agba m ghara ghara,” ka Karen kwuru. “Ụdị nwoke o mere ka à ga-asị na ọ bụ abụghị onye ọ bụ n’ezie.”

Karen bụ nanị otu n’ime imerime ndị a na-egwu wayo gburugburu ụwa. A maghị ego ole a na-egwunara ndị ọzọ, ọ bụ ezie na a na-eme atụmatụ na ọnụ ego ahụ dị ọtụtụ narị ijeri dollar, ọ na-arịwanyekwa elu kwa afọ. E wezụga mfu ego, ndị e gwuru wayo dị ka Karen na-enwe obi mgbawa n’ịmara na mmadụ—ọ na-abụkarị onye ha tụkwasịrị obi—ghọgburu ha.

Mgbochi Ọrịa Dị Mma Karịa Ọgwụgwọ

A na-akọwa igwu wayo dị ka “atụmatụ mmadụ mere ma ọ bụ aghụghọ ọ ma ụma ghọọ iji nweta ego site n’ime ka à ga-asị na ọ bụ ụdị onye ọ na-abụghị, site n’ịgha ụgha ma ọ bụ site n’ikwe nkwa ụgha.” N’ụzọ dị mwute, a dịghị eme ọtụtụ ndị wayo ihe ọ bụla n’ihi na ọ na-esikarị ike ịnwapụta na a ma ụma n’ezie ghọgbuo mmadụ. Ọzọkwa, ọtụtụ ndị wayo ghọtara iwu nke ọma ma na-akụdo aka n’ebe ndị iwu na-akọwachaghị ihe nke ọma—ha maara otú e si egwu ndị mmadụ wayo n’ụzọ ndị siri ike ma ọ bụ n’ụzọ ndị na-agaghị ekwe mee ịgba ha akwụkwọ. Tụkwasị na nke ahụ, ịkpụpụ onye wayo n’ụlọikpe na-ewe ezigbo oge na ego. Dị ka ọ na-adịkarị, ndị a na-ama ikpe maka mpụ ha na-abụ ndị zuru ọtụtụ nde dollar ma ọ bụ ndị mere ihe na-awụ nnọọ akpata oyi n’ahụ́ ruo n’ókè nke ọtụtụ mmadụ ikwu okwu banyere ya. Ọbụna mgbe e jidere onye wayo ma nye ya ntaramahụhụ, ma eleghị anya, o mefuworị ma ọ bụ zoo ego ahụ o gwutere na wayo. N’ihi ya, ndị e gwuru wayo adịkebeghị enweta ego iti aka n’obi ọ bụla maka ego funahụrụ ha.

N’ikwu ya n’ụzọ dị mfe, ọ bụrụ na e gwuo gị wayo, o yikarịrị ka ọ dịghị ihe ị ga-eme banyere ya. Ọ kasị nnọọ mma izere ịbụ onye e gwuru wayo karịa ịnwa ịchọ ụzọ ị ga-esi nwetaghachi ego gị mgbe e gwusịworo gị wayo. Otu nwoke amamihe dere n’oge dị anya gara aga, sị: “Onye nwere ezi uche ahụwo ihe ọjọọ, wee zobe onwe ya: ma ndị na-enweghị uche agabigawo, e wee rie ha nha.” (Ilu 22:3) Isiokwu na-esonụ ga-akọwa ụzọ ndị ị pụrụ isi chebe onwe gị pụọ n’ịbụ onye e gwuru wayo.