Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ịgba Alụkwaghịm Ọ̀ Bụ Ngwọta Ya?

Ịgba Alụkwaghịm Ọ̀ Bụ Ngwọta Ya?

Echiche nke Bible

Ịgba Alụkwaghịm Ọ̀ Bụ Ngwọta Ya?

N A Britain, onye ụkọchukwu anabata ndị gbakọtara maka ememe. N’ihu ya, e nwere otu di na nwunye guzo ọtọ, tinyere ọtụtụ ezigbo ndị enyi ha na ụmụ ha. Hà bịara ememe agbamakwụkwọ ọzọ na-enye obi ụtọ? Ọ dịghị ma ọlị! Ememe a bụ maka iji weta alụmdi na nwunye ha ná njedebe. Ee, ịgba alụkwaghịm aghọwo ihe a na-emekarị nke na chọọchị ụfọdụ eguzobewo ememe ịgba alụkwaghịm!

Ị̀ na-eche echiche ịgba alụkwaghịm? Ọ bụrụ otú ahụ, itisa alụmdi na nwunye gị ọ̀ ga-eme ka i nwekwuo obi ụtọ ná ndụ n’ezie? È nwere ihe ndị dị irè gị na nwunye gị pụrụ ime iji nweta obi ụtọ?

“Ha Ewee Ghọọ Otu Anụ Ahụ́”

Mgbe e jikọrọ mmadụ abụọ mbụ ahụ n’alụmdi na nwunye, Chineke kwuru na nwoke ‘ga-arapara n’ahụ́ nwunye ya: ha ewee ghọọ otu anụ ahụ́.’ (Jenesis 2:24) N’ihi ya, e mere alụmdi na nwunye ka ọ bụrụ nkekọ ga-adịgide adịgide. Ọ bụ ya mere Jizọs ji mesịa kwuo na “ịkwa iko” bụ nanị ihe ndabere Akwụkwọ Nsọ maka ịgba alụkwaghịm, bụ́ nke ga-eme ka o kwe omume ịlụgharị di ma ọ bụ nwunye.—Matiu 19:3-9. *

Nke a na-emesi ike mkpa ọ dị iguzosi ike n’ihe ná nkwekọrịta alụmdi na nwunye. Gịnịkwanụ ma ọ bụrụ na nsogbu ndị dị n’alụmdi na nwunye unu siri nnọọ ike?

Ịgba Alụkwaghịm Ọ̀ Bụ Ihe Amamihe Dị na Ya Ime?

Jizọs setịpụrụ ụkpụrụ anyị pụrụ iji tụlee ihe ndị pụrụ isi n’omume anyị apụta, mgbe ọ sịrị: “A na-anwapụta na amamihe ziri ezi site n’ọrụ ya.” (Matiu 11:19) Gịnị ka ihe ndị na-esi n’imerime alụkwaghịm na-enweghị isi a na-agba taa, apụta, na-egosi?

“E kwubigawo okwu ókè banyere uru ịgba alụkwaghịm bara,” ka Prọfesọ Linda Waite na-ekwu, bụ́ ọkà mmụta mmekọrịta ọha na eze na Mahadum Chicago, bụrụkwa onyeisi nke ìgwè ndị ọkà mmụta bụ́ ndị na-amụ banyere alụmdi na nwunye ndị obi ụtọ kọrọ na ha. N’otu aka ahụ, mgbe o tinyesịrị afọ 11 n’ịmụ banyere mmeghachi omume nke ọtụtụ puku mmadụ, Prọfesọ Michael Argyle nke Mahadum Oxford, chọpụtara na “ndị na-enwe obi ụtọ kasị nta n’ụwa bụ ndị gbara alụkwaghịm ma ọ bụ ndị mere nkewa.” N’ihi gịnị ka nke ahụ ji dị otú ahụ?

Ọ bụ ezie na ịgba alụkwaghịm pụrụ iwepụ nsogbu ụfọdụ, ọ pụkwara ịkpata ọtụtụ ihe ndị na-egbu mmụọ bụ́ ndị ị na-agaghị achịkwali. N’ezie, nnyocha e mere na-egosi na ịgba alụkwaghịm adịghị ebelatakebe ihe mgbaàmà nke ịda mbà n’obi ma ọ bụ kwalite ùgwù onwe onye.

Ọ bụrụgodị na alụmdi na nwunye gị abụghị “ịgba,” ịnọgide na ya pụrụ ịbara gị uru. Ọtụtụ ndị kpebiri ime otú ahụ na-enweta obi ụtọ. Prọfesọ Waite na-ekwu, sị: “A na-edozi ọtụtụ nsogbu ka oge na-aga, o yikwara ka ndị di na nwunye hà na-abịa nwee obi ụtọ karị.” N’eziokwu, otu nnyocha e mere na-egosi na ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ mmadụ 8 n’ime mmadụ 10 ọ bụla, bụ́ ndị “na-enwetụghị obi ụtọ” n’alụmdi na nwunye ha ma zere ịgba alụkwaghịm, bịara nwee nnọọ “obi ụtọ n’alụmdi na nwunye” ha afọ ise mgbe e mesịrị. Ya mere, ọ bụrụgodị na e nwee nsogbu ndị siri ike, ndị di na nwunye ekwesịghị iji ọsọ gbaa alụkwaghịm.

Nzọụkwụ Ndị Dị Irè

Ndị na-eche echiche ịgba alụkwaghịm kwesịrị ịjụ onwe ha ma ihe ndị ha tụrụ anya ya n’alụmdi na nwunye hà bụ ndị ezi uche dị na ha. Usoro mgbasa ozi anọwo na-egosikarị ihe nkiri nke nwoke na nwanyị ndị nwere mmekọrịta ịhụnanya, bụ́ ndị mesịrị nwee agbamakwụkwọ hiri ụdụ, ma e mechizie ihe nkiri ahụ dị ka akụkọ ifo. Mgbe a gbasịrị akwụkwọ, ihe agaghị ka e si chee ya pụrụ ịkpalite esemokwu n’ihi emezughị ihe ndị dị ukwuu a tụrụ anya ha. Ka esemokwu na-arịwanye elu, a na-abịa nwee ọnọdụ nke iwe iju ha obi. Ịhụnanya na-amalite ịdakpọ, ka oge na-agakwa, iwe na ịkpọasị na-ewere ọnọdụ. N’ọnọdụ ndị dị otú ahụ, ụfọdụ pụrụ iche na nanị ihe a ga-eme bụ ịgba alụkwaghịm.—Ilu 13:12.

Kama ikwe ka echiche na-ezighị ezi na-emetụta otú i si ele ihe anya, soro ndị na-eguzosi ike ná nkwekọrịta alụmdi na nwunye ha na-akpakọrịta. A gbara Ndị Kraịst ume ka ha ‘nọgide na-akasirịta ibe ha obi ma na-ewulirịta ibe ha elu.’ (1 Ndị Tesalonaịka 5:11) N’eziokwu, ọ dị ndị nwere nsogbu n’alụmdi na nwunye ha mkpa inweta agbamume site n’aka ndị kwere ekwe ibe ha.

Ịdị Mkpa nke Àgwà Nsọpụrụ Chineke

“Yikwasịnụ onwe unu mmetụta ndị dị nro bụ́ ọmịiko, obiọma, ịdị umeala n’obi, ịdị nwayọọ, na ogologo ntachi obi,” ka Pọl onyeozi gbara anyị ume. (Ndị Kọlọsi 3:12) Àgwà nsọpụrụ Chineke pụrụ ichekwa ịdị n’otu nke alụmdi na nwunye n’oge e nwere nsogbu.

Dị ka ihe atụ, Pọl dere, sị: “Nọgidenụ na-anagiderịta ibe unu ma na-agbaghara ibe unu kpamkpam ma ọ bụrụ na onye ọ bụla nwere ihe mere ọ ga-eji mee mkpesa megide ibe ya.” (Ndị Kọlọsi 3:13) Christopher Peterson, bụ́ ọkà n’akparamàgwà mmadụ na Mahadum nke Michigan na-ekwu, sị: “Mgbaghara bụ àgwà nke ya na obi ụtọ nwere njikọ kasị chie anya.”

Obiọma, ịdị nro, na mgbaghara na-eduje n’ịhụnanya, nke bụ́ “ihe nkekọ zuru okè nke ịdị n’otu.” (Ndị Kọlọsi 3:14) Ihe ịrụ ụka adịghị ya na ọ dị mgbe unu hụrịtara onwe unu n’anya ma nwee obi ụtọ. Ùnu pụrụ inweghachi ịhụnanya ahụ unu nwere na mbụ? Otú ọ sọrọ ọnọdụ unu ya siruo n’ike, karanụ obi. Olileanya dị. N’eziokwu, ịrapagidesi ike n’ebe ibe unu nọ ma na-etinye ụkpụrụ Bible n’ọrụ pụrụ iwetara unu obi ụtọ dị ukwuu karịa ka unu chere na ọ pụrụ ikwe mee. N’eziokwu, mgbalị unu ga-etinye na nke a ga-eme ka obi Jehova Chineke, Onye guzobere alụmdi na nwunye, ṅụrịa.—Ilu 15:20.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 6 Ọgbakọ Ndị Kraịst nke Ndịàmà Jehova na-asọpụrụ ikike nke di ma ọ bụ nwunye aka ya dị ọcha nwere n’ikpebi ma ọ̀ ga-agba di ma ọ bụ nwunye ya kwara iko alụkwaghịm ma ọ bụ na ọ gaghị agba ya. Lee Teta! nke May 8, 1999, peeji nke 5-9.