Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ụdị Nna nke Dị Ụmụaka Mkpa

Ụdị Nna nke Dị Ụmụaka Mkpa

Ụdị Nna nke Dị Ụmụaka Mkpa

Ọ DỊ ụmụaka mkpa inwe nna nke hụrụ ha n’anya, nke dị njikere ịkwado ha, nakwa nke na-eme ihe nile ọ pụrụ ime iji nyere ha aka ito ghọọ ndị okenye na-akpa ezi àgwà, ndị a pụrụ ịtụkwasị obi. E lebabereghị eziokwu ahụ bụ́ na ụdị nna a dị ụmụaka mkpa anya otú kwesịrịnụ.

N’eziokwu, ọ bụ ndị nne na-amụbata ụmụ n’ụwa, ọ bụkwa nnọọ eziokwu na ịbụ ezi nne dị mkpa. Ma n’ikwu na nna na-ekerekwa òkè dị oké mkpa otú ahụ, magazin bụ́ The Wilson Quarterly kwuru, sị: “Ọdịda ndị bụ́ nna na-ada n’ịrụ ọrụ ha nke ọma bụ isi ihe na-akpata nsogbu ndị kasị njọ a na-enwe n’America”—anyị pụkwara ịgbakwụnye, sị, nakwa n’ụwa nile.

Akwụkwọ akụkọ Brazil bụ́ Jornal da Tarde na-akọ banyere otu nnyocha e mere bụ́ nke gosiri na ọtụtụ nsogbu akparamàgwà ndị ntorobịa na-enwe—dị ka ime ihe ike, ịwa anya, emeghị nke ọma n’ụlọ akwụkwọ, na enweghị mmasị n’ihe—‘na-abịakarị n’ihi nna ịgbahapụ ụmụ ya.’ Akwụkwọ Ịtali bụ́ Gli imperfetti genitori (Nne na Nna Na-ezughị Okè) nke Marcello Bernardi dere, na-emesikwa ya ike na, n’ụzọ kasị mma, ọ dị ụmụaka mkpa inwe ma nne ma nna iji na-eto nke ọma.

A Pụrụ Ime Ka Ndụ Ezinụlọ Ka Mma

Ọ bụrụgodị na nna nke na-adịghị elebara ụmụ ya anya so kpata nsogbu n’ezinụlọ ma ọ bụ na ọ bụ ya kpatara ya n’ụzọ bụ́ isi, ọ pụtaghị na a pụghị idozi nsogbu ahụ ma mee ka ndụ ezinụlọ ka mma. N’ụzọ dị aṅaa? Gịnị ka ọ dị nna ahụ mkpa ime?

N’ụzọ doro anya, ezinụlọ a haziri nke ọma dị ụmụaka mkpa, ọ dị ha mkpa inwe echiche bụ́ na onye bu ọdịmma ha n’obi na-achị ya. Mgbe a na-egboghị mkpa ahụ, dị ka ọ na-adịkarị taa, ọ na-emetụta ndụ ụmụaka n’ụzọ dị njọ. Otú ọ dị, olileanya ka dịkwa, ma nna ọ̀ nọ ya ma ọ bụ na ọ nọghị ya. “Nna nke ụmụ mgbei,” ka Bible na-ekwu n’Abụ Ọma 68:5, “ka Chineke bụ n’ebe obibi Ya dị nsọ.” *

Otú E Si Enweta Enyemaka

Ọnọdụ ahụ Lidia, bụ́ nwa agbọghọ ahụ si Poland, nke a kpọtụrụ aha n’isiokwu bu ụzọ, kọrọ banyere ya, na-anwapụta eziokwu ahụ bụ́ na enyemaka Chineke dị mkpa iji nwee ihe ịga nke ọma nakwa na a pụrụ inweta ya. Olee ihe ndụ ezinụlọ ha dịịrị ka ya? Olee otú ezinụlọ ahụ si nweta enyemaka Chineke?

Franciszek, bụ́ nna Lidia, na-ekweta na mgbe ụmụ ya dị obere, na ya leghaara ezinụlọ ya anya, dị nnọọ ka nwa ya nwanyị kọrọ. Ọ na-ekwu, sị: “Achọghị m ịma ihe ụmụ anyị nọ na-eme. Egosighị m ha mmetụta ịhụnanya, ọ dịghịkwa nkekọ ọ bụla dị n’etiti anyị.” N’ihi ya, ọ maghị na mgbe Lidia dị afọ 14, ya na nwanne ya nwoke na nwanne ya nwanyị ndị ọ tọrọ amalitelarị ịga oriri oké mkpọtụ, ise siga, ịṅụ ihe ọṅụṅụ na-aba n’anya, na ịlụ ọgụ.

N’ikpeazụ, Franciszek bịara ghọta nsogbu ụmụ ya nọ na-aba na ya, ọ wụkwara ya akpata oyi n’ahụ́ nke na o mere ihe banyere ya. “Ekpekuru m Chineke ekpere maka enyemaka,” ka ọ na-ekwu. N’ụzọ dị ịrịba ama, n’oge na-adịghị anya mgbe e mesịrị, Ndịàmà Jehova gara n’ụlọ ya, ya na nwunye ya kwetakwara ịmụ Bible. Ka oge na-aga, nne na nna ahụ malitere itinye ozizi Bible n’ọrụ ná ndụ ha. Mmetụta dị aṅaa ka o nwere n’ebe ụmụ ha nọ?

Franciszek na-akọwa, sị: “Ha malitere ịhụ na m akwụsịla ịṅụ mmanya ma malite ịghọ nna ka mma. Ha bịara chọọ ịmatakwu Ndịàmà Jehova nke ọma. Ha malitekwara ịmụ Bible ma kwụsị iso ndị ọjọọ na-akpakọrịta.” Nwa ya nwoke, bụ́ Rafał, na-ekwu banyere nna ya, sị: “Abịara m hụ ya n’anya dị ka enyi m.” Ọ na-agbakwụnye, sị: “Na mberede, abịara m bụrụ onye na-enweghịzi mmasị n’ajọ òtù okporo ámá. Anyị bịara rụsiwe ọrụ ndị metụtara ihe ime mmụọ ike.”

Franciszek bụzi Onye Kraịst bụ́ okenye n’ọgbakọ nke Ndịàmà Jehova, ọ ka na-ekerekwa òkè ná ndụ ezinụlọ ya, nakwa n’uto ime mmụọ nke onye nke ọ bụla. Nwunye ya na Lidia bụ ndị ọsụ ụzọ, ndị na-ezisa ozi ọma oge nile. Rafał na nwanne ya nwanyị nke ọ tọrọ, bụ́ Sylwia, na-eji obi ha dum ekere òkè n’ọmụmụ Bible, n’ịza ajụjụ ná nzukọ Ndị Kraịst, nakwa n’ịgwa ndị ọzọ ihe ndị ha kweere.

O Mere Dị Ka Ihe Ọ Kụziri Si Dị

Tụleekwa banyere ihe mere Luis, bụ́ nna Macarena. Cheta na ọ bụ ya bụ nwa agbọghọ ahụ dị afọ 21 nọ na Spen bụ́ onye e hotara ihe o kwuru n’isiokwu bu ụzọ. Ụzọ ndụ Luis bịara yie nke nna ya bụ́ onye aṅụrụma. Dị ka Macarena kwuru, ọ na-esoro ndị enyi ya pụọ, ọ dịghị onye ga-ahụ ya anya ruo ọtụtụ ụbọchị. Ọzọkwa, ọ na-emeso nwunye ya dị ka ohu kama ịbụ onye ibe e ji kpọrọ ihe. Alụmdi na nwunye ha chọwara itisa, Macarena na ụmụnne ya ndị nke ọ tọrọ bịakwara nọrọ n’obi nkoropụ.

Otú ọ dị, ka oge na-aga, Luis kwetara iso Ndịàmà Jehova mụọ Bible. Ọ na-akọwa, sị: “Amalitere m iso nwunye m na ụmụ m na-anọrị. Anyị bịara na-ekwurịta okwu, na-erikọ nri ọnụ, na-amụkọkwa Bible ọnụ. Anyị kekwaara òkè n’ịrụ ọrụ ụlọ nakwa ná ntụrụndụ.” Macarena na-ekwu, sị: “Amalitere m inwe mmetụta nke ịbụ onye nwere nna dị obiọma bụ́ onye na-egosi ezi mmasị n’ezinụlọ ya.”

N’ụzọ dị ịrịba ama, ọ bụghị nanị na Luis gbara ezinụlọ ya ume ijere Chineke ozi, kamakwa o mere dị ka ihe ọ kụziri si dị. Ọ hapụrụ “otu ọrụ achụmnta ego na-aga nke ọma,” ka Macarena na-akọwa, “n’ihi na ọ na-eri ya oge dị ukwuu ebe ọ chọkwaranụ itinye oge ka ukwuu n’ihe ndị metụtara ezinụlọ ya.” Ọ rụpụtara ihe dị ịrịba ama. “Ihe nlereanya ya akụziworo m otú e si eme ka anya legide otu ebe, kụziekwara m ibute ihe ime mmụọ ụzọ,” ka Macarena na-ekwu. Macarena na-eje ozi ugbu a dị ka ọsụ ụzọ, nne ya na ụmụnne ya ndị ọ tọrọ na-ekerechikwa òkè anya n’ọgbakọ Ndị Kraịst.

Mkpebi Ọga Kpata Kpata ahụ Na-arụ n’Ụlọ Ọrụ Ụgbọ Okporo Ígwè Mere

N’ụzọ doro anya, ụdị nna dị ụmụaka mkpa bụ nke na-eburu ọdịmma nke ụmụ ya n’uche eme mkpebi. Nwa nwoke nọ n’afọ iri na ụma nke Takeshi Tamura, bụ́ ọga kpata kpata Japan ahụ a kpọtụrụ aha n’isiokwu bu ụzọ, malitere inwe mkpakọrịta ọjọọ, o yikwara ka ọ̀ na-aga iche aka ghọrọ nsogbu. Nke ahụ bụ na 1986, bụ́ afọ Takeshi kpebiri ịhapụ ọkwa ya dị elu n’Ụlọ Ọrụ Ụgbọ Okporo Ígwè nke Mba Japan. Olee otú Takeshi si ele mkpebi ya anya ugbu a, ihe karịrị afọ 18 o mesịrị mkpebi ahụ?

“Ma eleghị anya, ọ bụ mkpebi kasị mma m metụrụla,” ka o kwuru na nso nso a. “Iwepụtakwu oge iji na-anọnyere nwa m nwoke nakwa anyị imekọ ihe ọnụ, gụnyere iso ya na-amụ Bible, nwere mmetụta dị ịrịba ama. Anyị ghọrọ enyi, ọ kwụsịkwara mkpakọrịta ọjọọ ya na omume na-ezighị ezi.”

Nwunye Takeshi ghọrọ otu n’ime Ndịàmà Jehova afọ ole na ole tupu mgbe ahụ, ọ bụkwa àgwà ọma ya kpaliri di ya ileba anya na Bible ma na-etinyekwu anya n’ihe metụtara ezinụlọ ya. N’ikpeazụ, Takeshi, nwa ya nwoke, na nwa ya nwanyị ghọchara Ndịàmà. Takeshi na nwa ya nwoke na-eje ozi ugbu a dị ka ndị okenye n’ọgbakọ ha dị iche iche, nwunye ya na nwa ha nwanyị bụkwa ndị ọsụ ụzọ.

Enyemaka Dị Ndị Nna Mkpa

Ọtụtụ ndị bụ́ nna, n’agbanyeghị na ha ghọtara na ha na-eleghara ụmụ ha anya, amaghị ihe ha ga-emere ha. Akwụkwọ akụkọ ndị Spen bụ́ La Vanguardia buru isiakụkọ bụ́ “Pasent 42 nke Ndị Nne na Nna [Bụ́ Ndị Spen] Ekweta na Ha Amaghị Otú Ha Ga-esi Zụlite Ụmụ Ha Ndị Nọ n’Afọ Iri na Ụma.” Ma a pụkwara ikwu otu ihe ahụ banyere ndị nna nke ụmụaka ndị na-erubeghị afọ iri na atọ nakwa nke ụmụaka na-amụ ije. N’ụzọ dị iche n’ihe ọtụtụ ndị na-eche, ọ dịkwa ụmụaka ndị a mkpa inwe nna nke na-anọ ya ma na-elebara ha anya.

Gịnị ọzọ ka a pụrụ ịmụta banyere ụzọ isi ghọọ ezi nna? Ole ndị bụụrụ ndị nna ihe nlereanya kasị mma, gịnịkwa ka a pụrụ ịmụta n’aka ha? Isiokwu ikpeazụ anyị n’usoro isiokwu a ga-atụle ajụjụ ndị a.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 7 Biko lee isiakwụkwọ bụ́ “Ezinụlọ Ndị Nwere Nanị Nne Ma Ọ Bụ Nna Pụrụ Ịga nke Ọma!” n’akwụkwọ bụ́ Isi Ihe Na-akpata Obi Ụtọ Ezinụlọ, nke Ndịàmà Jehova bipụtara.

[Foto ndị dị na peeji nke 17]

Nna ndị gboro mkpa ụmụ ha

Franciszek na ezinụlọ ya

Luis na ezinụlọ ya

Takeshi na ezinụlọ ya